Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • rq ihe ọmụmụ 11 p. 22-23
  • Nkwenkwe na Omenala Ndị Na-adịghị Atọ Chineke Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkwenkwe na Omenala Ndị Na-adịghị Atọ Chineke Ụtọ
  • Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ista Ka Ọ Bụ Ememe Ncheta Olee nke I Kwesịrị Ime?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Kpebie Ife Chineke Otú Ọ Chọrọ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Ista?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Ememme Ndị Na-adịghị Chineke Mma
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
rq ihe ọmụmụ 11 p. 22-23

Ihe Ọmụmụ nke 11

Nkwenkwe na Omenala Ndị Na-adịghị Atọ Chineke Ụtọ

Nkwenkwe na omenala ndị dị aṅaa dị njọ? (1)

Ndị Kraịst hà kwesịrị ikwere na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu? (2)

Gịnị mere ezi ndị Kraịst adịghị eme ememe Krismas, Ista, ma ọ bụ ụbọchi ọmụmụ? (3, 4)

Ndị nwụrụ anwụ hà pụrụ imerụ ndị dị ndụ ahụ? (5)

Jisọs ọ̀ nwụrụ n’elu obe? (6)

Ruo ókè hà aṅaa ka ime ihe na-atọ Chineke ụtọ dị mkpa? (7)

1. Ọ bụghị nkwenkwe na omenala nile dị njọ. Ma Chineke adịghị akwado ha ma ọ bụrụ na ha sitere n’okpukpe ụgha ma ọ bụ na-emegide nkụzi Bible.—Matiu 15:6.

2. Atọ n’Ime Otu: Jehova ọ̀ bụ Atọ n’Ime Otu—ndị atọ n’ime otu Chukwu? Ee e! Jehova, bụ́ Nna, bụ ‘onye nanị ya bụ ezi Chineke.’ (Jọn 17:3; Mak 12:29) Jisọs bụ Ọkpara Ya o bu ụzọ mụọ, ọ nọkwa n’okpuru Chineke. (1 Ndị Kọrint 11:3) Nna ahụ ka Ọkpara ahụ ukwuu. (Jọn 14:28) Mmụọ nsọ abụghị onye; ọ bụ ike ọrụ Chineke.—Jenesis 1:2; Ọrụ 2:18.

3. Krismas na Ista: A mụghị Jisọs na December 25. A mụrụ ya n’ihe dị ka n’October 1, oge mgbe ndị ọzụzụ atụrụ na-edebe ìgwè atụrụ ha n’èzí n’oge anyasị. (Luk 2:8-12) Ọ dịghị mgbe Jisọs nyere ndị Kraịst iwu ime ememe ụbọchị ọmụmụ ya. Kama nke ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eme ememe, ma ọ bụ ncheta, nke ọnwụ ya. (Luk 22:19, 20) Krismas na omenala ya nile sitere n’okpukpe ụgha oge ochie. Otu ihe ahụ bụ eziokwu banyere omenala nile nke Ista, ndị dị ka iji àkwá na òké bekee eme ihe. Ndị Kraịst oge mbụ emeghị ememe Krismas ma ọ bụ Ista, dịkwa ka ndị Kraịst taa na-adịghị eme ya.

4. Ụbọchị Ọmụmụ: Nanị ememe ụbọchị ọmụmụ abụọ a kpọtụrụ uche na Bible bụ ndị na-adịghị efe Jehova mere ha. (Jenesis 40:20-22; Mak 6:21, 22, 24-27) Ndị Kraịst oge mbụ emeghị ememe ụbọchị ọmụmụ. Omenala nke ime ememe ụbọchị ọmụmụ sitere n’okpukpe ụgha oge ochie. Ezi ndị Kraịst na-enyerịta onyinye ma na-enwekọrịta oge ọma ọnụ n’oge ndị ọzọ n’afọ.

5. Egwu Ndị Nwụrụ Anwụ: Ndị nwụrụ anwụ apụghị ime ihe ọ bụla ma ọ bụ nwee mmetụta ihe ọ bụla. Anyị apụghị inyere ha aka, ha apụkwaghị imerụ anyị ahụ. (Abụ Ọma 146:4; Eklisiastis 9:5, 10) Mkpụrụ obi na-anwụ anwụ; ọ dịghị adị ndụ gaa n’ihu mgbe a nwụsịrị. (Ezikiel 18:4) Ma mgbe ụfọdụ, ajọ ndị mmụọ ozi, ndị a na-akpọ ndị mmụọ ọjọọ, na-eme dị ka à ga-asị na ha bụ mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ. Omenala ọ bụla nke nwere ihe jikọtara ya na egwu ma ọ bụ ofufe ndị nwụrụ anwụ dị njọ.—Aịsaịa 8:19.

6. Obe: Jisọs anwụghị n’elu obe. Ọ nwụrụ n’elu ogologo osisi. Okwu Grik a sụgharịrị “obe” n’ọtụtụ Bible pụtara nanị otu ógwè osisi. Ihe oyiyi nke obe sitere n’okpukpe ụgha oge ochie. Ndị Kraịst oge mbụ ejighị obe mee ihe ma ọ bụ fee ya ofufe. Ya mere, ì chere na ọ ga-abụ ihe dị mma iji obe mee ihe n’ofufe?—Deuterọnọmi 7:26; 1 Ndị Kọrint 10:14.

7. Ọ pụrụ isi ike ịhapụ ụfọdụ n’ime nkwenkwe na omenala ndị a. Ndị ikwu na ndị enyi pụrụ ịgbalị ime ka i kwere ịghara ịgbanwe nkwenkwe gị. Ma ime ihe na-atọ Chineke ụtọ dị mkpa karịa ihe na-atọ mmadụ ụtọ.—Ilu 29:25; Matiu 10:36, 37.

[Foto dị na peeji nke 22]

Chineke abụghị Atọ n’Ime Otu

[Foto dị na peeji nke 23]

Krismas na Ista sitere n’okpukpe ụgha oge ochie

[Foto dị na peeji nke 23]

E nweghị ihe mere a ga-eji fee ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụ tụọ ha egwu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya