Ha Ji Ihe Mafọọrọ Ha Nyere Ụmụnna Ha Aka
N’AFỌ 49, Pita, Jems, na Jọn, “bụ́ ndị yiri ka hà bụ ogidi,” gwara Pọl onyeozi na Banabas ihe ha ga-eme. Ha gwara ha ka ha buru Ndị Kraịst dara ogbenye n’uche ka ha na-ekwusara ndị mba ọzọ ozi ọma. (Gal. 2:9, 10) Olee otú ha si mee ya?
Akwụkwọ ozi ndị Pọl dere gosiri otú o si lebara okwu ahụ anya. Dị ka ihe atụ, o degaara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt akwụkwọ ozi, sị: “N’ihe banyere ịnakọta onyinye maka ndị nsọ, dị nnọọ ka m nyere ọgbakọ ndị dị na Galeshia iwu, na-emekwanụ otú ahụ. Kwa ụbọchị mbụ n’izu, ka onye ọ bụla n’ime unu nọrọ n’ụlọ ya wepụta ihe ma debe ya dị ka ihe si na-agara ya nke ọma, ka e wee ghara ịnakọta onyinye mgbe m bịarutere. Ma mgbe m rutere ebe ahụ, ọ bụ ndị ikom ọ bụla unu ji akwụkwọ ozi kwado ka m ga-eziga ka ha buru onyinye obiọma unu gaa Jeruselem.”—1 Kọr. 16:1-3.
N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara ndị Kọrịnt, o kwughachiri ihe mere e ji anakọta onyinye ahụ. Ọ bụ “ka ihe hara nhata,” ka ha jiri ihe mafọọrọ ha nyere ụmụnna ha ihe na-esiri ike aka.—2 Kọr. 8:12-15.
Mgbe Pọl degaara Ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ n’ihe dị ka afọ 56, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na a nakọtachaala onyinye ahụ. O kwuru, sị: “Achọwala m ịga Jeruselem ijere ndị nsọ ozi. N’ihi na ọ masịrị ndị nọ na Masedonia na Akeya inye ndị ọzọ ihe ha site n’inye ndị dara ogbenye n’etiti ndị nsọ nọ na Jeruselem onyinye.” (Rom 15:25, 26) Obere oge ka Pọl dechara ihe ahụ, o mere ihe ahụ a gwara ya mee. Ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ na mgbe ọ laghachiri Jeruselem, e jidekwa ya, ọ gwara Filiks, bụ́ gọvanọ ndị Rom, sị: “Abịara m ka m wetara obodo m onyinye ebere na àjà dị iche iche.”—Ọrụ 24:17.
Ihe Pọl kwuru banyere Ndị Kraịst nọ na Masedonia gosiri àgwà Ndị Kraịst kpara na narị afọ mbụ. O kwuru, sị: “Ha rịọsiri anyị arịrịọ ike . . . ka anyị kwe ka ha nwee ihe ùgwù nke iji obiọma na-enye ihe.” Pọl onyeozi gwara ndị Kọrịnt ka ha ṅomie ihe ahụ ha mere. O kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” Gịnị mere ọgbakọ ndị ahụ ji na-emesapụ aka otú ahụ? Ihe mere ha ji mee ya abụghị “naanị iji na-enye ndị nsọ ihe na-akpa ha n’ụba,” kama ọ bụ iji na-ekele Chineke ugboro ugboro. (2 Kọr. 8:4; 9:7, 12) Anyịnwa nwere ike ibu ụdị ihe ahụ n’obi mgbe anyị na-emesapụ aka. Jehova Chineke ga-agọzi onye na-emesapụ aka otú ahụ, nke na-agbakwa mbọ inyere ndị ọzọ aka. N’eziokwu, ngọzi Chineke na-eme mmadụ ọgaranya.—Ilu 10:22.
[Igbe dị na peeji nke 9]
ỤZỌ ỤFỌDỤ NDỊ KPEBIRI ISI NA-ENYE ONYINYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ
Dị ka e mere n’oge Pọl onyeozi, ọtụtụ ndị taa “na-ewepụta” ma ọ bụ kpebie ego ole ha chọrọ inye n’onyinye ma tinye ya n’igbe e dere “Worldwide Work” (ya bụ, “Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ”). (1 Kọr. 16:2) Kwa ọnwa, ọgbakọ ọ bụla na-ewekọta ego ha nwetara n’igbe ahụ ma zigara ya alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ha bi. Mmadụ nwekwara ike iji aka ya zigara alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba ebe o bi ego ọ chọrọ iji nye onyinye. Ị chọọ ịmata aha ụlọ ọrụ iwu kwadoro nke Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ ná mba i bi, jụọ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba ahụ. I nwere ike inweta adres alaka ụlọ ọrụ ahụ n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, bụ́ www.jw.org. Ụdị ihe ndị i nwere ike iji aka gị zigara alaka ụlọ ọrụ bụ:
ONYINYE
• O nwere ike ịbụ ego, ọla, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ e nwere ike ireta ego.
• E kwesịrị izitekọta ha na akwụkwọ ozi iji kọwaa na ihe ndị ahụ bụ onyinye.
EGO I NWERE IKE IWEREGHACHI
• Mmadụ nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ ego ma kwuo na ya nwere ike iwereghachi ya mgbe ọ bụla ọ dị ya mkpa.
• O kwesịrị izitekọta ya na akwụkwọ ozi iji kọwaa na ya nwere ike iwereghachi ego ahụ mgbe ọ bụla ọ dị ya mkpa.
UDỊ ONYINYE NDỊ ỌZỌ
E wezụga inye onyinye ego na ihe ndị ọzọ e nwere ike ireta ego, e nwere ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi nye ihe iji kwado ozi Alaeze nke a na-eje n’ụwa niile. E dere ha n’okpuru ebe a. N’agbanyeghị nke ị họọrọ, biko buru ụzọ kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba ebe i bi ka i nwee ike ịmata nke iwu kwadoro ná mba ahụ. Ebe ọ bụ na mba ọ bụla nwere iwu nke ha, ọ dị mkpa ka mmadụ buru ụzọ jụọ ndị ọkàiwu tupu ya ahọrọ ụzọ kacha mma ọ ga-esi nye onyinye.
Ịnshọransị: I nwere ike idenye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na-elekọta mba ebe i bi n’ebe a na-ede aha onye a ga-enye ego ịnshọransị ma onye dejupụtara akwụkwọ ịnshọransị ahụ nwụọ, ma ọ bụkwanụ e denye ya n’ebe a na-ede aha onye ga-eso keta ego mmadụ ga-enweta ma ọ laa ezumike nká.
Ego E Tinyere n’Ụlọ Akụ̀: Mmadụ nwere ike ime ndokwa ka e nye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ego o tinyere n’ụlọ akụ̀ ma ọ bụ ego ọ gbazinyere ụlọ akụ̀ ma ọ bụkwanụ ego ezumike nká ya ma ọ nwụọ. Ọ ga-eme ya otú ụlọ akụ̀ dị ná mba ebe o bi kwuru ka e si mee ya.
Aka Òkè na Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: E nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova aka òkè na ihe ndị nọchiri anya ego n’onyinye. Mmadụ nwekwara ike ikwu ka e nye alaka ụlọ ọrụ ihe ndị ahụ ma ya nwụọ.
Ala na Ụlọ: E nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ala na ụlọ e nwere ike ire ere. Ọ bụrụ na ọ bụ ụlọ onye nwe ya ka bi na ya, o nwere ike inye ya ma ka biri na ya ruo mgbe ọ nwụrụ.
Ike Ekpe na Ihe E Nyere Mmadụ Ka O Jide: E nwere ike idenyere alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ego ma ọ bụ ihe ọzọ n’akwụkwọ ike ekpe nke iwu kwadoro. Mmadụ nwekwara ike inye onye ọzọ ihe ka o jide ma dee ka e mechaa nye ya alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova.
Onye na-enye ụdị onyinye ndị a kwesịrị ime atụmatụ nke ọma.
Ị chọọ ịmatakwu ụzọ ndị e si enye onyinye, i nwere ike ịkpọ Alaka Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Naịjirịa na telefon ma ọ bụ jiri adres e dere n’okpuru ebe a degara ha akwụkwọ ozi ma ọ bụkwanụ kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba ebe i bi.
JEHOVAH’S WITNESSES
P.M.B. 1090,
Benin City 300001,
Edo State, Nigeria.
Telefon: 07080662020