Ịda Ogbenye—‘Ọnọdụ Mberede Na-adịghị Ada Ụda’
“ANYỊ na-anụ ọtụtụ ihe banyere ọnọdụ mberede na-ada ụda nke ikpo ọkụ nke ụwa na ihe mkpuchi ozone na mmetọ oké osimiri,” ka onye ndụmọdụ nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu, bụ́ Dr. Mahbub Ul-Haq kwuru, ma ọ gbakwụnyere, sị: “Ikpo ọkụ nke ụwa na ọtụtụ ihe mberede ndị ọzọ na-ada ụda egbubeghị onye ọ bụla [ebe] ihe mberede ndị na-adịghị ada ụda na-ala ọtụtụ ndụ n’iyi kwa ụbọchị ná mba ndị ka na-emepe emepe.” Dr. Ul-Haq kwuru okwu banyere otu n’ime ihe mberede ndị ahụ na-adịghị ada ụda. “Ịda ogbenye,” ka o kwuru, “bụ ihe kasị egbu egbu.” Ò si aṅaa bụrụ otú ahụ?
Nye ọtụtụ n’ime 1.3 ijeri mmadụ n’ụwa nile bụ́ ndị na-eji otu dollar ma ọ bụ ihe dị ala karị adị ndụ n’ụbọchị, ịda ogbenye na-aghọ n’ezie ọdachi na-egbu egbu. Ihe ruru nde 18 mmadụ na-anwụ kwa afọ n’ihi “ihe ndị e jikọtara ha na ịda ogbenye na-akpata,” ka magazin bụ́ UN Chronicle na-akọ. Ọnụ ọgụgụ a na-ebu isi! Chee echiche isi akụkọ ndị “na-ada ụda” ọ ga-abụ ma ọ bụrụ na, dị ka ihe atụ, ndị nile bi n’Australia, ihe dị ka nde 18 mmadụ, anwụọ n’otu afọ! Ma, a “dịghị ekwukarị okwu banyere” ọnwụ nke ọtụtụ nde ndị ogbenye a, ka otu mgbasa akụkọ Redio UN kwuru. Nke a bụ n’ezie, ‘ọdachi na-adịghị ada ụda.’
Iji kwụsị ịgba nkịtị ahụ, ndị nnọchiteanya sitere mba 117 gara Nzukọ Ụwa mbụ e nwetụrụla maka Mmepe Ọha na Eze kwuru okwu banyere ụzọ dị iche iche isi gbasoo nsogbu ịda ogbenye dị n’ụwa mgba. “Otu narị na iri afọ ise gara aga, ụwa buru agha megide ịgba ohu,” ka James Gustave Speth, bụ́ onye isi nke Usoro Mmepe nke Mba Ndị Dị n’Otu, chetaara ha. “Taa anyị aghaghị ibu agha zuru ụwa ọnụ megide ịda ogbenye ọha mmadụ.” Gịnị kpatara nchegbu ahụ? Ịda ogbenye, ka ọ dọrọ aka ná ntị, “na-amụba obi nkoropụ na akwụsighị ike, [ọ] na-emebikwa ụwa anyị.”
Otú ọ dị, ọbụna ka ndị ahụ bịaranụ na-ekwurịta ụzọ dị iche iche isi kwụsị ịda ogbenye, otu ‘klọọkụ ịda ogbenye,’ nke e ji amata ọnụ ọgụgụ ụmụ ọhụrụ a na-amụ kwa ụbọchị n’ezinụlọ ndị dara ogbenye, gosiri na ọnọdụ ịda ogbenye zuru ụwa ọnụ na-akawanye njọ. Klọọkụ ahụ, nke e gosipụtara n’ebe a na-eme mgbakọ ahụ, gosiri na n’oge nzukọ ahụ were otu izu, a gbakwụnyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụmụ ọhụrụ 600,000 n’ọnụ ọgụgụ nọgidere na-arị elu nke ndị ogbenye. Ná ngwụsị nke ụbọchị ikpeazụ nke nzukọ ahụ, a gbanyụrụ ihu klọọkụ; ma n’ezie, dị ka Speth kwuru, “klọọkụ ahụ na-akụ na-aga n’ihu.” Ajụjụ dị ugbu a bụ, A ga-anụ ya?