Ista Ka Ọ Bụ Ememe Ncheta Olee nke I Kwesịrị Ime?
KA ANYANWỤ nke chi ọbụbọ na-apụta n’ihu igwe n’April 7, ọtụtụ nde ga-enwe obi ụtọ ịhụ ụbọchị kasị nsọ n’afọ nye ha—Ista. N’otu mgbe a na-eji aha ahụ eme ihe banyere oge na-ewe 120 ụbọchị nke oriri na ibu ọnụ nke ji oge ezumike a kpọrọ Septuagesima malite ma gwụsịa n’ụbọchị a kpọrọ Ụbọchị Atọ n’Ime Otu. Taa a na-eji aha ahụ eme ihe banyere otu ụbọchị a na-echeta mbilite n’ọnwụ Jisọs—Ista Sunday.
Otú ọ dị, n’otu uhuruchi ná mmalite nke otu izu ahụ, ọtụtụ nde ndị ọzọ ga-ezukọ ime Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst, nke a makwaara dị ka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ọ bụ ememe nke Jisọs n’onwe ya guzobere n’abalị ikpeazụ ya n’elu ala. Mgbe ahụ ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”—Luk 22:19.
Olee nke i kwesịrị ime?
Mmalite nke Ista
Aha ahụ bụ́ Ista, nke e ji eme ihe n’ọtụtụ ala, adịghị na Bible. Akwụkwọ bụ́ Medieval Holidays and Festivals na-agwa anyị na “a gụrụ ụbọchị ezumike ahụ aha Chi Nwanyị Chi Ọbụbọ na nke Oge Opupu Ihe Ubi nke ndị ọgọ mmụọ, bụ́ Eostre.” Ònye bụkwa chi nwanyị a? “Dị ka akụkọ mgbe ochie si kọọ, ọ bụ Eostre meghere ọnụ ụzọ nile nke Valhalla iji nabata Baldur, nke a kpọrọ Chi Ọcha, n’ihi ịdị ọcha ya nakwa Chi Anyanwụ, n’ihi na egedege ihu ya na-enye ihe a kpọrọ mmadụ ìhè,” ka The American Book of Days na-aza. Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na Chọọchị n’oge mmalite ya nakweere omenala ochie dị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ ma nye ha nkọwa nke ndị Kraịst. Ebe ememe nke Eostre bụ iji mee ememe nke imeghachi ka ndụ dị ọhụrụ n’oge opupu ihe ubi ọ dị mfe ime ya ka ọ bụrụ ememe nke mbilite n’ọnwụ nke Jisọs, onye ha na-ekwu okwuchukwu ya.”
Nnakwere a na-akọwa otú omenala dị iche iche nke Ista, dị ka àkwá Ista, òké bekee Ista, na àkàrà ọkụ ndị a kara akara obe, si malite n’ala ụfọdụ. Banyere omenala nke ighe àkàrà ndị a kara akara obe, “nke elu ha na-egbuke egbuke na-acha nchara nchara bụ́ ndị a kara akara . . . obe,” akwụkwọ bụ́ Easter and Its Customs na-asị: “Obe bụ ihe oyiyi ndị ọgọ mmụọ ogologo oge tupu ya enweta ịdị mkpa na-adịgide adịgide site n’ihe omume nke ụbọchị Friday Ọma mbụ, mgbe ụfọdụkwa a na-akakwa ya na bredị na achịcha dị iche iche tupu oge ndị Kraịst.”
Ọ dịghị ebe anyị hụrụ e hotara ihe ndị a n’ime Akwụkwọ Nsọ, ọ dịghịkwa ihe àmà nke na-egosi na ndị na-eso ụzọ Jisọs oge mbụ kwenyeere ha. N’ezie, Pita onyeozi na-agwa anyị ‘ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi anyị ike, ka anyị wee were ya na-eto eto ruo nzọpụta.’ (1 Pita 2:2) Ya mere n’ihi gịnị ka chọọchị nile nke Krisendọm ji nakwere ụdị ihe oyiyi ndị ahụ doro anya na ha bụ nke ndị ọgọ mmụọ n’ime nkwenkwe na omume ha?
Akwụkwọ bụ́ Curiosities of Popular Customs na-aza, sị: “Ọ bụ ụkpụrụ na-adịghị agbanwe agbanwe nke Chọọchị oge mbụ inye ụdị ememe ndị ọgọ mmụọ ndị ahụ ka dịnụ bụ́ ndị a na-enweghị ike iwepụ nkọwa ndị Kraịst. Banyere Ista mgbanwegharị ahụ dị nnọọ mfe n’ụzọ pụrụ iche. Ịṅụrị ọṅụ n’ihi ọwụwa nke anyanwụ nkịtị, na mbilite nke okike site n’ọnwụ nke oge oyi, ghọrọ ịṅụrị ọṅụ n’ihi ọwụwa nke Anyanwụ ezi omume, ná mbilite n’ọnwụ nke Kraịst site n’ili. Ụfọdụ n’ime ememe ndị ọgọ mmụọ bụ́ ndị weere ọnọdụ ihe dị ka na May 1 bụkwa ndị a gbanwere ikwekọ n’ememe Ista.” Kama izere ememe omenala na nke majik ndị a ma ama nke ndị ọgọ mmụọ, ndị ndú okpukpe nakweere ha ma nye ha “nkọwa ndị Kraịst.”
‘Ma è nwere ihe dị njọ na nke ahụ?’ ka ị pụrụ iche n’echiche. Ụfọdụ echeghị na e nwere. “Mgbe e si ebe ọzọ wetara ndị mmadụ okpukpe dị ka Iso Ụzọ Kraịst, ọ na-anakwere ma ‘na-eme’ ụfọdụ n’ime omenala akụkọ ifo ndị malitere n’okpukpe ndị ka ya ochie ‘baptism,’” ka Alan W. Watts, onye ụkọchukwu nke Episcopal, kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Easter—Its Story and Meaning. “Ọ na-ahọrọ ma na-ewebata ememe ọdịnala ndị yiri ka ha na ụkpụrụ ebighị ebi nke Chọọchị kụziri n’usoro ofufe ya yiri otu ihe ahụ.” Nye ọtụtụ ndị, eziokwu ahụ bụ na chọọchị ha kwadoro ememe ndị a ma were ha ka ihe dị nsọ bụ ihe zuru ezu mere ha ga-eji anakwere ha. Ma a na-eleghara ajụjụ ndị dị mkpa anya. Olee otú omenala ndị a dị Chineke? Ò nyewo anyị nduzi ọ bụla anyị ga-agbaso n’okwu a?
Inweta Echiche Chineke
“Ụbọchị Ista, Ememe nke Mbilite n’Ọnwụ Onyenwe Anyị, bụ ememe kasị ukwuu nke Chọọchị Ndị Kraịst,” ka Christina Hole kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Easter and Its Customs. Ndị ọzọ na-ede akwụkwọ kwenyere na nke a. “O nweghị ụbọchị dị nsọ ma ọ bụ ememe n’afọ ndị Kraịst nke a pụrụ iji atụnyere Ista Sunday n’ịdị mkpa,” ka Robert J. Myers na-ekwu n’akwụkwọ bụ́ Celebrations. Otú ọ dị, nke ahụ na-ewelite ụfọdụ ajụjụ. Ọ bụrụ na ime ememe Ista dị oké mkpa, gịnị mere na e nyeghị iwu ọ bụla kpọmkwem n’ime Bible ime otú ahụ? È nwere ihe ndekọ ọ bụla nke ndị na-eso ụzọ Jisọs oge mbụ ime ememe Ista Sunday?
Ọ bụghị na Bible enyeghị nduzi banyere ihe e kwesịrị ime ememe ya ma ọ bụ ihe a na-ekwesịghị. Chineke gwara mba Israel oge ochie okwu banyere nke a kpọmkwem, dịkwa ka anyị rịbara ama ná mmalite, e nyere ndị Kraịst ntụziaka doro anya ịnọgide na-eme Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst. (1 Ndị Kọrint 11:23-26; Ndị Kọlọsi 2:16, 17) Mbipụta mbụ nke The Encyclopædia Britannica na-agwa anyị, sị: “E nweghị ihe ọ bụla na-egosi na e mere ememe Ista n’Agba Ọhụrụ, ma ọ bụ n’ihe odide nke ndị Nna chọọchị. Ịdị nsọ nke oge ndị pụrụ iche bụ echiche nke na-adịghị n’uche nke ndị Kraịst mbụ. . . . Ma Onyenwe anyị ma ndị ozi ya enyeghị iwu ka a na-eme nke a ma ọ bụ ememe ọ bụla ọzọ.”
Ụfọdụ ndị na-eche na ọṅụ nke ememe ndị dị otú ahụ na obi ụtọ ha na-eweta bụ ihe zuru ezu maka iji na-eme ha. Otú ọ dị, anyị pụrụ ịmụta ihe site n’oge mgbe ụmụ Israel nakweere otu ihe omume okpukpe nke ndị Ijipt wee gụgharịa ya ‘ememe a ga-emere Jehova.’ Ha “wee nọdụ ala iri ihe na ịṅụ ihe” ma “bilie igwu egwu.” Ma ihe ha mere were Jehova Chineke iwe nke ukwuu, o nyekwara ha oké ntaramahụhụ.—Ọpụpụ 32:1-10, 25-28, 35.
Okwu Chineke doro nnọọ anya. “Ìhè” nke ezi nkwenkwe na “ọchịchịrị” nke ụwa Setan apụghị inwekọ ihe; Kraịst na ofufe ndị ọgọ mmụọ apụghị inwe “nnwekọ otu olu.” A na-agwa anyị, sị: “N’ihi nke a sinụ n’etiti ha pụta, guzokwanụ iche, ka Onyenwe anyị kwuru, unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka; Mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu.”—2 Ndị Kọrint 6:14-18.
Ebe ọ bụ na nanị Ememe Ncheta—ọ bụghị Ista—ka e nyere ndị Kraịst iwu na Bible ime, e kwesịrị ime ya. Ya mere olee otú anyị pụrụ isi mee ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị?
[Foto dị na peeji nke 5]
‘Ememe a na-emere Jehova’ nke ụmụ Israel mere were Chineke iwe nke ukwuu
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]
Ihu akwụkwọ: M. Thonig/H. Armstrong Roberts