Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 2/8 p. 29-30
  • Ikiri Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikiri Ụwa
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmetọ Ụmụaka Juru Ebe Nile
  • Ọ̀ Bụ “Nna Nna Kasị Ochie”?
  • Robot Na-awa Ahụ
  • Ndị Na-anwụ n’Ihe Mberede Okporo Ụzọ Na-arị Elu
  • Ebe Ndị A Na-edebeghị Ọcha
  • Ibelata Ihe Ize Ndụ nke Ọrịa Mkpụrụ Akụrụ
  • Ihe Ista Pụtara n’Australia
  • Ihe Na-akpali Agụụ Mmekọahụ Maka Ndị Inyom
  • Ndị Ịzụ Ihe Riri Ahụ
  • Iledo Ụmụaka
  • Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Ista?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Ista Ka Ọ Bụ Ememe Ncheta Olee nke I Kwesịrị Ime?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Baịbụl Ò Kwuru Ka Anyị Na-agba Ista?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Nsogbu Ahụ Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 2/8 p. 29-30

Ikiri Ụwa

Mmetọ Ụmụaka Juru Ebe Nile

“A chọpụtawo n’otu nnyocha ọhụrụ [United States] e mere maka ahụ ike nke ụmụ okoro ndị nọ n’oge uto ha, na ihe karịrị otu n’ime ụmụ okoro 8 toruworo ogo ịga ụlọ akwụkwọ dị elu kwuru na e tirụrụ ha ahụ ma ọ bụ metọọ ha n’ụzọ mmekọahụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-akọ. A chọpụtara ná nnyocha ahụ na “itirụ ụmụ okoro ahụ zuru nnọọ ebe nile karịa imetọ ha n’ụzọ mmekọahụ, nakwa na ọ bụ onye òtù ezinụlọ ha tiri ha ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ntirụ ahụ ahụ, o wekwaara ọnọdụ n’ebe obibi ha.” A kasị metọọ ụmụ okoro bụ́ ndị America agbụrụ ha bụ Esia, na-enwe pasent 9 na-ekwu na e metọwo ha. N’etiti ụmụ okoro Spain, pasent 7 kwuru na e metọwo ha n’ụzọ mmekọahụ, ebe pasent 3 n’etiti ndị isi ojii na ndị ọcha kọrọ na e metọwo ha n’ụzọ mmekọahụ. Akwụkwọ ajụjụ ahụ akọwaghị ihe mmetọ bụ. Nanị ihe ọ jụrụ bụ ma ọ̀ dịwo mgbe e tirụrụ onye ahụ ga-azaghachinụ ahụ ma ọ bụ metọọ ya n’ụzọ mmekọahụ.

Ọ̀ Bụ “Nna Nna Kasị Ochie”?

Na nso nso a, ndị bishọp si Esia nile gbakọtara na Vatican City iji tụlee ụzọ dị iche iche a ga-esi gbasaa Okpukpe Katọlik ruo ala Esia. “N’ihe ka ukwuu ná mba ndị dị n’Esia, Iso Ụzọ Kraịst bụ okpukpe nke Ebe Ọdịda Anyanwụ nke ọchịchị ndị ọcha wetara,” ka Monsignor Oswald Gomis nke Sri Lanka na-ekwu. N’ihi ya, ihe ịma aka e nwere bụ “iji okwu ndị kwekọrọ na nke ndị Esia kọwaa Jisọs,” ka ụlọ ọrụ bụ́ Associated Press na-akọ. “Ndị bishọp ahụ kwuru banyere ime ka chọọchị Rom kwekọọ n’omenala na asụsụ ha nakwa ka omenala na asụsụ ha kwekọọ na chọọchị Rom.” Otu ihe atụ e nyere bụ ife ndị nna ochie ofufe. Iji dọta mmasị ndị na-eme omenala oge ochie a, Monsignor John Tong Hon nke Hong Kong tụrụ aro ka Katọlik jiri nwayọọ nwayọọ webata echiche nke chi “ndị Kraịst” dị ka “nna nna kasị ochie.”

Robot Na-awa Ahụ

Ndị dọkịta abụọ na-awa ahụ n’otu ụlọ ọgwụ dị na Paris ejiriwo robot e ji kọmputa eduzi waa obi na nke mbụ ya n’enweghị nsogbu, ka akwụkwọ akụkọ France bụ́ Le Figaro na-akọ. A wara mmadụ isii ahụ, gụnyere otu igbugharị okpo n’obi. Usoro e ji eme ya na-agụnye ịwa ahụ site n’ebe a wapuru awapu dị sentimita anọ. N’ịnọdụ n’akụkụ ihe ndọba kọmputa dị ọtụtụ mita site n’ebe onye ọrịa nọ, ndị dọkịta ahụ na-awa ahụ na-esite na kamera nyokpuo anya n’ime ahụ onye ọrịa ahụ ma jiri ihe abụọ e ji achịkwa robot chịkwaa mmegharị aka nke robot ahụ. Ebe kọmputa ahụ na-eji site n’okpukpu atọ ruo ise na-ebelata ngagharị nke dọkịta na-awa ahụ, ịwa ahụ ahụ na-aga kpọmkwem n’ihe a chọrọ karị ma na-ebelata ngwá ọrụ ndị e ji arụ ọrụ n’ime ahụ. Abamuru ọzọ bụ na onye ọrịa ahụ na-enwe ihe mgbu dị nta mgbe ọ na-agbake.

Ndị Na-anwụ n’Ihe Mberede Okporo Ụzọ Na-arị Elu

Kwa afọ, a na-egbu ihe karịrị mmadụ 500,000 n’okporo ụzọ awara awara n’ụwa, ndị na-anwụkwa n’ihe mberede okporo ụzọ gburugburu ụwa na-arịkwa elu, ka obere akwụkwọ akụkọ bụ́ Fleet Maintenance & Safety Report na-akọ. Olee ohere ndị i nwere inwe ihe mberede okporo ụzọ dị oké njọ? Dị ka akụkọ ahụ si kwuo, “ná mba ndị nwere ‘ọtụtụ ụgbọala,’ ọ dịkarịa ala otu mmadụ n’ime mmadụ 20 na-anwụ ma ọ bụ na-emerụ ahụ ná mkpọka ndị na-eme n’okporo ụzọ kwa afọ, a na-enyekwa otu n’ime mmadụ 2 àkwà n’ụlọ ọgwụ ma ọ dịkarịa ala otu ugboro n’ogologo ndụ ha n’ihi mmerụahụ nke ihe mberede okporo ụzọ kpatara.”

Ebe Ndị A Na-edebeghị Ọcha

N’agbanyeghị ókè ọ pụrụ iyiru ihe na-agaghị eme eme, elu ọ́kwá mposi dị n’ebe obibi gị pụrụ ịdị ọcha karịa bọọdụ e ji ebe ihe dị na kichin gị. Nke ahụ bụ ihe ndị nnyocha si Mahadum Arizona kwubiri mgbe ha jisịrị izu 30 nyochaa nje bacteria a chọtara n’ebe obibi 15. Ìgwè ahụ weere ụfọdụ nje bacteria ahụ n’ebe 14 dị n’ebe obibi nke ọ bụla, gụnyere isi pọmpụ, elu ọ́kwá ịsa ihe, bọọdụ ndị e ji ebe ihe, ákwà e ji ehicha efere, na elu ọ́kwá mposi. Gịnị ka ha chọpụtara? “Ndị nnyocha chọpụtara nje bacteria ji ọtụtụ nde okpukpu karịa nke dị n’elu ọ́kwá mposi na mmiri a pịchatara n’ákwà e ji ehicha efere,” ka magazin New Scientist na-ekwu. “Ọbụna bọọdụ ndị e ji ebe ihe nwere nje bacteria karịrị nke ahụ okpukpu atọ.” Ọnụ na-ekwuru ha ná nnyocha ahụ, bụ́ Pat Rusin, kwuru na “elu ọ́kwá mposi na-akọcha nnọọ akọ nke na ọ dịghị ebu ọtụtụ nje bacteria, bụ́ ndị na-enwe mmasị ibi n’ebe ndị dị mmiri mmiri,” ka magazin ahụ na-akọ. Iji debekwuo ihe ọcha, Rusin na-atụ aro ịsa ákwà e ji ehicha efere ọcha kwa izu. Ọ na-ekwu, sị: “Nanị tinye otu iko bleach n’ọ́kwá ịsa ihe nke mmiri juru, tinye ákwà ahụ e ji ehicha efere n’ime ya ma hapụ ya n’ime mmiri ahụ ruo minit 10 tupu ị gbapụ mmiri ahụ.”

Ibelata Ihe Ize Ndụ nke Ọrịa Mkpụrụ Akụrụ

Ndị nchọpụta na-enyocha ihe oriri nke ihe karịrị ndị nọọsụ 80,000 na United States n’agbata afọ 1986 na 1994, chọpụtara na ihe ọṅụṅụ ụfọdụ yiri ka ha ga-enyere mmadụ aka izere ọrịa mkpụrụ akụrụ karị ndị ọzọ, ka magazin bụ́ Science News na-akọ. N’ime ihe ọṅụṅụ 17 e nyochara, tii jiri pasent 8 belata ihe ize ndụ nke ọrịa mkpụrụ akụrụ, ebe kọfị dị otú o kwesịrị ma ọ bụ nke e wepụrụ caffeine dị na ya jiri pasent 9 belata ihe ize ndụ ya. Ịṅụru mmanya ókè jiri pasent 20 ma ọ bụ karịa nye aka belata ihe ize ndụ mmadụ nwere ịrịa ọrịa mkpụrụ akụrụ. “N’ụzọ na-eju anya, otu iko mmiri grape dị ounce 8 n’ịdị arọ a ṅụrụ kwa ụbọchị jiri pasent 44 kwalite ihe ize ndụ nke ọrịa mkpụrụ akụrụ,” ka ihe ọmụmụ ahụ gosiri. “Ọ dịghị ihe ọṅụṅụ ọzọ nwere mmetụta dị njọ dị otú ahụ.” E hotara Dr. Gary Curhan, bụ́ ọkachamara ná mgbasa na ọgwụgwọ nke ọrịa na ọkachamara ná mkpụrụ akụrụ na Boston, dị ka onye na-asị: “Ibelatatụ ịṅụ ihe ọṅụṅụ pụrụ ime ka ọnọdụ ka mma,” ma ọ bụ nanị dị ka otu akụkụ nke usoro ọgwụgwọ sara mbara.

Ihe Ista Pụtara n’Australia

Ụlọ ọrụ Australia na-ebipụta akwụkwọ akụkọ bụ́ Sun-Herald mere njụta echiche nke e sitere na ya jụọ ndị mmadụ aghara aghara ihe Ista pụtara nye ha. Ihe ndị a zara e bipụtara dị n’usoro a: àkwá chocolate nke Ista (pasent 54), ezumike ogologo izu dum (pasent 39), Ihe Ngosi Ista Mara Mma (pasent 21), ememe okpukpe (pasent 20). David Milikan, bụ́ onye ụkọchukwu nke Chọọchị Uniting, kwuru na o jughị ya anya na nanị mmadụ ole na ole na Sydney jikọtara Ista na okpukpe. O kwukwasịrị: “Chọọchị dị iche iche na-adakpọ adakpọ . . . Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị òtù okpukpe nile ndị bụ́ isi na-adalata adalata nke ukwuu.” Achịbishọp Roman Katọlik nke Sydney kwara arịrị, sị: “Nye ọtụtụ ndị, Ista enweghị ihe ọ pụtara n’ụzọ okpukpe ma ọlị; ọ bụ nanị ememe ọzọ nke ụwa.”

Ihe Na-akpali Agụụ Mmekọahụ Maka Ndị Inyom

“Ndị inyom ji nwayọọ nwayọọ na-achụkwute ndị ikom ná mmasị ha nwere n’ihe na-akọwapụta ihe banyere mmekọahụ na kọmputa,” ka The New York Times na-akọ. Ọtụtụ ógbè dị na kọmputa ndị dị otú ahụ bụ́ maka ndị inyom na-ejikọta “foto ndị na-egosi mmekọahụ . . . na ịzụ ihe.” Mgbe otu ógbè pụtasịrị nke mbụ ya, bụ́ nke e mepụtara maka ndị inyom na-eso ndị ikom enwe mmekọahụ, Times kwuru na “ógbè ahụ bụ nanị akụkụ ọzọ dị nta n’ime nnukwu usoro ihe omume ndị na-egosi mmekọahụ n’ezoghị ọnụ bụ́ ndị jupụtara na kọmpụta.”

Ndị Ịzụ Ihe Riri Ahụ

“Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị Germany bụ ndị ịzụ ihe riri ahụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Grafschafter Nachrichten na-akọ. Dị ka ọkà akparamàgwà mmadụ n’ihe banyere achụmnta ego bụ́ Alfred Gebert si kwuo, ndị ịzụ ihe riri ahụ na-enweta oké obi ụtọ nke na-apụ n’anya ozugbo ha kwụsịrị ụgwọ ihe ndị ha zụrụ. Ọbụna ha na-enwe ajọ mmetụta ihe mgbu ma ha kwụsịwa ya, ka Gebert na-ekwu. “Ha na-ama jijiji, ọsụsọ na-agba ha, ha na-enwekwa afọ mgbu.” N’ihi nke a, ndị na-enweta nnukwu ego nọ n’ihe ize ndụ karịa ndị ogbenye. A na-asị na ihe ndị pụrụ ịkpata iri ahụ ahụ na-agụnye ‘owu ọmụma, ùgwù onwe onye dị ala, nchekasị, na nsogbu ndị a na-enwe n’ebe ọrụ.’ Iji nye aka lụso iri ahụ ahụ ọgụ, Gebert na-atụ aro ime ihe omume ntụrụndụ. Nke dị mkpa karịsịa, ka Gebert na-ekwu, bụ isoro ọha na eze na-akpakọrịta. Ọ na-ekwu, sị: “Ma e nwetaghị enyemaka sitere n’ebe ọzọ, a na-amata iri ahụ ahụ nanị mgbe a dabara n’ụgwọ ma jiri ego fọrọ afọ zụrụ ihe.”

Iledo Ụmụaka

Ndị nne na nna ụfọdụ na Japan amalitewo igo ndị na-eme nchọpụta na-arụrụ onwe ha ọrụ iledo ụmụaka ha iji chebe ha pụọ n’aka ndị ọchọ okwu n’ụlọ akwụkwọ. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Yomiuri si kwuo, otu prọfesọ na Mahadum Obodo Ukwu bụ́ Osaka bụ́ onye nyochaworo ihe karịrị ụmụ akwụkwọ 6,000 kwuru, sị: “Ụmụaka ndị a na-achọ okwu na-agbalị n’ozuzu ha izochiri ya ezinụlọ ha, na-atụ egwu na a ga-akatọ ha n’ihi enweghị ike imegwara ma ọ bụ ịkwụsị ya.” Ndị nne na nna ụfọdụ bụ́ ndị na-eche na a na-amaja ụmụaka ha amalitewo itinye ígwè electronic na-adọrọ okwu n’ahụ ha ka ha wee gee ntị ná nkwurịta okwu ha. Ndị ọzọ egowo ndị nchọpụta na-arụrụ onwe ha ọrụ ịnọ ‘n’ebe dịtụ anya ka ha na-eso nwatakịrị ahụ, na-edekọ ihe àmà megide ndị na-emekpọ ya ọnụ ma na-efebata dị ka ndị mmụọ ozi na-eche nche iji napụta nwatakịrị nke ndụ ya nọ n’ihe ize ndụ.’ Ma ndị na-agbachitere ụmụaka, ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu, “na-akatọ nledo ndị nne na nna dị ka ihe dị njọ nke yiri ka ọ ga-ekewapụkwu ndị ahụ na-eto eto bụ́ ndị ọ kasị dị mkpa ịtụkwasị ndị toworo eto obi ma na-agwa ha ihe nzuzo ha.” Otú ọ dị, ndị nne na nna na-azọrọ na ọ bụ otu ụzọ isi nyere ụmụ ha a na-enye nsogbu aka mgbe ha na ha na-adịghị enwe nkwurịta okwu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya