“Ọ Bụghị Mmadụ Nile Ka A Kpọrọ Ịbịa Oriri Ahụ”
AKWỤKWỌ bụ́ Human Development Report 1998, bụ́ akụkọ mgbaafọ nke Ihe Omume Mmepe Obodo nke Òtù UN, ma ọ bụ UNDP chịkọtara, lekwasịrị anya ná mmụba a na-enwetụbeghị ụdị ya n’iji ihe ndị e mepụtara emepụta eme ihe n’ụwa. O kpughere na, n’ụwa nile, anyị na-emefu ugbu a ego ji okpukpu isii karịa ka anyị mefuru na 1950 na nke ji okpukpu abụọ karịa ka anyị mefuru na 1975 ná ngwá ahịa. N’agbanyeghị mmụba a e nwere n’iji ihe ndị e mepụtara emepụta eme ihe, ọga kpata kpata nke UNDP, bụ́ James Gustave Speth, na-ekwu, sị: “Ọ bụghị mmadụ nile ka a kpọrọ ịbịa oriri ahụ.”
Iji maa atụ: Pasent 20 nke ndị kasị baa ọgaranya n’ụwa na-eri azụ̀ ji okpukpu asaa karịa nke pasent 20 nke ndị kasị daa ogbenye n’ụwa na-eri. Pasent 20 ahụ nke ndị kasị baa ọgaranya na-erikwa anụ okpukpu 11, na-eji ike eletrik eme ihe okpukpu 17, nwee usoro njikọ telifon okpukpu 49, na-eji akwụkwọ eme ihe okpukpu 77, nweekwa ụgbọala okpukpu 149 karịa pasent 20 nke ndị kasị daa ogbenye n’ụwa.
N’ikwu banyere nchọpụta ndị a, Redio òtù UN kwuru na iji belata ndalata e nwere n’ihe ndị sitere n’okike dị n’ụwa, ọ dị akụkụ ụwa ebe ndị ụlọ ọrụ mmepụta ihe juru mkpa ịgbanwe ụzọ ha si eji ihe ndị e mepụtara emepụta eme ihe. N’otu oge ahụ, mba ndị kasị baa ọgaranya kwesịrị isoro ndị dara ogbenye n’ụwa kerịtakwuo akụ̀ na ụba ha ka ha wee nwee ike iritekwu uru site n’ihe ndị sitere n’okike dị n’ụwa. Akụ̀ na ụba hà aṅaa ka ọ ga-adị mkpa ka e kerịta?
Maazị Speth gbakọrọ na ọ bụrụ na mba ndị ụlọ ọrụ mmepụta ihe juru na ha ga-etinye mmaji abụọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ enyemaka ha na-enye maka mmepe ugbu a—site n’ijeri $50 ruo $100 ijeri n’otu afọ—ndị nile dara ogbenye n’ụwa nile ga-enwe ike inweta ihe oriri, ahụ ike, mmụta, na ebe obibi. Ugbu a ijeri $50 pụrụ iyi ego buru oké ibu. Ma, Maazị Speth na-ekwu, sị: “Ọ bụ ego ndị Europe na-emefu kwa afọ na siga, ọ bụkwa ọkara nke ego ndị United States na-emefu taa n’ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya.”
Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, mgbalị a gbakọtara aka mee iji kee ihe ndị sitere n’ụwa a otú ọ ga-erutezu mmadụ nile n’ụzọ ha nhata karị ga-eme ihe dị ukwuu n’ịkwụsị ịda ogbenye na-egbu mgbu n’obi. Gịnị ka a chọrọ iji mee nke a? Otu onyeisi nke òtù UN kwuru, sị: “N’ụzọ bụ́ isi ihe a chọrọ bụ mgbanwe nke obi, uche na ọchịchọ.” Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ kwere na nke ahụ ma ghọtakwa na òtù ndị omeiwu nke taa, n’agbanyeghị ezi nzube ha pụrụ inwe, apụghị ime ka e nwee mgbanwe ndị dị otú ahụ, ma ya fọdụzie ịkwụsị àgwà ndị dị ka anyaukwu.
Ka o sina dị, nye ndị na-echegbu onwe ha banyere ọdịnihu nke ezinụlọ mmadụ na mbara ụwa anyị, olileanya dị. Ọ bụ ihe na-agba ume ịmata na Onye Okike ụwa ekwewo nkwa iwepụ nsogbu nile nke mmadụ kpam kpam. Ọbụ abụ ahụ buru amụma, sị: “Ala emewo ihe omume ya: Chineke, bụ́ Chineke anyị, ga-agọzi anyị. Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” (Abụ Ọma 67:6; 72:16) Ee, mgbe ahụ a ‘ga-akpọ onye ọ bụla bi n’ụwa ịbịa oriri ahụ’!