Ikiri Ụwa
Ọgụgụ Bible Na-eweta Uru
Ndị America na-agụ Bible ma ọ dịkarịa ala otu ugboro n’izu na-enwe ọṅụ na afọ ojuju ka ukwuu, na-enwekwa nzube ka ukwuu ná ndụ karịa ndị na-adịghị agụru Bible otú ahụ, dị ka otu ihe ọmụmụ nke Associated Press kọrọ. Ná nnyocha e mere ndị America toruworo ogo mmadụ, nke òtù bụ́ Market Facts, Inc., nke Illinois duziri, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 90 nke ndị na-agụ Bible mgbe mgbe kwuru na ha na-enwe udo nke uche oge nile ma ọ bụ ihe ka ọtụtụ n’oge nile, ma e jiri ha tụnyere pasent 58 ndị na-adịghị agụru Bible otu ugboro n’ọnwa. Ọzọkwa, pasent 15 nke ndị na-agụchi Bible anya kwuru na ha na-enwe nchegbu banyere ịbụ ndị ndị ọzọ nabatara, ma e jiri ha tụnyere pasent 28 ndị na-adịghị agụchi ya anya. Nanị pasent 12 nke ndị na-agụ ya mgbe mgbe kwuru na ha na-enwe nchegbu banyere ọnwụ mgbe ụfọdụ ma ọ bụ nke ukwuu, ma e jiri ha tụnyere pasent 22 ndị na-adịghị agụ ya mgbe mgbe.
Ihe Ụmụ Ọhụrụ Na-anụ
Nnyocha e mere na nso nso a na-anwapụta na ọ̀tụ̀tụ̀ na ụda nke okwu ndị nwa ọhụrụ na-anụ na-emetụta ikike o nwere iche echiche n’ụzọ ezi uche dị na ya, idozi nsogbu, na ichezi echiche, ka The New York Times na-akọ. Nnyocha e mere na Mahadum nke Iowa chọpụtara na ụmụaka ndị nne na nna ha bụ́ ndị ọkachamara nụrụ nkezi nke okwu 2,100 kwa hour, ebe ndị nne na nna ha bụ ndị ọrụ nkịtị nụrụ okwu 1,200, ma ndị nne na nna ha na-enweta ihe enyemaka nụrụ nanị 600. A rịbakwara ụda olu nke ndị nne na nna ama—nke na-agba ume, ịba mba, ịhụnanya, ma ọ bụ nke na-enye iwu. Nnyocha ahụ were afọ abụọ na ọkara gosiri na ihe dị iche iche a na-anụ “nwere mmetụta dị ukwuu n’ikike ichezi echiche nke nwatakịrị ọ bụla ka ọ na-erule afọ 4.” Otu n’ime ndị ahụ na-eme nnyocha, bụ́ Dr. Betty Hart, kwuru na afọ atọ mbụ ná ndụ nke ụmụ mmadụ pụrụ iche n’ihi na ụmụ ọhụrụ na-adabere nnọọ kpam kpam n’ebe ndị okenye nọ maka ọzụzụ na asụsụ nile ha.
Ahụhụ Ndị Buru Oké Ibu
Akpụ bụ ihe oriri bụ isi nye ihe dị ka nde 200 ndị mmadụ n’Africa. Ma ugbu a, site n’enyemaka nke obere ahụhụ na-eri ibe ya a na-akpọ Typhlodromalus aripo, e nwere akpụ ka ukwuu ga-ezu mmadụ nile. Dị ka magazin bụ́ New Scientist si kwuo, e sitere na Brazil bubata ahụhụ ahụ bụ́ T. aripo iji lụsoo otu n’ime ahụhụ kasị ebibi akpụ n’ụwa ọgụ, bụ́ ahụhụ ududo na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, nke bibiri ihe ruru otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụfọdụ akpụ nke Africa. Ndị na-eme nnyocha chọpụtara na ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Brazil, nke nwere ọtụtụ akpụ, nwere nsogbu ole na ole nke ahụhụ ududo na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ kpatara. A chọpụtara na ahụhụ ahụ na-eri ibe ya, bụ́ T. aripo, na-anọdụ n’ọnụ ọnụ ihe ọkụkụ ahụ na-echere ka ahụhụ ndị ahụ na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ pụta, mgbe ahụ riekwa ha. Ọ bụghị nanị na ahụhụ T. aripo na-egbu ihe ruru pasent 90 nke ahụhụ ududo na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, ka magazin ahụ na-ekwu, kama ha na-enyekwara ndị ọrụ ugbo aka izere iji ọgwụ ahụhụ eme ihe, bụ́ nke ọtụtụ ndị na-apụghị ịzụtali.
Abụọ Dị Mma Karịa Otu
Ndị mmadụ na-enwe ihe ịga nke ọma ka ukwuu n’ịgbalị ịgbaso ụzọ ndụ nke na-akwalite ahụ ike karị mgbe ha nwere onye ibe nke na-eme otu ihe ahụ, dị ka magazin Britain bụ́ New Scientist si kwuo. Nke a bụ nkwubi okwu e ruru site ná nnyocha nke di na nwunye 1,204, bụ́ nke a kọrọ n’akwụkwọ bụ́ Archives of Family Medicine. Stephen Pyke, nke Ụlọ Akwụkwọ Ịdị Ọcha na Ọgwụ nke Ebe Okpomọkụ dị na London na-ekwu, sị: “O yikarịrị ka ndị mmadụ hà ga-akwụsị ise sịga, belata cholesterol ha ma felata ma ọ bụrụ na ha abụọ agbasoo okwu ndụmọdụ ahụ.”
Nlekọta Ụda Olu
Onye ọ bụla nke na-ekwukarị okwu, dị ka onye nkụzi, nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye olu gụrụ na ịtụfu ụda olu ya, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star na-akọ. N’otu aka ahụ, iti mkpu mgbe nile iji bụrụ onye a nụrụ ihe ọ na-ekwu na gburugburu ebe mkpọtụ dị pụrụ imebi akwara ụda olu. Ịgba izù na ịkwacha akpịrị mgbe nile na-emebikwa ụda olu gị, ka onye ọkà ná nsogbu okwu ọnụ na asụsụ bụ́ Bonnie Mann na-ekwu. Ọ na-adụ ọdụ ịghara ichere ruo mgbe nsogbu ahụ siri ike tupu i mee ihe banyere ya, na-agbakwa ume ịnọzi ọnọdụ iji mee ka nrụgide dị n’olu na ubu belata. Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ọ dị mkpa, karịsịa, ime ka akpịrị gị ghara ịkpọ nkụ.” Ọ bụrụ na ị na-ekwukarị okwu, Mann na-atụ aro ịdị na-aṅụrụtụ mmiri ụbọchị dum.
Ikiri Ihu Igwe Tibet
Mba iri dị n’ógbè Esia na Pacific ahaziwo ule nnwale iji mụọ maka ifufe monsoon, ka magazin bụ́ New Scientist na-akọ. Ọrụ ugbo n’ógbè ndị dị ukwuu nke Esia na-adabere na mmiri ozuzo nke ifufe monsoon na-ebute, ma ndị a pụrụ ịgbanwe nke ukwuu site n’afọ ruo n’afọ. Ndị ọkà mmụta ihu igwe kwenyere na ala dị larịị nke Tibet bụ isi ihe na-akpata mmiri ozuzo nke ifufe monsoon na-ebute, ma e nwetabeghị ihe ndekọ sitere Tibet maka nkọwa. Mgbe e sosịrị China kwurịta okwu, ugbu a a na-eguzobe ígwè ọrụ nke mmadụ na-adịghị achịkwa na Tibet iji kirie ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ, ịdị udè, ifufe, na ihe ndị ọzọ na-emetụta ihu igwe Himalaya. Ndị na-eme nnyocha nwere olileanya na ihe ndekọ e nwetara ga-eduga ná nghọta ka mma nke ifufe monsoon nke Esia.
E Gwupụta Ebe E Nwere Ọchịchị Ndị Rom n’Israel
Ndị ọkà mmụta ihe ochie n’Israel achọpụtawo ihe owuwu nke ọchịchị ndị Rom na Sisaria nke pụrụ ịbụ obí eze Pritoriọm ahụ ebe a tụrụ Pọl onyeozi mkpọrọ, ka otu akụkọ sitere n’ụlọ ọrụ Reuters na-ekwu. Yosef Porath, bụ́ onye isi nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Oge Ochie nke Israel na Sisaria, kwuru na ndị ọkà mmụta ihe ochie nọ n’ebe ahụ egwupụtawo ihe osise nwere ihe odide Latin nke na-egosi na otu ọfịs dị n’ebe ahụ pụrụ ịbụworị ụlọ ọrụ maka nchebe ime obodo. “Ihe odide a na-enye aka idozi nsogbu nke ebe nnụrụ okwu ikpe nke St. Paul n’ihu gọvanọ Rom nke a kọwara n’Agba Ọhụrụ weere ọnọdụ,” ka Porath kwuru. O kwuru na ebe ahụ bụ nanị ebe e nwere ọchịchị Rom nke a ka gwupụtara n’Israel na otu n’ime ole na ole dị ná mba Rom oge ochie.
Ahụhụ Dị Ka Ọgwụ
N’oge a na-alụ otu agha na 1947, dọkịta China na-awa ndị agha ahụ bụ́ Wu Zhicheng chọrọ ịchịkwa nje n’ahụ ndị merụrụ ahụ, ma ọgwụ ndị o nwere gwụrụ. N’ịfọ nke nta ka obi koropụ ya, o chigharịkwuuru onye dibịa nọ n’ógbè ahụ, bụ́ onye tụrụ aro ọgwụ ọdịnala ndị China—mmiri e sikọtara ya na ahụhụ maka iji sachaa ọnyá ndị ahụ na ọgwụ e ji ụdị ahụhụ ndị pụrụ iche mee. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ China Today si kwuo, ihe ọ rụpụtara dị mma nke ukwuu nke na Dr. Wu malitere ọrụ were ogologo oge nke ime nchọpụta maka iji ahụhụ eme ọgwụ. O kwenyere na ọgwụ e ji ahụhụ mee na-enye aka eme ka usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ na-arụ ọrụ nke ọma ma na-ekwu, sị: “Ahụhụ bụ obere ụlọ nkwakọba ihe oriri na-edozi ahụ. O nwere ihe karịrị ihe ndị na-edozi ahụ 50 nke ahụ mmadụ chọrọ, amino acid 28 na mineral na ngwakọta mmiri ọgwụ dị iche iche.”
“Ọrịa Ọfịs”
Ihe karịrị pasent 80 nke ndị Itali na-enwe nsogbu ịnọzi ọnọdụ n’ihi ụzọ ndụ nke ịnọ otu ebe, dị ka otu nnyocha nke Prọfesọ Maurizio Ricciardi, bụ́ onye nduzi ụlọ ọrụ ịnọzi ọnọdụ nke Mahadum nke Siena, duziri si gosi. Ihe karịrị ọkara nke ndị a na-arịa “ọrịa ọfịs” na-emekwa mkpesa banyere ihe ndị dị ka azụ mgbu, isi ọwụwa, agbọ onunu, ajụ obubu na nsogbu ịkwụ ọtọ, mgbanwe ná mgbali ọbara, afọ ọsịsa, afọ okuko, ọzịza nke eriri afọ, na afọ ọzịza, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Il Messaggero na-akọ. “Mgbe otu hour ọ bụla nke ịrụ ọrụ gasịrị, ndị Japan na ndị China na-eme ụfọdụ mmega ahụ dị mfe” iji lụsoo nsogbu ndị a ọgụ, ka Ricciardi na-ekwu, “ebe ọ bụ na nye anyị, nanị nkwụsịtụ anyị na-enwe bụ maka kọfị.”
Ndị Na-eto Eto Na-agụ Ihe Bụ́ Ndị Brazil
Ma ịma ka e si agụ na ka e si ede ma afọ ole ụmụ akwụkwọ na-anọ n’ụlọ akwụkwọ na-arị elu na Brazil, ka magazin bụ́ Exame na-ekwu. Ọ bụ ezie na a ka nwere ohere dị ukwuu maka ọganihu, n’agbata 1991 na 1995, e nwere ndalata nke pasent 36 n’amaghị ka e si agụ na ka e si ede ná ndị nọ n’afọ 7 ruo 14, dị ka Ụlọ Akwụkwọ Nkà Mmụta Ọdịdị Mbara Ala na Ndekọ Ọnụ Ọgụgụ nke Brazil si kwuo. Nkezi afọ a nọrọ n’ụlọ akwụkwọ ji pasent 10 rịa elu n’agbata afọ 1990 na 1995. A pụrụ ịhụ mmasị na-arị elu n’ịgụ ihe n’etiti ndị na-eto eto bụ́ ndị Brazil n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmụba nke pasent 40 n’ọnụ ọgụgụ nke ụmụ akwụkwọ ndị jere mkpọsa akwụkwọ e mere na nso nso a na Rio de Janeiro. Ndị e rekarịsịrị ná mkpọsa ahụ—ngụkọta nke pasent 24 nke ihe nile e rere—bụ akwụkwọ ndị e dere maka ndị na-eto eto, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ O Estado de S. Paulo na-akọ.
Ndị Punjab na Ọrịa Mkpụrụ Akụrụ
Ndị si steeti Punjab na ógbè ndị gbara ya gburugburu n’India yikarịrị ka ha ga-arịa ọrịa mkpụrụ akụrụ karịa ógbè ọ bụla ọzọ n’ụwa, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ India Today International na-akọ. E ji ịrụsi ọrụ ike na iri nri nke ọma mara ndị Punjab, ma ọtụtụ mgbe ha adịghị aṅụ mmiri zuru ezu n’ọnwa ndị na-adị ọkụ nke oge okpomọkụ, ka akụkọ ahụ na-ekwu. N’ihi nke a, ná nnọkọ nkwurịta okwu mba nile banyere ọwara mamịrị e nwere na nso nso a, a kọwara ógbè ha dị ka “ógbè ọrịa mkpụrụ akụrụ” nke ụwa. Nkezi ibu ibu nke otu mkpụrụ akụrụ n’ebe ahụ bụ n’agbata sentimita abụọ ma ọ bụ atọ [ihe dị ka otu inch], ma e jiri ya tụnyere otu sentimita [ihe na-erughị ọkara inch] na Europe na United States. Akụkọ ahụ na-ekwu na ihe kpatara nke a bụ omume nke ọtụtụ ndị India ileghara ụmụ obere ahụ mgbu anya ma ọ bụ iyigharị ọgwụgwọ. Ndị ọkachamara n’ihe banyere ọwara mamịrị na-ekwu na ndị ji ahụ kwesịrị ịṅụ ma ọ dịkarịa ala quart mmiri dị ọcha abụọ kwa ụbọchị.