Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 8/8 p. 3-4
  • Ọ̀ Bụ Akara Aka Ka Ọ Bụ Nanị Ihe Ndabara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Bụ Akara Aka Ka Ọ Bụ Nanị Ihe Ndabara?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịchọ Nkọwa
  • Ịkọwa Akara Aka
  • Ihe Na-ekpebi Ya
  • Bible Ọ̀ Na-akụzi Nkweta n’Akara Aka?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ikwere n’Akara Aka Ọ̀ Na-achị Ndu Gi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ịchọ Ọdịnihu A Kara Aka nke Mmadụ
    Teta!—1999
  • Ihe Ọghọm—Akara Aka Ka Ọ̀ Bụ Ihe Ndabara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 8/8 p. 3-4

Ọ̀ Bụ Akara Aka Ka Ọ Bụ Nanị Ihe Ndabara?

“AKARA aka gburu ọtụtụ ndị ma hapụ ndị ọzọ,” ka International Herald Tribune kwuru. N’afọ gara aga, mwakpo nke ndị na-eyi ọha egwu wakporo ọfịs ndị nnọchiteanya America dị na Kenya na Tanzania gburu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 200 ma merụọ ọtụtụ narị mmadụ ahụ. Otú ọ dị, “oge chebere ndị ọkwá ha kasị elu n’ọfịs onye nnọchiteanya ahụ,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru.

Ndị a lanarịrị n’ihi na ha nọ na-enwe nzukọ n’otu akụkụ nke ụlọ ahụ bụ́ ebe dịpụrụ adịpụ site n’ebe ahụ bọmbụ gbawara. Ma otu onye ọkwá ya dị elu n’ọfịs onye nnọchiteanya mba ahụ, bụ́ onye kwesịrị ịga nzukọ ahụ ma ọ gaghị, nọ n’ebe dịkwu nso n’ebe ahụ bọmbụ ahụ gbawara, o gbukwara ya.

“Akara aka kpakwara Arlene Kirk aka ọjọọ,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru. Mgbe o si ezumike na-alaghachi Kenya, Arlene jiri obi ya nye onye ọzọ oche ya n’ụgbọelu mmadụ karịrị akarị tinyere aha ha isoro. Otú ọ dị, ndị njem ndị ọzọ buru ya ụzọ nye oche ha, mere o ji gbaa ụgbọelu ahụ. N’ihi ya, ọ bịara ọrụ n’ọfịs onye nnọchiteanya mba ahụ n’ụbọchị bọmbụ ahụ gbawara, o gbukwara ya.

Ọdachi abụrụghị mmadụ ihe ọhụrụ. Ma, ịkọwa ihe ọdachi bụ adịtụghị mfe. Mgbe nile, ụfọdụ na-anwụ n’ihe ọghọm na ọdachi ndị na-eme n’ụwa nile, ebe ụfọdụ na-alanarị. Otú ọ dị, ọ bụghị nanị mgbe e nwere ọdachi ka ụfọdụ na-ajụ, ‘N’ihi gịnị ka o ji mee m?’ Ọbụna n’ihe banyere ihe ọma na-eme ná ndụ, ọ na-eyi ka ụfọdụ hà na-enweta ihe ọma karịa ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na nye ọtụtụ ndị ndụ bụ ndọlị na-adịghị agwụ agwụ, nye ndị ọzọ ihe yiri ka ọ na-agara ha nnọọ were were. Ya mere, ị pụrụ ịjụ, ‘Ọ̀ pụrụ ịbụ na n’ụzọ ụfọdụ nke a bụ ihe e mere atụmatụ ya? Akara aka ọ̀ na-achịkwa ndụ m?’

Ịchọ Nkọwa

Ihe dị ka afọ 3,000 gara aga, otu eze nwere amamihe hụrụ ihe ndị ọ na-atụghị anya ha na-eme gburugburu ya. O nyere nkọwa na-esonụ maka ihe ndị a merenụ: “Mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.” (Eklisiastis 9:11) Mgbe ụfọdụ ihe a na-atụghị anya ya na-eme. O nweghị nnọọ ụzọ a ga-esi kwuo ya tupu o mee. Ihe ndị dị ịrịba ama na-emenụ, ma nke ọma ma nke ọjọọ, na-abụkarị ndị oge na-emetụta.

Otú ọ dị, ị pụrụ inwe otu echiche ahụ ndị mmadụ na-enwe bụ́ ndị, kama ịkọwa ihe dị ka ihe ndị na-eme ná ndaba, na-eche na ọ dị ihe ọzọ na-akpata ha—akara aka. Ikwenye n’ọdịnihu a kara aka bụ otu n’ime nkwenkwe okpukpe kasị ochie mmadụ nwere, kasị zuokwa ebe nile.a Prọfesọ François Jouan, bụ́ onyeisi Ụlọ Ọrụ Na-eme Nchọpụta Banyere Akụkọ Ọdịbendị Na-emeghị Eme na Mahadum Paris, na-ekwu, sị: “E nweghị ọgbọ ma ọ bụ ọdịnala na-ekwebeghị na e nwere chi ụfọdụ na-ekpebi ọdịnihu a kara aka . . . iji kọwaa ihe nile a na-apụghị ịkọwa akọwa ná ndụ anyị.” Ọ bụ nke ahụ mere e ji anụkarị ka ụmụ mmadụ na-ekwu, sị: “Oge ọnwụ ya erubeghị” ma ọ bụ, “Nke ahụ bụ akara aka ya.” Gịnị bụ akara aka?

Ịkọwa Akara Aka

Okwu Bekee pụtara akara aka si n’okwu Latin bụ́ fatum, nke pụtara “okwu amụma, ihe a gbatara n’afa, ihe chi kpebiri.” Ọ bụ ezie na n’oge ụfọdụ a na-eche na ọ bụ ikike na-enweghị kpọmkwem onye o bu n’uche na-ekpebi ọdịnihu n’ụzọ a na-apụghị izere ezere ma kọwaa akọwa, ihe ka n’ọtụtụ mgbe, a na-eche na ikike a bụ chi.

Ọkọ akụkọ ihe mere eme banyere okpukpe bụ́ Helmer Ringgren na-akọwa, sị: “Ihe gbara ọkpụrụkpụ n’echiche e nwere banyere okpukpe bụ na ọdịnihu a kara aka nke mmadụ abụghị ihe na-abaghị uru ma ọ bụ ihe na-eme ná ndabara, kama ọ bụ ikike nke a pụrụ ikwu na ọ bụ ọchịchọ ma ọ bụ nzube na-akpata ya.” Ọ bụ ezie na a na-echekarị na a pụrụ ịgbanwetụ ihe ruo ókè ụfọdụ, ọtụtụ ndị na-ele ụmụ mmadụ anya dị ka ndị na-enweghị ike, na-enweghịkwa ike ime ihe ọ bụla banyere ya. N’ụzọ dị otú a ha ‘na-ezute akara aka ha.’

Ọ dịwo anya ndị ọkà mmụta okpukpe na ndị ọkà ihe ọmụma nwara ịkọwa akara aka. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion na-ekwu, sị: “Echiche e nwere banyere akara aka, n’agbanyeghị otú e si gbanwee ya, asụsụ ọ dị na ya, otú nkọwa ya si dịtụ iche, na-enwekarị akụkụ gbara ọkpụrụkpụ nke bụ́ ihe omimi.” Otú ọ dị, otu ihe a na-ahụ n’ime echiche a na-agbagwoju anya bụ echiche nke inwe ikike dị elu na-achịkwa ma na-eduzi ihe omume mmadụ. A na-eche na ikike a na-ekpebi ndụ ndị mmadụ na mba tupu oge eruo, na-eme ka ọdịnihu bụrụ nnọọ ihe a na-apụghị izere ezere dị ka oge ndị gaworo aga.

Ihe Na-ekpebi Ya

Ọ̀ dị ihe o mere ma ì kwere n’akara aka ma ọ bụ na i kweghị? “Ọnọdụ ndụ ụmụ mmadụ na-eme ihe dị ukwuu n’ikpebi echiche ha, ma, n’aka nke ọzọ, echiche ha na-eme ihe dị ukwuu n’ikpebi ọnọdụ ha,” ka ọkà ihe ọmụma si England bụ́ Bertrand Russell dere.

N’ezie, ikwenye n’akara aka—ma ihe dị otú ahụ ọ̀ dị ma ọ bụ na ọ dịghị—pụrụ imetụta otú anyị si eme omume. N’ikwenye na ọ bụ uche ndị bụ́ chi, ọtụtụ na-anakwere ọnọdụ ha n’emeghị ihe ọ bụla—n’agbanyeghị ókè ọ jọruru ná njọ ma ọ bụ siruo ike—dị ka a ga-asị na ọ bụ ihe ha ketara ná ndụ ha bụ́ nke a na-apụghị ịgbanwe. N’ihi ya, ikwenye n’akara aka na-eme ka a ghara inwe echiche nke inwe ibu ọrụ onwe onye.

N’aka nke ọzọ, ikwenye n’ọdịnihu a kara aka akpaliwo ndị ọzọ ime ihe dị iche. Dị ka ihe atụ, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ọ bụ ọtụtụ ihe kpatara mgbasa nke usoro akụ̀ na ụba ịdị n’aka ndị nkịtị na mgbanwe e nwere n’usoro mmepụta ihe. Otu n’ime ha bụ nkwenkwe e kwere n’ọdịnihu a kara aka. Ụfọdụ okpukpe Protestant na-ezi na Chineke na-enye ndị mmadụ akara aka maka nzọpụta. Onye Germany bụ́ ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Max Weber na-ekwu, sị: “Ajụjụ bụ́, Àbụ m otu n’ime ndị a họpụtara? aghaghị ịbụ na o chewo onye ọ bụla kwere ekwe ihu otu mgbe.” Ndị mmadụ nọ na-achọ ịmata ma ha nwere ngọzi Chineke ma bụrụ ndị e si otú ahụ nye akara aka maka nzọpụta. Weber kwuru na ha mere nke a site n’itinye aka ‘n’ihe omume ụwa.’ E lere ọganihu n’achụmnta ego na mkwakọba nke akụ̀ na ụba anya dị ka ihe na-egosi ihu ọma Chineke.

Ikwenye n’akara aka na-akwanye ụfọdụ n’imebiga ihe ókè. N’agha ụwa nke abụọ, ndị agha ụgbọelu Japan na-eme mwakpo ga-ata isi ha kwenyere na kamikaze, ma ọ bụ “ikuku nsọ.” Echiche nke bụ́ na ndị bụ́ chi nwere nzube nakwa na mmadụ pụrụ ikere ókè na ya mere ka e nwee echiche okpukpe banyere ọnwụ. N’iri afọ gara aga, ndị na-atụ bọmbụ ga-ata isi ha nọ n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa mere isi akụkọ ọtụtụ ugboro n’ihi mwakpo ha na-atụ egwu. Ikwenye n’akara aka na-ekere ókè dị ukwuu ná ‘mwakpo ndị a na-akpata igbu onwe onye nke okpukpe kpaliri,’ ka otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma na-ekwu.

Ma n’ihi gịnị ka ikwenye n’akara aka ji bụrụ nke juru ebe nile? Ịtụletụ mmalite ya ga-enye azịza ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Echiche banyere akara aka zuru nnọọ ebe nile nke na mgbe a na-ekwu okwu ọnwụ mmadụ, n’ọtụtụ asụsụ a na-ejikarị okwu bụ́ “akara aka” eme ihe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya