Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w16 Nọvemba p. 19-20
  • “Ọrụ A Dị Ukwuu”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ọrụ A Dị Ukwuu”
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Otú Jehova Si Emesapụ Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ha Niile Na-ejere Ya Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ha Ji Ihe Mafọọrọ Ha Nyere Ụmụnna Ha Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Otú Anyị Nwere Ike Isi Nyere Ndị Ọzọ Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
w16 Nọvemba p. 19-20
Ebe Eze Devid na-egosi otu nwoke ụkpụrụ a ga-eji arụ ụlọ nsọ; ebe nwanna na-eleru ụkpụrụ ụlọ anya

“Ọrụ A Dị Ukwuu”

MGBE oge ruru ka e nwee otu nnọkọ dị oké mkpa na Jeruselem, Eze Devid kpọkọtara ndị niile bụ́ ndị isi, ndị na-eje ozi n’obí eze, na ndị dike. Obi bụ ha sọ aṅụrị mgbe a mara ọkwa pụrụ iche na Jehova ekwuola na ọ bụ Sọlọmọn nwa Devid ga-arụ ụlọ pụrụ iche a ga na-anọ efe ezi Chineke. N’oge ahụ, Devid emeela agadi. Ma, Chineke nyere ya ụkpụrụ a ga-eji rụọ ụlọ ahụ, ya akọọrọ ya Sọlọmọn. Devid sịrị: “Ọrụ a dị ukwuu; n’ihi na nnukwu ụlọ a abụghị maka mmadụ, kama ọ bụ maka Jehova Chineke.”—1 Ihe 28:1, 2, 6, 11, 12; 29:1.

Ajụjụ Devid jụziri bụ: “Ònye n’ime unu na-ewepụta onwe ya iwetara Jehova onyinye taa?” (1 Ihe 29:5) A sị na ị nọ ebe ahụ, gịnị ka ị gaara eme? Ọ̀ gaara emetụ gị n’obi ịkwado ọrụ ahụ? Ndị Izrel malitere inye onyinye ozugbo. N’eziokwu, ha ‘ṅụrịrị ọṅụ n’ihi onyinye afọ ofufo ha nyere, n’ihi na ha ji obi zuru ezu nye Jehova onyinye afọ ofufo.’—1 Ihe 29:9.

Mgbe ọtụtụ narị afọ gara, Jehova mere ka e nwee ihe karịrị ụlọ nsọ ahụ. Ọ bụ ụlọ nsọ ihe atụ, nke ga-eme ka ụmụ mmadụ nwee ike ịna-efe ya n’ihi àjà ahụ Jizọs chụrụ. (Hib. 9:11, 12) N’oge anyị a, gịnị ka Jehova ji na-enyere ndị mmadụ aka ka ha na ya dị ná mma? Ọ bụ ozi ọma anyị na-ekwusa. (Mat. 28:19, 20) O meela ka a na-amụrụ ọtụtụ nde mmadụ Baịbụl kwa afọ, na-eme ọtụtụ puku mmadụ baptizim, na-ehiwekwa ọtụtụ narị ọgbakọ ndị ọhụrụ.

Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka a na-ebikwu akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, na-arụkwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ma na-elekọta ha, na-enwetakwu ebe a ga na-anọ eme mgbakọ. Ọ̀ bụ na i kwetaghị na ikwusa ozi ọma bụ nnukwu ọrụ bara ezigbo uru?—Mat. 24:14.

Anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya, ghọtakwa na e kwesịrị ikwusa ozi ọma a ngwa ngwa. Ọ bụ ya mere anyị ji enye onyinye sí anyị n’obi. Anyị na-esi otú ahụ ‘ewetara Jehova onyinye.’ Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị ‘ji ihe anyị ndị dị oké ọnụ ahịa asọpụrụ Jehova,’ na-ahụkwa otú e si jiri ihe ndị ahụ niile na-arụ ọrụ kachanụ a rụtụrụla kemgbe ụwa.—Ilu 3:9.

Ụzọ Ụfọdụ Ndị Kpebiri Isi Na-enye Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ

Ọtụtụ ndị taa na-eme ụdị ihe ahụ e mere n’oge Pọl onyeozi. Ha ‘na-ewepụta ihe,’ ya bụ, kpebie ego ole ha chọrọ inye n’onyinye, ma tinye ya n’igbe e dere “Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ.” (1 Kọr. 16:2) Kwa ọnwa, ọgbakọ ọ bụla na-ewekọta ego ha nwetara n’igbe ahụ ma zigara ya alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ha. Mmadụ nwekwara ike iji aka ya zigara alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba o bi ego ọ chọrọ iji nye onyinye. Ị chọọ ịmata aha ụlọ ọrụ iwu kwadoro nke Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ ná mba i bi, jụọ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba ahụ i bi. I nwere ike inweta adres alaka ụlọ ọrụ ahụ n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, bụ́ www.jw.org/ig. Ụdị ihe ndị i nwere ike iji aka gị zigara alaka ụlọ ọrụ bụ:

ONYINYE

  • Mmadụ nwere ike isi n’Ịntanet ma ọ bụ jiri kaadị ndọrọ ego kwụnyere anyị ego o dewere n’ụlọ akụ̀. N’alaka ụlọ ọrụ ụfọdụ, e nwere ike isi na jw.org ma ọ bụ n’adres Ịntanet ọzọ a kpọrọ aha kwụnyere anyị ego.

  • O nwere ike ịbụ ego, ọlaedo, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ e nwere ike ireta ego. E kwesịrị izitekọta ha na akwụkwọ ozi iji kọwaa na ihe ndị ahụ bụ onyinye.

EGO I NWERE IKE IWEREGHACHI

  • Mmadụ nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ ego ma kwuo na ya nwere ike iwereghachi ya mgbe ọ bụla ọ chọrọ.

  • O kwesịrị izitekọta ya na akwụkwọ ozi iji kọwaa na ya nwere ike iwereghachi ego ahụ mgbe ọ bụla ọ chọrọ.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

E wezụga inye onyinye ego na ihe ndị ọzọ e nwere ike ireta ego, mmadụ nwere ike isi n’ụzọ ndị ọzọ nye onyinye iji kwado ozi ọma Alaeze Chineke a na-ekwusa n’ụwa niile. E dere ha n’okpuru ebe a. N’agbanyeghị nke ị họọrọ, biko buru ụzọ kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba i bi ka i nwee ike ịmata nke iwu kwadoro ná mba ahụ. Ebe ọ bụ na mba ọ bụla nwere iwu nke ha, mmadụ kwesịrị ibu ụzọ jụọ ndị ọkàiwu tupu ya ahọrọ ụzọ kacha mma ọ ga-esi nye onyinye.

Ịnshọransị: I nwere ike idenye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na-elekọta mba i bi n’ebe a na-ede aha onye a ga-enye ego ịnshọransị ma onye dejupụtara akwụkwọ ịnshọransị ahụ nwụọ, ma ọ bụkwanụ e denye ya n’ebe a na-ede aha onye a ga-enye ego mmadụ ga-enweta ma ọ laa ezumike nká.

Ego E Dowere n’Ụlọ Akụ̀: Mmadụ nwere ike ime ndokwa ka e nye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ego ya dị́ n’ụlọ akụ̀ ma ọ bụ ego ezumike nká ya ma ọ nwụọ. Ọ ga-eme ya otú ụlọ akụ̀ dị́ ná mba o bi kwuru ka e si mee ya.

Aka Òkè na Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: E nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova aka òkè na ihe ndị nọchiri anya ego. Mmadụ nwekwara ike ikwu ka e nye alaka ụlọ ọrụ ihe ndị ahụ ma ya nwụọ.

Ala na Ụlọ: E nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ala na ụlọ e nwere ike ire ere. Ọ bụrụ na ọ bụ ụlọ onye nwe ya ka bi na ya, o nwere ike inye ya alaka ụlọ ọrụ ma ka biri na ya ruo mgbe ọ nwụrụ.

Ike Ekpe na Ihe E Nyere Mmadụ Ka O Jide: E nwere ike idenyere alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ego ma ọ bụ ihe ọzọ n’akwụkwọ ike ekpe nke iwu kwadoro. Mmadụ nwekwara ike inye onye ọzọ ihe ka o jide ma dee ka e nye ya alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ma e mechaa.

Okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-egosi na onye chọrọ inye ụdị onyinye ndị a e depụtara kwesịrị ime atụmatụ nke ọma.

Ị chọọ ịmatakwu ụzọ ndị e si enye onyinye, gaa n’ala ala adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig, pịa ebe e dere “Nye Onyinye Maka Ọrụ Anyị Na-arụ n’Ụwa Niile,” ma ọ bụ, gị akpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba i bi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya