Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Ikpe Na-ezighị Ezi?
“Ọ bụ nanị ndị nwere ego ka a na-akwanyere ùgwù, ma a na-emeso anyị onwe anyị bụ́ ndị na-enweghịdị ihe ọ bụla iri ma ọ bụ ebe ọ bụla ihi ụra ihe dị ka ụmụ anụmanụ. Ọ bụrụ na m na-atụ anya ihe ọ bụla ga-eme n’ọdịnihu, ọ bụ ịnwụ n’enweghị onye ga-ama na m nwụrụ.”—Arnulfo, otu nwata nwoke dị afọ 15 na-enweghị ebe obibi.
E NWERE ikpe na-ezighị ezi dị ukwuu n’ụwa. Otu akụkọ sitere n’aka Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNICEF) kwuru, sị: “N’afọ iri gara aga, e gbuwo ihe karịrị nde ụmụntakịrị 2 n’oge agha, ebe ihe karịrị nde 4 ka nọ ndụ n’agbanyeghị na e gbupụrụ akụkụ ahụ ha, ihe karịkwara 1 nde aghọwo ụmụ mgbei ma ọ bụ e kewapụwo ha iche n’ebe n’ezinụlọ ha nọ n’ihi agha.” Agụụ na ịda ogbenye, bụ́ nke na-etikwa ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa ihe otiti, na akụ̀ na ụba na inweju ihe onwunwe na-agakarị ụkwụ na ụkwụ. N’ala ndị na-emepe emepe, a dịghị enye ọtụtụ ndị na-eto eto dị ka Arnulfo ohere ịgụ akwụkwọ.
Ikpe na-ezighị ezi na-akasị egbu mgbu mgbe ọ bụ ndị kwesịrị igosi gị ịhụnanya ma chebe gị mere ya. Tụlee banyere otu nwata nwanyị dị afọ 17 aha ya bụ Susana. Nne ya gbahapụrụ ya na ụmụnne ya ndị nwoke abụọ ọ tọrọ. “Ọtụtụ afọ agafewo,” ka Susana na-ekwu n’obi ilu, “nne m agwabeghịkwa m ka mụ na ya biri, n’agbanyeghị na anyị bi n’otu obodo. Ọ sịtụbeghịdị m, ‘ahụrụ m gị n’anya,’ nke a bụkwa ihe meworo ka m na-ewe iwe mgbe nile, ọ ka na-ewekwa m iwe.” Ọ bụrụ na e mesoo gị omume ọjọọ dị otú ahụ, ọ pụrụ isiri gị ike ịchịkwa iwe gị. Otu onye e metọrọ mgbe ọ bụ nwata kwuru, sị: “O mewo ọbụna ka m na-ewesara Chineke iwe.”
Ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị inwe mwute ma na-ewe iwe mgbe e mesoro gị mmeso ọjọọ. Bible na-ekwu, sị: “Mmegbu na-eme ka onye maara ihe ghọọ onye nzuzu.” (Eklisiastis 7:7) Inweta ikpe na-ezighị ezi kwa ụbọchị ná ndụ gị pụkwara ime ka ị daa mbà n’obi. (Tụlee Abụ Ọma 43:2.) Ya mere ngwụsị nke ikpe na-ezighị ezi pụrụ ịgụsi gị agụụ ike. Otu nwata nwanyị si Etiti Kọntinent America na-echeta, sị: “Mgbe m dị afọ 13, esonyeere m òtù ụmụ akwụkwọ. Enwere m ọchịchọ siri ike iso mee ka ihe gbanwee, ka agụụ ghara ịgụ ụmụntakịrị. . . . Emesịrị m sonye n’ọgụ e ji ngwá agha lụọ.” Otú ọ dị, kama inweta ikpe ziri ezi, ndị soja ibe ya metọrọ ya mmetọ dị egwu.
Ọnọdụ ndị dị otú ahụ na-echetara anyị na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ enweghị ikike imeziwanye ọnọdụ ha. Oleezi otú ndị ikpe na-ezighị ezi metụtara pụrụ isi nagide ya?a Olee otú ị pụrụ isi mee ihe banyere obi ilu na ọnụma ndị ị pụrụ inwe?
Iwepụ Obi Ilu na Iwe
Site n’oge ruo n’oge, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i chetara onwe gị na anyị bi na “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe a. Bible buru amụma na ụmụ mmadụ taa ga-abụ “ndị na-akpa àgwà na-ezighị ezi, . . . na-enweghị ịhụnanya, na-adịghị agbaghara mmehie, na-eme nkwutọ, na-adịghị ejide onwe ha, dị obi ọjọọ, na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị aghụghọ.” (2 Timoti 3:1-4, New International Version) Ọtụtụ ndị bụ ndị “mmehie ha na-adịghị ewute ha ọzọ.” (Ndị Efesọs 4:19) Ya mere ikpe na-ezighị ezi bụ ihe dị adị ná ndụ nke a na-adịghị agbanarị agbanarị. N’ihi ya “ọ bụrụ na ị hụ na a na-emegbu ogbenye, na a na-anapụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume n’ike n’ala a na-achị achị, ibobo anwụla gị n’ihe ahụ a na-eme.”—Eklisiastis 5:8.
Bible nwere ezi ihe mere o ji dọọ aka ná ntị megide inwebiga obi ilu ókè. Dị ka ihe atụ, o na-ekwu, sị: “Ka e wepụ ihe ilu na ọnụma na iwe na iti mkpu . . . n’etiti unu.” (Ndị Efesọs 4:31) N’ihi gịnị? N’ihi na ka oge na-aga, ịnọgide na-ewe oké iwe na-emerụ ahụ ma bụrụ mmadụ ibibi onwe ya. (Tụlee Ilu 14:30; Ndị Efesọs 4:26, 27.) Nke a na-adịkarịsị otú a ma ọ bụrụ na ‘ọ bụ megide Jehova ka obi gị dị ọkụ.’ (Ilu 19:3) Iwesara Chineke iwe na-emebi kpọmkwem mmekọrịta gị na Onye ahụ pụrụ inyere gị aka karịsịa. Bible na-ekwu na ‘anya Jehova na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.’—2 Ihe E Mere 16:9.
Bible kwukwara banyere Jehova, sị: “Ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) Ọ bụ nnupụisi Adam na Iv kpatara ikpe na-ezighị ezi. (Eklisiastis 7:29) Mmadụ—ọ bụghị Chineke—‘enwewo ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.’ (Eklisiastis 8:9) Chetakwa na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan Ekwensu. (1 Jọn 5:19) Setan, ọ bụghị Jehova, na-akpata ikpe na-ezighị ezi nke ụwa.
Njedebe nke Ikpe Na-ezighị Ezi
N’ụzọ dabara nke ọma, ikpe na-ezighị ezi agaghị adịru mgbe ebighị ebi. Iburu nke ahụ n’uche pụrụ inyere gị aka ịnagide ya. Tụlee ahụmahụ nke otu nwoke aha ya bụ Esaf, bụ́ onye biri ndụ n’oge Bible. Ikpe na-ezighị ezi gbara ya gburugburu, n’agbanyeghị na o bi n’etiti ndị na-azọrọ na ha na-ejere Jehova ozi. Kama ịbụ ndị e nyere ntaramahụhụ n’ihi mmeso ọjọọ ha na-emeso ndị ọzọ, ndị obi ọjọọ yiri ka ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu na nke na-aga nke ọma! Esaf kwetara, sị: “[Ekworo] m ekworo, [mgbe] ọ bụ udo nke ndị na-emebi iwu ka m na-ahụ.” Esaf chefuru onwe ya ruo nwa mgbe site n’itinye uche ya nile n’ihe ndị dị otú ahụ.—Abụ Ọma 73:1-12.
Ka oge na-aga, Esaf bịara ghọta onwe ya n’ụzọ dị ịrịba àmà. O kwuru banyere ndị ajọ omume sị: “N’ezie ọ bụ n’ebe nile na-alọ alọ ka I [Chineke] na-edo ha: I mewo ka ha daruo ntikpọ.” (Abụ Ọma 73:16-19) Ee, Esaf bịara ghọta na ka oge na-aga, ụmụ mmadụ adịghị alanarị ntaramahụhụ maka omume ọjọọ ha n’ezie. Ọtụtụ mgbe, mmehie ha na-ekpughe ha, a tụọkwa ha mkpọrọ, ego ha agwụ, a chụọ ha n’ọrụ, ma ọ bụ a napụ ha ọkwá ọchịchị. Ya dịkarịa nnọọ anya, ndị ajọ omume ‘ga-adaru ntikpọ’ mgbe Chineke ga-eme ihe o kpere n’ikpe megide ajọ usoro ihe a.—Abụ Ọma 10:15, 17, 18; 37:9-11.
Ịmata na Chineke ga-edozi ihe n’ọdịnihu dị nso pụrụ inyere gị aka ịchịkwa iwe na nkụda mmụọ gị. “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ,” ka Bible na-adụ n’ọdụ. “Burunụ ụzọ na-eche ihe ọma n’ihu mmadụ nile. A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọlara onwe unu ọ́bọ̀, kama chaaranụ iwe ahụ ụzọ: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Mụ nwe ọ́bọ̀; Mụ onwe m ga-enyeghachi, ka Onyenwe anyị kwuru.”—Ndị Rom 12:17-19; tụlee 1 Pita 2:23.
Inweta Enyemaka na Nkwado
Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na ị na-enwe oké ihe mgbu nke uche, dị ka ihe ndị na-egbu mgbu n’obi ị na-echeta. Dị ka otu akụkọ sitere n’aka òtù UNICEF si kwuo, “ụmụaka ndị nọgideworo na-ahụ ime ihe ike ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile na-enwe mgbanwe dị ukwuu n’ihe ha kweere na n’àgwà ha, gụnyere atụkwasịkwaghị ndị mmadụ n’ozuzu ha obi. Nke a bụ eziokwu karịsịa banyere ụmụaka ndị ndị ha werebuuru dị ka ndị agbata obi ma ọ bụ ndị enyi ha wakporo ma ọ bụ metọọ.”
E nweghị ngwọta dị mfe maka nsogbu ndị dị otú ahụ. Ma ọ bụrụ na echiche na-ezighị ezi ma ọ bụ ihe na-egbu mgbu n’obi ị na-echeta na-adọkọrọ echiche gị, ma eleghị anya enyemaka dị gị mkpa. (Tụlee Abụ Ọma 119:133.) Nke mbụ, ị pụrụ ịgụ akwụkwọ na-ekwu kpọmkwem banyere nsogbu ndị i nweworo. Dị ka ihe atụ, magazin Teta! ebipụtawo ọtụtụ isiokwu na-enye ndị e dinara n’ike, ndị e zuru ohi, na ụmụaka ndị e metọrọ emetọ ndụmọdụ ndị dị irè. Ịkọrọ onye tozuru okè, bụ́ onye na-eji ọmịiko aṅa ntị nchegbu gị na mmetụta ị na-enwe pụrụ inyere gị aka nke ukwuu. (Ilu 12:25) Ikekwe ị pụrụ ịkọrọ ya ndị mụrụ gị.
Ma gịnị ma ọ bụrụ na i nweghị nkwado nne na nna? Chọọ nkwado n’ọgbakọ ndị Kraịst. N’etiti Ndịàmà Jehova, ndị okenye ọgbakọ bụ ebe mgbaba nye ndị na-ata ahụhụ. (Aịsaịa 32:1, 2) Ọ bụghị nanị na ha ga-aṅa gị ntị kamakwa ha pụrụ inwe ndụmọdụ ndị dị irè inye gị. Echefukwala na ndị Kraịst ndị ọzọ tozuru okè pụrụ ịbụrụ gị “ụmụnne ndị ikom, na ụmụnne ndị inyom na nne.” (Mak 10:29, 30) Ì chetara Susana, bụ́ onye nne ya gbahapụrụ? Ọgbakọ ndị Kraịst nyere ya na ụmụnne ya nkwado. Otu onye Kraịst na-eje ozi nwere mmasị dị ukwuu n’ezinụlọ Susana nke na Susana na-akpọ ya nna nkuchi ya. Ụdị nkwado dị otú ahụ, ka Susana na-ekwu, “enyeworo anyị aka itozu okè ma guzoro kwem n’eziokwu.”
Ndị ọkachamara na-ekwu na ịnọgide na-enwe usoro ihe ndị bara uru a na-eme mgbe dum pụkwara inye aka. Nanị ije ụlọ akwụkwọ na ịrụ ọrụ ụlọ gị pụrụ ime ihe dị ukwuu n’iwepụ uche gị n’echiche na-ezighị ezi. Otú ọ dị, ị ga-erite uru karịsịa site ịgbaso usoro ihe ime mmụọ a na-eme mgbe dum—ije nzukọ ndị Kraịst na ikwusa ozi ọma.—Tụlee Ndị Filipaị 3:16.
Ikpe na-ezighị ezi agaghị akwụsị n’ụwa ruo mgbe Alaeze Chineke ga-abịa ma mezuo uche Chineke n’ụwa nile. (Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10) Ka ọ dịgodị, mee ihe ị pụrụ ime iji nagide ya. Jiri nkwa ahụ bụ́ na dị ka Onye Ọchịchị nke Alaeze Chineke, Jisọs Kraịst “ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta,” kwagide onwe gị.—Abụ Ọma 72:12, 13.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụ ezie na isiokwu a lekwasịrị anya n’ikpe na-ezighị ezi nke ndị ntorobịa pụrụ inweta n’ala ndị dara ogbenye, ụkpụrụ ndị a tụlere n’ebe a metụtara ụdị ọ bụla nke ikpe na-ezighị ezi mmadụ pụrụ inweta.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]
“O mewo ọbụna ka m na-ewesara Chineke iwe”
[Foto dị na peeji nke 28]
Nkwado nke ndị Kraịst ibe gị pụrụ inyere gị aka ịnagide ikpe na-ezighị ezi