Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 9/8 p. 20-21
  • Ha Ekpebisiwo Ike na Ike Agaghị Agwụ Ha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Ekpebisiwo Ike na Ike Agaghị Agwụ Ha
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olileanya nke Mbilite n’Ọnwụ Kwagidere Ha
  • Ike Agwụghị Ya
    Teta!—1999
  • Olileanya Mbilite N’ọnwụ Bụ Ihe E Ji N’aka!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Olileanya Mbilite n’Ọnwụ—Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • “Nwanne Gị Nwoke Ga-ebili”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 9/8 p. 20-21

Ha Ekpebisiwo Ike na Ike Agaghị Agwụ Ha

TETA! nke January 8, 1999 nwere otu obere isiokwu na-ekwu banyere ọgụ were oge Matt Tapio dị afọ 17 lụsoro ọrịa cancer. Isiokwu ya bụ “Ike Agwụghị Ya.” Matt mesịrị nwụọ n’April 19, 1998, mgbe a ka na-akwadebe isiokwu ahụ.

Isiokwu ahụ rụtụrụ aka n’ihe Matt kwuru n’ajụjụ ọnụ a gbara ya dị na tepụ nke a kpọrọ n’otu nzukọ nke Ndịàmà Jehova, nke a kpalikwara ọtụtụ ndị na-eto eto gụrụ ya karịsịa. Ndị a bụ ụfọdụ n’ime echiche ha.

Deseree, bụ́ onye dị afọ 20 si Canada, dere banyere mmetụta o nwere mgbe ya na onye ya na ya na-ejekọ ozi oge nile gụrụ banyere ókè Matt hụruru Jehova n’anya: “Anya mmiri pụrụ anyị n’anya. Anyị bere nnọọ ákwá ruo oge ụfọdụ. . . . Lee ka anyị nile, nke ka nke ndị na-eto eto, pụrụ isi mụta n’aka Matt ‘ime ihe ị pụrụ ime ugbu a! . . . N’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, ya adịla mgbe ị ga-akwụsị ịgba àmà banyere Jehova’!”

Erin, bụ́ onye si Kentucky, U.S.A., dere, sị: “Ákwá ekweghị m odidi mgbe m na-agụ ahụmahụ ya. N’ịbụ nwa agbọghọ ji ahụ, dị afọ 16, achọrọ m imere Jehova ihe m nwere ike imere ya ugbu a m pụrụ ime ya, ka ọ ga-abụ n’otu ụbọchị, mgbe e si n’ọnwụ kpọlite ya, m ga-enwe ike ịgwa Matt n’onwe m otú ahụmahụ ya si gbaa m ume.” N’otu aka ahụ, Maria, bụ́ onye dị afọ 15 si Texas, U.S.A., kọwara, sị: “Ekpebisiwo m ike ime ihe nile m nwere ike imere Jehova ugbu a ahụ ka siri m ike. Ndụmọdụ Matt enyeworo m nnọọ aka.”

Jessica, bụ́ onye ntorobịa si South Carolina, U.S.A., dere, sị: “Adị m afọ 13, ọ bụkwaara m nnukwu ihe agbamume ịhụ onye ntorobịa ọzọ nwere ịnụ ọkụ n’obi na ịhụnanya dị ukwuu maka Jehova. Nanị ịgụ banyere ọnọdụ Matt Tapio mere ka m ghọta ngọzi ọ bụụrụ m ịbụ onye ahụ siri ike. Agụnyewo m Matt n’ime ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị m bu n’uche ikele n’usoro ihe ọhụrụ!”

Sara, bụ́ onye si San Severino Marche, Itali, dere, sị: “Isiokwu ahụ gbara m anya mmiri. Adị m afọ 17, mụ na Matt bụ ọgbọ. Ebe m nwere ezi ahụ ike, ọchịchọ m bụ ka ọ ghara ịdị mgbe m ga-akwụsị ikwu banyere Jehova, dị nnọọ ka Matt na-akwụsịtụghị, ọbụna n’oge kasị sie ike ná ndụ ya. Unu emeela maka ibipụta ahụmahụ ndị dị ka nke a, bụ́ ndị na-akpali anyị inye Jehova akụkụ kasị mma nke ndụ anyị, oge anyị, na ume anyị.—Eklisiastis 12:1.”

Olileanya nke Mbilite n’Ọnwụ Kwagidere Ha

Ma mmadụ ọ̀ bụ nwata ma ọ bụ okenye, onye ọ bụla na-enwe ahụmahụ nke ọnwụ taa. Otu onye dị afọ 19 aha ya bụ Heidi kwuru, sị: “N’ime izu abụọ gara aga, mmadụ abụọ m hụrụ n’anya anwụnahụwo m, nanị ihe kwagidekwara m bụ olileanya nke ịhụ ha ná mbilite n’ọnwụ.

“Eji m Matt na mkpebisi ike ya ịnọgide na-agba àmà nye ndị ọzọ n’agbanyeghị ọrịa jisiri ya ike anya isi. Ọ bụ ezi ihe nlereanya nye mmadụ nile, ana m atụkwa anya ịmakụ ya ná mbilite n’ọnwụ.”

Otu nne aha ya bụ Nancy dere, sị: “Eji m anya mmiri gụọ isiokwu ahụ. Akpụ ụbụrụ gburu nwa anyị nwanyị bụ́ Rachelle na January 11, 1996, nanị ụbọchị abụọ tupu Matt enweta ihe mgbaru ọsọ ya nke ịbụ onye e mere baptism. Rachelle dị nanị afọ isii mgbe akpụ ahụ gburu ya, ma dị ka Matt, ọ bụ onye mmeri, ọ gbalịkwara ókè o nwere ike ime ihe na-atọ Jehova ụtọ.

“Ụbọchị Jehova ga-enye anyị ngọzi nke ịhụ nwa anyị nwanyị n’ahụ ike ma nwee ike ịma ụtọ ịbụ nwata ya n’ụzọ kasị zuo ezuo ga-abụ ụbọchị oké obi ụtọ. Dị ka Jaịrọs na nwunye ya, anyị ga-enwe ‘oké obi ụtọ.’”—Mak 5:42, NW.

Shannon, bụ́ onye si Georgia, U.S.A., dere, sị: “Akụkọ a gosiri m na mmadụ pụrụ iguzosi ike nye Jehova ọ bụrụgodị na mmadụ na-arịa ọrịa. Ọ bụ ezie na enweghị m oké ọrịa m na-arịa nakwa na enwewo m ezi ahụ ike mgbe nile, aga m edebe ya iji gụọ ya mgbe ọzọ.

“Enwere m olileanya na nne na nna Matt ga-enweta nkasi obi n’olileanya mbilite n’ọnwụ. Onye m hụrụ n’anya nke ukwuu nwụnahụkwara m—nne m ochie, na 1995. Enwere m ekele n’ebe ọ dị ukwuu n’ihi na ama m onye Jehova bụ nakwa na enwere m olileanya nke ịhụ ndị m hụrụ n’anya ọzọ.”

Otu onye Spain nọ n’afọ iri na ụma dere, sị: “Nne na nna m kụnyere n’ime mụ na ụmụnne m ndị nwanyị anọ abamuru nke ịga nzukọ ndị Kraịst. Ma mgbe m gụsịrị ahụmahụ a, aghọtara m na anyị pụrụ iwere ha nanị dị ka imezu iwu. M na-ekele ndị mụrụ Matt maka inye ya ezigbo mmụta ime mmụọ dị otú ahụ. Ha bụ ihe nlereanya nye anyị nile. Ọ ga-amasị m ime ka ha mata na ọ bụ ezie na o siri ike ịnagide ụdị mfu dị otú a, Jehova na-anọdebe anyị mgbe nile.

“Enwere m olileanya izute Matt n’ụwa ọhụrụ. Ọ ga-amasị m ịgwa ya na ọ bụ ezi ihe nlereanya nakwa na anyị nile na-echeta ya n’obi anyị. Jehova bụ Chineke nke ndị dị ndụ, ugbu a Matt nọkwa n’otu ọnọdụ ahụ nwanne m nwanyị nwụrụ n’afọ anọ gara aga nọ—ná ncheta Jehova. (Luk 20:38) Matt, nwanne m nwanyị Eva, na ọtụtụ ndị ohu Chineke ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’ọnọdụ ahụ. Jehova dị ebube, ọ gaghịkwa ahapụ anyị ma ọlị.”

N’ezie, olileanya nke mbilite n’ọnwụ magburu onwe ya. Ka anyị lee ya anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, ka anyị gosikwa ekele maka nkwa a dị ebube site n’icheta Onye Okike anyị kwa ụbọchị, ọbụna dị ka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jisọs Kraịst, mere.

[Foto dị na peeji nke 20]

Deseree

[Foto dị na peeji nke 20]

Erin

[Foto dị na peeji nke 20]

Maria

[Foto dị na peeji nke 20]

Jessica

[Foto dị na peeji nke 21]

Sara

[Foto dị na peeji nke 21]

Heidi

[Foto dị na peeji nke 21]

Nancy, na di ya na nwa ha nwanyị bụ́ Rachelle

[Foto dị na peeji nke 21]

Shannon

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya