Osisi Na-abụ Abụ
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA KENYA
E NWERE otu osisi na-abụkarị abụ dị n’ala ahịhịa buru oké ibu nke Africa. Osisi ahụ bụ otu ụdị nke osisi acacia, a makwa ya dị ka osisi ogwu na-afụ opi. Ọ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na mgbe ikuku kufere n’alaka ya n’esighị ike, ọ na-adị ka osisi ahụ ọ na-afụ opi.
Mgbe ikuku kugharịrị ogwu osisi ahụ, bụ́ nke dịbigara ogologo ókè ma dị gịrịgịrị, ọ na-ada ụda dị mma, nke na-atọ ụtọ. Tụkwasị n’ụda ọma nke ogwu ndị ahụ, oghere dị n’akpụ nke osisi ahụ na-ada ụda dị nnọọ ka nke karama ihe na-adịghị mgbe e jiri ya fụọ opi. Ọ bụ ụmụ ahụhụ kpụrụ “ngwá egwú” ndị a, bụ́ ndị a sị na ha na-atụ ọnụ n’akpụ ndị ahụ, bụ́ ebe obibi dị okirikiri nke ụmụ ahụhụ ahụ, ha na-atụkwa obere ọnụ mbata na ọpụpụ n’ime ha. Ebe ọ bụ na akpụ na ọnụ ndị ahụ anaghị aha nhata, ha na-ada ụda dị iche iche. Ụda ndị a na-eme ka osisi ogwu ahụ na-afụ opi bụrụkwuo ọpụrụiche ma makwuo mma.
Osisi a na-echetara anyị okwu ọbụ abụ ahụ bụ́ onye kpọsara n’ụzọ ihe atụ, sị: “Osisi nile nke oké ọhịa ga-eti mkpu ọṅụ [n’abụ] n’ihu Jehova.” (Abụ Ọma 96:12, 13) N’ezie, mgbe ikuku kufere n’ogwu na akpụ ndị ahụ yiri opi, ha na-ada ụda ndị bụ abụ Africa mara mma, ndị na-emetụ n’ahụ.