Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 11/8 p. 25-27
  • Mgbe Mmiri Na-ekweghị Izo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Mmiri Na-ekweghị Izo
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndịàmà Ibe Ha Meghachiri Omume n’Ụzọ Ịhụnanya
  • Obi Ụtọ nke Dị n’Inye Ihe na n’Inweta Enyemaka
  • Ihe Ngwọta Na-adịgide Adịgide
  • Ịgbatara Ndị Ọdachi Dakwasịrị Ọsọ Enyemaka
    Ihe Ndị E Ji Onyinye I Nyere Eme
  • Jehova Na-enye Ntọhapụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ụkọ Nri Dị Taa?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Gbasoo Ihe Nlereanya Jizọs Ma Gosi Nchegbu Maka Ndị Ogbenye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 11/8 p. 25-27

Mgbe Mmiri Na-ekweghị Izo

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA BRAZIL

N’AFỌ gara aga, oké ụkọ mmiri ozuzo kpara akụkụ buru ibu nke ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Brazil aka ọjọọ. Dị ka magazin bụ́ Veja si kwuo, ọtụtụ narị puku ndị nordestino, dị ka a na-akpọ ndị bi n’akụkụ ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke mba ahụ, hụrụ onwe ha dị ka ndị “ụkọ mmiri ozuzo ahụ ga-emekpa ahụ.” Ụkọ mmiri ozuzo ahụ bibiri osikapa, àgwà, na ọka, wee kpata ụnwụ nri zuru ebe nile—nke kasị njọ kemgbe afọ 15 gara aga. N’ebe ụfọdụ, ọbụna mmiri ọṅụṅụ kọrọ ụkọ.

Ndị Brazil na-enwebu ụkọ mmiri ozuzo. Na 1877, n’oge mba ahụ nwere ụkọ mmiri ozuzu kasị njọ, ihe dị ka mmadụ 500,000 n’ime ha nwụrụ n’agụụ. N’oge ahụ eze ukwu ndị Brazil, bụ́ Dom Pedro nke Abụọ, ṅụrụ iyi na ya ga-achọta ihe ngwọta nke nsogbu ụkọ mmiri ahụ ọbụna ma ọ bụrụ na ya aghaghị ire ọla nile dị n’okpueze ya iji mee ya! Nke ahụ mere ihe karịrị 100 afọ gara aga; ma, taa, nsogbu ahụ ka dị. N’oge ụkọ mmiri nke afọ gara aga, e mere atụmatụ na ọ ga-emetụta ihe ruru nde mmadụ iri bi n’obodo 1,209 dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Brazil.

Ndịàmà Ibe Ha Meghachiri Omume n’Ụzọ Ịhụnanya

Mgbe akụkọ banyere ụkọ mmiri ozuzo ahụ ruru alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Brazil, e mere ihe ozugbo. E zigara ndị nnọchiteanya na-ejegharị ejegharị n’ebe ndị o metụtara nke ukwuu na steeti Bahia, Ceará, Paraíba, Pernambuco, na Piauí iji chọpụta otú nsogbu ahụ hà. Ndị nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị chọpụtara na Ndịàmà 900 na ndị a na-amụrụ Bible bi n’ebe ndị ahụ nọ n’oké mkpa. Ụfọdụ n’ime ha na-eri ji iji dịrị ndụ; ndị ọzọ nwere nanị osikapa iri. Otu ezinụlọ enweghị ihe oriri iri, ha nwekwara nanị mmiri ara ehi iji mere nri ụtụtụ, nri ehihie, na nke abalị. Otu nwanna nwanyị onye Kraịst na-arịa ọrịa cancer aghaghị ire àkwà ya iji zụrụ obere ihe oriri. Otu ezinụlọ dị mmadụ isii eriwo ihe ha chere na ọ bụ nri ikpeazụ ha mgbe enyemaka ụmụnna ha ndị Kraịst rutere ha.

E guzobere kọmitii enyemaka ozugbo ahụ ikesa ihe oriri na ihe ndị e wetara. Ndịàmà si Recife na ndị si n’obodo ndị ọzọ dị nso nyere ndị ahụ nọ ná mkpa ọtụtụ ihe. Ma mgbe a chọkwuru enyemaka, ndị Kraịst si Rio de Janeiro sonyekwara iji nyere ụmụnna ha aka. N’obere oge, Ndịàmà ahụ nyere tọn ihe oriri 34 ma kwụọ ụgwọ iburu ihe enyemaka gaa mita 2,300 ruo Recife.

N’isi obodo steeti Piauí na Paraíba, a natara tọn ihe oriri isii n’egbughị oge. E wepụtara otu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’obodo Fortaleza maka idebe ihe oriri ndị e nyere ruo nwa oge. Ma e nwere otu nsogbu. Olee otú Ndịàmà ahụ pụrụ isi buga ihe oriri ndị ahụ n’ebe ha na-aga? Otu nwoke na-abụghị otu n’ime Ndịàmà Jehova jiri obiọma wepụta gwongworo ya ka e jiri ya buga ha. Otú ọ dị, a na-akwụsị ụgbọala ndị bu ihe oriri na ihe enyemaka n’ụzọ ma na-ezu ihe ndị ha bu. Ihe ndị ahụ e nyere hà ga-eru ebe ha na-aga? Ndịàmà ahụ kpebisiri ike ịchọpụta. N’ịbụ ndị nwere okwukwe siri ike na Jehova, ha kwọọrọ gwongworo ahụ bujuru ihe oriri banye n’ebe ahụ. Ihe enyemaka ndị ahụ rutere n’udo, e jikwara obi ekele nara ha.

Obi Ụtọ nke Dị n’Inye Ihe na n’Inweta Enyemaka

Ndịàmà ahụ haziri ihe enyemaka nwere obi ụtọ n’ịbụ ndị e nyere ohere inyere ụmụnna ha aka. Otu okenye ọgbakọ bi na São Paulo kwuru, sị: “Oge gara aga, e nwere ụnwụ nri, a gwaghị anyị ka anyị tụọ ihe. Lee obi ekele anyị nwere na a gwara anyị n’oge a!” Ndịàmà bi na Fortaleza dere, sị: “Obi dị anyị ụtọ nke ukwuu n’ịbụ ndị nwere ike inyere ụmụnna anyị aka, karịsịa n’ihi na anyị ji n’aka na anyị emewo ka obi Jehova ṅụrịa. Anyị echezọtụbeghị ihe e dere na Jemes 2:15, 16.” Amaokwu ndị ahụ nke Bible na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị gba ọtọ, n’enweghịkwa ihe oriri ga-ezuru ya kwa ụbọchị, ma otu onye n’etiti unu sị ha, Labanụ n’udo, nyaanụ ọkụ, rijuokwanụ afọ; ma unu enyeghị ha ihe na-akpa ahụ ha; uru gịnị ka ọ bara?”

Mgbe ụfọdụ Ndịàmà ahụ nyere ihe enyemaka na-amapawa ozi na-agba ume ná ngwugwu ihe oriri ndị ahụ. Otu ozi kwuru, sị: “Burunụ nkwa ahụ dị n’Abụ Ọma 72:16 n’uche, nke bụ́ na n’oge na-adịghị anya, n’ụwa ọhụrụ nke Chineke, ihe oriri ga-eju eju.” Ọ dịghị mkpa ikwuwe ya, Ndịàmà ahụ ụnwụ nri tiri ihe otiti nwere nnọọ obi ekele maka obiọma nke ụmụnna ha. Otu Onyeàmà nke ezinụlọ ya nwetara enyemaka dị ha oké mkpa jiri obi ekele dee, sị: “Mụ na ezinụlọ m lere omume a anya dị ka ngosipụta a na-ahụ anya nke ịhụnanya nke Chineke na Nna anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, na nke nchegbu ịhụnanya nke nzukọ ya nwere maka anyị, bụ́ ndị nọ na ya. Nke a emewo ka anyị nwee mmetụta nke ịnọ ya na ndị ya nso karị.”

Ihe Ngwọta Na-adịgide Adịgide

N’ụzọ megidere onwe ya, ụkọ mmiri adịghị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Brazil; e nwere osimiri nke mmiri dị ọcha n’ime ala, nakwa mmiri buru ibu n’ihe ndị e ji echekwa mmiri. A sị nnọọ na o kwere omume ime ka mmadụ nile nweta mmiri site n’ebe ndị a, ala ahụ gaara emepụta ihe.

Otu ụbọchị, a ga-agwọta nsogbu ahụ mekpara Eze Ukwu Dom Pedro nke Abụọ ahụ kpam kpam. Ụbọchị ahụ ga-abụ mgbe Alaeze Chineke, site n’aka Jisọs Kraịst, ga-agwọta nsogbu nile nke ụwa, gụnyere ụnwụ nri. Mgbe ahụ amụma Aịsaịa ga-emezu n’ala ahụ e nwere ụkọ mmiri ozuzo: “N’ọzara ka mmiri na-agbawapụta, mmiri iyi kwa n’ala ihe na-adịghị. Mirage ga-aghọkwa ọdọ mmiri, ala mmiri na-adịghị ga-aghọkwa isi iyi jupụtara na mmiri.”—Aịsaịa 35:1, 2, 6, 7.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 27]

“Na-arụ Ezi Ihe n’Ebe Mmadụ Nile Nọ”

Pọl onyeozi dụrụ ndị kwere ekwe ibe ya ọdụ, sị: “Ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka anyị na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.” (Ndị Galetia 6:10) Ụkọ mmiri ozuzo ahụ e nwere na Brazil n’oge na-adịbeghị anya nyere Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ ohere itinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ n’ụzọ a na-ahụ anya. Ha gosiri nchegbu ịhụnanya ọ bụghị nanị maka ndị kwere ekwe ibe ha kamakwa maka ndị ọzọ. N’ihi ya, ụfọdụ ndị na-emegidebu ọrụ Ndịàmà Jehova amalitewo ịtụleghachi echiche ha nwere banyere ha.

Otu nwoke were nnọọ iwe na mbụ mgbe nwunye ya kpebiri isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Ka oge na-aga, nwunye ya malitere isoro ndị ọzọ na-ekerịta nkwenkwe ya o nwetara ọhụrụ. N’oge mgbe ụnwụ nri ahụ nọ n’uju ya Ndịàmà nọ n’ebe ahụ wetere ihe oriri n’ebe obibi nke di na nwunye ahụ, ọ masịrị nwoke ahụ nke ukwuu nke na o kpebiri ime ihe ọ ṅụburu iyi na ọ dịghị ihe ga-eme ya emee ya—ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè ha. Ọ bụ ezie na ọ ka nwetụrụ obi abụọ n’ihe banyere Bible ịbụ nke e dere n’ike mmụọ nsọ, nwoke a bụbu onye mmegide nakweere ọmụmụ Bible ebe obibi.

N’ógbè ọzọ, Ndịàmà nọ n’ebe ahụ kọrọ, sị: “Ọ tụrụ anyị n’anya na ihe enyemaka ndị ahụ rutere nnọọ ngwa ngwa. Ihe oriri e nyere karịrị ihe anyị tụrụ anya ya. Ya mere mgbe anyị gbosịrị mkpa ụmụnna anyị na ezinụlọ ha, anyị kenyere ndị a na-amụrụ Bible, ndị ikwu ha, nakwa ndị agbata obi Ndịàmà Jehova, ihe oriri.”

Ndịàmà bi n’otu obodo nta nyere ụfọdụ n’ime ndị agbata obi ha ngwugwu ihe oriri. Otu onye nwe ụlọ nke nwere obi ekele kwuru, sị: “Unu na-eme ihe Kraịst kụziri; unu na-enye ihe n’atụghị anya ka a kwụọ ihe ọ bụla.”

[Foto dị na peeji nke 26]

Ihe ụkọ mmiri ozuzo ahụ kpatara

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]

Foto UN/DPI nke Evan Schneider sere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya