Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/12 p. 2
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Amamihe na Uru Ndị Dị n’Ịhazi Ihe Onwunwe
    Teta!—1999
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ezinụlọ Anyị Dara Ogbenye?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ha Niile Na-ejere Ya Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Otú Jehova Si Emesapụ Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2012
km 6/12 p. 2

Igbe Ajụjụ

◼ Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka nzukọ Jehova were ihe ụfọdụ anyị nwere ma ọ bụkwanụ ihe niile anyị nwere ma anyị nwụọ, olee ihe anyị kwesịrị ichebara echiche?

Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ maghịzi ihe e ji ihe ndị o nwere na-eme. (Ekli. 9:5, 6) N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-eke ékpé, kwuo otú ha chọrọ ka e si kee ihe ndị ha nwere ma ha nwụọ. (2 Eze 20:1) Iwu kwadoro ide ụdị ihe ahụ ede. E dewe ya, a na-enwekarị ebe onye ahụ ga-ekwu onye ọ chọrọ ka ọ bụrụ ya ga-eke ihe ndị ahụ o nwere. N’ọtụtụ obodo, ọ bụrụ na onye ahụ edeghị ya ede n’akwụkwọ, ndị ọchịchị na-eji aka ha kpebie otú a ga-esi kee ya. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka e nye ọgbakọ Jehova ihe ụfọdụ anyị nwere ma ọ bụkwanụ ihe niile anyị nwere, anyị kwesịrị ide ya ede n’akwụkwọ. N’akwụkwọ ahụ, anyị kwesịrị ịkpọ okwu aha. Ọ dịkwa mma ka anyị kpachapụ anya n’onye anyị chọrọ ka ọ bụrụ ya ga-eke ya.

Ọrụ onye ga-eke ihe onye nwụrụ anwụ abụghị obere ọrụ. Ọ bụrụ na ego onye ahụ nwere hiri nne ma ọ bụkwanụ na ọ rụrụ ọtụtụ ụlọ, ọ ga-ewe onye ga-eke ya ezigbo oge ịchọtacha akwụkwọ ikike niile ma kee ha otú onye nwe ha si kwuo. Ihe ọzọ bụ na ndị ọchịchị nwere ihe ha dere ede onye ahụ ga-eme. Ọ bụghị mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ga-arụli ọrụ a. Onye ọ bụla anyị chọrọ ka o meere anyị ihe a kwesịrị ịbụ onye anyị ma na ọ ga-emeli ya. O kwesịkwara ịbụ onye anyị tụkwasịrị obi na onye ga-eme ihe otú anyị si kwuo.—Gụọ isiokwu bụ́ “Amamihe na Uru Ndị Dị n’Ịhazi Ihe Onwunwe.” Ọ gbara na Teta! Jenụwarị 8, 1999, p. 16-19.

Ihe Ị Ga-eme ma Ọ Bụrụ Gịnwa Ka A Gwara Kee Ihe Mmadụ Nwere: Ọ bụrụ na mmadụ agwa gị na ọ bụ gị ga-eke ihe ndị o nwere ma ya nwụọ, buru ụzọ chee echiche ihe dị n’ọrụ ahụ. Kpeekwa ekpere banyere ya, iji mara ma ị̀ ga-emeli ya. (Luk 14:28-32) Onye ahụ nwụọ, ị ga-aga gwa ndị niile o dere aha ha n’akwụkwọ. Ọ bụrụzie na ụlọikpe enye gị ikike ka i kee ihe ndị o nwere, ị ga-eke ya otú iwu si kwuo na otú onye ahụ si gwa gị. Onye na-eke ihe onye nwụrụ anwụ kwesịrị ịma na o nweghị otu n’ime ihe onye ahụ kwuru ọ ga-eleghara anya, ma ihe ọ ga-eke ò hiri nne ma ọ bụkwanụ dị ntakịrị. Ihe ọ bụla mmadụ nyere ọgbakọ Jehova n’onyinye bụ ihe e nyere Jehova. E kwesịghị iji ya gwuo egwu.—Luk 16:10; 21:1-4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya