Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 7/8 p. 20-25
  • Chineke Abụwo Onye Inyeaka Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Abụwo Onye Inyeaka Anyị
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nzụlite Okpukpe
  • Ịmụta na Itinye Eziokwu n’Ọrụ
  • Iji Akọ Eme Nkwusa
  • Oge Ule Siri Ike
  • Ndụ n’Ogige Ndị Ahụ
  • Otú Anyi Si Mee Nkwusa
  • Ntọhapụ, na Ịlaghachi Maputo
  • Ịhazi Ibu Ọrụ
  • Ngọzi Ndị Sitere n’Aka Chineke Nọgidere Na-abịa
  • Ijere Jehova Ozi N’oge Dị Mma na N’oge Nsogbu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Jehova Na-eche Banyere Anyị Mgbe Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Idei Mmiri E Nwere na Mozambique—Otú Ndị Kraịst Si Lekọta Ndị O Metụtara
    Teta!—2001
Teta!—1999
g99 7/8 p. 20-25

Chineke Abụwo Onye Inyeaka Anyị

DỊ KA FRANCISCO COANA SI KỌỌ

“Ọ bụrụ na ị jụ irubere ndị ọchịchị isi, a ga-egbu gị!” ka nwanne m nwoke dọrọ m aka ná ntị.

“Nke ahụ ga-aka nnọọ mma karịa ibi ndụ n’ọnọdụ ndị a jọgburu onwe ha,” ka m zaghachiri.

NKE ahụ bụ mkparịta ụka mụ na deede m nwere na September 1975. Ọ bịara iwetara m ihe oriri n’oge a tụrụ m mkpọrọ na Maputo (ebe a na-akpọ Lourenço Marques n’oge ahụ), n’ebe ndịda Mozambique. A tụbakọtara anyị ihe karịrị mmadụ 180, nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị bụ Ndịàmà Jehova, n’ime otu ọnụ ụlọ nga. Nwanne m nwoke wesara m iwe nke ukwuu nke na o nyeghịdị m ihe oriri o wetaara m!

Iji nyere gị aka ịghọta nzukọ a na-emetụ n’ahụ, ka m laghachi azụ ma kọọ otú m si bịa n’ụlọ mkpọrọ.

Nzụlite Okpukpe

A mụrụ m na 1955 n’ezinụlọ na-eje Chọọchị Presbyterian n’obodo Calanga dị n’Ógbè Manica. Ebe a adịghị anya site n’obodo ukwu Maputo. Ọ bụ ezie na nna m adịghị eje chọọchị, nne m na-eje, ọ ga-akpọrọkwa ụmụ ya ise jee chọọchị n’ụbọchị Sunday. Mgbe anyị bụ ụmụaka, ọ kuziiri anyị Ekpere Onyenwe Anyị, m ga-ekpeghachikwa ya ọtụtụ mgbe. (Matiu 6:9-12) Dị ka nwata nwoke, ajụrụ m nne m ajụjụ ndị dị ka “N’ihi gịnị ka anyị ji anwụ anwụ?” na, “Ndị mmadụ hà ga na-anwụ anwụ mgbe nile?”

Nne m kwuru na ọnwụ bụ akụkụ nke nzube Chineke—na ndị mere ihe ọjọọ ga-aga ọkụ mmụọ, ndị mekwara ezi ihe ga-aga eluigwe. Ọ bụ ezie na azaghị m ihe ọ bụla, azịza ya wutere m. Eziokwu na-agbawa obi bụ́ na ọnwụ dị adị gburu m mgbu n’obi, karịsịa mgbe nna anyị, anyị hụrụ n’anya nwụsịrị mgbe m dị nanị afọ iri. M mesịrị nwee ọchịchọ siri ike ịma ihe banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ na ma hà nwere olileanya ọ bụla.

Ịmụta na Itinye Eziokwu n’Ọrụ

N’oge na-adịghị anya mgbe nna m nwụsịrị, otu n’ime ndị nkụzi ụlọ akwụkwọ anyị jiri akwụkwọ bụ́ Site Na Paradais Etufuru Rue Paradais Enweghachiri kụziere klas anyị ihe. Akwụkwọ ahụ, nke Watch Tower Bible and Tract Society bipụtara, dị n’asụsụ Zulu, bụ́ asụsụ ndị South Africa. Onye nkụzi ahụ kwere ka m gbaziri ya, ọ bụkwa ezie na amachaghị m asụsụ Zulu, ihe m mụtara n’akụkụ Bible ndị a kpọtụrụ uche na ha nyere m obi ụtọ.

Mgbe m dị afọ 16, a kpọrọ nwanne m nwoke bụ́ onye na-akpa afọ ezinụlọ anyị ije ozi agha. Mgbe ahụ ka m malitere ịrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-emepụta sent dị na Maputo na ije ụlọ akwụkwọ nkà na ụzụ n’abalị. N’oge ezumike nri ehihie n’ụlọ ọrụ, m na-ekiri Teófilo Chiulele, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova—ọ na-agụ Bible mgbe nile. Mgbe Teófilo chọpụtara mmasị m, ọ malitere ịgwa m okwu.

Mgbe e mesịrị, Onyeàmà ọzọ, bụ́ Luis Bila, malitere iduziri m ọmụmụ Bible. Obi ruru m ala ịmụta na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla nakwa na ha nwere olileanya nke ịbụ ndị a ga-eme ka ha dịghachi ndụ ná mbilite n’ọnwụ. (Eklisiastis 9:5, 10; Jọn 5:28, 29) Edegaara m nne m akwụkwọ ozi ngwa ngwa ma nye ya azịza ndị dabeere na Bible banyere ajụjụ ndị ahụ m jụrụ ya. O nwere obi ụtọ na emesiwo m chọta azịza ndị a pụrụ ịdabere na ha n’ikpeazụ.

N’ịbụ onye ịnụ ọkụ n’obi n’ihi ihe m na-amụta kpaliri, ejikeere m isoro ndị ọzọ kerịta ihe ndị a. E kwere ka m kwuo okwu dabeere na Bible n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụghị na chọọchị. N’oge na-adịghị anya a dịghịzi anabata m na chọọchị. Ọbụna ndị òtù ezinụlọ m malitere ịkpagbu m, n’agbanyeghị na nkwenkwe m chọtara ọhụrụ masịrị nne m. Deede tiri m ezigbo ihe. Mgbe mmegide dị otú ahụ na-emetụghị m, ndị òtù ezinụlọ anyị malitere ime m akaje, karịsịa mgbe ha hụrụ ka m na-ekpe ekpere n’oge nri. Ya mere m ga-ekpe ekpere n’ọnụ ụlọ ịsa ahụ tupu m bịa na tebụl iri nri. Enwere m mmetụta na “Chineke bụ onye na-enyere m aka.”—Abụ Ọma 54:4.

E gbochiziri Luis ịbịa duziere m Bible n’ụlọ anyị. Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị mụrụ ihe n’ụlọ ya. Mgbe m malitere ije nzukọ ọgbakọ ma na-ekere òkè n’ime nkwusa, a na-akpọchibido m ụzọ n’èzí mgbe m lọtara. N’ihi ya, m na-emesịzi hie n’ụlọ Ndịàmà dị iche iche.

N’ikpeazụ, na May 13, 1973, m gosipụtara nrara m rara onwe m nye Jehova Chineke site na baptism ime mmiri. N’oge ahụ, Mozambique nọ n’aka ọchịchị ndị Portugal, nke machibidoworo Ndịàmà Jehova iwu na Portugal na n’ebe nile ọ na-achị. N’October 1, 1974, aghọrọ m ọsụ ụzọ, dị ka Ndịàmà Jehova na-akpọ ndị na-ezisa ozi ọma oge nile. Ebe ihe mgbaru ọsọ m bụ ịghọ onye ozi ala ọzọ, amalitere m ịmụ Bekee ka m wee nwee ike iru eru ije ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead, na United States, maka ọzụzụ ozi ala ọzọ.

Iji Akọ Eme Nkwusa

N’afọ ndị ahụ nke mmachibido iwu, ndị uwe ojii nke ọchịchị ndị Portugal, bụ́ PIDE, tụrụ ọtụtụ Ndịàmà mkpọrọ n’ihi ime nkwusa. Ya mere iji ghara ịbụ ndị a chọpụtara, anyị jiri akọ mee ihe. Dị ka ihe atụ, anyị ga-eme nkwusa n’otu ụlọ ma gazie n’ụlọ ọzọ dị n’ebe dị iche. Ọzọkwa, mmadụ abụọ n’ime anyị ga-eje n’ogige ntụrụndụ obodo n’oge ezumike nri ehihie anyị ma ọ bụ ná mgbede. Otu onye ga-anọdebe mmadụ ma malite ịgụ akwụkwọ akụkọ. N’oge na-adịghị anya, onye nke ọzọ n’ime anyị ga-anọdụ ala, kirie akwụkwọ akụkọ ahụ, ma kwuo ihe dị otú a: “Ewo, leedị nnọọ mmadụ ole nwụrụnụ! Ma ị̀ maara na n’ime ọchịchị Chineke nke a agaghị emezi?”

Mkparịta ụka ga-esochi, bụ́ mgbe onye ahụ nọworo na-agụ akwụkwọ akụkọ ga-arịọ ka e gosi ya ihe àmà Bible e nwere banyere ihe onye nke ọzọ kwuworo. Mgbe ahụ anyị ga-eme ndokwa ịbịa n’echi ya iji gaa n’ihu ná mkparịta ụka ahụ. N’ụzọ dị otú a anyị na-enwekarị ike eme ka onye ahụ na-anọdebe anyị tinye ọnụ ná mkparịta ụka anyị banyere amụma Bible, a malitekwara ọtụtụ ọmụmụ Bible. Anyị ga-ekele Chineke maka inyere anyị aka.

Oge Ule Siri Ike

N’April 25, 1974, ọchịchị aka ike dị na Portugal kwụsịrị, e nwekwara ọtụtụ mgbanwe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ebe ndị Portugal na-achị. Na Mozambique, ndị ọchịchị gbaghaara ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi ihe metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, tinyekwara Ndịàmà a tụrụ mkpọrọ n’ihi nnọpụiche ha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma mgbe ahụ, na June 25, 1975, nanị ọnwa 14 ka nke a gasịrị, Mozambique nweere onwe ya pụọ n’aka Portugal. Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, oké mkpagbu ọhụrụ megide Ndịàmà malitere. A kpọkọtara ìgwè ndị bi n’ógbè dị iche iche ijide Ndịàmà nile ha pụrụ ịchọta. A kpọrọ anyị “ndị nledo nke Ọchịchị ndị Portugal hapụrụ lawa.”

Na September, a rụgidere m ije otu nzukọ nke ìgwè ndị bi n’ógbè anyị. Ka m garuru, achọpụtara m na ndị nile so n’ìgwè ọmụmụ Bible m nọ n’ebe ahụ. E nyere anyị iwu ikwu okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke na-eto òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-achịnụ. Mgbe anyị jiri nkwanye ùgwù jụ, a kpụjere anyị n’ụlọ mkpọrọ ma tinye anyị n’otu ọnụ ụlọ nga mmadụ jubigara ókè na ya nke m kwuru banyere ya ná mmalite.

Mmadụ jupụtara n’ọnụ ụlọ nga ahụ nke na anyị apụghị imegharị ahụ. Ka mmadụ ole na ole wee nwee ike ịhụ ebe ha ga-ehi ụra n’ala, ndị ọzọ aghaghị ịnọdụ ala ma ọ bụ kwụrụ ọtọ. E nwere nanị otu ụlọ mposi, ọ na-asụchikarịkwa, nke na ọ na-asọpụta asọpụta, na-eme ka ebe nile na-esi ìsì ọjọọ. Nri anyị bụ spaghetti mmanụ mmanụ a wụjuru ọkpụkpụ azụ̀, nke okporo okporo ijiji na-ejukwa n’elu ya, bụ́ nke anyị na-aghaghị iji aka a na-akwọghị akwọ rie. Ruo ụbọchị 19 anyị ihe karịrị mmadụ 180 diri ọnọdụ ndị a jọgburu onwe ha. A kpọfeziri anyị n’ebe e jichiri nanị Ndịàmà, gụnyere ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka. N’ọnwa ole na ole sochirinụ, ọtụtụ ụmụaka nwụrụ n’ihi ọnọdụ na-awụ agbata oyi n’ahụ nke ụlọ mkpọrọ ahụ.

N’ikpeazụ, gọọmenti kpebiri ịchụga Ndịàmà na Carico, bụ́ ógbè dịmiri adịmi n’ebe ugwu. Ebumnobi ha bụ ikewapụ anyị iche. Mgbe ahụ e nwere ihe dị ka Ndịàmà 7,000 na Mozambique, nke ihe ka ukwuu n’ime ha bụ ndị e meworo baptism na 1974 nakwa na 1975. N’ịghọta na akwụkwọ e ji amụ Bible ga-adị anyị mkpa n’oge ahụ a ga-ekewapụ anyị iche, anatara m ikike ịlaghachi n’ụlọ iji wekọta ụfọdụ ihe oriri na ihe onwunwe maka njem ahụ. Onye uwe ojii so m ahụghị na m chịbilatara achịcha ụfọdụ dị ná mkpọ ha ma fanyejuo mbipụta ndị e ji amụ Bible n’ala ala ha. N’oge dị otú ahụ, egwu atụghị anyị. Anyị tụkwasịrị Chineke obi inyere anyị aka.—Ndị Hibru 13:6.

Ndụ n’Ogige Ndị Ahụ

Anyị rutere Carico na January 1976 ma hụ ọtụtụ Ndịàmà si Malawi dị nso n’ebe ahụ, ka ha bi n’ụlọ ntu ndị ha wuru n’onwe ha. Malite na 1972 ruo 1975, ihe karịrị mmadụ 30,000, gụnyere ụmụaka, agbapụwo n’ihi oké mkpagbu okpukpe dị na Malawi. E kwere ka ha biri n’ebe ugwu Mozambique dị ka ndị gbara ọsọ ndụ, mgbe anyị bịarutekwara, ha kwere ka anyị nọrọ n’ụlọ ha ma soro ha kerịta obere ihe ha nwere.

Ebe ọtụtụ n’ime anyị na-amaghị ewu ihe owuwu, ụmụnna anyị si Malawi gosiri anyị otú anyị ga-esi kpụọ brik ma jiri ha na ahịhịa si n’ọhịa wuo ụlọ anyị. Ha kụzikwaara anyị otú anyị ga-esi kọọ nri ma mee ihe ndị ọzọ iji lekọta onwe anyị. N’ụzọ dị otú a, amụtara m ịkwa nkà, ọrụ ugbo, na ịkwá ákwà. Nkà ndị a anyị mụtara baara ọtụtụ n’ime anyị uru mgbe anyị mesịrị laghachi n’obodo anyị.

Ihe kasị echegbu anyị bụ ijigide ọnọdụ ime mmụọ anyị, aghaghịkwa m ikwu na ọ dịghị mgbe nri ime mmụọ kọrọ anyị ụkọ. Olee otú nke a si kwe omume? Dị ka m kwuru ná mmalite, mgbe a chụpụrụ anyị n’obodo anyị, ọtụtụ n’ime anyị jiri ọgụgụ isi anyị webakọta akwụkwọ e ji amụ Bible na ihe onwunwe anyị ndị ọzọ. Ọzọkwa, Ndịàmà Jehova nọ na South Africa biri Ụlọ Nche ndị dị obere. Nke a mere ka ọ dịkwuo mfe iweba ha n’ogige ndị ahụ.

Ka a rịọsịrị ọtụtụ arịrịọ, na December 1, 1978, e nyere ikike ka e nwee alụmdi na nwunye mbụ n’ime ogige ahụ. N’ụbọchị ahụ mụ na Alita Chilaule gbara akwụkwọ, onye nna ya so ná ndị mbụ e mere baptism na Maputo laa azụ na 1958. Mgbe anyị mụrụ Dorcas na Samuel, anyị kụziiri ha ịhụ Jehova n’anya, anyị na-akpọrọkwa ha eje nzukọ ndị Kraịst mgbe nile. Mgbe e mesịrị, anyị mụtara nwa ọzọ, nke aha ya bụ Jaimito.

Otú Anyi Si Mee Nkwusa

E nyere Ndịàmà ikike ịdị na-esi n’ogige ahụ apụ ije ree ihe, nke gụnyere ihe oriri ndị ha wetara n’ugbo ha. Ọtụtụ n’ime anyị jiri ohere a mee nkwusa. N’ezie, amaara m ụma na-ere nnu m oké ọnụ ka onye ọ bụla wee ghara ịzụrụ ya. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị m zutere nabatara ozi Alaeze, m malitekwara ọtụtụ ọmụmụ Bible.

Otu n’ime ndị m na-amụrụ Bible sooro otu onyeisi nke otu ụlọ ọrụ dị na Milange dị nso nwee nkwụrịta okwu bụ́ onye gosiri mmasị na Bible. Mgbe a gwara m banyere nke a, e degaara m onyeisi ahụ akwụkwọ ozi. Ọ zaghachiri ya site n’ịkpọ m òkù ka m bịa leta ya. Ya mere m zoro akwụkwọ e ji amụ Bible n’ahụ m ma gawa, dị ka a ga-asị na m na-aga iresị ya ụfọdụ arịa ndị m rụrụ.

Mgbe m ruru, ahụrụ m na ndị soja na-eche ụlọ ahụ nche; egwu tụrụ m. Otú ọ dị, nwoke ahụ pụtara ma gwa ndị soja ahụ na ya achọghị ka e nye ya nsogbu. Anyị malitere ọmụmụ Bible anyị n’elekere ise nke mgbede, o gosikwara nnọọ nnukwu mmasị nke na anyị amụchaghị ya ruo n’elekere ise nke ụtụtụ echi ya! Mgbe e mesịrị, o kwere nkwa inweta akwụkwọ anyị site na Portugal, ebe a na-egbochighị ya ịnata ozi site na post ọfịs. Ọ ga-enyezi m akwụkwọ ahụ, m ga-ewebakwa ya n’ime ogige ahụ.

N’eziokwu, e jidere ma kpọchie ụfọdụ n’ime anyị ọtụtụ mgbe n’ihi ọrụ nkwusa anyị. Ma, mgbe ọtụtụ nabatara ozi Alaeze ahụ, anyị nwere obi ike na Chineke nọ na-enyere anyị aka, dị nnọọ ka o nyeere ndị Kraịst narị afọ mbụ aka.—Ọrụ Ndị Ozi, isi nke 3-5.

Ntọhapụ, na Ịlaghachi Maputo

Na September 1985, mgbe e tinyesịrị ọnọdụ ahụ n’ekpere, e kpebiri na anyị ga-ahazi ka anyị si n’ogige ahụ pụọ n’ìgwè. Ọ bụ ezie na ụfọdụ nogidere n’ogige ndị ahụ dị na Carico ma nọgide na-abụ ndị e kewapụrụ iche n’ebe Ndịàmà Jehova ndị ọzọ nọ ruo afọ asaa sochirinụ, ndị ọzọ gbalara Malawi na Zambia. Mụ na nwunye m kpebiri ịkpọrọ ụmụ anyị jee biri na Milange dị nso. Enwetara m ọrụ na ebe obibi n’ebe ahụ, anyị gakwara n’ihu n’ozi anyị. N’afọ na-esochinụ anyị laghachiri Maputo n’ikpeazụ.

Ná mbụ, anyị na ndị ikwu anyị bi. Inweta ọrụ siri ike, ma ka oge na-aga m jisiri ike nweta ọrụ. Alita rere ahụekere e ghere eghe iji nye aka n’obere ego anyị na-akpata. Ebe ọ bụ na enwewo m ọganihu n’asụsụ Bekee, m tinyere akwụkwọ anamachọ ọrụ n’Ụlọ Ọrụ Onye Nnọchiteanya Britain. Emere m nke ọma n’ule ndị e lere, enyekwara m ọrụ n’ụgwọ ọnwa ji okpukpu 20 karịa ihe m na-akpatabu! N’eziokwu enwere m mmetụta na Jehova enyeworo m aka, ekelekwara m ya n’ekpere.

Ịhazi Ibu Ọrụ

N’ikpeazụ, na February 11, 1991, gọọmenti Mozambique nakweere Ndịàmà Jehova dị ka ndị iwu kwadoro. Lee ụbọchị kwesịrị ncheta ọ bụ! N’afọ sochiri ya a kpọrọ m òkù ije ozi dị ka onye òtù kọmitii na-elekọta ọrụ nkwusa nke Ndịàmà Jehova na Mozambique. N’oge ahụ, ụmụ anyị dị nanị afọ 12, 9, na 6. Ejiri m abalị ahụ kpee ekpere, na-arịọ Jehova maka amamihe n’ime mkpebi ga-egosi nguzo kwesịrị ekwesị n’ibu ma ibu ọrụ ezinụlọ ma nke nzukọ.

Anyị nwetaliri ụlọ ụgbọala na-adọkpụ, nke anyị jiri chụọ nta ego. Anyị were ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ n’ọrụ ime na ire bred, azụmahịa ahụ gakwara nke ọma. Esi m otú a nwee oge ilekọta ihe ùgwù nzukọ ndị m nwetara ọhụrụ. Ụlọ dịkwa anyị mkpa, ebe ọ bụ na o kweghị anyị omume ịnọgide na-akwụ ụgwọ ụlọ ahụ anyị bi na ya. Ya mere edegaara m ndị ọchịchị akwụkwọ arịrịọ, na-akọwa ọnọdụ ezinụlọ m. N’oge na-adịghị anya anyị natara nkwado inweta ụlọ. Nke a wuru ewu, ebe ọ bụ na abụ m onye Mozambique mbụ zụtara ụlọ n’aka gọọmenti.

E jiriwo ụmụ ndị nabatara usoro ntụziaka ime mmụọ anyị, gọzie mụ na Alita. (Deuterọnọmi 6:6-9) Ọ bụ àgwà anyị ịdị na-atụle ihe mmụta Bible dịịrị ụbọchị na 5:40 ụtụtụ, mgbe nke ahụ kasịrị anyị na-agụkọtazi Bible ọnụ. Ebe ọ dị mkpa ka ụmụ anyị ruo ụlọ akwụkwọ n’oge, ndokwa isi ụtụtụ a maara ha ahụ. N’elekere 6:00 ná mgbede Friday, anyị na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị, bụ́ oge anyị na ụmụ anyị na-ekwurịta isiokwu Bible ndị ha meworo nnyocha na ha n’izu ahụ. Ọ bụkwa n’oge a ka anyị na-amụgharị ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ maka ozi.

E mewo ụmụ anyị nile baptism. N’ezie, Dorcas na Samuel anọwo na-asụ ụzọ eri 1994, kemgbe e mesịkwara ya baptism, Jaimito abụwo ọsụ ụzọ inyeaka. Ụmụ anyị ka na-eje akwụkwọ, nke ọ bụla n’ime ha nwekwara ihe mgbaru ọsọ nke ịmụba ozi ya mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ. Alita haziri oge ya ịsụ ụzọ na ilekọta ụlọ anyị. Ruo ọtụtụ afọ, tinyere afọ ndị m nọrọ n’ebe a na-ejichi mmadụ, ejere m ozi dị ka ọsụ ụzọ. Otú ọ dị, kemgbe 1993, anọwo m na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova n’oge ehihie.

Ngọzi Ndị Sitere n’Aka Chineke Nọgidere Na-abịa

Na 1997, enwetara m ngọzi magburu onwe ya nke ije ọzụzụ were ọnwa abụọ maka ndị so na Kọmitii Alaka. Ebe a nọ nwee ọzụzụ ahụ bụ na United States n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower dị na Patterson, New York. Ya mere, mgbalị m tinyere n’ịmụ Bekee baara m uru ọzọ. Mgbe m na-alọta, o kwere m omume ileta ndị ohu Jehova bi n’ala ndị ọzọ, leekwa ka nke a si mee ka obi m jupụta n’ekele maka òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ!

Ịhụnanya a dị n’etiti ezi ndị Kraịst abụwo otu ihe mere e ji na-adọtakwu ọtụtụ puku ndị nwere obi eziokwu isonyere Ndịàmà Jehova na Mozambique. (Jọn 13:35) Site n’ihe dị ka mmadụ 7,000 na-eme nkwusa mgbe ahụ a chụgara anyị n’ogige mkpọrọ, anyị nweziri ihe karịrị ndị nkwusa 29,000 nke ozi ọma Alaeze Chineke na Mozambique dum. Ndị a nọ n’ihe karịrị ọgbakọ 665; e nwere nanị 4 na 1958.

Na 1993, a kwadoro atụmatụ ndị e mere maka alaka ụlọ ọrụ na Maputo nke ga-aba ndị ọrụ nke alaka karịrị mmadụ 75 ma lekọta mmụba dị egwu nke ofufe dị ọcha na Mozambique. E wusịrị ihe owuwu ahụ ka afọ anọ gasịrị. Mgbe ahụ, na December 19, 1998, anyị nwere ọṅụ dị ukwuu mgbe mmadụ 1,098 si ọtụtụ mba bịara maka nraranye nke ihe owuwu ahụ mara mma. N’usoro ihe omume ahụ, enwetara m ihe ùgwù nke ịgba ndị nọrọ ọtụtụ afọ n’ebe ahụ a chụgara anyị na Carico, ajụjụ ọnụ. Asịrị m ka ndị a chụgara n’ebe ahụ welie aka ha elu, o metụkwara ndị na-ege ntị n’ahụ nke ukwuu mgbe ọtụtụ narị mmadụ weliri aka elu.

N’echi ya ìgwè mmadụ dị 8,525 bịara n’Ụlọ Mgbakọ dị na Matola maka mmeghachi nke usoro ihe omume nraranye ahụ, akụkọ ndị na-agba ume sitere ná mba ndị ọzọ, na okwu ndị dabeere na Bible nke ndị nleta si n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova, dị na Brooklyn, New York, ga-ekwu.

N’eziokwu, kemgbe m nwetara ihe ọmụma nke eziokwu Bible mgbe m nọ n’afọ iri na ụma, enwetawo m mmegide ezinụlọ, iyi egwu nke ogbugbu, mkpagbu jọgburu onwe ya nke na mgbe ụfọdụ m na-eche na ọ kaara m mma ịnwụ anwụ karịa ịdị ndụ. Ma, enwere m ọṅụ n’ihi na n’ihi ahụmahụ ndị a, mmekọrịta mụ na Jehova adịwanyewo mma. N’ezie, dị ka onye ọbụ abụ Bible kwuru, “Chineke bụ onye na-enyere m aka: Onyenwe anyị nọ n’etiti ndị na-akwagide mkpụrụ obi m.” (Abụ Ọma 54:4) Ọ bụwo ihe ùgwù na-enweghị atụ nye mụ na ezinụlọ m isoro ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke ndị na-efe Jehova ofufe na-ejere ya ozi.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndịàmà nọ n’ihu Ụlọ Nzụkọ Alaeze e wuru mgbe e kewapụrụ ha iche

[Foto dị na peeji nke 24]

Mgbe anyị na-enwe ọmụmụ Bible ezinụlọ anyị

[Foto dị na peeji nke 25]

Ndị biri n’ogige Carico weliri aka ha elu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya