Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Okpukpe Na-amasịru Ndị Na-eto Eto?
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA FRANCE
NYE ndị na-eto eto 750,000 nọ n’ebe ahụ, nke a gaje ịbụ uhuruchi nke oké obi ụtọ. Ha fegharịrị ọkọlọtọ, gụọ egwú, kụọkwa aka. Ụzarị ìhè na ihe ndị na-agbapụ ọkụ jupụtara ebe nile, ndị na-eti egwú kpasukwara ìgwè mmadụ ahụ. Ebe ahụ yiri “nnukwute ebe a na-agba egwú disko.” N’ikpeazụ, n’iti mkpu otuto, nwoke ha nọrịị na-eche pụtara n’ọgbọ.
Nke a ọ̀ bụ mmalite nke njem nleta ụwa nke otu òtù egwú rock? Ee e. Ọ bụ nzukọ okpukpe nke ìgwè mmadụ e nwere na Paris n’oge Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa nke Katọlik, nwoke ahụ abụghịkwa onye ọzọ ma e wezụga Popu John Paul nke Abụọ!
Nye ụfọdụ ndị, mmasị ndị na-eto eto na-enwe n’ememe okpukpe dị ka nke a pụrụ ịbụ ihe ijuanya. Ma ugbu a usoro mgbasa ozi na-ekwu okwu banyere ntụte okpukpe n’etiti ndị ntorobịa.
Ọdịdị A Na-ahụ Anya
N’elu elu, okpukpe pụrụ iyi ka ọ na-eme nke ọma. Ihe dị ka pasent 68 nke ndị na-eto eto bụ́ ndị Europe na-ekwu na ha so n’otu okpukpe, ọnụ ọgụgụ a gafekwara pasent 90 n’Ireland. N’Armenia, nke bụbu ripọblik nke Soviet bụ́ ebe ọtụtụ ndị na-elebu okpukpe anya dị ka ihe ncheta nke ọgbọ gara aga, otu onye ụkọchukwu kwuru banyere chọọchị ndị juziri eju ugbu a bụ́ ndị nweburu mgbe ha tọgbọ chakoo, sị: “Ndọrọ nke okpukpe na-adọrọ ndị na-eto eto na-eju m anya.”
N’ọtụtụ mba usoro mgbasa ozi akọsawo banyere aka ndị na-eto eto na-etinye n’òtù okpukpe ndị a na-amachaghị na n’òtù mmụọ nsọ dị iche iche. Ememe okpukpe, dị ka nke ahụ e hotara ná mmalite, na-ewu ewu. Otú ọ dị, gịnị na-eme mgbe anyị nyobara anya n’ime?
Inyobakwu Ya Anya
Inyobakwu ya anya na-ekpughe na na 1967, pasent 81 nke ndị ntorobịa bụ́ ndị France kwere na Chineke, ma na 1997, ọnụ ọgụgụ ahụ erughị ọkara. Na Europe nile, nanị pasent 28 nke ndị na-eto eto kwere na Chineke bụ́ onye. Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ọ bụ nanị pasent 12 nke ndị ntorobịa bụ́ ndị Europe na-ekpechi ekpere anya. Olee otú nke a si apụta ìhè n’otú ndị ntorobịa si ele okpukpe anya?
Na Denmark, pasent 90 nke ndị na-eto eto na-ekwu na ha so n’okpukpe mba ahụ. Nanị pasent 3 na-akọwa onwe ha dị ka ndị òtù ya siri ike. Na 1997 otu njụta echiche nke La Croix mere, bụ́ akwụkwọ akụkọ ndị Katọlik na France, gosiri na pasent 70 nke ndị ntorobịa bụ́ ndị France kwetara na okpukpe enweghị mmetụta ọ bụla n’ezie ná ndụ ha. Ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ n’ime ha weere ahụmahụ onwe onye n’ihe dị mkpa karịa nkụzi okpukpe. Ọ bụkwa otu ihe ahụ n’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná mba Europe ndị ọzọ.
N’ihi gịnị ka ndị na-eto eto ji na-agbakụta chọọchị azụ? Nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha, okpukpe ndị bụ́ isi adịghị eme ka e nwee obi ike. Dị ka ihe atụ, na France, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-eto eto na-eche na okpukpe bụ ihe na-akpata nkewa n’ụwa. Ọzọkwa, a na-ahụkarị ndị ntorobịa bụ́ ndị nwere echiche yiri nke Judith dị afọ 15, bụ́ onye Katọlik si Spain. Ọ sịrị: “Ekweghị m n’ihe chọọchị na-ekwu banyere omume ọma.” N’otu aka ahụ, Joseph dị afọ 20, onye si Taiwan, na-ahụ okpukpe dị ka nke “na-agbasobiga ọdịnala ókè.” Ma ọ bụrụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-eto eto ekweghị n’ihe okpukpe ha na-akụzi, olee ihe ha kwere na ya?
Okpukpe Kwekọro n’Ihe Mmadụ Chọrọ
Ugbu a ndị na-eto eto na-ahọrọkarị nkwenkwe okpukpe otú ha na-esi ahọrọ nri site ná ndepụta ihe oriri. “Omume kwekọrọ n’ihe mmadụ chọrọ” n’okpukpe ka otu magazin kpọrọ ya. Otu magazin ndị Katọlik kpọrọ ya “ikiri ihe dị n’okpukpe.” Echiche ndị nọbu na-aghọ ihe oge ha gafeworo bụ ihe ndị a na-ahụkarị ugbu a. N’ihi ya, na Europe ihe dị ka pasent 33 nke ndị na-eto eto kwenyere n’ọgwụ isi ọma, pasent 40 kwenyere na ndị dibịa afa pụrụ ịkọ ọdịnihu, pasent 27 kwenyekwara na kpakpando na-enwe mmetụta ná ndụ ndị mmadụ. Echiche ndị dị ka ịlọ ụwa bụzi akụkụ nke ihe ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ ndị Europe kwere na ha.
Ndịrịta iche nke nkwenkwe okpukpe buru ibu nke na ndị na-eto eto pụrụ ịhọrọ echiche ndị kwekọrọ n’ihe ndị ha chọrọ. Ole na ole kwenyere na ọ bụ nanị otu okpukpe nwere eziokwu ahụ. Ebe ndị na-eto eto na-ahọrọ ihe ndị masịrị ha, ọdịiche dị na nkwenkwe okpukpe ha na-adịwanye ntakịrị. N’ihi ya, ndị ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze na-ekwuzi banyere “mkpochapụ na-aga n’ihu n’ihu” ma ọ bụ “mbibi n’ozuzu ya” nke ụkpụrụ okwukwe ọkpụtọrọkpụ. N’ọnọdụ ime mmụọ dị otú a, olee otú okpukpe ndị bụ́ isi si emeghachi omume?
Ọchịchọ Okpukpe Na-achọ Ndị Ntorobịa
Okpukpe dị iche iche na-ahụ ya dị ka ihe ịma aka ịdọta mmasị ndị ntorobịa. Otu ụkọchukwu bụ́ onye France jụrụ ajụjụ banyere ìgwè mmadụ bịara ememe Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa nke Katọlik na Paris, sị: “Olee ebe ndị ntorobịa a si bịa? Enweghị m ndị ntorobịa na chọọchị m. Adịghị m ahụ ha.” N’ọchịchọ ya ịdọta na ijigide mmasị ndị ntorobịa, Chọọchị Katọlik aghaghị ịgbanwe ozi ya na otú e si ele ya anya.
“Chọọchị agbanwee ụzọ ya!” ka akwụkwọ akụkọ France bụ́ Le Figaro kpọsara. Maka ememe Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa nke 12 e mere na Paris, chọọchị jiri ụlọ ọrụ ndị ka mara banyere ịchịkọba ihe ngosi egwú rock mee ihe n’ilekọta ihe omume ahụ. E mere ihe ngosi gafere 300 iji mee ndị ntorobịa si ihe karịrị mba 100 obi ụtọ, a kwakwaara ndị ụkọchukwu uwe pụrụ iche.
N’ihi aghọtaghị ndị na-eto eto taa na ịmata mkpa ọ dị ime mgbanwe, ọtụtụ okpukpe na-aghọ okpukpe nke ngwakọta ihe dị iche iche. N’ikwekọ n’ụkpụrụ a, Michel Dubost, bụ́ onye ụkọchukwu haziri ememe Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa ahụ e mere na Paris, kwuru, sị: “N’ezie, ọ ga-amasị m ka ndị nile e mere baptism na-ekwesị ntụkwasị obi nye Kraịst. Ma a sịgodị na ha ekwesịghị, a ga-anabata ha na chọọchị.”
Ọchịchọ Ndị Ntorobịa Na-achọ Azịza
N’ime ka ọ pụta ìhè na ndị ntorobịa na-achọ azịza n’ezie, otu akwụkwọ akụkọ kọwara ọbịbịa ndị ntorobịa bịara ememe okpukpe ahụ e mere na Paris dị ka “iti mkpu maka okwukwe, kama ịbụ ngosipụta nke okwukwe.” Chọọchị Katọlik ò mere ihe maka mkpu ahụ?
Mgbe i wepụrụ ihe mfụchi ya ma ọ bụ nyoba anya n’ime ihe otu akwụkwọ akụkọ Katọlik kpọrọ “mmegharị anya” nke nnukwute ememe okpukpe, gịnị ga-afọdụ? Akwụkwọ akụkọ France bụ́ Le Monde kwuru banyere “enweghị ezigbo ihe dị” ya n’ime.
Ọ bụ ezie na otú ọ dị n’ile anya dị mkpa, ihe oriri aghaghị ịdị na-edozi ahụ. Ajụjụ ndị na-eto eto na-ajụ banyere nzube nke ndụ chọrọ azịza ndị na-eju afọ n’ụzọ ime mmụọ. Azịza ndị mara mma, ndị na-erijughị afọ a na-enye ndị ntorobịa adịghị eju ha afọ.
N’ịbụ ndị na-enweghị ezigbo ihe dị n’ime ha, ihe omume okpukpe ndị dị otú ahụ hà na-enwe mmetụta ọ bụla na-adịte anya n’ahụ ndị ntorobịa taa? Onye France bụ́ ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Danièle Hervieu-Léger kwuru, sị: “Oké ihe omume ndị a adịkebeghị eme ka e nwee mmetụta na-adịte anya n’etiti ọha mmadụ.” Ya bụrụ otú ahụ, olee ebe ndị na-eto eto pụrụ inweta azịza ndị na-eju afọ nye ajụjụ ha?
Azịza Ndị Na-eju Afọ
Na 1997 magazin France bụ́ Le Point bipụtara otu isiokwu banyere ihe isi ike ndị na-eto eto na-eche ihu. Tinyere ajụjụ dị iche iche banyere nzube nke ndụ bụ́ ndị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-eto eto na-ajụkarị, ndị ntorobịa aghaghịkwa ịnagide mpụ na ime ihe ike. Ọ̀ ga-ekwe omume imeri nke a? Isiokwu magazin ahụ kọwara, sị: “Mgbe ọ dị afọ 30, David malitere inwe nchegbu banyere mmetụta mmanya na-aba n’anya, ọgwụ ọjọọ, na ime ihe ike na-enwe n’ahụ ya. Ndịàmà Jehova kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ya, na-enwe azịza banyere olileanya o nwere maka inwere onwe ya. Ọ mụrụ ihe. O chegharirị. Ọ kwụrụ ụgwọ ịgba chaa chaa ndị o ji ma kwụghachi ndị nile na-amaghịdị na o gwuru ha wayo n’egwuregwu poker ụgwọ. Ọ nakwaghị ese siga, aṅụ mmanya, ma ọ bụ na-alụ ọgụ.”
Banyere ndị ntorobịa ndị ọzọ sooro Ndịàmà Jehova mụọ Bible, isiokwu ahụ gara n’ihu, sị: “Ha achọtawo azịza nye ajụjụ ha nile.” Otu Onyeàmà na-eto eto kwuru ya n’ụzọ dị mfe, sị: “Bible anọwo na-ekwu eziokwu kemgbe puku afọ abụọ, ya mere gịnị mere m ga-eji gaa n’ebe ọzọ maka nduzi?”
Okwu Chineke nwere ozi maka ndị ntorobịa. Okwu ndụmọdụ ya bara uru na-enyere ha aka ịnagide nsogbu nke taa ma na-enye ha ebe mgbakwasị ụkwụ siri ike maka ikweta n’ọdịnihu nke udo na òtù ụmụnna. N’ụwa nke na-agbanwe agbanwe mgbe nile, olileanya nke Bible na-enye bụ “arịlịka nke mkpụrụ obi, nke bụ́ ihe ntụkwasị obi na ihe na-eguzosi ike,” na-enye nkwụsi ike na nkasi obi. (Ndị Hibru 6:19) Ọtụtụ narị puku ndị ntorobịa achọtawo ezi nzube ná ndụ ha site n’iso Ndịàmà Jehova mụọ Bible. Ha ahụwo n’onwe ha otú Bible si arụpụta mgbanwe na-abụghị nanị n’elu elu. Site n’ịnakwere azịza Bible, ndị na-eto eto na-ahụ na a na-enyeghachi ọchịchọ ha na-achọ ezi okwukwe ụgwọ ọrụ.
[Foto dị na peeji nke 12]
Ememe okpukpe adọta ọtụtụ puku ndị ntorobịa na Paris
[Foto dị na peeji nke 13]
Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa e mere na Paris—ọ̀ bụ ezigbo ntụte okpukpe?