À Pụrụ Ikpezi?
“Ọ dị mfe ịmalite okwu ịgba alụkwaghịm ngwa ngwa,” ka akwụkwọ bụ́ “Couples in Crisis” na-ekwu, “n’agbanyeghịkwa nke ahụ e nwerịrị ọtụtụ alụmdi na nwunye dị mma n’ezie, ndị pụkwara inwe ihe ịga nke ọma ma e dozie nsogbu ha.”
NCHỌPỤTA a na ozizi nọteworo aka nke Jisọs Kraịst banyere ịgba alụkwaghịm kwekọrọ. Ọ bụ ezie na o kwuru na onye òtù ọlụlụ aka ya dị ọcha nwere ikike ịgba alụkwaghịm n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye, o kwughị na a ga-emerịrị otú ahụ. (Matiu 19:3-9) Onye òtù ọlụlụ kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ inwe ihe ndị mere ọ ga-eji gbalịa ichebe alụmdi na nwunye ahụ. Onye ahụ mere ihe ọjọọ ka pụrụ ịhụ nwunye ya n’anya.a Ọ pụrụ ịbụ di na-echebara ndị ọzọ echiche na nna na-eji ihe akpọrọ ihe nke na-egbo mkpa ezinụlọ ya nke ọma. Onye òtù ọlụlụ nke kwesịrị ntụkwasị obi nwere ike kpebie ka ha kpezie kama ịgba alụkwaghịm n’ihi mkpa ya na ndị nke ụmụ ya. Ya bụrụ otú ahụ, olee ihe ndị a pụrụ ịtụle, oleekwa otú a pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma n’ịnagide ihe ịma aka nke iwulighachi alụmdi na nwunye ahụ?
Iji malite, a ghaghị ikwu na ma ịgba alụkwaghịm ma mkpezi adịghị nke dị mfe. Ọzọkwa, nanị ịgbaghara onye òtù ọlụlụ kwara iko eyighị ka ọ ga-agwọta nsogbu ndị zoro ezo n’alụmdi na nwunye. Ọ na-ewekarị nnyocha onwe onye siri oké ike, ezi nkwurịta okwu, na ịrụsi ọrụ ike iji chebe alụmdi na nwunye. Ndị di na nwunye na-elelịkarị ogologo oge na mgbalị ọ na-ewe iji wuliteghachi alụmdi na nwunye nwere nsogbu. Ka o sina dị, ọtụtụ anọgidesiwo ike, n’ihi ya nweekwa alụmdi na nwunye dị mma.
Ajụjụ Ndị A Ga-aza
Iji mee mkpebi dabeere n’ihe ọ maara, ọ dị onye òtù ọlụlụ kwesịrị ntụkwasị obi mkpa ka mmetụta ọ na-enwe na nhọrọ ndị chere ya ihu doo ya anya. Ọ pụrụ ịtụle ihe ndị na-esonụ: Ọ̀ chọrọ ịlọghachi? Ọ̀ kwụsịwo ikwa iko kpam kpam, ka ọ̀ na-ala azụ ime otú ahụ ozugbo? Ò kwuwo na o wutere ya? Ya bụrụ otú ahụ, ò nwere nchegharị n’ezie, nwee ezi mwute maka ihe o mere? Ka ọ̀ na-anwa ịta m ụta maka ihe ọjọọ o mere? Ọ̀ kwara ụta n’ezie maka mwute ọ kpatawooro m? Ka ọ̀ na-ewe iwe nanị n’ihi na e kpughewo ma kpaghasịa mmekọrịta ya rụrụ arụ?
Gịnị banyere ọdịnihu? Ọ̀ malitewo ịgbanwe àgwà na omume ndị dugara n’ịkwa iko ahụ? Ò kpebisiwo ike ịghara ime ihe ọjọọ ahụ ọzọ? Ka ọ̀ ka nwere ọchịchọ ime mfegharị na inwe nkekọ ịhụnanya na-ekwesịghị ekwesị n’ebe nwanyị ọzọ nọ? (Matiu 5:27, 28) Ọ̀ chọrọ n’ezie iwuliteghachi alụmdi na nwunye ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, gịnị ka ọ na-eme banyere ya? Azịza dị mma nye ajụjụ ndị a pụrụ ịbụ ihe ndabere maka ikwere na ịdịghachi n’otu n’alụmdi na nwunye ga-ekwe omume.
Nkwurịta Okwu Dị Mkpa
“Mmebi echiche nile dị,” ka otu onye so dee Bible na-ekwu, “mgbe izu nzuzo na-adịghị.” (Ilu 15:22) N’ezie, nke a na-eme mgbe ọ dị onye òtù ọlụlụ aka ya dị ọcha mkpa isoro onye òtù ọlụlụ ya kwurịta banyere ekwesịghị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye ahụ. N’ekwughị banyere ihe ndị dịịrị nanị onwe onye, ha pụrụ inwe nkwurịta okwu sitere n’obi eziokwu ma na-eru n’obi, nke nwere ike ime ka eziokwu banyere ihe merenụ pụta ìhè ma wepụ echiche na-ezighị ezi. N’aka nke ya, nke a nwere ike nye aka igbochi di na nwunye ahụ izere onwe ha ọzọ n’ihi nghọtahie na mkpasu iwe dịteworo anya. N’eziokwu, nkwurịta okwu dị otú ahụ yiri ka ọ̀ ga-egbu ma di ma nwunye mgbu n’obi. Ma ọtụtụ ahụwo na ọ bụ akụkụ dị mkpa nke usoro iweghachi ntụkwasị obi.
Ihe ọzọ dị mkpa a ga-eme iji kpezie n’ezie bụ ịgbalị ịmata ebe e nwere nsogbu n’alụmdi na nwunye ahụ—ihe ndị ọ ga-adị ma di ma nwunye mkpa ịrụ ọrụ na ha. Zelda West-Meads na-adụ ọdụ, sị: “Mgbe unu kwurịtasịrị banyere ọnọdụ ahụ na-egbu mgbu n’obi, mgbe unu kpebisịrị na mmekọrịta ahụ akwụsịwo kpam kpam, na unu ka chọrọ ka alụmdi na nwunye unu dịgide, mezie ihe mebirinụ ma mee ka alụmdi na nwunye [ahụ] dịghachi ọhụrụ.”
Ikekwe unu ejibughị ibe unu kpọrọ ihe. Ọ pụrụ ịbụ na e legharawo ihe omume ime mmụọ anya. Ma eleghị anya unu adịghị ewepụtabu oge zuru ezu iji nọkọọ ọnụ. Ikekwe i gosibeghị onye òtù ọlụlụ gị ịhụnanya, mmetụta ịhụnanya, ịja mma, na nsọpụrụ otú ọ dị ya mkpa. Ịtụleghachikọ nzube na ihe ndị unu ji kpọrọ ihe ga-eme ihe dị ukwuu n’ime ka unu nọrọ onwe unu nso karị, ọ ga-enyekwa aka igbochi ekwesịghị ntụkwasị obi n’ọdịnihu.
Ịrụ Ọrụ ná Mgbaghara
N’agbanyeghị mgbalị o ji obi eziokwu na-eme, ọ pụrụ isiri onye òtù ọlụlụ e mejọrọ ike ịgbaghara di ya, ma ya fọdụkwa nwanyị nke ọzọ ahụ. (Ndị Efesọs 4:32) Otú ọ dị, ọ pụrụ ikwe mee iji nwayọọ nwayọọ rụọ ọrụ banyere iwepụ mkpasu iwe na obi ilu. “Ọ dị onye òtù ọlụlụ kwesịrị ntụkwasị obi mkpa ịghọta na oge ga-abịa mgbe ha ga-echezọ ihe meworonụ ma bido ndụ n’isi,” ka otu akwụkwọ ntụaka na-adụ ọdụ. “Ọ dị mkpa ka ị ghara ịnọgide na-ekwu banyere mmehie onye òtù ọlụlụ gị meburu iji nye [ya] ahụhụ oge ọ bụla unu na-arụ ụka.”
Ọtụtụ di na nwunye achọpụtawo na site n’ịgbalị ibelata na ịkwụsị iwe oké iwe, ha emesịwo kwụsị ibuso onye ahụ mejọrọnụ iro. Ime otú ahụ bụ nzọụkwụ dị mkpa n’iwuliteghachi alụmdi na nwunye.
Mụta Ịtụkwasị Obi Ọzọ
“Ànyị ga-enwe ike ịtụkwasị onwe anyị obi ọzọ?” ka otu nwanyị nọ ná mwute kwara n’arịrị. Nchegbu ya ziri ezi n’ihi na nghọrị nke onye ahụ kwara iko ebibiwo—ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ emebiwo—ntụkwasị obi ahụ n’ụzọ dị ukwuu. Dị ka ọkwá dị oké ọnụ ahịa, ọ dị mfe imebi ntụkwasị obi ma ọ dịghị mfe mmekwata. Eziokwu dị na ya bụ na a ghaghị inwerịta ntụkwasị obi na nkwanye ùgwù ọ bụghị nanị ka mmekọrịta wee dịgide kama ka o nwee ike ịga nke ọma.
Dị ka ọ na-adịkarị, nke a ga-agụnye ịmụta ịtụkwasị obi ọzọ. Kama onye òtù ọlụlụ nke mejọrọnụ ikwu n’ụzọ enweghị mmetụta ka a tụkwasị ya obi, ọ pụrụ inye aka wuliteghachi ntụkwasị obi site n’ịghara izochi ihe ọ bụla na ikwu eziokwu banyere ihe ndị ọ na-eme. A na-agba ndị Kraịst ume ka ha ‘tụpụ okwu ụgha ma na-agwarịta ibe ha eziokwu.’ (Ndị Efesọs 4:25) Iji mee ka a tụkwasị gị obi ọzọ, ị pụrụ ná mmalite ịdị ‘na-agwa [onye òtù ọlụlụ] gị eziokwu banyere ebe ị na-aga kpọmkwem,’ ka Zelda West-Meads na-ekwu. “Gwa [onye òtù ọlụlụ] gị ebe ị na-aga, mgbe ị ga-alọghachi ma jide n’aka na ị nọ n’ebe i kwuru na ị ga-anọ.” Ọ bụrụ na atụmatụ agbanwee, mee ka ọ mara.
Ọ pụrụ iwe oge na mgbalị iji wuliteghachi ùgwù onwe onye. Onye òtù ọlụlụ nke mejọrọnụ pụrụ inye aka site n’igosi mmetụta ịhụnanya dị ukwuu na ikwupụta ịja mma ọtụtụ mgbe—na-agwa nwunye ya ọtụtụ mgbe na ya nwere ekele maka ya ma hụ ya n’anya. Otu onye ndụmọdụ alụmdi na nwunye a na-akwanyere ùgwù na-adụ ọdụ, sị: “Jaa ya mma n’ihe nile ọ na-eme.” (Ilu 31:31, Today’s English Version) Nwunye, n’aka nke ya, pụrụ ịrụ ọrụ n’iwuliteghachi obi ike onwe onye site n’ilekwasị anya n’ihe ndị ọ na-eme nke ọma ná ndụ ya.
Ọ Na-ewe Oge
N’ihi isi ike nke ihe mgbu nke ekwesịghị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye na-akpata, ọ bụghị ihe ijuanya na a ka pụrụ icheta ihe ndị na-egbu mgbu n’obi nke ọma mgbe ọtụtụ afọ gasịrị. Otú ọ dị, ka iwe ahụ ji nwayọọ nwayọọ na-apụ n’obi, ịdị ụmeala n’obi, ndidi, na ntachi obi nke mmadụ abụọ ahụ ga-enye aka wuliteghachi ntụkwasị obi na nkwanye ùgwù.—Ndị Rom 5:3, 4; 1 Pita 3:8, 9.
“Oké ihe mgbu nke ọnwa ole na ole mbụ ahụ adịghị adịte anya,” ka akwụkwọ bụ́ To Love, Honour and Betray na-ekwu n’ụzọ imesi obi ike. “[Ọ] na-emesị kwụsị . . . Ị ga-emesị hụ na ị pụrụ ịnọru ọtụtụ ụbọchị, izu, ọnwa na ọbụna afọ n’echeghị banyere ya.” Ka ị na-anọgide na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’alụmdi na nwunye gị ma na-achọ ngọzi na nduzi Chineke, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-enweta nkasi obi nke “udo nke Chineke, nke kachasị uche nile.”—Ndị Filipaị 4:4-7, 9.
“N’ileghachi anya azụ,” ka Pedro na-akọ, “ahụmahụ ahụ agbanwewo ụzọ ndụ anyị. Ọ ka dị anyị mkpa imezi ihe ole na ole n’alụmdi na nwunye anyị site n’oge ruo n’oge. Ma anyị alanarịwo ahụmahụ ọjọọ ahụ. Anyị ka bụ di na nwunye. Anyị nwekwara obi ụtọ.”
Ma gịnị ma ọ bụrụ na onye òtù ọlụlụ nke aka ya dị ọcha enweghị ihe mere ọ ga-eji gbaghara onye nke na-ekwesighị ntụkwasị obi? Ma ọ bụ gịnị ma ọ gbaghara di ya (ruo n’ókè nke iwepụ mkpasu iwe n’obi ya) ma n’ihi ezi ihe ụfọdụ họrọkwa iji ndokwa ịgba alụkwaghịm nke dị na Bible mee ihe?b Ihe ndị dị aṅaa ka ịgba alụkwaghịm na-achọ n’aka mmadụ? Anyị na-akpọ gị òkù ka ị tụlee ihe ndị ịgba alụkwaghịm gụnyere, nakwa otú ụfọdụ siworo nagide ya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji mee ka ọ dị mfe, anyị ga na-ekwu banyere nwunye dị ka onye òtù ọlụlụ nke kwesịrị ntụkwasị obi. Otú ọ dị, ụkpụrụ ndị a ga-atụle metụtakwara ndị di aka ha dị ọcha bụ́ ndị nwunye ha na-ekwesịghị ntụkwasị obi.
b Biko lee isiokwu bụ́ “Echiche nke Bible: Ịkwa Iko Ndị Lụrụ Dị Ma Ọ Bụ Nwunye—Ịgbaghara Ka Ọ̀ Bụ Ịghara Ịgbaghara?” dị ná mbipụta Teta! nke August 8, 1995.
[Igbe dị na peeji nke 6]
NKWADO BARA ỤRU
N’ihi ọtụtụ ihe ndị a pụrụ ịtụle, ọ pụrụ ịba uru ịchọ enyemaka nke onye ndụmọdụ nwere ahụmahụ, nke nwekwara echiche ziri ezi. Dị ka ihe atụ, Ndịàmà Jehova nwere ndị okenye ọgbakọ nwere obiọma na ọmịiko.—Jemes 5:13-15.
A na-agba ndị ndụmọdụ, ndị enyi, na ndị ikwu ume ka ha ghara ịchọ ka e mee ihe ha kwuru ma ọ bụ ịkwado ma ọ bụ ịkatọ ịgba alụkwaghịm Akwụkwọ Nsọ kwadoro ma ọ bụ mkpezi. Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst nke gbara alụkwaghịm na-agba ume, sị: “Nanị nye nkwado buru ibu, hapụkwa anyị ka anyị kpebie ihe anyị ga-eme n’onwe anyị.”
Ndụmọdụ kwesịrị ịdaberesi ike na Bible. “Agwala ha mmetụta ha kwesịrị inwe ma ọ bụ nke ha na-ekwesịghị inwe,” ka otu nwanyị a gbara alụkwaghịm turu aro ya. “Kama nke ahụ, hapụ ha ka ha kwuo obi ha.” Mmetụta maka ndị ọzọ, ịhụnanya ụmụnna, na ọmịiko ga-enye aka ibelata oké mwute nke mmebi e mebiri ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye kpatara. (1 Pita 3:8) Onye ndụmọdụ nwere ahụmahụ kwuru, sị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha: ma ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ.”—Ilu 12:18.
“Nghọta, okwu nkasi obi, na agbamume dị m mkpa,” ka otu di kwesịrị ntụkwasị obi na-ekwupụta. “Nwunye m nwekwara ọchịchọ siri ike maka nduzi na ịja mma maka mgbalị ndị ọ na-eme—ezigbote nkwado nke pụrụ inyere ya aka ịga n’ihu.”
Ọ bụrụ na mgbe mmadụ jisịrị ekpere chee echiche nke ọma ya ekpebie ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ ikewara n’ihi ihe Akwụkwọ Nsọ kwadoro, e kwesịghị inye ndụmọdụ n’ụzọ ga-eme ka onye ahụ nwee obi amamikpe. Kama nke ahụ, a pụrụ inyere onye ahụ aka ịnagide obi amamikpe nke na-adịghị mkpa.
“Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye na-enye nkasi obi bara uru,” ka otu onye o metụtara kwuru, “ya adịla mgbe ị ga-echezọ oké mmetụta uche nke mmadụ na-enwe.”
[Igbe dị na peeji nke 7]
IHE MERE ỤFỌDỤ JI EBIKỌ
N’ọtụtụ ógbè, e nwere ndị nwunye na-enwechaghị ihe ọzọ ha pụrụ ime karịa isoro di ha na-akwa iko nke na-enweghị nchegharị biri. Dị ka ihe atụ, ndị Kraịst ụfọdụ bụ́ ndị nwunye bi n’ebe ndị esemokwu tisasịrị ma ọ bụ n’ebe a na-akpata ego dị ala esorowo di ha na-ekwesịghị ntụkwasị obi biri, bụ́ onye na-anọgide na-elekọta ezinụlọ ya n’ụzọ ndị ọzọ, ọ bụ ezie na o nwere ike ọ bụghị onye kwere ekwe. N’ihi ya, ha nwere ebe obibi, nchebe dị mkpa, na-enweta ego mgbe nile, nwetụkwa ahụ iru ala nke inwe di n’ụlọ—ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ onye na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi. Ha echewo na ịnọgide, ọ bụ ezie na ọ masịghị ha ma ọ bụ na ọ dịghị mfe, emewo ka ha—n’ọnọdụ nke ha kpọmkwem—chịkwaa ndụ ha karịa ka ha gaara achịkwa ya ma a sị na ha nọ na-adọlị n’onwe ha.
Mgbe ha nagidesịrị ọnọdụ dị otú ahụ—mgbe ụfọdụ ruo ọtụtụ afọ—ụfọdụ n’ime ndị nwunye ndị a enwewo ngọzi na-enye ọṅụ nke imesị hụ di ha ka ha gbanwere ụzọ ha ma ghọọ ndị Kraịst bụ́ di kwesịrị ntụkwasị obi ma na-ahụ n’anya.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 7:12-16.
Ya mere, e kwesịghị ịkatọ ndị họọrọ isoro onye òtù ọlụlụ ha biri—ọbụna ma ọ bụrụ na o nweghị nchegharị. Ha emewo mkpebi siri ike, e kwesịkwara inye ha enyemaka na nkwado nile dị ha mkpa.
[Igbe dị na peeji nke 8]
ÒNYE KA O SI N’AKA?
N’eziokwu, n’ọnọdụ ụfọdụ ezughị okè nke onye òtù ọlụlụ aka ya dị ọcha pụrụ isowo kpata esemokwu, ma Bible na-ekwu na “a na-anwa onye ọ bụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke aka ya na-adọkpụfu ya, e wee rafuo ya. Mgbe ahụ agụụ ihe ọjọọ ahụ, mgbe ọ tụwooro ime, o wee mụpụta mmehie.” (Jemes 1:14, 15, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọ bụ ezie na a pụrụ inwe ihe dị iche iche na-eso akpata ya, “agụụ ihe ọjọọ nke aka” mmadụ bụ ihe bụ́ isi ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na mmejọ nke onye òtù ọlụlụ akpata nsogbu alụmdi na nwunye, n’ezie ịkwa iko abụghị ụzọ isi dozie ya.—Ndị Hibru 13:4.
Kama nke ahụ, a pụrụ idozi nsogbu alụmdi na nwunye mgbe ma di ma nwunye nọgidesiri ike n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Nke na-agụnye ‘ịnagiderịta ibe ha, iwerekwa amara gbaghara onwe ha.’ Ha kwesịkwara ịnọgide na-egosi àgwà ndị dị ka “obi ebere, obiọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.” Nke kasị mkpa, ha kwesịrị “iyikwasị ịhụnanya, nke bụ ihe nkekọ nke izu okè.”—Ndị Kọlọsi 3:12-15.
[Foto dị na peeji nke 7]
Di na nwunye ịṅa ibe ha ntị nke ọma pụrụ inyere ha aka iwuliteghachi alụmdi na nwunye