Akwụkwọ Akpụ—Nri Kwa Ụbọchị Maka Ọtụtụ Nde
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA CENTRAL AFRICAN REPUBLIC
HA NILE malitere n’ihe dị ka afọ 1600, mgbe ndị Portugal si n’Ebe Ndịda America weta akpụ, ma ọ bụ manioc, n’Africa. E kwetara na ọ bụ na Brazil ka akpụ sitere n’ihi na a nụrụ okwu ahụ bụ́ “manioc” na nke mbụ ya site n’agbụrụ ndị Tupia nke Brazil na Ndagwurugwu Amazon.
Mkpọrọgwụ ya na-amasị ndị Africa nke ukwuu, ma gịnị banyere akwụkwọ ya nke na-acha ezigbo akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ? Ụfọdụ ji ha eme ihe dị ka ọgwụ n’elu ọnyá ghere oghe ma ọ bụ iji agwọ ọrịa kpọtọmkpọ. Otú ọ dị, nye ọtụtụ nde bi na Central African Republic na ọtụtụ mba Africa ndị ọzọ, akwụkwọ ha bụ nri kwa ụbọchị, ebe ọ bụ na a pụrụ ime ka ha ghọọ nri na-atọ ụtọ. N’eziokwu, otu n’ime okwu mbụ ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ nke Watch Tower na-amụta n’ebe a bụ ngunza. Nke a bụ ofe dị ụtọ e ji akwụkwọ akpụ sie, ọ bụkwa nri zuru mba nke Central African Republic—erimeri nke onye ọ bụla bịara ileta ebe etiti Africa na-aghaghị ịgbalị iritụ.
Ihe ka ọtụtụ ná ndị Europe bi n’Africa agaghị anwa imetụ nri e ji akwụkwọ ndị a sie aka ma ọlị, ebe ha na-ewere ya dị ka nri nke ndị obodo ahụ, ọ bụghị maka ndị si mba ọzọ. Ma gịnị bụ ihe ndị mere eme? Ná mba ndị dị ka Central Africa, Sierra Leone, na Zaire, akwụkwọ ndị a bụ ihe oriri bụ isi nke ọtụtụ ezinụlọ.
Mgbe ị na-efefe ma ọ bụ na-eme njem na-agafe na Central African Republic, ị ga-ahụ mba na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ mara mma—osisi, ọhịa, ala ahịhịa, na, n’agbata ha, obere ubi akpụ na akwụkwọ ha nke na-acha ezigbo akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, ndị e ji mara ha. Ubi akpụ gbara obodo nta ọ bụla gburugburu. Ndị mmadụ na-akọ ya n’akụkụ ebe obibi ha, ọbụnakwa n’isi obodo, bụ́ Bangui, ị ga-ahụ akpụ n’obere ibé ala na ájá ndị dị nso n’ogige ụlọ obibi ma ọ bu n’akụkụ okporo ụzọ. N’ezie, ọ bụ otu ihe dị mkpa e ji esi nri n’akụkụ a nke ụwa.
Nwaletụ Ngunza
Ozugbo ha rutere, ndị enyi ha na-akpọ ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ òkù n’oge na-adịghị anya ka ha bịa ritụ ngunza. Nke a bụ erimeri na-agụnye nri ahụ a ma ama e ji akwụkwọ manioc sie. Ndị inyom obodo ahụ maara otú e si akwadebe ya ka ọ tọọ ụtọ. O yiri ka nwanyị ọ bụla nwere otú o si esi nke ya. Otu n’ime ihe ndị mbụ ụmụ agbọghọ na-amụta site n’aka nne ha banyere isi nri bụ otú e si akwadebe ngunza.
Ha na-eji nganga akọwa ihe ọ bụ na otú ha si akwadebe ya. Ndị inyom ahụ na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na i gosi mmasị n’erimeri obodo ha nke a. Nke mbụ, ha ga-agwa gị na akwụkwọ akpụ dị ọnụ ala, jupụtakwa ebe nile, nakwa na ị pụrụ ịkụrụ ya ma n’oge udu mmiri ma n’oge ọkọchị. N’oge ọgba aghara akụ̀ na ụba na ịrị elu nke ọnụ ahịa, akwụkwọ akpụ na-arụ ọrụ dị mkpa n’inye ezinụlọ ihe oriri. Biko chetakwa na ezinụlọ ndị Africa na-ebukarị ibu. E nwere ọtụtụ ọnụ a ga-enye ihe oriri na ọtụtụ afọ a ga-azụ. Ịkwadebe ngunza na-ewe ọtụtụ hour. Akwụkwọ ndị ahụ aghaghị ịkwụsị ilu ilu tupu e rie ha. A na-esite ná nkwadebe ọdịnala ewepụ ihe na-egbu egbu dị na ha, bụ́ nke na-agụnye igwe ya egwe na isi ya n’ọkụ ugboro ugboro.
Mmanụ ndị inyom Africa na-enwekarị mmasị iji na-akwadebe ngunza bụ mmanụ nkwụ. Ọ bụ iwu na a ga-eji mmanụ ahụ na-achatụ uhie uhie ha kwadebere n’onwe ha mee ihe. Ngunza tinyere obere ahụekere e gwere egwe na ma eleghị anya yabasị na garlic bụ nri kwa ụbọchị maka ezinụlọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ị na-atụ anya ndị ọbịa? Mgbe ahụ ngunza ahụ aghaghị ịbụ ihe pụrụ iche, ihe ha ga-echeta. Ya mere nwanyị ahụ na-elekọta ndị ọbịa ga-etinye ihe na-amasịkarị ya—azụ ma ọ bụ iberibe anụ a mịrị n’ọkụ—tinyere ọtụtụ garlic na yabasị, ha na ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ahụekere e gwere ọhụrụ n’ụlọ. A na-awụnye ndị a nile n’ime otu nnukwu ite. Nke fọdụrụnụ bụ ndidi na isi ya n’ọkụ ruo ogologo oge.
Taa nwanyị na-ele anyị ọbịa ga-enye anyị ngunza na osikapa. Efere osikapa a wụkwasịrị otu ekú ngunza ma ọ bụ abụọ dị ọkụ bụ ihe ụtọ nye ndị Africa nakwa ọtụtụ ndị sitere mba ọzọ. Tinye ntakịrị ose ụfụ, ugbu a kwa ị na-amata ihe ngunza bụ. I kporichaa ndụ n’erimeri ahụ, otu iko mmanya na-acha uhie uhie ga-ewepụta ụtọ ya n’ụzọ zuru ezu.
Olee Maka Ngukassa Ma Ọ Bụ Kanda?
N’ime njem site n’ọwụwa anyanwụ gaa n’ọdịda anyanwụ mba ahụ, ị ga-ahụ na ndị mmadụ na-akwadebe ngunza n’ụzọ dịgasị iche iche. Gịnịkwanụ maka ngukassa? N’ụbọchị mmiri ozuzo nke oyi na-atụ, ngukassa, bụ́ ofe a na-eji ihe dị iche iche dị n’ubi esi, pụrụ ịbụ ihe kwesịrị ekwesị nye gị. A na-esikọta mmanụ nkwụ, ọgede, ahụekere, poteto ụtọ, ọka, na n’ezie, akwụkwọ akpụ ụfọdụ ọnụ, ma a dịghị etinye ya nnu—ọbụnadị otu mkpụrụ nnu. Nke ahụ bụ ihe nzuzo ya! Ihe ọ na-arụpụta bụ nri na-atọ ụtọ ma na-edozi ahụ. Ọ bụrụkwa na ị na-eme njem ga-ewe ogologo oge, were ụfọdụ kanda gawa. Ihe e ji mee nke a bụ akwụkwọ akpụ nke a sụkọtara ya na azụ ma ọ bụ anụ a mịrị n’ọkụ ọnụ. A na-akwadebe kanda site n’iji akwụkwọ fụchie ngwakọta nke a ma mịa ya n’ọkụ ruo ọtụtụ hour, ruo mgbe o siri ike ma kpọọ nkụ. Ọ na-adịru ọtụtụ ụbọchị, a pụkwara iji iberibe bred rie ya. Ọ magburu onwe ya maka ndị njem.
Mgbe ọ bụla ị na-eme nleta n’Africa, gịnị ma i kwuo ka e nye gị akpụ? Nwalee ya, sonyekwara ọtụtụ nde na-anụ ụtọ ya!