Amamihe na Uru Ndị Dị n’Ịhazi Ihe Onwunwe
IHE agaraghị Maazị na Oriakụ Peterson dị ka ha si chee.a Ha tụkwasịrị obi n’ego ha nwetara mgbe ha rere ihe onwunwe ha iji nyere ha aka inwe ego n’afọ ndị ha ga-anọ ezumike nká na inwe ihe zuru ezu ka oge na-aga iji nye ụmụ ha onyinye buru ibu n’otu aka ahụ. Ụtụ isi buru ibu a chọrọ ka ha kwụọ mgbe ha rere ihe onwunwe ndị ahụ tisara atụmanya ndị ahụ.
Maazi na Oriakụ Smith nwekwara ihe onwunwe ndị ọnụ ahịa ha rịworo elu nke ukwuu ka ọtụtụ afọ gasịworo. Site ná ndokwa pụrụ iche ha mere maka ire ihe onwunwe ndị ahụ, ha meere onwe ha ndokwa maka inwe ego n’oge ezumike nká ha, inye ụmụ ha onyinye dị mma, na ihe ha ga-eji rụọ ọrụ ebere kasị amasị ha.
Ụwa gbara Rose Jones gharịị. Oge na-adịghị anya ka di ya nwụchusịrị ọnwụ, ọ malitere inweta akwụkwọ ndị ọ na-aghọtaghị sitere n’aka gọọmenti steeti na nke etiti. Di ya, bụ́ John, anọwo na-ahụ maka ego ha kemgbe, gụnyere ịkwụ ụtụ isi, ịgbata inshọransị ndụ, na ihe ndị ọzọ. Ọ nọwo na-agwa ya mgbe nile ka ọ ghara ichegbu onwe ya—“ihe nile dị otú ha kwesịrị ịdị.” Ma ebe ọ nwụrụ n’ekeghị ékpé, e jichiri ụfọdụ n’ime ihe onwunwe ndị ọ dabeere na ha maka inweta ego. A gwara ya na ọ dị ya mkpa ugbu a inweta ọkàiwu ga-enyere ya aka chọpụta ihe onwunwe di ya na ihe a ga-eme iji denye aha ya dị ka onye nwezi ha. A gwakwara ya na a ga-enyefe ụmụaka di ya mụrụ site n’alụmdi na nwunye ya mbụ ụfọdụ n’ime ihe onwunwe ndị a, dị ka iwu si kwuo, ọ bụ ezie na ọ maara na nke a abụghị nzube di ya. Amaghị ihe ọ ga-eme na ichegbu onwe ya banyere ego ole ọ ga-ewe iji mee ka ihe dịghachi ka ha dị mere ka ibu arọ nke ịbụ nwanyị di ya nwụrụ ka nnọọ njọ.
Mary Brown nwekwara ọdachi nke ịbụ onye di ya nwụchuru ọnwụ. O nwetatụrụ nkasi obi site n’ịmata na di ya emewo ndokwa inshọransị ndụ kwesịrị ekwesị ka ya na ụmụ ha abụọ wee nwee ego. Ọ ghọtakwara ihe onwunwe ndị ghọrọ nke ya ozugbo di ya nwụsịrị na ihe onwunwe ndị ọ ga-enweta site n’ékpé di ya kere. Ọ bụ ezie na ọ na-eme mgbanwe iji nwee ike ịnagide ihe ịma aka ndị ịbụ nwanyị di ya nwụrụ na-eweta, o nwere obi ekele dị ukwuu n’ebe di ya nọ n’ihi inwe nchebara echiche dị ukwuu n’ịhazi ihe ya, nke na ọ fọrọ nke nta ka ọnwụ ya ghara inwe mmetụta ọ bụla n’ụzọ ego n’ebe ya na ụmụ ya nọ.
Gịnị kpatara ọdịiche ahụ dị n’ihe banyere Maazi na Oriakụ Smith na Mary Brown? Ọ bụ ịhazi ihe onwunwe.
Gịnị Bụ Ịhazi Ihe Onwunwe?
Ịhazi ihe onwunwe bụ nanị usoro nke ikpebi otú a ga-esi kee ihe onwunwe gị ma ị nwụọ, mgbe ahụzi ime ihe iji mezuo mkpebi gị n’ụzọ dị irè na n’ụzọ na-agaghị efu oké ego. Ihe ndị dị otú ahụ pụrụ ịgụnye ide aha ihe onwunwe, ide aha ndị ga-eketa ha, na ime ka ihe ndekọ ndị dị otú ahụ bụrụ ékpé na ihe e nyere ka e jide. N’ọnọdụ ndị siri ike ọ ga-agụnye ọtụtụ ihe karị.
Ọ bụ ezie na obi abụọ adịghị ya na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ga-ekwenye n’amamihe dị n’ime ndokwa ndị dị otú ahụ, nanị ole na ole meworo otú ahụ. N’ụzọ na-eju anya, pasent 70 nke ndị toworo eto na United States ekeghị ékpé! Ihe ndị na-esonụ bụ ụdị ngọpụ ndị a na-enye: “Enweghị m nnọọ ohere; M ga-eme ya mgbe e mesịrị.” “Enweghị m nnukwu ego ma ọ bụ ihe onwunwe m ga-enye onye ọzọ.” “Enweghị m ọkàiwu.” “Achọghị m iche echiche banyere ọnwụ m.” “Amaghị m ebe m ga-ebido.”
N’eziokwu, iche echiche banyere ịhazi ihe onwunwe pụrụ ịbụ ihe na-emenye ụjọ. Ma o kwesịghị ịbụ. Ịmalite ya na-abụkarị nanị okwu banyere ịhazi onwe gị na ịghọta mkpebi ndị ị na-eche ihu. Dị ka ọtụtụ ihe, ịhazi ihe onwunwe esighị ike mgbe e keriri ya gaa n’ihe ndị a ga-eme ma na-eme ha otu otu.
Ihe Ndị A Ga-eme
Ihe mbụ ị ga-eme bụ idepụtasị ihe onwunwe gị nile. I kwesịrị idepụta ọ bụghị nanị ihe ndị i nwere kamakwa ọnụ ego ihe onwunwe nke ọ bụla na otú i si nwere ya ma ọ bụ akwụkwọ na-egosi na ọ bụ gị nwe ya. (Lee igbe bụ́ “Akwụkwọ Ndepụta Ọnụ Ahịa Ma E Wepụsịa Ụgwọ E Ji.”) A pụrụ ikegasị ihe ka ukwuu n’ihe onwunwe n’ụdị n’ụdị dị ka ụgwọ (ihe mbé, ihe ndị nọchiri anya ego, ego e nwekọrọ ọnụ), ala na ụlọ (ụlọ gị, nke ndị ọzọ bi na ya ma ọ bụ nke e ji achụ nta ego), ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀ (ego e tinyere n’ụlọ akụ̀, ego e ji akwụkwọ ndọrọ ego enweta, ego e nwere n’ụlọ azụmahịa ego), ihe onwunwe gị (ihe ochie ndị a chịkọtara, ihe nkà, ọla, obere ụgbọala, arịa ụlọ), inshọransị ndụ, ego ezumike nká, na achụmnta ego. Mgbe i depụtasịrị ihe ndị i nwe, depụta ihe ndị i ji n’ụgwọ, dị ka ego ị gbazitere i ji zụọ ụlọ, ego mbite, akwụkwọ i ji kwe nkwa ịkwụ ụgwọ, na ụgwọ ihe ndị e goro n’aka. Iwepụ ụgwọ ndị a ná ngụkọta ihe onwunwe gị ga-egosi ọnụ ahịa nke ihe i nwere. N’ọtụtụ mba a na-ana ụtụ isi n’ihe ndị e nyefere ndị ọzọ mgbe mmadụ nwụrụ. Ọnụ ahịa ihe onwunwe e nyefere onye ọzọ ma e wepụsịa mmefu nile na-ekpebi ụtụ isi a ga-atụ, n’ihi ya ọnụ ahịa ga-afọdụ ma e wepụsịa mmefu nile bụ ego ole dị mkpa ịchọpụta.
Ihe nke abụọ bụ ileru anya ná nzube gị bụ́ isi—ọ bụghị ịmata ego ole o ruru, kama ịmata ihe ị chọrọ imere onwe gị na ndị ga-eketa ihe onwunwe gị. Dị ka ọ na-adịkarị, onye nwere di ma ọ bụ nwunye ga-achọ idebere di ma ọ bụ nwunye ya ihe. Onye nwere ụmụ nwere ike chọọ ịkpakọbatụrụ ụmụ ya ego. Nwa toworo eto nwere ike chọọ ime ndokwa maka nlekọta nke nne ma ọ bụ nna ya meworo agadi. Ọzọkwa, i nwere ike chọọ icheta ndị enyi gị ụfọdụ ma ọ bụ ụlọ ọrụ ndị na-arụ ọrụ ebere mgbe ị na-ahazi ihe onwunwe gị. Ọ dị mkpa idetu onye a ga-agụnye ná nhazi ihe onwunwe gị na nzube gị banyere onye nke ọ bụla.
Echezọla ịtụle ihe dịgasị iche iche pụrụ ịdapụta na mberede ndị pụrụ imetụta nhazi ihe onwunwe gị. Dị ka ihe atụ, gịnị ma ọ bụrụ na onye ahụ ga-eketa ihe onwunwe gị eburu gị ụzọ nwụọ? Mgbe ahụ ị̀ ga-achọ ka di ma ọ bụ nwunye ya, ụmụ ya, ma ọ bụ ikekwe onye ọzọ were òkè ahụ?
Ihe nke atọ bụ ịhọrọ ndị ga-ahụ maka ime ihe ndị ahụ ị chọrọ. N’ọnọdụ ka ukwuu ọ ga-adị gị mkpa inweta onye ga-emezu ya na ikekwe onye nlekọta na onye ga-ejide ya. N’agbanyeghị onye ị họọrọ, nweta ma ọ dịkarịa ala otu onye ọzọ ga-enyere ya aka, hụkwa na onye ọ bụla ị họọrọ dị njikere ịrụ ọrụ ahụ. Onye ga-emezu ya bụ onye ga-achịkọta ihe onwunwe gị mgbe ị nwụrụ, hụ maka okwu metụtara iwu ma ọ bụ inweta ikike ike ékpé, ma mesịa kee ihe onwunwe gị otú i si chọọ. Ọ na-akasịkarị mma ịhọrọ onye òtù ezinụlọ maka ibu ọrụ a, ọ bụ ezie na ụlọ ọrụ dị ka ngalaba na-ahụ maka ihe onwunwe ndị mmadụ n’ụlọ akụ̀ pụrụ ịkasị mma ma ọ bụrụ na ọnọdụ nke gị siri ike. E kwesịrị ide aha onye nlekọta n’ékpé gị maka ịzụlite ụmụ gị ma ọ bụrụ na gị na onye òtù ọlụlụ gị anwụọ mgbe ụmụ unu ka dị obere. Ọ bụrụ na nhazi gị gụnyere inye onye ọzọ ihe ka o jidere ụmụ gị, a pụkwara ide aha onye nlekọta ahụ ịbụ onye ahụ ga-ejide ya, ma ọ bụrụhaala na ọ maara ka e si ejide ego. Ọ bụrụ na onye nlekọta ahụ amaghị ka e si ejide ego, a pụrụ idenye aha ụlọ ọrụ dị ka ngalaba na-ahụ maka ihe onwunwe ndị mmadụ n’ụlọ akụ̀ ịbụ nke nanị ya ga-ejide ya ma ọ bụ nke ga-eso onye nlekọta jide ya.
Ihe nke anọ bụ ịghọta ihe ndị dịnụ inyere gị aka imezu nzube gị. Ị̀ chọrọ inye onye ga-eketa ihe gị onyinye kpam kpam, ka ị̀ ga-enyefe onye ọzọ ihe onwunwe gị ka o jidere onye ahụ? E nwere ọdịiche buru ibu. Ọ bụrụ na i nyefee mmadụ ihe onwunwe kpam kpam, o nwekwaghị ihe gbasara gị n’ihe onwunwe ahụ mgbe ị nwụrụ. Otú ọ dị, ọbụna mgbe ị nwụsịrị, ị ga-anọgide na-enwe ikike ụfọdụ n’ihe onwunwe i nyere onye ọzọ ka o jide. Onye ahụ ga-ejide ya nke i denyere aha ya ga-elekọta ma jiri ihe onwunwe ndị ahụ mee ihe maka abamuru nke ndị ahụ ga-eketa ihe onwunwe gị dị ka ntụziaka gị si dị n’akwụkwọ ahụ. Dị ka ihe atụ, n’ihe banyere obere ụmụaka, onye ga-ejide ihe pụrụ ime ndokwa maka ilekọta ha dị ka mkpa ha n’otu n’otu si dị ma kpebie afọ ole nwatakịrị ga-adị wee malite ịchịkwa ihe onwunwe ndị e depụtara n’akwụkwọ ahụ.
Ònye Pụrụ Inye Aka?
N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ọnọdụ nile, i kwesịrị ịkpọtụrụ onye a zụrụ n’ihe banyere ịhazi ihe onwunwe ka o nyere gị aka ịghọta ihe ndị dịnụ inyere gị aka imezu nzube gị. E kwesịrị ịkwadebe nhazi ihe onwunwe gị ikwekọ ná nzube na ọnọdụ nke gị. Ime nhazi ihe onwunwe gị pụrụ ịchọ enyemaka nke ndị ndụmọdụ dịgasị iche iche, dị ka onye mpịazi ego, onye na-ahazi atụmatụ ego, na onye ọrụ ịnshọransị. Ọ bụrụ na nhazi ihe onwunwe gị gụnyere ụlọ ọrụ ebere, ọ pụrụ ikwe gị mee inweta ihe ọmụma n’efu site ná ngalaba nke ụlọ ọrụ ahụ na-arụ ọrụ ebere nke na-ahụ maka inye ihe e mere atụmatụ ya. Dị ka ihe atụ, Ngalaba Na-ahụ Maka Inye Ihe E Mere Atụmatụ Ya nke Watch Tower Bible and Tract Society na-enyere ndị nwere mmasị ịgụnye Society ná nhazi ihe onwunwe ha aka. Ọtụtụ eritewo uru n’ije ozi a site n’ịnata aro ndị doro anya banyere ụzọ kasị mma isi hazie ihe ha iji belata ụtụ isi ma mee ka uru ha ga-ahapụrụ ndị ha hụrụ n’anya na Society buo ibu.b
Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị pụrụ inye aka mgbe a na-eme nhazi ahụ, ọkàiwu bụ́ ọkachamara n’ịhazi ihe onwunwe bụ ya kwesịrị ịkwadebe nhazi ikpeazụ nke ihe onwunwe gị na ihe odide ndị dị mkpa. I kwesịrị inwere onwe gị ịjụ onye ndụmọdụ ọ bụla ajụjụ banyere ọzụzụ na ahụmahụ o nwere n’ịhazi ihe onwunwe. Ọ bụrụ na ọ dị otu ihe na-echegbu gị kpọmkwem, dị ka inyefe ezinụlọ gị achụmnta ego gị ma ọ bụ ilekọta onye ikwu gị nwere nkwarụ, jụọ onye ndụmọdụ ahụ ma ò nwewo ahụmahụ na mbụ banyere ihe ndị dị otú ahụ. N’ọnọdụ nile, kwuo ka a kọwaara gị ego ole ị ga-akwụ maka ọrụ a rụụrụ gị, deekwa nkwekọrịta a n’akwụkwọ.
Ịhazi ihe onwunwe bụ otu ebe inwe ihe ọmụma dị nta na ya pụrụ ịdị ize ndụ. Tụlee dị ka ihe atụ, otu di na nwunye anyị ga-akpọ Paul na Mary. Ha chọrọ inyefe ụmụ ha ndị nwanyị atọ ihe onwunwe ha nile n’ụzọ ha nhata. Ebe ada ha, bụ́ Sarah, bi nso n’ebe ha bi, ha kpebiri itinye aha ya na nke ha, na-edenyekọta aha ya na nke ha dị ka ndị nwe ihe onwunwe ha. ‘N’ụzọ dị otú a,’ ka ha chere, ‘Sarah ga-enwe ike ilekọta ihe onwunwe anyị ma ọ bụrụ na anyị nwee nkwarụ. Ọzọkwa, idenyekọta aha anyị na nke Sarah dị ka ndị nwe ihe nile pụtara na nanị ya ga-enwe ha mgbe anyị nwụrụ, anyị ga-ezerekwa mkpa nke ike ékpé na inweta ikike ike ékpé. Ọ pụrụ nanị isoro ụmụnne ya kee ihe ndị a hapụụrụ ha mgbe anyị nwụsịrị.’
Ma ihe agaghị otú Paul and Mary si hazie ha. Mgbe ndị mụrụ ha nwụsịrị, Sarah na ụmụnne ya kere ihe onwunwe ha, ma nnyefe nke e nyefere ha ihe ndị ahụ wetara ụtụ isi nke belatara òkè nke Sarah nke ukwuu. E wezụga nke ahụ, iso nwere ihe enyeghị Sarah ikike nile nke ilekọta ihe nke ndị mụrụ ya chọrọ ka o nwee. Nzube Paul na Mary dị mma. Ha chọrọ ijide n’aka na a ga-elekọta ha ma ha nwee nkwarụ. Ha chọkwara inyefe ụmụ ha ihe onwunwe ha n’ụzọ gara were were, nke na-agaghị efu oké ego. Otú ọ dị, ha họọrọ ụzọ na-ezighị ezi iji mezuo nzube ha.
Ịhazi ihe onwunwe gị ekwesịghị ịbụ ihe a ga-eme otu ugboro n’oge ndụ gị. Ọ dị mkpa ịdị na-atụleghachi ya site n’oge ruo n’oge n’ihi na iwu ụtụ isi na-agbanwe, iwu banyere ihe nketa na-agbanwe, ọnọdụ e nwere ná ndụ na-agbanwekwa agbanwe. Ọnwụ onye ikwu, inwe ụmụ ụmụ, inweta ihe nketa, na mmụba nke ihe onwunwe bụ ihe ndị pụrụ ime ka ọ dị mkpa ịtụleghachi nhazi ihe onwunwe gị.
Ee, ịhazi ihe onwunwe bụ ihe ịma aka. Ọ na-achọ oge, ume, na nraranye. Ọ na-achọkwa ime mkpebi ụfọdụ siri ike site n’oge ruo n’oge. Ịhazi ihe onwunwe bụ ihe omume na-akpali mmetụta uche dị ukwuu. Ọ na-agụnye ndị mmadụ na ihe ndị ị na-eche banyere ha na ọchịchọ gị banyere ọdịnihu ha. Ọ na-achọ ime nnyocha uche siri ike iji kpebie ihe ị chọrọ iji ihe onwunwe gị mee na ikpebi ụzọ kasị mma isi mezuo nzube ndị ahụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na mmadụ elebaraghị nhazi ihe onwunwe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ pụrụ ịkpata nsogbu ndị siri ike, dị ka e gosiri n’ahụmahụ ndị dị ná mmalite isiokwu a. Ee, ụgwọ ọrụ ya ga-akarị nnọọ ihe ọ ga-efu. Ụgwọ ọrụ kasị ukwuu bụ udo nke uche nke na-abịa site n’ịmara na i nwere nhazi kasị ọhụrụ iji chebe ndị ị hụrụ n’anya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụ ezie na e chepụtara ihe atụ ndị e jiri mee ihe n’isiokwu a echepụta, ha dabeere n’akụkụ dị iche iche nke ahụmahụ ndị mere eme n’ezie. Ọzọkwa, ihe ọmụma dị n’isiokwu a dabeere n’ụzọ bụ́ isi n’iwu United States, ma ụkpụrụ ndị a tụlere na-emetụta ọtụtụ mba ndị ọzọ.
b Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko lee broshuọ bụ́ Planned Giving to Benefit Kingdom Service Worldwide, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Igbe dị na peeji nke 18]
Ihe Ndị Ị Ga-eme
• Depụtasịa ihe onwunwe gị nile, na-edepụta ihe ndị i nwere na ihe ndị i ji n’ụgwọ
• Kpebie nzube gị na nke ezinụlọ gị, ihe ndị ị chọrọ imezu, na mkpa e nwere
• Họrọ ndị ga-emezu ihe ndị ị chọrọ dị ka onye ga-emezu ya, onye ga-ejide ihe, na onye ga-elekọta ụmụ gị, jidekwa n’aka na ha dị njikere ịnakwere ibu ọrụ ahụ
• Chọpụta nhọrọ ndị e nwere maka ịhazi ihe onwunwe site n’inweta ndụmọdụ site n’aka onye nwere ahụmahụ n’ịhazi ihe onwunwe
[Chaatị dị na peeji nke 17]
Akwụkwọ Ndepụta Ọnụ Ahịa Ma E Wepụsịa Ụgwọ E Ji
Ihe Onwunwe Ndị Dị Ndị Dị n’Aha Ndị E Denyekọtara
n’Aha Gị Onye Ebe Gị Aha Ndị Ọzọ
Ụlọ obibi (ọnụ
ahịa ya ugbu a) ₦ ₦ ₦
Ala na ụlọ ndị ọzọ ₦ ₦ ₦
Ihe ndekọ ego ụlọ
akụ̀ (ego e ji
akwụkwọ ndọrọ ego
enweta na ego dị
n’ụlọ akụ̀) ₦ ₦ ₦
Ihe ndekọ ego ndị ọzọ ₦ ₦ ₦
Ihe mbé, ihe nọchiri
anya ego, na ego e
nwekọrọ ọnụ ₦ ₦ ₦
Inshọransị ndụ (ọnụ
ego e dere na ya) ₦ ₦ ₦
Ihe a na-enweta
site n’achụmnta ego
e so ndị ọzọ nwee ₦ ₦ ₦
Ihe ndekọ ego maka
atụmatụ oge ezumike nká ₦ ₦ ₦
Ihe onwunwe onwe onye ₦ ₦ ₦
Ihe onwunwe ndị
ọzọ (kpọọ ha aha) ₦ ₦ ₦
Ngụkọta ihe
onwunwe nile ₦ ₦ ₦
Ụgwọ Ndị E Ji
Ego a gbazitere
e ji zụọ ụlọ ₦ ₦ ₦
Ego mbite ndị ọzọ ma
ọ bụ ụgwọ (ego ndị i
bitere n’onwe gị, ihe
ndị a zụrụ n’aka, na
ihe ndị ọzọ) ₦ ₦ ₦
Ngụkọta ụgwọ nile e ji ₦ ₦ ₦
Ihe onwunwe fọrọnụ
(ihe onwunwe fọrọnụ ma
e wepụsịa ụgwọ ndị e ji) ₦ ₦ ₦
[Foto dị na peeji nke 17]
Ịhazi ihe onwunwe na-agụnye ime nhazi maka ọdịnihu nke ndị ị hụrụ n’anya