Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 11/15 p. 8-9
  • Otú Anyị Nwere Ike Isi Nyere Ndị Ọzọ Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Anyị Nwere Ike Isi Nyere Ndị Ọzọ Aka
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ha Ji Ihe Mafọọrọ Ha Nyere Ụmụnna Ha Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • “Ọrụ A Dị Ukwuu”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Otú Jehova Si Emesapụ Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ha Niile Na-ejere Ya Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 11/15 p. 8-9

Otú Anyị Nwere Ike Isi Nyere Ndị Ọzọ Aka

N’OTU mba na-abaghị ọgaranya, otu okenye aha ya bụ François kwuru, sị: “Agha dara mgbe e mechara ntụliaka. N’ihi ya, ọtụtụ puku ụmụnna anyị hapụrụ ụlọ ha gbaa ọsọ ndụ. Nri na ọgwụ bịara dị ụkọ. Nke a hụrụ ahụ adịrị ezigbo ọnụ. Ụlọ akụ̀ mechichara emechi. Ego adịghịzi n’ígwè ndị e si na ha adọta ego. E nwedịghị nke na-arụ ọrụ.”

Ozugbo ụmụnna nọ n’alaka ụlọ ọrụ nụrụ ihe na-emenụ, ha malitere izigara ụmụnna ndị gbagara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche ego na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa. Òtù abụọ na-akwarịta mgbọ nọchichara ụzọ n’obodo ahụ. Ma, ebe ọ bụ na ha abụọ macha na Ndịàmà Jehova anaghị akwado òtù nke ọ bụla, ha na-ekwe ka ụgbọala si alaka ụlọ ọrụ na-agafe.

Nwanna François kwuru, sị: “Mgbe anyị na-aga n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ndị agha zoro ezo gbawara anyị égbè. Ma, mgbọ atụtaghị anyị. Mgbe anyị hụrụ otu onye agha bu égbè ka o ji ọsọ na-abịa, anyị tụgharịrị ụgbọala anyị ozugbo, nyesie ya ọkụ ike ma laghachi alaka ụlọ ọrụ. Obi dị anyị ụtọ na Jehova napụtara anyị. Ụmụnna ndị gbagara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ anyị na-aga dị otu narị na iri atọ. N’echi ya, ha niile si n’ebe ahụ gaa n’ebe ọzọ ọkọ na-agaghị akọ ha. Ụfọdụ ụmụnna gbatara ọsọ ndụ n’alaka ụlọ ọrụ. Anyị ji Baịbụl na-akasi ha obi, na-enyekwa ha ihe ndị dị ha mkpa ruo mgbe ọgba aghara ahụ biri.”

François kwukwara, sị: “Ụmụnna si n’ebe dị iche iche n’obodo ahụ mechara detara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ozi, kelee ha ezigbo ekele. Otú ahụ ụmụnna ndị nọ n’ebe ndị ọzọ si nyere ha aka mere ka ha tụkwasịkwuo Jehova obi.”

Mgbe ọ bụla e nwere ọdachi, ihe anyị na-eme abụghị naanị ịgwa ụmụnna anyị ka ha gaa “nyaa ọkụ, rijuokwa afọ.” (Jems 2:15, 16) Kama, anyị na-achọ otú anyị ga-esi egboro ha mkpa ha. Ọ bụ ụdị ihe a ka ndị na-eso ụzọ Jizọs mere n’oge ndịozi. Mgbe ha nụrụ na ụnwụ ga-ada, ha “kpebisiri ike, onye ọ bụla n’ime ha dị ka o nwere ike inye, izigara ụmụnna bi na Judia ihe enyemaka.”—Ọrụ 11:28-30.

Ebe anyị na-ejere Jehova ozi, anyị na-eji ego anyị na ihe ndị ọzọ anyị nwere enyere ndị ọzọ aka. Ma, ndị mmadụ kwesịkwara ịnụ okwu Chineke. (Mat. 5:3) Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha gaa mee ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ihe mere o ji nye ha iwu a bụ ka ha nyere ndị mmadụ aka ịghọta na ha kwesịrị ịmụ gbasara Chineke. (Mat. 28:19, 20) Anyị na-eji oge anyị, ike anyị, na ihe ndị ọzọ anyị nwere arụ ọrụ a Jizọs nyere anyị. Anyị na-ejikwa onyinye anyị nwetara maka ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa niile enyere ndị nwere ọdachi aka. Ma, ihe kacha mkpa a na-eji onyinye ndị ahụ eme bụ ịkwado ozi ọma a na-ekwusa na ihe ndị ọzọ gbasara Alaeze Chineke. Anyị na-esi otú ahụ egosi na anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya.—Mat. 22:37-39.

Obi kwesịrị isi ndị niile na-akwado ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ekwusa n’ụwa niile ike na e ji onyinye ha na-eme ihe e kwesịrị iji ya eme. Ì nwere ike inyere ụmụnna gị aka? Ị̀ chọrọ iji onyinye gị na-akwado ozi ọma anyị na-ekwusa? Ya bụrụ otú ahụ, “ajụla imere ha ihe ọma bụ́ ndị e kwesịrị imere ya, mgbe ọ dị n’ike aka gị ime ya.”—Ilu 3:27.

ỤZỌ ỤFỌDỤ NDỊ KPEBIRI ISI NA-ENYE ONYINYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ

Ọtụtụ ndị taa na-eme ụdị ihe ahụ e mere n’oge Pọl onyeozi. Ha “na-ewepụta” ma ọ bụ kpebie ego ole ha chọrọ inye n’onyinye ma tinye ya n’igbe e dere “Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ.” (1 Kọr. 16:2) Kwa ọnwa, ọgbakọ ọ bụla na-ewekọta ego ha nwetara n’igbe ahụ ma zigara ya alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ha bi. Mmadụ nwekwara ike iji aka ya zigara alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba o bi ego ọ chọrọ iji nye onyinye. Ị chọọ ịmata aha ụlọ ọrụ iwu kwadoro nke Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ ná mba i bi, jụọ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba ahụ. I nwere ike inweta adres alaka ụlọ ọrụ ahụ n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, bụ́ www.jw.org/ig. Ụdị ihe ndị i nwere ike iji aka gị zigara alaka ụlọ ọrụ bụ:

  • ONYINYE

    • O nwere ike ịbụ ego, ọla, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ e nwere ike ireta ego.

    • E kwesịrị izitekọta ha na akwụkwọ ozi iji kọwaa na ihe ndị ahụ bụ onyinye.

  • EGO I NWERE IKE IWEREGHACHI

    • Mmadụ nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ ego ma kwuo na ya nwere ike iwereghachi ya mgbe ọ bụla ọ dị ya mkpa.

    • O kwesịrị izitekọta ya na akwụkwọ ozi iji kọwaa na ya nwere ike iwereghachi ego ahụ mgbe ọ bụla ọ dị ya mkpa.

  • ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

    E wezụga inye onyinye ego na ihe ndị ọzọ e nwere ike ireta ego, e nwere ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi nye ihe iji kwado ozi Alaeze nke a na-eje n’ụwa niile. E dere ha n’okpuru ebe a. N’agbanyeghị nke ị họọrọ, biko buru ụzọ kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba i bi ka i nwee ike ịmata nke iwu kwadoro ná mba ahụ. Ebe ọ bụ na mba ọ bụla nwere iwu nke ha, ọ dị mkpa ka mmadụ buru ụzọ jụọ ndị ọkàiwu tupu ya ahọrọ ụzọ kacha mma ọ ga-esi nye onyinye.

    Ịnshọransị: I nwere ike idenye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na-elekọta mba i bi n’ebe a na-ede aha onye a ga-enye ego ịnshọransị ma onye dejupụtara akwụkwọ ịnshọransị ahụ nwụọ, ma ọ bụkwanụ e denye ya n’ebe a na-ede aha onye a ga-enye ego mmadụ ga-enweta ma ọ laa ezumike nká.

    Ego E Tinyere n’Ụlọ Akụ̀: Mmadụ nwere ike ime ndokwa ka e nye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ego o tinyere n’ụlọ akụ̀ ma ọ bụ ego ọ gbazinyere ụlọ akụ̀ ma ọ bụkwanụ ego ezumike nká ya ma ọ nwụọ. Ọ ga-eme ya otú ụlọ akụ̀ dị ná mba o bi kwuru ka e si mee ya.

    Aka Òkè na Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: E nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova aka òkè na ihe ndị nọchiri anya ego. Mmadụ nwekwara ike ikwu ka e nye alaka ụlọ ọrụ ihe ndị ahụ ma ya nwụọ.

    Ala na Ụlọ: E nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ala na ụlọ e nwere ike ire ere. Ọ bụrụ na ọ bụ ụlọ onye nwe ya ka bi na ya, o nwere ike inye ya alaka ụlọ ọrụ ma ka biri na ya ruo mgbe ọ nwụrụ.

    Ike Ekpe na Ihe E Nyere Mmadụ Ka O Jide: E nwere ike idenyere alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ego ma ọ bụ ihe ọzọ n’akwụkwọ ike ekpe nke iwu kwadoro. Mmadụ nwekwara ike inye onye ọzọ ihe ka o jide ma dee ka e nye ya alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ma e mechaa.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-egosi, onye na-enye ụdị onyinye a kwesịrị ime atụmatụ nke ọma.

Ị chọọ ịmatakwu ụzọ ndị e si enye onyinye, i nwere ike ịkpọ Alaka Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Naịjirịa na telefon ma ọ bụ jiri adres e dere n’okpuru ebe a degara ha akwụkwọ ozi ma ọ bụkwanụ kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba ebe i bi.

JEHOVAH’S WITNESSES

P.M.B. 1090,

Benin City 300001,

Edo State, Nigeria.

Telefon: 07080662020

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya