Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwhf isiokwu 35
  • Ihe Unu Ga-eme Ka Unu Ghara Ịgba Alụkwaghịm n’Agadi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Unu Ga-eme Ka Unu Ghara Ịgba Alụkwaghịm n’Agadi
  • Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị mere ndị di na nwunye ji agba alụkwaghịm mgbe ha merela agadi?
  • Ihe i nwere ike ime
  • À Pụrụ Ikpezi?
    Teta!—1999
  • Nhọrọ nke Ịgba Alụkwaghịm
    Teta!—1999
  • Ihe Ị Ga-eme ma E Nwee Onye Gị na Ya Dị n’Ezigbo Mma
    Teta!—2013
  • Ihe Anọ I Kwesịrị Ịma Banyere Ịgba Alụkwaghịm
    Teta!—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
ijwhf isiokwu 35
Ebe di na nwunye merela agadị obi na-adịghị mma nọ iche iche. Ha abụọ na-ele anya ebe dị iche iche.

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ALỤMDI NA NWUNYE

Ihe Unu Ga-eme Ka Unu Ghara Ịgba Alụkwaghịm n’Agadi

N’Agbata afọ 1990 na 2015, ndị dị afọ iri ise ma ọ bụ karịa, ndị gbara di ha ma ọ bụ nwunye ha alụkwaghịm ji okpukpu abụọ karịa ndị nke afọ ndị gara aga n’Amerịka, ndị nke dị ihe karịrị afọ iri isii na ise ejiri okpukpu atọ karịa. Gịnị mere ndị agadi ji agba di ha ma ọ bụ nwunye ha alụkwaghịm? Gịnị ka unu ga-eme ka unu ghara ịgba alụkwaghịm ma unu mee agadi?

Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a

  • Gịnị mere ndị di na nwunye ji agba alụkwaghịm mgbe ha merela agadi?

  • Ihe i nwere ike ime

  • Ihe ndị unu nwere ike ikwurịta

Gịnị mere ndị di na nwunye ji agba alụkwaghịm mgbe ha merela agadi?

  • Di na nwunye gbaa alụkwaghịm ma ha mee agadi, ọ na-abụkarị na ọ dịla anya ha ji nwayọọ nwayọọ kwụsị ịdị ná mma. Ka chi na-eji na-abọ, ihe na-amasị ụfọdụ ndị di na-abịa dị iche n’ihe na-amasị ndị nwunye ha, ya emezie ka ihe ndị na-amasị ha abụọ dị ole na ole. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ụmụaka hapụ ụlọ gaa biri nke ha, ọ na-edozi di na nwunye anya na ha nọ kemgbe na-agba mbọ ka ha bụrụ ezigbo nne na nna, chefuzie ịna-agba mbọ ka ha bụrụ ezigbo di na nwunye.

  • Kemgbe afọ ole na ole gara aga, ndị e weere ka ndị ọkachamara n’ihe gbasara alụmdi na nwunye na-agwa ndị di na nwunye ka ha lekwasị anya n’ihe bụ́ mkpa nke onwe ha, ọ bụghị nke di ha ma ọ bụ nwunye ha. Ha na-agwa ndị di na nwunye ka ha jụọ onwe ha, sị, ‘M̀ na-enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye m?’ ‘Ọ̀ na-eme ka m bụrụkwuo ezigbo mmadụ?’ ‘Di m ma ọ bụ nwunye m ọ̀ na-egosi na ọ hụrụ m n’anya nakwa na o ji m kpọrọ ihe?’ Ndị mmadụ taa chere na ọ bụrụ na azịza nke ọ bụla n’ajụjụ ndị a bụ “mba,” i kwesịrị ime ihe ga-eme gị obi ụtọ, ya bụ, ịgba alụkwaghịm ma biwe ndụ otú ọzọ.

  • Ndị mmadụ anaghịzi ele ịgba alụkwaghịm anya ka ihe ọjọọ. Eric Klinenberg, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere mmekọrịta mmadụ na ibe ya, dere, sị: “Afọ ole na ole gara aga, ike alụmdi na nwunye gwụ mmadụ ya achọwa ịgba alụkwaghịm, ọ ga-ekwurịrị ezigbo ihe mere o ji chọọ ịgba alụkwaghịm. Ma ọ bụghịzi otú ọ dị taa. Ihe na-emezi taa bụ na ọ bụrụ na mmadụ anaghị enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ya, ọ ga-ekwu ihe mere ọ ga-eji ghara ịhapụ di ma ọ bụ nwunye ya. Ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na ndị mmadụ taa chere na mmadụ kwesịrị ịna-eme naanị ihe ga-eme onwe ya obi ụtọ.”a

Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ gbaa alụkwaghịm, ihe o mere bụ ịkwụsị otu nsogbu o nwere ma banye n’ọzọ. Dị ka ihe atụ, otu nchọpụta e mere gosiri na ihe na-esiri ndị gbara alụkwaghịm mgbe ha merela agadi ike, karịchaa ụmụ nwaanyị.

E nwekwara ihe ọzọ e kwesịrị ichebara echiche. Akwụkwọ bụ́ Don’t Divorce kwuru, sị, “Ọ bụrụgodị na ị gbanwee otú i si ebi ndụ, ị gaghị agbanwe onye ị bụ. È nweela ihe i mere iji gbanwee otú na-adịghị mma i si agwa ndị mmadụ okwu, bụkwanụ ihe na-esere gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu? Ị̀ gbanweela otú i si akpa àgwà ma gị na mmadụ nwee nghọtahie?”b

Ihe i nwere ike ime

  • Nabata ihe gbanwerenụ. Ihe nwere ike igbanwe n’alụmdi na nwunye ọ bụla. O nwere ike ịbụ na ihe agbanweela na alụmdi na nwunye unu maka na ụmụ unu ahapụla unu gaa biri nke ha ma ọ bụkwanụ na ihe na-amasị unu abụọ dịzi iche iche. Kama ịna-echekarị gbasara otú ihe dị n’oge gara aga, na-eche otú unu ga-esi mee ka ihe ka mma n’agbanyeghị otú ihe si dịrị unu ugbu a.

    Ebe di na nwunye merela agadị nọ na tebụl a na-anọ eri nri. Nke nwaanyị na-ele foto ndị ha na nwa ha nwoke sere, nke nwoke ana-ele anya n’oche n’enweghị onye nọ na ya dị ebe ahụ.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Asịla, ‘Gịnị mere oge gara aga ji ka oge a mma?’ n’ihi na ị jụọ ajụjụ a, ị naghị egosi na ị ma ihe.”​—Ekliziastis 7:10.

  • Gbaa mbọ ka unu na-adịkwu ná mma. Ì nwere ike ịgba mbọ ka ihe na-amasị di gị ma ọ bụ nwunye gị ugbu a masịwakwa gị ma ọ bụkwanụ gị enyere ya aka ka ihe na-amasị gị masịwa ya? Ì nwere ike ịchọpụta otu ihe ọhụrụ ga na-atọ unu abụọ ụtọ unu ga na-emekọ ọnụ? Mkpa unu kwesịrị ịbụ ịna-anọrị otú ga-eme ka unu na-emekọ ihe ka di na nwunye, ọ bụghị naanị ka mmadụ abụọ bi n’otu ụlọ.

    Ebe di na nwunye merela agadị gbakọrọ aka na-elekọta okooko osisi ha.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Ka onye ọ bụla na-achọ ihe ga-abara onye ọzọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara naanị yanwa uru.”​—1 Ndị Kọrịnt 10:24.

  • Na-akpa àgwà ọma. Akwụsịla ịna-akpaso di gị ma ọ bụ nwunye gị àgwà ọma maka na unu ebiela ọtụtụ afọ. Na-agwa ya okwu otú gosiri na ị na-akwanyere ya ùgwù, gbaakwa mbọ na-akpaso ya àgwà ọma ndị ahụ ị nọ na-akpaso ya mgbe unu ka na-akpa akpa. Na-asị ya “biko” na “i meela.” Na-egosi ya mgbe niile na ị hụrụ ya n’anya nakwa na obi dị gị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere gị.

    Ebe otu agadi nwoke ji nche anwụ kpuchie nwunye ya, mepeekwara ya ụzọ ụgbọala ka ọ banye.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Na-enwerenụ ibe unu obiọma, na-enwekwanụ obi ebere.”​—Ndị Efesọs 4:32.

  • Na-echeta mgbe unu bụ nnu na mmanụ. Na-elekọnụ foto ndị unu sere n’ụbọchị agbamakwụkwọ unu ọnụ, ma ọ bụ ndị unu sere n’ebe ndị ọzọ unu gakọrọ ọnụ. Ọ ga-enyere unu aka ka unu ghara ịkwụsị ịhụ ibe unu n’anya na ịkwanyere ibe unu ùgwù ma ọ bụkwanụ ka unu maliteghachi ịhụ ibe unu n’anya na ịkwanyere ibe unu ùgwù.

    Ebe di na nwunye merela agadị na-enwe obi ụtọ ka ha na-ekiri foto ha.

    Ihe Baịbụl kwuru: “Ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya otú ọ hụrụ onwe ya. Nwunye kwesịkwara ịna-akwanyere di ya ezigbo ùgwù.”​—Ndị Efesọs 5:33.

a Ebe e si nweta ihe a bụ n’akwụkwọ bụ́ Going Solo​—The Extraordinary Rise and Surprising Appeal of Living Alone.

b Naanị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ga-eme ka mmadụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm bụ ịkwa iko. (Matiu 19:5, 6, 9) Gụọ isiokwu bụ́ “Baịbụl Ọ̀ Kagburu Ịgba Alụkwaghịm?”

Ihe ndị unu nwere ike ikwurịta

Onye nke ọ bụla n’ime unu buru ụzọ chebara ajụjụ ndị a echiche. Kwurịtazienụ ihe ndị unu chere banyere ha.

  • Olee àgwà ndị mere ka ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị masị gị?

  • Ka afọ na-aga, olee ihe ndị ị chọpụtara gbanwere n’alụmdi na nwunye unu?

  • Olee ihe ndị ị ga-achọ ka unu mezikwuo n’alụmdi na nwunye unu?

  • Gịnị na gịnị ka i nwere ike ime ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị dịkwuo ná mma?

  • Gịnị na gịnị ka di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere ike ime ka unu dịkwuo ná mma?

  • Olee ụmụ obere àgwà ọma ndị ị ga-achọ ka di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akpaso gị?

  • Olee ihe ndị unu abụọ nwere ike ịna-emekọ ọnụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya