Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 8/8 p. 5-8
  • Ịchọ Ọdịnihu A Kara Aka nke Mmadụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịchọ Ọdịnihu A Kara Aka nke Mmadụ
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ebe Ndị Akara Aka Malitere n’Oge Ochie
  • Akara Aka n’Ijipt Oge Ochie
  • Gris na Rom
  • “Ndị Kraịst” Arụrịta Ụka Banyere Akara Aka
  • Nkwenkwe Zuru Ebe Nile
  • Ọ̀ Bụ Akara Aka Ka Ọ Bụ Nanị Ihe Ndabara?
    Teta!—1999
  • Ikwere n’Akara Aka Ọ̀ Na-achị Ndu Gi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Bible Ọ̀ Na-akụzi Nkweta n’Akara Aka?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ihe Ọghọm—Akara Aka Ka Ọ̀ Bụ Ihe Ndabara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 8/8 p. 5-8

Ịchọ Ọdịnihu A Kara Aka nke Mmadụ

N’IHI gịnị ka ikwenye n’akara aka ji zuo nnọọ ebe nile? N’ọgbọ nile, mmadụ achọwo ikpughe ihe omimi na ịchọta nzube ụfọdụ site n’ihe ndị na-emenụ. “Ọ bụ na nke a ka echiche bụ́ ‘chi,’ ‘ọdịnihu a kara aka,’ na ‘ihe ndabara’ na-apụta ìhè, na-adabere ma ihe ndị na-emenụ hà bụ n’ihi ike mmadụ, ike na-abụghị nke mmadụ, ma ọ bụ na ọ dịghị nke ọ bụdị abụ,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Helmer Ringgren na-ekwu. Nkwenkwe, akụkọ mgbe ochie, na echiche ụgha ndị metụtara akara aka na ọdịnihu a kara aka juru eju n’akụkọ mgbe ochie.

Ọkachamara n’ihe banyere akụkọ ihe mere eme nke Asiria bụ́ Jean Bottéro na-ekwu, sị: “Mmepeanya Mesopotamia na-ekpebi otú anyị si ele akụkụ nile nke ọdịbendị anyị anya nke ukwuu,” na-ekwukwasị na ọ bụ na Mesopotamia ma ọ bụ Babilọn ka anyị na-ahụ “mmeghachi omume na echiche kasị ochie pụtara ìhè nke ihe a kpọrọ mmadụ banyere ikike karịrị nke mmadụ, bụ́ ụdị okpukpe kasị tee aka a matara ya.” Ọ bụkwa na nke a ka anyị si mata ebe akara aka malitere.

Ebe Ndị Akara Aka Malitere n’Oge Ochie

Ná mkpọmkpọ ebe dị na Mesopotamia, dị n’ebe bụ Iraq ugbu a, ndị ọkà mmụta ihe ochie achọpụtawo ụfọdụ n’ime ihe odide ndị kasị ochie mmadụ maara. Ọtụtụ puku nkume ndị e ji ihe odide cuneiform dee na-eme ka anyị mata otú ndụ dị n’oge mmepeanya oge ochie nke Sumer na Akkad na n’obodo a ma ama bụ́ Babilọn. Dị ka ọkà mmụta ihe ochie bụ́ Samuel N. Kramer si kwuo, ‘nsogbu nke ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata, nke ka nke n’ihe metụtara ihe omimi ndị na-akpata ha nyere ndị Sumer nchegbu.’ Ọchịchọ ha chọrọ azịza dugara ha n’echiche nke akara aka.

N’akwụkwọ ya bụ́ Babylon, ọkà mmụta ihe ochie bụ́ Joan Oates na-ekwu na “onye Babilọn ọ bụla nwere chi ma ọ bụ chi nwanyị nke ya.” Ndị Babilọn kweere na ndị bụ́ chi “na-ekpebi ọdịnihu a kara aka nke ihe nile a kpọrọ mmadụ, n’otu n’otu na n’ozuzu ha.” Dị ka Kramer si kwuo, ndị Sumer kweere na “ndị bụ́ chi na-achịkwa eluigwe na ụwa mere atụmatụ ma guzobe ihe ọjọọ, ụgha na ime ihe ike ịbụ akụkụ dị mkpa nke mmepanya.” Ikwenye n’akara aka zuru ebe nile, e jikwara ya kpọrọ oké ihe.

Ndị Babilọn chere na a pụrụ ịmata atụmatụ ndị bụ́ chi mere site n’ịjụ ndị mmụọ ase—“ụzọ e si esoro ndị bụ́ chi ekwurịta okwu.” Ịjụ ndị mmụọ ase gụnyere ịnwa ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu site n’ikiri, ịghọta, na ịkọwa ihe dị iche iche na ihe ndị na-emenụ. Dị ka ọ na-adịkarị, a tụlere nrọ, akparamàgwà anụmanụ, na ihe ndị dị n’ime ahụ. (Tụlee Ezikiel 21:21; Daniel 2:1-4.) E deturu n’elu nkume ihe ndị mere mgbe a na-atụghị anya ha ma ọ bụ ndị na-adịghị emekarị bụ́ ndị a sị na ha na-ekpughe ọdịnihu.

Dị ka onye France bụ́ ọkà mmụta banyere mmepeanya oge ochie bụ́ Édouard Dhorme si kwuo, “ruo otú anyị mụruru akụkọ ihe mere eme nke Mesopotamia ugbu a, anyị na-ahụ onye na-akọ ọdịnihu na echiche nke ịjụ ndị mmụọ ase.” Ịjụ ndị mmụọ ase ghọrọ akụkụ dị mkpa nke ndụ. N’ezie, Prọfesọ Bottéro na-ekwu na “a pụrụ ile ihe ọ bụla anya dị ka ihe a pụrụ inyocha enyocha na ihe e ji amata ọdịnihu . . . E weere eluigwe na ala dum dị ka ihe àmà a pụrụ iji mata ọdịnihu n’ụzọ ụfọdụ mgbe e nyochasịrị ha nke ọma.” Ndị Mesopotamia si otú a bụrụ ndị na-agụsi kpakpando ike dị ka ụzọ isi kwuo ihe ga-eme n’ọdịnihu.—Tụlee Aịsaịa 47:13.

Ọzọkwa, ndị Babilọn jiri ihe yiri mkpụrụ ludo ma ọ bụ ife nzà jụọ ndị mmụọ ase. N’akwụkwọ ya bụ́ Randomness, Deborah Bennett na-akọwa na nzube ha bụ ‘ime ka ndị mmadụ ghara inwe ike ime ya otú masịrị ha ma si otú a mee ka ndị bụ́ chi nwee ụzọ doro anya ha ga-esi na-ekwupụta uche ha.’ Otú ọ dị, e wereghị mkpebi nke ndị bụ́ chi ịbụ ndị a na-apụghị ịgbanwe agbanwe. A pụrụ inweta enyemaka iji zere akara aka ọjọọ site n’ịrịọ ndị bụ́ chi arịrịọ.

Akara Aka n’Ijipt Oge Ochie

Na narị afọ nke 15 T.O.A., ndị Babilọn na ndị Ijipt mekọrịtara ihe nke ukwuu. E webatara ihe omume okpukpe ndị metụtara akara aka ná mgbanwerịta ọdịbendị nke ha mesịrị nwee. N’ihi gịnị ka ndị Ijipt ji kwere n’akara aka? Dị ka John R. Baines, bụ́ prọfesọ na Nkà Mmụta Ihe Ochie Ndị A Chọpụtara n’Ijipt na Mahadum Oxford si kwuo, “akụkụ ka ukwuu nke okpukpe [Ijipt] metụtara ịgbalị ịghọta na ime ihe banyere ọdịnihu a na-apụghị ịkọwali na ihe ndabara ọjọọ.”

N’ime ọtụtụ chi ndị Ijipt, a kọwara Isis dị ka “nwanyị nwe ndụ, bụ́ onye na-ekpebi akara aka na ọdịnihu a kara aka.” Ndị Ijipt jụkwara ndị mmụọ ase ma gụọ kpakpando. (Tụlee Aịsaịa 19:3.) Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu, sị: “Ịdị nkọ ha n’ịjụ ndị bụ́ chi ajụjụ gabigara ókè.” Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ndị Ijipt bụ mmepeanya nwetara echiche akara aka site n’aka ndị Babilọn.

Gris na Rom

A bịa n’ihe metụtara okpukpe, “Gris oge ochie nwetara mmetụta na-adịte anya, ma ọ bụghị nke gabigara ókè nke ndị Babilọn,” ka Jean Bottéro na-ekwu. Prọfesọ Peter Green na-akọwa ihe mere ikwenye n’ọdịnihu a kara aka ji zuo nnọọ ebe nile na Gris: “N’ụwa nke ihe na-edochaghị anya, bụ́ ebe ụmụ mmadụ na-alawanye azụ ịza ajụjụ banyere mkpebi nke ha, na-ewerekwa onwe ha n’ezie ịbụ nanị ndị Akara Aka dị omimi na-adịghị agbanwe agbanwe na-achịkwa, ajọ iwu nke chi [akara aka nke ndị bụ́ chi na-ekpebi] bụ otu ụzọ nke ha na-esi ekpebiri onye ahụ ọdịnihu ya. Ọ bụrụhaala na mmadụ nwere nkà pụrụ iche ma ọ bụ nghọta, ọ pụrụ ịkọ ihe Akara Aka bụ. O nwere ike ọ gaghị abụ ihe mmadụ chọrọ ịnụ; ma agha e yiri eyi adịghị eri ngwụrọ.”

E wezụga imesi mmadụ obi ike banyere ọdịnihu, e jikwara ikwenye n’akara aka mezuo nzube ọjọọ ndị ọzọ. Echiche nke akara aka nyere aka ịchịkwa ndị mmadụ, n’ihi ya kwa, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ F. H. Sandbach si kwuo, “nkwenkwe e nwere na ọ bụ Chineke na-achị ụwa nile ga-amasị ndị na-achị achị.”

N’ihi gịni? Prọfesọ Green na-akọwa na nkwenkwe a “bụ ihe nkwado—nke omume, nke nkà mmụta okpukpe, nke asụsụ—maka usoro ọha mmadụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị a na-adịghị agbanwe agbanwe: ọ bụ ngwá ọrụ e ji eme ka mmadụ nọgide n’ọkwá nke sikarịsịrị ike na nke e ji eme ihe n’ụzọ aghụghọ nke ndị Gris na-achị achị chepụtatụworo. Ihe bụ nnọọ eziokwu banyere ihe ọ bụla na-emenụ bụ na a kawo ya aka na ọ ga-eme; ebe ọ bụkwa na ike nke okike na-ele ihe a kpọrọ mmadụ anya ọma dị ka Chineke si mee ya, ihe a kara aka apụghị ịghara ịbụ maka ọdịmma ha.” N’ezie, o mere ka “iji obi ọjọọ na-achọ ọdịmma onwe onye yie ihe ziri ezi.”

Nnakwere zuru ebe nile a nakweere akara aka pụtara ìhè n’akwụkwọ ndị Gris. N’ime ụdị nkà ndị e ji dee akwụkwọ n’oge ochie, e nwere uri, akụkọ mgbe ochie, na akụkọ ọdachi—ndị akara aka metụtara nke ukwuu. N’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke ndị Gris, ihe nọchiri anya ọdịnihu a kara aka nke mmadụ bụ chi nwanyị atọ a na-akpọ Moirai. Clotho na-adọpụta eriri nke ndụ, Lachesis na-ekpebi otú ndụ ga-aharu n’ogologo, Atropos na-egbubikwa ndụ mgbe oge a kara aka ruru. Ndị Rom nwere otu ụdị chi atọ ahụ bụ́ nke ha kpọrọ Parcae.

Ọ gụsiri ndị Rom na ndị Gris agụụ ike ịmata ihe ha weere na ọ bụ ọdịnihu a kara aka ga-abụ. N’ihi ya, ha nwetara ịgụ kpakpando na ịjụ ndị mmụọ ase n’aka ndị Babilọn ma meziwanye ha. Ndị Rom kpọrọ ihe omume ndị ahụ ha ji ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu portenta, ma ọ bụ ihe ịrịba ama. A kpọrọ ihe ndị ihe ịrịba ama ndị a gosiri omina. Mgbe ọ na-erule na narị afọ nke atọ T.O.A., ịgụ kpakpando aghọwo ihe zuru ebe nile na Gris, na 62 T.O.A., ihe osise nkọwa akara eluigwe kasị ochie nke ndị Gris a maara pụtara. Ndị Gris nwere nnọọ mmasị n’ịgụ kpakpando nke na dị ka Prọfesọ Gilbert Murray si kwuo, ịgụ kpakpando “metụtara uche ndị Gris dị ka ọrịa ọhụrụ na-adakwasị ụfọdụ ndị bi n’àgwàetiti dịmiri adịmi.”

N’ịnwa ịmata ọdịnihu, ndị Gris na ndị Rom jụtara ndị dibịa afa ihe nke ukwuu. Ha chere na ndị bụ́ chi sitere n’ọnụ ndị a na-agwa ndị mmadụ okwu. (Tụlee Ọrụ 16:16-19.) Gịnị bụ mmetụta nkwenkwe ndị a nwere? Ọkà ihe ọmụma bụ́ Bertrand Russell kwuru, sị: “Egwu ghọrọ olileanya; nzube nke ndụ bụ izere ihe ndabara ọjọọ kama ịbụ inweta ihe ọ bụla dị mma.” Ihe ndị yiri ya ghọrọ ihe ndị a na-arụrụ ụka na Krisendọm.

“Ndị Kraịst” Arụrịta Ụka Banyere Akara Aka

Ndị Kraịst oge mbụ biri n’ọdịbendị nke echiche ọdịnihu a kara aka nke ndị Gris na ndị Rom metụtara n’ụzọ siri ike. Dị ka ihe atụ, ndị a sị na ha bụ Ndị Nna Chọọchị dabeere nke ukwuu n’ọrụ ndị ọkà ihe ọmụma Gris dị ka Aristotle na Plato. Otu ihe omimi ha nwara ịghọta bụ, Olee otú Chineke nke kasị mara ihe, kasị ike, bụ́ onye “na-egosi ikpeazụ site na mbụ,” pụrụ isi bụrụkwa Chineke nke ịhụnanya? (Aịsaịa 46:10; 1 Jọn 4:8) Ọ bụrụ na Chineke ma ikpeazụ site na mbụ, ka ha chere, mgbe ahụ o bu ụzọ mara n’ezie banyere ndaba nke mmadụ dabara ná mmehie na ihe ọjọọ ga-esi na nke a pụta.

Origen, bụ́ otu n’ime ndị Kraịst mbụ kasị dee akwụkwọ, rụrụ ụka na otu n’ime ihe ndị dị mkpa a ga-eburu n’uche bụ echiche nke mmadụ inwere onwe ya ime nhọrọ. “N’ezie, e nwere ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ na-akwado n’ụzọ doro nnọọ anya mmadụ inwere onwe ya ime nhọrọ,” ka o dere.

Origen kwuru na ịta ikike ụfọdụ na-abụghị nke anyị ụta maka omume anyị “ezighị ezi nke ọ ga-eji kwekọọ n’ezi uche, kama ọ bụ okwu onye na-achọ imebi echiche nke mmadụ inwere onwe ya ime nhọrọ.” Origen rụrụ ụka na ọ bụ ezie na Chineke pụrụ ịmata oge ihe ga-eme n’ọdịnihu, nke a apụtaghị na ọ bụ ya na-akpata ihe na-eme eme ma ọ bụ na a na-aka ya aka na ọ ga-emerịrị. Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile kweere.

Otu nna Chọọchị a ma ama, bụ́ Augustine (354-430 O.A.), mere ka arụmụka ahụ gbagwojuo anya site n’ime ka òkè nnwere onwe ime nhọrọ na-ekere n’ihe ndị na-eme eme dị ala. Augustine mere ka Krisendọm bụrụ ebe bụ́ isi a na-amụ ihe banyere akara aka. Akwụkwọ ndị o dere, nke ka nke De libero arbitrio, bụ isi nkwurịta okwu ndị a na-enwe Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya. Arụmụka ahụ mesịrị ruo ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu ná Mgbanwe ahụ, Krisendọm kewakwara nnọọ ekewa n’ihi okwu banyere akara aka.a

Nkwenkwe Zuru Ebe Nile

Otú ọ dị, echiche dị iche iche banyere akara aka abụghị nanị ná mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ ka ha dị. N’ikpughe nkwenkwe ha n’akara aka, ọtụtụ ndị Alakụba na-ekwu “mektoub”—e dere ya ede—mgbe ha nwere ọdachi. Ọ bụ ezie na ọtụtụ okpukpe ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na-emesi ya ike na mmadụ na-akpata akara aka ya, otú ọ dị, e nwetụrụ nkwenkwe akara aka n’ozizi ha.

Dị ka ihe atụ, Karma nke okpukpe Hindu na okpukpe Buddha bụ akara aka a na-apụghị izere ezere nke ihe mmadụ mere ná ndụ ya mbụ na-akpata. Na China ihe odide ndị kasị ochie a chọpụtara dị ná mkpokoro mbe ndị e jiri jụọ ndị mmụọ ase. Akara aka ghọkwara akụkụ nke nkwenkwe nke ndị bụ́ ụmụ amaala na Kọntinent ndị dị n’America. Dị ka ihe atụ, ndị Aztec mepụtara kalenda na-egosi akara aka ndị mmadụ. Ikwenye n’akara aka bụkwa ihe zuru ebe nile n’Africa.

Nnakwere a nakweere echiche banyere akara aka n’ebe nile na-egosi n’ezie na mmadụ nwere mkpa dị ukwuu nke ikwere n’ike karịrị ya. N’akwụkwọ ya bụ́ Man’s Religions, John B. Noss na-ekweta, sị: “Okpukpe nile na-ekwu n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ na mmadụ adịghị akwụrụ n’onwe ya, na ọ pụghị ịkwụrụ n’onwe ya. Ọ dị nnọọ ihe jikọrọ ya na ikike dị n’Okike na mmekọrịta ya na Ndị Ọzọ, ọbụna ọ na-adaberekwa na ha. N’uche ma ọ bụ n’ụzọ doro anya, ọ maara na ya abụghị onye nwere ike nke onwe ya, bụ́ onye pụrụ ịkwụrụ onwe ya n’ụwa.”

E wezụga mkpa anyị nwere ikwere na Chineke, anyị nwekwara mkpa dị ukwuu ịghọta ihe na-eme gburugburu anyị. Otú ọ dị, e nwere ihe dị iche n’etiti ịmata Onye Okike kasị ike na ikwenye na ọ na-ekpebi akara aka anyị n’ụzọ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe. Olee nnọọ ókè anyị na-ekere n’ikpebi akara aka anyị? Ókè dị aṅaa ka Chineke na-ekere?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee magazin anyị a na-ebipụtakọ ya na nke a, bụ́ Ụlọ Nche, nke February 15, 1995, peji nke 3-4.

[Foto dị na peeji nke 5]

Kalenda ndị Babilọn ji agụ kpakpando, 1000 T.O.A.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Musée du Louvre, Paris

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndị Gris na ndị Rom kweere na ọ bụ chi nwanyị atọ na-ekpebi akara aka mmadụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Musée du Louvre, Paris

[Foto dị na peeji nke 7]

Isis nke Egypt, bụ́ “onye na-ekpebi akara aka na ọdịnihu a kara aka”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Musée du Louvre, Paris

[Foto dị na peeji nke 8]

E jiri ihe odide ndị kasị ochie nke ndị China e dere ná mkpokoro mbe jụọ ndị mmụọ ase

[Ebe E Si Nweta Foto]

Institute of History and Philology, Academia Sinica, Taipei

[Foto dị na peeji nke 8]

Ihe osise nkọwa akara eluigwe dị n’igbe a nke ndị Peasia

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto e sere site n’ikike nke British Museum

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya