Ụkpụrụ Ime Mmụọ—Ebee Ka Ha Na-eche Ihu?
“Ụmụ nwoke 15 na ụmụ nwanyị 15 gara nnọkọ uhuruchi [ndị Katọlik] nke a na-anọ na ya enye ndị na-achọ ịlụ di na nwunye ndụmọdụ. N’ime mmadụ 30 ahụ gara nzukọ ahụ, ọ bụ nanị mmadụ 3 kwuru na ha bụ ndị kwere ekwe.”—La Croix, bụ́ akwụkwọ akụkọ ndị Katọlik a na-ebipụta kwa ụbọchị n’asụsụ French.
ỤKPỤRỤ okpukpe nọ ná nsogbu. N’ihu mbipụta ya nke July 12, 1999, magazin bụ́ Newsweek, mbipụta ya nke a na-eziga mba ndị ọzọ jụrụ, sị: “Chineke Ọ̀ Nwụọla?” Magazin ahụ zara na nye ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ Europe, o yiri n’ezie ka ọ dị otú ahụ. Ka akwụkwọ akụkọ ndị France bụ́ Le Monde na-akọ banyere nzukọ ndị isi Chọọchị Katọlik nwere na Rom n’October nke otu afọ ahụ, o kwuru, sị: “Ọ na-esiri Chọọchị ike ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ izi ọha mmadụ nke ozi ya ‘na-agbaka ntị’ ozi. . . . N’Ịtali, okpukpe Katọlik ejikọtaghịzi ndị mmadụ. . . . Na Germany, arụmụka e nwere banyere ebe ndị a na-enweta ndụmọdụ maka isikwopụ afọ ime na-eme ka a nọgide na-enwe nkewa n’etiti popu na ọchịchị onye kwuo uche ya nke na-adịghịzi njikere ịnabata okwu ike. Ụfọdụ ndị na-ekiri ihe na-emenụ amalitelarị ikwu na ọ bụ n’ihi nkwụsị [mba Netherlands] kwụsịrị Iso Ụzọ Kraịst na mberede mere o ji were nguzo siri ike o weere n’ihe banyere omume na igbu onye nọ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma n’ụzọ ọ na-agaghị anụ ụfụ ọnwụ.”
Otú ahụkwa ka ọ dị nnọọ n’ebe ndị ọzọ. Na 1999, Achịbishọp nke Canterbury, bụ́ George Carey, dọrọ aka ná ntị na Chọọchị England “ga-agba aka nwa n’ọgbọ na-abịanụ.” N’isiokwu bụ́ “Ọgwụgwụ nke Ndị Kraịst na Europe,” akwụkwọ akụkọ ndị France bụ́ Le Figaro kwuru, sị: “A pụrụ ịhụ otu ọnọdụ ahụ n’ebe nile. . . . Ndị mmadụ ji nwayọọ nwayọọ na-egosipụta obi abụọ banyere ụkpụrụ omume na nke nkwenkwe.”
Ọnụ Ọgụgụ Ndị Na-ekpe Okpukpe Na-adalata
Na Europe, ọnụ ọgụgụ ndị na-aga ụka na-adalata n’ụzọ dị egwu. Ọ bụ ihe na-erughị pasent 10 nke ndị France bụ́ ndị Katọlik na-aga Mas kwa Sunday, ebe nanị site pasent 3 ruo 4 nke ndị Paris bụ́ ndị Katọlik na-agachi ụka anya. A chọpụtawo na ọnụ ọgụgụ ndị na-aga ụka na United Kingdom, Germany, nakwa ná mba ndị dị na Scandinavia belatara otú ahụ ma ọ bụ ọbụna belata karị.
Nke kasị enye ndị ndú okpukpe nsogbu n’obi bụ otú e si nwee ụkọ nke ndị chọrọ ịbụ ndị ụkọchukwu. N’ihe na-erughị otu narị afọ, ọnụ ọgụgụ ndị ụkọchukwu nọ na France adalatawo n’ụzọ dị egwu, site ná ndị ụkọchukwu 14 maka mmadụ 10,000 ọ bụla bi na ya ruo ihe na-erughị 1 ụkọchukwu maka mmadụ 10,000 taa. N’ebe nile na Europe, nkezi afọ ndụ ndị ụkọchukwu na-agbago agbago, ndị ụkọchukwu kọkwara ụkọ ọbụna ná mba ndị dị ka Ireland na Belgium. N’otu mgbe ahụ, ọnụ ọgụgụ ụmụaka na-aga katkizim na-adalata adalata, na-eme ka a na-enwe oké obi abụọ banyere ikike Chọọchị Katọlik nwere ịhụ na o nwetaghachiri onwe ya.
Ọ na-eyi ka a dịghịzi enwe obi ike n’ihe banyere okpukpe. Ọ bụ nanị pasent 6 nke ndị France kweere na “a pụrụ ịchọta eziokwu ahụ nanị n’otu okpukpe,” jiri ya tụnyere pasent 15 nke ndị kweere otú ahụ na 1981 na pasent 50 nke ndị kweere otú ahụ na 1952. Ọnụ ọgụgụ ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe na-arịwanye elu. Ọnụ ọgụgụ ndị sị na ọ dịghị okpukpe ha na-ekpe amụbawo site na pasent 26 na 1980 ruo pasent 42 na 2000.—Les valeurs des Français—Évolutions de 1980 à 2000 (Ụkpụrụ Ndị France—Ihe Ndị Merenụ Site na 1980 Ruo 2000).
Mgbanwe Ndị Dị Ịrịba Ama E Nwere n’Ụkpụrụ Omume
A na-ahụkwa nsogbu amaghị ụkpụrụ a ga-agbaso n’ihe ndị metụtara omume. Dị ka e kwuru ná mmalite, ọtụtụ ndị na-aga ụka adịghị anakwere ụkpụrụ omume nke chọọchị ha. Ha ekwenyeghị n’echiche bụ́ na ọ bụ ihe ruuru ndị ndú okpukpe isetịpụ ụkpụrụ omume. Otu ìgwè mmadụ ahụ nakweere nguzo popu weere n’ihe ndị ruuru mmadụ na-ajụ ịkwado ya mgbe okwu ya metụtara ihe ndị gbasara ha. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ mmadụ, ọbụna ọtụtụ ndị di na nwunye bụ́ ndị Katọlik, na-eleghara ihe o kwuru banyere igbochi afọ ime anya.
Àgwà a na-emetụta ma ndị na-ekpe okpukpe ma ndị na-adịghị ekpe okpukpe, n’ebe nile. Ndị mmadụ na-anabata omume ndị a katọrọ n’ezoghị ọnụ n’Akwụkwọ Nsọ. N’afọ 20 gara aga, pasent 45 nke ụmụ amaala France na-asọ idina ụdị onwe asọ. Taa, pasent 80 na-ewere ya dị ka ihe na-adịghị ihe o mere. Ọ bụ ezie na ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ kwadoro ka di na nwunye na-ekwesị ntụkwasị obi nye ibe ha, ọ bụ nanị pasent 36 na-akatọ ịkwa iko nke ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye dị ka ihe na-ekwesịtụghị ekwesị.—Ndị Rom 1:26, 27; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Ndị Hibru 13:4.
Ịgwakọta Mmiri na Mmanụ n’Okpukpe
N’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, a malitela inwe okpukpe onye mere otú masịrị ya bụ́ nke onye ọ bụla iche na ọ bụ ihe ruuru ya ịhọrọ nkwenkwe ya. A na-anakwere nkwenkwe ụfọdụ ma na-ewezụga ndị ọzọ n’ụsọ. Ụfọdụ na-akpọ onwe ha Ndị Kraịst ma na-ekwere n’ịlọ ụwa, ndị ọzọ adịghịkwa ala azụ ịnọ n’òtù okpukpe dịgasị iche iche n’otu mgbe. (Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4, 20; Matiu 7:21; Ndị Efesọs 4:5, 6) Akwụkwọ bụ́ Les valeurs des Français gosiri n’ezoghị ọnụ na ọtụtụ ndị kwere ekwe taa na-akpafunyụ anya site n’ụzọ chọọchị wara.
Otú ọ dị, agwọ nọ n’akịrịka n’ihe banyere omume a zuru ebe nile nke ndị mmadụ n’otu n’otu iji aka ha na-ahọrọ nkwenkwe okpukpe ha. Onye na-akọ banyere okpukpe, bụ́kwa onye òtù Institut de France, bụ́ Jean Delumeau, kwenyesiri ike na o kweghị omume mmadụ iji aka ya guzobe okpukpe ya n’adabereghị n’okpukpe ọ bụla gbanyeworo mkpọrọgwụ. “Nkwenkwe okpukpe apụghị ịdịgide ma ọ bụrụ na ọ dabereghị kpọmkwem na nkwenkwe nke okpukpe kwụ chịm.” Ezi ụkpụrụ ime mmụọ na ihe omume okpukpe aghaghị ịbụ ndị nwere ebe ha hiwere isi. Ebee ka ha pụrụ ihiwe isi n’ime ụwa nke mgbanwe kpaworo aka ọjọọ?
N’akụkụ ya nile, Bible na-echetara anyị na ọ bụ Chineke na-esetịpụ ụkpụrụ omume na nke akparamàgwà ndị dị mma, ọ bụ ezie na o nyere ụmụ mmadụ nnwere onwe ịgbaso ha ma ọ bụ ịghara ịgbaso ha. Ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile na-aghọta na akwụkwọ a e ji kpọrọ ihe kemgbe ụwa bara ezigbo uru taa nakwa na ọ bụ ‘oriọna dịịrị ụkwụ ha, bụrụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ ha.’ (Abụ Ọma 119:105) Olee otú ha si ruo ná nkwubi okwu dị otú ahụ? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.