Ahụekere A Kwọrọ Akwọ—Ụdị nke Ndị Africa
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA CENTRAL AFRICAN REPUBLIC
NÁ MBA ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ, a na-echekarị na ahụekere a kwọrọ akwọ bụ nanị ihe a na-ete n’elu bred. Otú ọ dị, n’ụfọdụ mba ndị dị n’Africa, a na-eji ya eme ihe karịrị nke ahụ n’ezie ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị. N’ụzọ dị aṅaa?
N’etiti Africa, a na-eji ahụekere a kwọrọ akwọ esi ọtụtụ ụdị ihe oriri ndị a ma ama. N’ebe a, dị ka ọ dị n’ebe ndị ọzọ na-emepe emepe, ọ na-esikarị ike inweta ntụ ọka na ọka a kwọrọ akwọ—ihe ndị e ji eme ka ofe rọọ arọọ. N’ihi ya, a na-ejikarị ahụekere a kwọrọ akwọ edochi anya ha.
Otú ọ dị, ihe bụ okwu abụghị nanị ịzụta otu mkpọ ahụekere a kwọrọ akwọ n’ụlọ ahịa ógbè na-ere ngwá ofe. N’ebe ahụ a na-eji obere ngaji ere ya, ọ dagbukwara onwe ya n’ọnụ. N’ihi ya ọtụtụ ụmụ nwanyị ndị Africa na-ahọrọ ime nke ha. Otú e si arụzu ọrụ a siri ike na-adọrọ nnọọ mmasị. E nwetara ihe ọmụma a na-esonụ site n’isoro ọtụtụ ụmụ nwanyị ndị Africa kwurịta okwu.
Ịkọ Ahụekere
Dị ka ihe àmà na-egosi, ahụekere abụghị ihe ọkụkụ siri ike nlekọta. Ihe kasị esi ike na ya bụ ịkọ ya akọ. A na-eme nke a ná mmalite oge udu mmiri mgbe ala ka kpọrọ nkụ ma sie ike. N’April a na-eji aka akụ mkpụrụ ya, ọ bụrụkwa na mmiri ezoo ngwa ngwa, a pụrụ ịbọ “mkpụrụ” ya ná ngwụsị ọnwa August ma ọ bụ ná mmalite ọnwa September.
N’ezie ahụekere so ná mkpụrụ na-adị ná mkpo a na-agbawa agbawa. Ọ bụghị osisi na-amị ahụekere, dị ka ị pụrụ icheworị; kama, ọ bụ ihe ọkụkụ na-akwụ n’ala, bụ́ ndị nwere ụzọ pụrụ iche ha na-esi eru n’ime ala na-amị ya.
N’ebe etiti Africa, ala a na-akụ ahụekere pụrụ ịdị ihe dị ka mita 90 n’ogologo na mita 50 n’obosara. Ụfọdụ ndị akụwo ha n’obere ala dịdewere ụlọ ha. A na-ejikarị obere ọgụ na mma ogè arụ ya. Nke a pụrụ ịchọ oké ndọlị! Ihe ọkụkụ ahụ na-achọ nlekọta anya dị ukwuu, ma ọ dịghị ihe ọzọ ná mmalite. Ọ dị mkpa iche ugbo ahụ nche ka ụmụ obere anụmanụ ghara ije bọọ mkpụrụ ha ma taa ha. Ọ dịkwa mkpa ịbọcha ya ahịhịa.
Ọ bụ mgbe oge ịbọ ya na-eru nso ka ọ na-adị mkpa karịsịa ka e chee ugbo ahụ nche. A pụrụ idebe ụmụaka ka ha na-eche ya nche ka oge ịbọ ya na-eru nso. Otu nwanyị kọrọ na onye agbata obi ya hụrụ ahụekere ya n’elu osisi ndị dịdewere ugbo ya. Ọ bụ enwe buuru ha gaa n’elu ebe ahụ ma were ha mee ihe oriri!
Ịbọ ya na-abụkarị ọrụ ezinụlọ. Onye ọ bụla na-aga n’ugbo inye aka. A na-eji aka efopụta ihe ọkụkụ ndị ahụ ma hapụ ha ka ha gbakọọ, a na-aghọsịzi ahụekere ndị ahụ ma jiri nnukwu efere, bụ́ ndị ndị gara ịbọ ya na-ebu n’isi, bulata ha n’ụlọ.
Gịnị ka a na-emezi ahụekere ndị ahụ? Mgbe a sasịrị ha, a na-eji mmiri e tinyere nnu sie ha. Ezinụlọ ahụ na-ata ụfọdụ ozugbo ahụ, ma a na-edebe ihe ka ukwuu na ha maka iji ha sie nri mgbe ọzọ. A na-agbasa ha n’ala n’ebe dị nso n’ụlọ ma hapụ ha ka ha kpọọ nke ọma. Mmadụ aghaghị ilegide ha anya iji na-achụpụ ewu ndị na-akpagharịnụ ga-achọ ịta ha.
Mgbe ahụekere ndị ahụ kpọrọ, a na-edebe ha n’ụlọ e ji ahịhịa na ụrọ wukwasị n’elu osisi. Nke a na-eme ka ahụekere ndị ahụ dịrị kọrọ kọrọ, ọ na-emekwa ka ụmụ obere anụmanụ nakwa ụmụaka aka, bụ́ ndị pụrụ ịdị na-achọ ihe ha ga-eri mgbe nne ha ka nọ n’ugbo na-arụ ọrụ, ghara ịta ha.
Site n’Ahụekere Gaa n’Ahụekere A Kwọrọ Akwọ
A ghaghị ịgbapụtasị ahụekere ndị ahụ ná mkpo ha tupu a kwọọ ha. Dị ka a na-emekarị, a na-ejizi ite e ji eghe ihe ghee ha n’elu ekwu e tinyere obere ọkụ. Nke a na-eme ka ha na-atọ otú ahụ ha si atọ ma mee ka ọ dị mfe ịgbachapụta ha. A na-ahapụ ahụekere ahụ ka ha jụọ oyi, a na-ahịọchasịkwa ha. A na-akwọzi ahụekere ahụ e ghere eghe n’ígwè e ji akwọ ihe. Ọ bụrụ na e nweghị ígwè e ji akwọ ihe, nwanyị ga-awụsa ha n’elu nnukwu nkume e ji egwe ihe ma jiri karama ma ọ bụ nwa nkume gwee ha.
N’oge na-adịghị anya a ga-eji ahụekere ahụ a kwọrọ akwọ mere ihe e ji eme ka ofe rọọ arọọ, nke na-abụkarị ihe oriri a na-esi n’otu ite na nke a na-eji eri akpụ, ogede, ma ọ bụ osikapa. Ọ bụrụ na ị na-eche otú ihe oriri e tinyere ahụekere a kwọrọ akwọ na-atọ, gịnị ma ị nwalee ime ya?
Ị pụrụ ịgbaso ntụziaka dị mma nke isi ihe ma jiri anụ, yabasị, garlic, na tomato sie ofe. Sie ya ruo mgbe anụ ahụ ghere, tinyekwa ya akwụkwọ nri e biri ebi ma ị chọọ. Ka o sinyere n’ọkụ, tinyetụ mmiri n’ime obere ahụekere a kwọrọ akwọ ma kpagharịa ya ka ọ rọọ arọọ—ihe dị ka otu iko maka anụ dị otu kilogram n’arọ—ma wụnye ya n’ime ofe ahụ, kpagharịakwa ya. Hapụ ya n’ọkụ na-enwusi ike ruo minit iri ma ọ bụ karịa ka ahụekere ahụ a kwọrọ akwọ ghara ịtọgbu ihe ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ofe ahụ arọghị arọ otú ị chọrọ, tinyekwuo ahụekere a kwọrọ akwọ. Tinye ya nnu otú dị gị mma. Ọ bụrụ na ihe ndị na-afụtụ ụfụ na-amasị gị, ị pụrụ itinyetụ ya ose.
Ọtụtụ na-ahụ na iji ụdị ofe ahụ rie osikapa na-atọ ụtọ! Ọ bụkwa ezie na nke gị nwere ike ọ gaghị abụ nke ezigbo ya, ị ga-amatatụ n’onwe gị ihe ndị a na-eji ahụekere a kwọrọ akwọ eme—n’ụdị nke ndị Africa!
[Foto ndị dị na peeji nke 22]
A na-abọ ahụekere, bulazie ha ụlọ ka a gbapụta ha ná mkpo ha ma kwọọ ha