Ike Agwụghị Ya
N’October 5, 1995, a wara Matt Tapio dị afọ 14 ahụ maka akpụ dị n’ụbụrụ ya. Akpụ ahụ bụ ụdị dị njọ. Ịwa ahụ ahụ bụ nke mbụ n’ime ọtụtụ ahụ a ga-awa ya n’ime afọ abụọ na ọkara ga-esochinụ. Usoro iji ọgwụ na ụzarị ọkụ agwọ ọrịa sochiri.
Matt biri na Michigan, U.S.A., bụ́ ebe ọ gara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ gọọmenti, gaakwa nzukọ ndị Kraịst. O jiri ohere ndị dapụtaranụ gwa ndị nkụzi na ụmụ klas ibe ya banyere nkwenkwe ya ma kerekwa òkè n’ịkpọtụrụ ndị ọzọ n’ozi ihu ọha. N’ọtụtụ ugboro ọ nọrọ n’ụlọ ọgwụ—ọ nọrọ ọnwa 18 n’ime afọ abụọ na ọkara ikpeazụ nke ndụ ya n’ụlọ ọgwụ—o tinyere ọtụtụ narị akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’aka ndị o zutere n’ebe ahụ.
Ọtụtụ oge o yiri ka ọ̀ bụ na Matt agaghị agbake, ma n’oge nke ọ bụla ọ gbakere. Otu oge, mgbe ọ na-aga ụlọ ọgwụ, ọrịa ahụ mesiwere ya ike, ọ kwụsịkwara iku ume. A malitere usoro mweghachi iku ume, a tụtekwara ya. Mgbe ọ matara onwe ya, ọ malitere ịkwa ákwá wee jiri olu dara ụda kwuo, sị: “Abụ m dike! Abụ m dike! Abụghị m ọgba ọsọ!” Ndị mmadụ sịrị na ọ bụ okwukwe Matt nwere n’ebe Chineke nọ debere ya ndụ ruo ogologo oge hà otú ahụ.
Matt mezuru ọchịchọ o jiri kpọrọ ihe na January 13, 1996, mgbe e mere ya baptism ná ngosipụta nke nrara ọ raara onwe ya nye Jehova Chineke. Baptism ahụ weere ọnọdụ n’ọdọ mmiri nke na-abụghị nke ọha na eze n’ihi ihe ize ndụ nke ibute ọrịa. Ụbọchị ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, ọ laghachiri ụlọ ọgwụ ka a waa ya ahụ ọzọ. N’August 1997, Matt gbọgidere agbọ ruo ọtụtụ izu n’akwụsịghị akwụsị, ma ọ kwụsịrị mgbe a wara ya ahụ ọzọ.
Ka ihe a nile na-eme, Matt nọgidere na-eme nnọọ ihe ọchị, na-akpa ndị dọkịta na ndị nọọsụ ụka ọchị. Ha apụghị ịghọta ihe mere o ji nwee omume ime ihe ọchị otú ahụ. Otu n’ime dọkịta ndị ahụ gwara ya, sị: “Matt, m bụrụ gị, m ga-esechi ákwà nkwụba nke gbara àkwà m gburugburu, kpuchie isi m, ma gwa onye ọ bụla pụọ.”
Na February 1998, Matt si n’ụlọ ọgwụ ahụ lọta nlọta nke so ná ndị ikpeazụ. Obi dị ya nnọọ ụtọ ịdị ndụ na ịlọta ụlọ nke na ozugbo ọ batara n’ụlọ, o kwuru, sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ! Ka anyị kpeenụ ekpere.” Mgbe ahụ o kwupụtara obi ụtọ ya gwa Jehova n’ekpere. N’April 19, ọnwa abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, ọrịa cancer ahụ gburu ya n’ikpeazụ.
Tupu mgbe ahụ, a kpọrọ ajụjụ ọnụ a gbara Matt na tepụ n’otu nzukọ Ndịàmà Jehova nwere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. A jụrụ ya, sị: “Gịnị ka ị ga-agwa anyị bụ́ ndị nwetụrụ ahụ ike banyere ozi na nzukọ ndị Kraịst anyị?”
Matt zaghachiri, sị: “Mee ihe ị pụrụ ime ugbu a. . . . Ị maghị ihe pụrụ ime. . . . Ma n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, ya adịla mgbe ị ga-akwụsị ịgba àmà banyere Jehova.”