Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 8/8 p. 29-30
  • Nkịta M Na-anụchitere M Ihe!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkịta M Na-anụchitere M Ihe!
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọrụ Twinkie
  • Iji Nkà Enye Ọzụzụ
  • Njikọ Na-enye Obi Ụtọ
  • Otú Nkịta Si Anụ Ísì Ihe
    È Kere Ya Eke?
  • Ọ̀ Bụ Anụ E Ji Mere Enyi nke A Hụrụ n’Anya Ka Ọ̀ Bụ Ajọ Ogbu Ọchụ?
    Teta!—2002
  • Enwetara M ‘Ihe Obi M Na-arịọ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ịtụkwasị Anya na Obi n’Ihe Nrite Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 8/8 p. 29-30

Nkịta M Na-anụchitere M Ihe!

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA BRITAIN

“AMAGHỊ m ihe m ga-eme ma e wezụga obere nkịta m!” Ka Dorothy tiri ná mkpu, ka o ji ịhụnanya na-ele obere nkịta bụ́ ụdị Jack Russell tụrụ àgwà ọcha na nchara nchara makpuuru onwe ya n’okpuru oche. “Enwetara m Twinkie nanị n’ọnwa ole na ole gara aga, ma o meelarị ka m nwee ume ọhụrụ ná ndụ m!”

N’ilerukwu anya, ahụrụ m na Twinkie yi uwe odo odo tapaara ya n’ahụ nke e bikwasịrị mkpụrụ edemede ojii ndị dị okpotokpo bụ́ “NKỊTA NA-ANỤ IHE MAKA ONYE NTỊ CHIRI.” ‘Lee anụmanụ pụrụ iche ọ bụ!’ M na-echeta iche n’ime onwe m. ‘Gịnị ka ọ ga-emeli?’

Anyị zutere ná ndaba ná Mgbakọ Mba Nile “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke Ndịàmà Jehova e nwere na July gara aga na London, England, nke mmadụ 44,000 bịara. Site n’ịnọdebe ígwè okwu, Dorothy nụrụ ihe omume ahụ, ya mere n’ihi gịnị ka nkịta na-anụ ihe jiri dị ya mkpa? Ka anyị nọdụrụ na-akparịta ụka n’oge izu ike nri ehihie, Dorothy kọọrọ m akụkọ banyere onwe ya.

Ọrụ Twinkie

Ntị chiri Dorothy kpam kpam n’ihi àgbà ọ rịara mgbe ọ dị afọ atọ. Kemgbe afọ 23 gara aga di ya nwụrụ, o bi nanị ya, ma, dị ka Dorothy si kọwaa, ọ bụghị nanị mkpakọrịta ya na mmadụ dị ya mkpa ka ọ na-emewanye agadi. “Ndị ntị chiri pụrụ inwe mmetụta nke anọghị nnọọ ná nchebe mgbe ha nọ n’afọ ndụ m,” ka o kwuru. “Adị m afọ 74 ma biri n’ụlọ nwere onye nlekọta, ma mgbe onye nlekọta ahụ bịara ịhụ m, adịghị m anụ ụda mgbịrịgba ụlọ m ma ọlị. N’iche na ọ pụrụ ịbụ na ejighị m ahụ, mgbe ụfọdụ ọ batara mgbe m na-amaghị; nke ahụ emenyewokwa m ụjọ. Ma ugbu a Twinkie na-anụ ụda mgbịrịgba ahụ, ọ na-abịakwa kpatụrụ m n’ụkwụ, durukwa m jee n’ọnụ ụzọ mbata. N’otu aka ahụ, mgbe Twinkie nụrụ mgbaàmà nke ovun mụ nwere oge nkwụsị, ọ na-agbakwute m, m na-esochikwa ya azụ. Ọ bụrụ na mgbaàmà anwụrụ ma ọ bụ ọkụ akụọ, a zụrụ Twinkie ịdọta uche m ma makpuruzie n’ala iji gosi na e nwere ihe pụrụ ịkpata ihe ize ndụ. Mgbe ọ bụla o nyeere m aka, m na-eji ihe oriri pụrụ iche, na-eto akpịrị bụ́ nke na-amasị ya akwụghachi ya ụgwọ.”

Iji Nkà Enye Ọzụzụ

A kpaliri mmasị m. “Olee otú i si nweta nkịta gị, ònye zụkwara ya?” Ka m jụrụ. Nke a kpaliri Dorothy ịkọrọ m ihe ụfọdụ banyere Nkịta Ndị Na-anụ Ihe Maka Ndị Ntị Chiri, bụ́ òtù ọrụ ebere nke nzube ya bụ inyere ndị nti chiri na Britain aka ịnọ n’adabereghị n’onye ọzọ ma si otú a meziwanye ọdịdị ndụ ha. Kemgbe 1982 o zijeworo ndị ntị chiri ọtụtụ narị nkịta na Britain. Ozugbo a zụsịrị ya nke ọma, a na-enyefe nkịta n’aka onye ọhụrụ ga-enwe ya site n’ikuchi ya, n’akwụghị ụgwọ ọ bụla.

Nkịta ndị a na-ahọrọ na-abụkarị ndị kpafuru akpafu, ndị a na-esitekarị n’ogige nkịta ndị kpafuru akpafu dị gburugburu mba ahụ enweta, ọ bụ ezie na ndị na-akpa nkịta na-enye ụfọdụ. Ọ na-ewe ihe ruru ọnwa 12 iji zụọ otu nkịta. Ndị na-akwado ọzụzụ ya na-akwụkarị ihe ọ na-efu, ụlọ ọrụ ma ọ bụ otu òtù na-ewekọta ụtụ ha dị nta ọnụ. Dorothy gwara m na otu òtù na-enyere ndị mmadụ aka ifelata jiri obi ebere kwadoo ọzụzụ Twinkie.

Ozugbo a họọrọ ya, a na-azụ nkịta nke ọ bụla ga na-anụ ihe, site na mgbe ha dị izu asaa ruo afọ atọ, imeghachi omume nye ụda ụfọdụ. Otú ọ dị, na mbụ a na-akpọjere ya onye ga-eme ka ọha na eze mara ya ahụ, bụ́ onye ọrụ afọ ofufo nke na-akpọrọ nkịta ahụ laa n’ụlọ ya ruo malite n’ọnwa abụọ ruo asatọ, na-adabere n’afọ ndụ nkịta ahụ na ahụmahụ o nwere. Ime ka ọha na eze mara ya ahụ pụrụ ịgụnye ịkụziri ya ezi àgwà ndị bụ́ isi, ma nzube ya bụ́ isi bụ ime ka anụmanụ ahụ mata ebe ọha mmadụ na-anọ na ụgbọ njem ọha nke ọma na ime ka o soro ndị mmadụ nọ n’afọ ndụ nile, gụnyere ụmụaka na ụmụ ọhụrụ nwee mmekọrịta n’ụzọ dịgasị iche. Nzube e ji eme ya bụ iji zụọ nkịta ahụ ịkpazi àgwà n’ọnọdụ ọ bụla ọ pụrụ imesị hụ onwe ya na ya.

Tụkwasị na nke a, anụrụ m na òtù ndị ọzọ na-eji nkịta enyere ndị nwere mkpa pụrụ iche aka. Tụkwasịkwa n’ịzụ ha irube isi n’iwu, a na-eme ka nkịta ndị a mata ebe na isisi ụfọdụ kpọmkwem. A kụziiri otu nkịta maara eweta ihe nke na-elekọta otu nwanyị na-apụghị isi n’oche nkwagharị bilie, iweta telifon na akwụkwọ ozi ya na imetụ stamp akwụkwọ ozi ọnụ mmiri! Nkịta ọzọ na-erube isi n’iwu 120 a na-enye ya, ọbụna iweta kom kom na mkpọ ndị dị na shelf nnukwu ụlọ ahịa. Onye ahụ nwere nkwarụ nke nwe nkịta ahụ, na-eji mkpanaka nwere ọkụ laser n’ọnụ ya eme ka a mata ihe ndị ọ họọrọ, nkịta ya na-ewegazikwara ya ha.

Njikọ Na-enye Obi Ụtọ

“Mmadụ nile hà na-aghọta uru Twinkie bara?” ka m jụrụ. “Otu onye na-ere ihe n’ụlọ ahịa ekweghị ka nkịta m bata,” ka Dorothy zaghachiri. “Echere m na nke a bụ n’ihi na ọ kpọsara ihe oriri ụfọdụ, ma omume ya pụrụ nnọọ iche, n’ihi na ọ ghọtaghị ihe mere Twinkie ji dị m mkpa.”

Aghọtala m ugbu a uru ọ bara inwe nkịta na-anụ ihe n’ụlọ, ma m ka nwere otu ajụjụ. Olee uru Twinkie bara mgbe Dorothy na ọtụtụ ndị Kraịst ibe ya nọ na-enwe mkpakọrịta obi ụtọ? “Apụrụ m ịmata ihe mmadụ na-ekwu nke ọma site n’ile ya anya n’egbugbere ọnụ, ngwá ịnụ ihe m na-enyekwara m aka inwe mkparịta ụka,” ka Dorothy kọwara. “Mgbe ndị mmadụ hụrụ uwe odo odo Twinkie, ha na-amata ozugbo na ntị chiri m. Ha na-elegidezi m anya n’ihu agwa m okwu, mgbe mgbe n’ụzọ doro anya ruo otú ha nwere ike. N’ụzọ dị otú a, ọ dịghị m mkpa ịkọwa nkwarụ m, nke ahụ na-emekwa ka ihe dịrị m nnọọ mfe karị.”

Nnọkọ mgbakọ ahụ na-achọ ịmaliteghachi, ọ dị mkpa ka Twinkie kpagharịa tupu ọ nọdụ ala maka ehihie ahụ. Tupu m pụọ, m hulatara ala dịdaa ya aka n’azụ. Twinkie meghere anya ya na-enwu zaa, mgbe ahụkwa lee Dorothy anya ma fegharịa ọdụ ya. Lee obere enyi na-erube isi, bara uru ọ bụ—mmekọrịta ha bụkwa ịgba!

[Foto dị na peeji nke 30]

Enyemaka Twinkie na-aba oké uru ná mgbakọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya