Mgbe Oké Ifufe ahụ Kwụsịrị, Iso Ụzọ Kraịst Gara n’Ihu
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA MOZAMBIQUE
N’UHURUCHI March 2, 1998, oké ifufe fekwasịrị obodo ukwu bụ́ Maputo, dị na Mozambique. N’ụtụtụ echi ya, ihe ndị oké ifufe mebiri jupụtara n’ebe nile. Osisi ndị dara ada jupụtara n’ụsọ mmiri, mmiri na-ekwo ekwo mebiri ọtụtụ okporo ụzọ, ikuku kupụrụ elu ọtụtụ ụlọ, ụlọ ndị ọzọ dakwara.
Ụlọ ndị dị n’alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova guzoro kwem. Ma ụlọ otu onye agbata obi ha, bụ́ ụlọ osisi nkịtị e ji gbam gbam kụọ elu ya, eguzoghị nnọọ. Ụlọ ahụ esighị nnọọ ike iguzogide oké ifufe ahụ, ọ dakasịkwara. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, mmadụ nile nọ n’ụlọ ahụ, otu nwanyị na ụmụ ya ise anwụghị, ha emerụghịkwa ahụ. Otú ọ dị, n’ụzọ ihe onwunwe, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ihe ha nile funahụrụ ha.
N’isi ụtụtụ, ndị ọrụ afọ ofufo si n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society gara na nke ezinụlọ ahụ ma hụ ka ha na-ewepụta ihe ha ụfọdụ n’ime ụlọ ahụ dakasịrị adakasị. Ihe onwunwe funahụrụ ha kpatakwuuru ha iru újú, ebe ha na-enweghị ego ga-ezu iwughachi ụlọ ha. N’ịbụ ndị na-enweghị nna, ezinụlọ ahụ na-enweta nanị obere ego, bụ́ nke ha na-enweta site n’ire ihe n’ahịa dị n’ógbè ha.
Mgbe Ndịàmà Jehova tụlesịrị ọnọdụ ahụ, ha wepụtara onwe ha ngwa ngwa inye aka. E kpebiri na ihe ndị fọdụrụ n’ime ihe ndị e jiri wuo ụlọ ahụ mbụ adịghị mma iji ha mee ihe ọzọ. N’ihi ya otu ìgwè ndị ọrụ afọ ofufo chịkọtara ihe ndị dị mkpa ma malite iwu obere ụlọ siri ike.
Na mbụ ndị agbata obi ha chọrọ ịma ihe na-aganụ, ma n’oge na-adịghị anya o juru ha anya, mgbe ha hụrụ otú ọrụ ahụ si na-aga n’ihu ngwa ngwa. N’ime ụbọchị ise e wughachiri ụlọ ahụ kpam kpam, a pụkwara ibi ya ebi. Mgbe ọ banyere n’ụlọ ọhụrụ ya, nwanyị ahụ enweghị ọnụ okwu. Otú ọ dị, okwu adịghị mkpa, n’ihi na obi ụtọ nke nwanyị ahụ na ụmụ ya pụtara ìhè mgbe ndị ọrụ ahụ hụrụ ihu ọchị na anya ha jupụtara ná nnukwu ekele.
Ndị ọrụ afọ ofufe ahụ nwekwara obi ụtọ. Ha nwere obi ụtọ ịbụ ndị nwere ohere igosipụta mmụọ nke ezi Iso Ụzọ Kraịst n’ụzọ a hụrụ anya.—Ndị Galetia 6:10.
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
March 5
March 6
March 7
Ndịàmà nọ n’ógbè ha wughachiiri ezinụlọ a ụlọ ha