Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 12/15 p. 4-5
  • Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ha Niile Na-ejere Ya Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ha Niile Na-ejere Ya Ozi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọrụ A Dị Ukwuu”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Otú Jehova Si Emesapụ Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ha Ji Ihe Mafọọrọ Ha Nyere Ụmụnna Ha Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Otú Anyị Nwere Ike Isi Nyere Ndị Ọzọ Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 12/15 p. 4-5
Ebe mmadụ na-enye onyinye

Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ha Niile Na-ejere Ya Ozi

CHINEKE kere ụmụ mmadụ ka ha nwee ike iji aka ha kpebie ihe ha ga-eme. Ọ na-agọzikwa ndị ji obi ha niile na-akwado ofufe ya, ndị so na-eme ka e doo aha ya nsọ, na-akwadokwa nzube ya dị ebube. Jehova achọghị ka isi anyị na-erubere ya bụrụ n’ihi na anyị achọghị ka a taa anyị ahụhụ ma ọ bụ n’ihi na a manyere anyị amanye. Kama, ọ chọrọ ka anyị jiri obi anyị niile na-erubere ya isi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya n’eziokwu, nweekwa obi ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere anyị.

Dị ka ihe atụ, mgbe ụmụ Izrel nọ n’ala ịkpa Saịnaị, Jehova gwara ha ka ha rụọ ebe ha ga-anọ na-efe ya ofufe. O kwuru, sị: “Sinụ n’etiti unu nata onyinye a ga-enye Jehova. Ka onye ọ bụla obi ya kpaliri weta onyinye Jehova.” (Ọpụ. 35:⁠5) Onye Izrel ọ bụla ga-enye ihe otú ike ya hà. A ga-eji ihe onye ọ bụla nyere rụọ ọrụ Jehova, n’agbanyeghị ihe onye ahụ nyere ma ọ bụ otú ọ hà. Gịnị ka ụmụ Izrel mere?

Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla obi ya kwaliri na onye ọ bụla mmụọ ya kpaliri” nyere onyinye. Ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ji obi ha niile nye onyinye a ga-eji rụọ ọrụ Jehova, ya bụ, ọla a na-etinye n’uwe, ọla ntị, mgbaaka, ọlaedo, ọlaọcha, ọla kọpa, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị atụrụ e sijiri odo odo, eri na-acha uhie uhie, ezigbo eri linin, ajị ewu, akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara, akpụkpọ anụ sil, osisi akeshịa, nkume ndị dị oké ọnụ ahịa, mmanụ bọlsọm, mmanụ ọkụ, na mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ. “Ihe e wetara wee zuo maka ọrụ niile a gaje ịrụ, o zuru ọbụna gafee.”​—⁠Ọpụ. 35:​21-24, 27-29; 36:⁠7.

Ihe kacha tọọ Jehova ụtọ abụghị ihe ndị Izrel nyere ya, kama ọ bụ otú ha si jiri obi ha niile nye ya ihe ndị ahụ, si otú ahụ gosi na ha na-akwado ezi ofufe. Ha jikwa oge ha na ike ha rụọ ọrụ Chineke. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị inyom niile ndị maara ihe ji aka ha kpaa ihe.” N’eziokwu, “ndị inyom niile nwere nkà bụ́ ndị obi ha kpaliri ji ajị ewu kpaa ihe ọkpụkpa.” Jehova nyekwara Bezalel “amamihe na nghọta na ihe ọmụma na nkà ịrụ ụdị ọrụ ọ bụla.” Chineke mere ka Bezalel na Oholiab nwee nkà ha ga-eji rụọ ọrụ niile o kwuru ka a rụọ.​—⁠Ọpụ. 35:​25, 26, 30-35.

Mgbe Jehova gwara ụmụ Izrel ka ha nye onyinye, obi siri ya ezigbo ike na “onye ọ bụla obi ya kwaliri” ga-akwado ezi ofufe. Ọ gọzikwara ndị niile ji obi ha niile nye ya ihe. O duziri ha, meekwa ka ha nwee obi ụtọ na-enweghị atụ. Jehova si otú ahụ gosi na ọ bụrụ na ya agọzie ndị ohu ya ji obi ha niile na-ejere ya ozi, ọ ga-eme ka ha nwee nkà na ihe ndị ọzọ ha ga-eji mee uche ya. (Ọma 34:⁠9) Ka i ji obi gị niile na-ejere Jehova ozi, o doro anya na ọ ga-agọzi gị.

ỤZỌ ỤFỌDỤ NDỊ KPEBIRI ISI NA-ENYE ONYINYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ

Ọtụtụ ndị taa na-eme ụdị ihe ahụ e mere n’oge Pọl onyeozi. Ha “na-ewepụta” ma ọ bụ kpebie ego ole ha chọrọ inye n’onyinye ma tinye ya n’igbe e dere “Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ.” (1 Kọr. 16:⁠2) Kwa ọnwa, ọgbakọ ọ bụla na-ewekọta ego ha nwetara n’igbe ahụ ma zigara ya alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ha. Mmadụ nwekwara ike iji aka ya zigara alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba o bi ego ọ chọrọ iji nye onyinye. Ị chọọ ịmata aha ụlọ ọrụ iwu kwadoro nke Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ ná mba i bi, jụọ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba ahụ. I nwere ike inweta adres alaka ụlọ ọrụ ahụ n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, bụ́ www.jw.org/ig. Ụdị ihe ndị i nwere ike iji aka gị zigara alaka ụlọ ọrụ bụ:

ONYINYE

  • Mmadụ nwere ike isi n’Ịntanet ma ọ bụ jiri kaadị ndọrọ ego kwụnyere anyị ego o dewere n’ụlọ akụ̀. N’alaka ụlọ ọrụ ụfọdụ, e nwere ike isi na jw.org ma ọ bụ n’adres Ịntanet ọzọ a kpọrọ aha kwụnyere anyị ego.

  • O nwere ike ịbụ ego, ọla, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ e nwere ike ireta ego. E kwesịrị izitekọta ha na akwụkwọ ozi iji kọwaa na ihe ndị ahụ bụ onyinye.

EGO I NWERE IKE IWEREGHACHI

  • Mmadụ nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ ego ma kwuo na ya nwere ike iwereghachi ya mgbe ọ bụla ọ chọrọ.

  • O kwesịrị izitekọta ya na akwụkwọ ozi iji kọwaa na ya nwere ike iwereghachi ego ahụ mgbe ọ bụla ọ chọrọ.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

E wezụga inye onyinye ego na ihe ndị ọzọ e nwere ike ireta ego, e nwere ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi nye ihe iji kwado ozi Alaeze nke a na-eje n’ụwa niile. E dere ha n’okpuru ebe a. N’agbanyeghị nke ị họọrọ, biko buru ụzọ kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba i bi ka i nwee ike ịmata nke iwu kwadoro ná mba ahụ. Ebe ọ bụ na mba ọ bụla nwere iwu nke ha, mmadụ kwesịrị ibu ụzọ jụọ ndị ọkàiwu tupu ya ahọrọ ụzọ kacha mma ọ ga-esi nye onyinye.

Ịnshọransị: I nwere ike idenye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na-elekọta mba i bi n’ebe a na-ede aha onye a ga-enye ego ịnshọransị ma onye dejupụtara akwụkwọ ịnshọransị ahụ nwụọ, ma ọ bụkwanụ e denye ya n’ebe a na-ede aha onye a ga-enye ego mmadụ ga-enweta ma ọ laa ezumike nká.

Ego E Dowere n’Ụlọ Akụ̀: Mmadụ nwere ike ime ndokwa ka e nye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ego ya dị n’ụlọ akụ̀ ma ọ bụ ego ezumike nká ya ma ọ nwụọ. Ọ ga-eme ya otú ụlọ akụ̀ dị ná mba o bi kwuru ka e si mee ya.

Aka Òkè na Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: E nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova aka òkè na ihe ndị nọchiri anya ego. Mmadụ nwekwara ike ikwu ka e nye alaka ụlọ ọrụ ihe ndị ahụ ma ya nwụọ.

Ala na Ụlọ: E nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ala na ụlọ e nwere ike ire ere. Ọ bụrụ na ọ bụ ụlọ onye nwe ya ka bi na ya, o nwere ike inye ya alaka ụlọ ọrụ ma ka biri na ya ruo mgbe ọ nwụrụ.

Ike Ekpe na Ihe E Nyere Mmadụ Ka O Jide: E nwere ike idenyere alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ego ma ọ bụ ihe ọzọ n’akwụkwọ ike ekpe nke iwu kwadoro. Mmadụ nwekwara ike inye onye ọzọ ihe ka o jide ma dee ka e nye ya alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ma e mechaa.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-egosi, onye chọrọ inye ụdị onyinye a kwesịrị ime atụmatụ nke ọma.

Ị chọọ ịmatakwu ụzọ ndị e si enye onyinye, i nwere ike ịkpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba i bi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya