Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwfq isiokwu 19
  • Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Ista?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Ista?
  • Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwukarị
  • Gịnị mere Ndịàmà Jehova anaghị agba Ista?
  • Ista Ka Ọ Bụ Ememe Ncheta Olee nke I Kwesịrị Ime?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Baịbụl Ò Kwuru Ka Anyị Na-agba Ista?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ista Ọ̀ Bụ Ememme Ndị Kraịst n’Eziokwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Nkwenkwe na Omenala Ndị Na-adịghị Atọ Chineke Ụtọ
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
ijwfq isiokwu 19

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Ista?

Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwukarị

Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ihe mere Ndịàmà Jehova anaghị agba Ista bụ maka na ha abụghị Ndị Kraịst.

Nke bụ́ eziokwu: Anyị kweere na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị. Anyị na-emekwa ike anyị niile ‘isochi nzọụkwụ ya anya.’—1 Pita 2:21; Luk 2:11.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Unu ekweghị na Chineke kpọlitere Jizọs n’ọnwụ.

Nke bụ́ eziokwu: Anyị kweere na Chineke kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. O so n’ihe bụ́ isi Onye Kraịst ọ bụla ga-ekwere, anyị na-ekwụkarịkwa ya ma anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma.—1 Ndị Kọrịnt 15:3, 4, 12-15.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ọ nadịghị emetụ unu n’ahụ́ na ụmụaka unu esoghị na-enwe obi ụtọ a na-enwe n’oge Ista.

Nke bụ́ eziokwu: Anyị hụrụ ụmụaka anyị n’anya. Anyị na-agbakwa mbọ na-azụ ha ma na-enyere ha aka inwe obi ụtọ.—Taịtọs 2:4.

Gịnị mere Ndịàmà Jehova anaghị agba Ista?

  • Ememme Ista esighị na Baịbụl.

  • Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-echeta ọnwụ ya, ọ bụghị mbilite n’ọnwụ ya. Anyị na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ n’oge dabara n’oge Baịbụl kwuru na ọ nwụrụ.—Luk 22:19, 20.

  • Anyị ma na Ista adịghị Chineke mma n’ihi na ihe ndị a na-eme na ya si n’ememme ndị oge ochie na-emere chi ọmụmụ ma ọ bụ chi na-eme ka ihe a kụrụ n’ubi too. Chineke chọrọ “ofufe a na-ekewaghị ekewa,” ọ ga-ewekwa ya iwe ma onye sịrị na ya na-efe ya na-eme ememme ndị ọ na-anabataghị.—Ọpụpụ 20:5; 1 Ndị Eze 18:21.

Anyị kwetasiri ike na ihe mere anyị anaghị agba Ista bụ n’ihi ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl gwara anyị ka jiri “ezi amamihe na ikike iche echiche” anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme kama iso omenala. (Ilu 3:21; Matiu 15:3) Ọ bụ eziokwu na anyị na-agwa ndị mmadụ ihe anyị kweere banyere Ista ma ha jụọ anyị, ma anyị na-ahapụ onye ọ bụla ka o jiri aka ya kpebie ma ọ̀ ga-agba Ista ma ọ bụ na ọ gaghị agba.—1 Pita 3:15.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya