Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 7/8 p. 18-19
  • Ọ̀ Dị Njọ Ịkpa Nganga?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Dị Njọ Ịkpa Nganga?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nganga nke Na-emerụ Ahụ
  • È Nwere Nganga Ziri Ezi?
  • Ihe Nganga Na-efu—Olee Otú Ọ Haruru?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ị Ga-alụsoli Setan Ọgụ ma Merie
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Gịnị Banyere Ịkpa Nganga n’Ihi Agbụrụ?
    Teta!—1998
  • Mmadụ Ịdị Umeala n’Obi Ọ̀ Na-egosi na Ọ Dịghị Ike Ka Ọ̀ Na-egosi na Ọ Dị Ike?
    Teta!—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 7/8 p. 18-19

Echiche nke Bible

Ọ̀ Dị Njọ Ịkpa Nganga?

A NA-EKWUKARỊ na nganga bụ nke mbụ n’ime mmehie asaa dị oké njọ. Ma, ọtụtụ ndị taa kweere na oge nke echiche dị otú ahụ agafechaala. Ka anyị na-achọ ịbanye narị afọ nke 21, e weere nganga dị ka àgwà ziri ezi, ọ bụghị mmehie.

Otú ọ dị, mgbe Bible na-ekwu banyere nganga, ọ na-enyekarị echiche nke ihe na-adịghị mma. N’akwụkwọ Bible bụ́ Ilu nanị, e nwere ọtụtụ okwu na-akatọ nganga. Dị ka ihe atụ, Ilu 8:13 na-ekwu, sị: “Mpako, na nganga, na ụzọ ọjọọ, na ọnụ na-ekwu okwu ịgbakụta Chineke azụ, ka m kpọworo asị.” Ilu 16:5 na-ekwu, sị: “Ihe arụ n’anya Jehova ka onye ọ bụla bụ nke [dị nganga n’obi ya, NW]” Ilu 16 Amaokwu ya nke 18 adọọ aka ná ntị, sị: “N’ihu ntipịa ka [nganga NW] na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.”

Nganga nke Na-emerụ Ahụ

A pụrụ ịkọwa nganga nke a katọrọ na Bible dị ka ile onwe onye anya n’ụzọ gafere ókè, echiche na-adịghị mma nke ịka ndị ọzọ n’ihi nkà, mma, akụ̀ na ụba, agụmakwụkwọ, ọkwá na ihe ndị ọzọ nke mmadụ. Ọ pụrụ ịpụta ìhè n’àgwà nleda anya, itu ọnụ, ịkparị mmadụ, ma ọ bụ ịfụli onwe onye elu. Ichebiga echiche ókè banyere onwe onye pụrụ iduba mmadụ n’ịjụ ịnakwere mgbazi dị mkpa; ịjụ ikweta mmejọ o mejọrọ na ịrịọ mgbaghara, ịhapụ ihe, na ekweghị ka e mechuo ya ihu; ma ọ bụ n’ịbụ onye na-ewe iwe n’ụzọ na-enweghị isi n’ihi ihe onye ọzọ mere ma ọ bụ kwuo.

Ndị na-akpa nganga pụrụ ikwesi olu ike ka a na-eme ihe n’ụzọ nke ha mgbe nile ma ọ bụ ghara ime ya eme. O sighị ike ịhụ na àgwà dị otú ahụ na-akpatakarị otu ụdị esemokwu ma ọ bụ ọzọ n’etiti mmadụ na ibe ya. Ịkpa nganga n’ihi agbụrụ ma ọ bụ mba akpatawo ọtụtụ agha na nkwafu ọbara. Dị ka Bible si kwuo, ọ bụ nganga dubara otu nwa Chineke bụ́ mmụọ n’inupụ isi, mee onwe ya Setan bụ́ Ekwensu. N’ihe banyere iru eru nke ndị Kraịst bụ́ ndị okenye, Pọl nyere ndụmọdụ, sị: “Onye na-abụghị onye ọhụrụ, ka a ghara ịfụli ya elu, o wee daba n’ọmụma ikpe Ekwensu.” (1 Timoti 3:6; tulee Ezikiel 28:13-17.) Ọ bụrụ na nganga na-akpata ihe ndị a, ọ bụghị ihe ijuanya na Chineke katọrọ ya. Otú ọ dị, ị pụrụ ịjụ sị, ‘Ọ̀ bụ na ọ dịghị mgbe nganga pụrụ izi ezi?’

È Nwere Nganga Ziri Ezi?

N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, e jiri ngwaa bụ́ kau·khaʹo·mai, nke a sụgharịrị ịbụ “ịkpa nganga, ịnya isi, itu ọnụ,” mee ihe n’ụzọ nyere ma echiche na-ezighị ezi ma nke ziri ezi. Dị ka ihe atụ, Pọl na-ekwu na anyị pụrụ ‘ịnya isi, na-adabere n’olileanya nke otuto Chineke.’ Ọ tụkwara aro, sị: “Onye na-anya isi, ya nyaa n’Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 5:2; 2 Ndị Kọrint 10:17) Nke a pụtara iji Jehova eme nganga dị ka Chineke anyị, mmetụta nke pụrụ iduba anyị n’iji aha na àgwà ọma ya anya isi.

Iji maa atụ: Ọ̀ dị njọ ịchọ ịgbachitere aha ọma mmadụ mgbe a na-ekwutọ ya? Ọ dịghị ma ọlị. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ekwuo ihe na-adịghị mma banyere ndị òtù ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị ọzọ ị hụrụ n’anya ma na-akwanyere ùgwù, ọ̀ gaghị ewute gị ma kpalie gị ịgbachitere ha? “Ihe a na-ahọpụta ka ezi aha bụ karịa ọtụtụ akụ̀,” ka Bible na-ekwu. (Ilu 22:1) N’otu oge, Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile gwara Fero Ijipt dị mpako, sị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka M guzoworo gị, ka M wee mee ka ị hụ ike m, ka e wee kọọkwa akụkọ aha m n’ụwa nile.” (Ọpụpụ 9:16) Ya mere Chineke ji aha na àgwà ọma ya anya isi, ọ na-anụkwara ya ọkụ n’obi. Anyị pụkwara inwe mmasị n’ịgbachitere aha na àgwà ọma anyị ma ka ghara ịbụ ndị ịfụli onwe onye elu na nganga ọchịchọ onwe onye nanị kpaliri.—Ilu 16:18.

Nkwanye ùgwù dị mkpa ná mmekọrịta ọ bụla dị mma. Mmekọrịta anyị na ndị ọzọ na azụmahịa anyị adịghị aga nke ọma mgbe anyị na-enweghịzi obi ike n’ebe ndị anyị na ha na-emekọ ihe nọ. N’otu aka ahụ, ọrụ a gbakọtara aka na-arụ ma ọ bụ azụmahịa e jikọrọ aka na-azụ pụrụ ịdakpọ ma ọ bụrụ na nanị otu onye n’ime ndị na-akwado ya emee ihe mebiri aha ya onwe ya ma ọ bụ nke ndị òtù ya n’ihu ọha. Iji mezuo ebumnuche ha, n’agbanyeghị ihe ha pụrụ ịbụ, ha aghaghị ịnọgide na-enwe ezi aha. Nke a bụ otu ihe mere na ndị nlekọta n’ọgbakọ ndị Kraịst aghaghị “inwe àmà dị mma” site n’ọnụ ndị nọ n’èzí. (1 Timoti 3:7) Ọ bụghị iji nganga ebuli onwe onye elu na-akpali ọchịchọ ha inwe aha ọma, kama ọ bụ mkpa ọ dị ịnọchite anya Chineke n’ụzọ kwesịrị ekwesị na nke ùgwù dị na ya. E kwuwerị, olee otú a ga-esi tụkwasị onye ozi na-enweghị ezi àmà site n’ọnụ ndị nọ n’èzí, obi?

Gịnị banyere ịkpa nganga n’ihi ihe mmadụ rụzuru n’onwe ya? Were, dị ka ihe atụ, obi ụtọ ndị nne na nna pụrụ inwe mgbe nwa ha mere nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Nrụzu ihe dị otú ahụ na-eweta afọ ojuju kwesịrị ekwesị. Mgbe ọ na-edegara ndị Kraịst ibe ya nọ na Tesalọnaịka akwụkwọ, Pọl kpughere na ya ṅụrịkwara ọṅụ n’ihe ndị a rụzuru: “Anyị ji ụgwọ ikele Chineke ekele mgbe nile banyere unu, ụmụnna anyị, dị ka o kwesịrị, n’ihi na okwukwe unu na-aba ụba nke ukwuu, ịhụnanya ahụ unu nile n’otu n’otu na-ahụrịta ibe unu na-ehikwa nne; ya mere anyị onwe anyị na-anya isi n’ahụ unu n’etiti nzukọ Chineke nile n’ihi ntachi obi unu na okwukwe unu n’ime nsogbu unu nile na n’ime mkpagbu nile unu na-anagide.” (2 Ndị Tesalọnaịka 1:3, 4, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ee, ọ bụ ọchịchọ ebumpụta ụwa ịṅụrị ọṅụ n’ihe ndị a hụrụ n’anya rụzuru. Ya mere, gịnị bụ ọdịiche dị n’etiti nganga na-ezighị ezi na nganga ziri ezi?

Ọ bụghị ihe na-ekwesịghị ekwesị anyị ịchọ ichebe aha ọma anyị, inwe ihe ịga nke ọma, na inwe obi ụtọ n’ihi ihe ịga nke ọma dị otú ahụ. Otú ọ dị, ibuli onwe onye elu, mpako, na itu ọnụ banyere onwe onye ma ọ bụ ndị ọzọ bụ ihe ndị Chineke katọrọ. N’ezie ọ ga-adị mwute ma ọ bụrụ na ndị ọ bụla amalite ‘ịfụli onwe ha elu’ ma ọ bụ ‘ịtụkwasị uche n’onwe ha karịa nke ha kwesịrị ịtụkwasị uche.’ E nyeghị ndị Kraịst ohere iji onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla akpa nganga ma ọ bụ etu ọnụ ma e wezụga Jehova Chineke na ihe ndị o mewooro ha. (1 Ndị Kọrint 4:6, 7; Ndị Rom 12:3) Onye amụma bụ́ Jeremaịa na-enye anyị ezi ụkpụrụ ịgbaso: “Onye na-anya isi, ya nyaa isi na nke a, na o nwere uche n’ebe M nọ, wee mara m, na Mụ onwe m bụ Jehova Nke na-eme ebere na ikpe ziri ezi na ezi omume n’ụwa.”—Jeremaịa 9:24.

[Foto dị na peeji nke 18]

“Popu Innocent nke Iri,” nke Don Diego Rodríguez de Silva Velázquez sere

[Ebe E Si Nweta Foto]

Scala/Art Resource, NY

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya