Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 11/8 p. 28-29
  • Ikiri Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikiri Ụwa
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọpịpịa Popu
  • Ọrịa Na-enweghị Mgbaàmà
  • Ndị Njem Ụgbọelu Na-akpaghasị Ihe
  • Ego Olili nke Na-arị Elu
  • Ihe Ochie Ndị Nọ n’Ihe Ize Ndụ
  • Ọ̀ Bụ Dibịa Ezé Ọgwụgwọ Ya Na-adịghị Egbu Mgbu?
  • Ihe Mkpofu Nuklia
  • Imegharị Ahụ n’Okwu Iji Cheta Okwu Kwesịrị Ekwesị
  • Ndị Na-anwụ n’Ihi Ọrụ
  • Ntiwapụ nke Ọrịa Cancer Ọnụ
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ịkpọ Ozu Ọkụ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ọ̀ Dị Njọ Ịkpọ Ozu Ọkụ?
    Teta!—2009
  • Ikiri Ụwa
    Teta!—1996
Teta!—1999
g99 11/8 p. 28-29

Ikiri Ụwa

Ọpịpịa Popu

N’ime ememe narị afọ iri, Popu John Paul nke Abụọ akpọsawo afọ 2000 ịbụ Afọ Dị Nsọ, o kwuwokwa na ya ga-enye ndị bịara Rom ọpịpịa, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ L’Osservatore Romano na-akọ. Ọpịpịa bụ ụzọ e si eme ka ndị Katọlik ghara ịnata ntaramahụhụ maka mmehie. Akwụkwọ akụkọ Vatican na-ekwu, sị: “Ọrụ ọma ọ bụla a rụrụ mgbe e nwere ihu ọma Chineke kwesịrị inweta ụgwọ ọrụ.” Otú ọ dị, otu akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu na omume ahụ na-akpalitekwa ajụjụ ụfọdụ na-akpali mmasị, ndị dị ka, “Ọ bụrụ na mmadụ nile nwere ihu ọma Chineke nke na-eweta mgbaghara mmehie, olee mkpa ọ dị Chọọchị inye ọpịpịa?” nakwa, “Ọ bụrụ na Chọọchị pụrụ inye ọpịpịa uru ya na-adịghị agwụ agwụ, n’ihi gịnị ka o ji enye onwe ya nsogbu inye ọpịpịa na-aba uru ruo nwa oge?”

Ọrịa Na-enweghị Mgbaàmà

Osteoporosis bụ ọrịa na-enweghị mgbaàmà nke “na-eyi ihe karịrị nde ndị America 28 na ihe dị ka nde ndị Canada 1.4 egwu,” ka akwụkwọ akụkọ Toronto Star na-ekwu. Ọ na-ejide ndị ikom na ndị inyom, nwata na okenye, ọ “na-ewerekwa ọnọdụ mgbe mkpụrụ ndụ ndị merela ochie bụ́ ndị dị n’ọkpụkpụ na-anwụ ngwa ngwa karịa ka ndị ọhụrụ ga-enwe ike ịnọchị anya ha si apụta.” Ndị bu ọrịa ahụ nwere ike ha agaghị ahụ ihe àmà ya ruo mgbe ha gbajiri ọkpụkpụ. Ndị ọkachamara kweere na oké ịkpara nri ókè nke ọnụ ọgụgụ na-aba ụba nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na ụmụ akwụkwọ mahadum na-eme egwuregwu “na-emebi otu ọkpụkpụ ahụ ha kwesịrị ịdị na-azụlite maka oge ha ga-eme okenye. Ndị na-eto eto na-akpara nri ókè na-ajụkarị iri nri ndị dị mkpa iji wusie ọkpụkpụ ha ike.” Dị ka akụkọ ahụ si kwuo, “a na-enweta ihe dị ka pasent 90 nke ịdị arọ nke ọkpụkpụ mgbe a na-erule afọ 18; ndị toworo eto na-enweta ọ̀tụ̀tụ̀ ha kasị elu mgbe ha na-erule afọ 30.” Akụkọ ahụ na-atụ aro na iji mee ka ọkpụkpụ nweta ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ ya kasị elu, onye ọ bụla kwesịrị ‘inweta calcium na vitamin D zuru ezu, na-emega ahụ mgbe nile, na-ezerekwa ise siga na ịṅụ oké mmanya.’

Ndị Njem Ụgbọelu Na-akpaghasị Ihe

“Ọnụma n’ime ụgbọelu”—àgwà na-enweghị nchịkwa nke ndị a na-ebu n’ụgbọelu—“ejiriwo pasent 400 mụbaa n’ime afọ ise gara aga,” ka magazin bụ́ Business Traveler International na-ekwu. Gịnị kpatara oké mmụba ahụ? Nrụgide bụ ihe bụ́ isi na-akpata ya. Njem ụgbọelu a na-ebidoghị n’oge ma ọ bụ nke a kagburu akagbu, ịfa afa, na ịtụ ụjọ iji ụgbọelu eme njem na-akpatacha nchegbu, bụ́ nke, n’aka nke ya, pụrụ ịkpata ntiwapụ nke ọnụma. “Ndị ọrụ ụgbọelu na-akwalite iji ụgbọelu eme njem dị ka nke na-adịghị egbu oge na nke na-aga were were, ọ bụghịkwa otú ahụ ka ọ dị,” ka Stuart Howard, nke Òtù Ndị Ọrụ Ụgbọ Njem nke Mba Nile na-ekwu. Onye nnọchiteanya nke otu nnukwu ụlọ ọrụ ụgbọelu kwenyere na mmalite a malitere njem ụgbọelu a machibidoro ise siga na ha bụ ihe ọzọ kpatara ọnụma ụgbọelu. Dị ka akụkọ ahụ si kwuo, “ọ bụ ndị na-ese siga iwe ji kpatara ihe karịrị ọkara [nke] mkpaghasị ndị njem kpaghasịrị ihe” n’otu ụlọ ọrụ ụgbọelu na 1997. Ihe ọzọ na-akpata ya bụ ịṅụ mmanya na-aba n’anya, bụ́ nke mmetụta ya pụrụ ịdị ukwuu n’ebe dị elu. Gịnị ka akụkọ ahụ na-atụ aro ka i mee ma ọ bụrụ na onye njem ibe gị na-eme mkpọtụ? “Akpọla ndị na-arụ ọrụ n’ime ụgbọelu. Kama nke ahụ, bilie n’oche gị ma jiri akọ mee ka ha mara banyere nsogbu ahụ.” Ọ na-atụkwa aro, sị: “Chebe onwe gị pụọ ná mkpasu iwe pụrụ ịdapụta site n’iwere akwụkwọ dị mfe ọgụgụ ma ọ bụ ige egwu dị ụtọ” nke obere ngwá egwú stereo na-akpọ.

Ego Olili nke Na-arị Elu

Ọnụ ọgụgụ mmadụ na-ebuwanye ibu anọwo na-echigharịkwuru isu ozu ọkụ iji belata ego olili ozu. Dị ka Òtù Ndị Na-eduzi Olili Ozu nke Mba si kwuo, nkezi ego ili ozu n’ụzọ ọdịnala were $4,600 na United States na 1996. N’ụzọ dị iche, “isu ozu ọkụ were n’agbata $500 na $2,000,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Chicago Sun-Times na-ekwu, “na-adabere n’ụdị igbe a họọrọ iji suo ozu ahụ ọkụ na ite a ga-etinye ntụ́ ya.” Ọzọkwa, isu ozu ọkụ adịghị achọ ala ili ozu na nkume ili, bụ́ ndị pụrụ ime ka ego ili ozu n’ụzọ ọdịnala jiri pasent 40 rịkwuo elu. Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na na United States na 1997, e suru pasent 23.6 nke ndị nile nwụrụnụ ọkụ, a na-atụkwa anya na ọnụ ọgụgụ ahụ ga-eru pasent 42 n’ime afọ iri na-abịanụ.

Ihe Ochie Ndị Nọ n’Ihe Ize Ndụ

Izu ohi, imebisi ihe, na ndị na-eme njem nleta na-anụbiga ọkụ n’obi ókè na-eyi ebe ndị a kwakọrọ ihe ochie egwu, ka magazin bụ́ New Scientist na-akọ. “Ọ ga-amasị ụfọdụ ndị ọkà mmụta banyere ala ibuga ihe ochie ndị kasị dị oké ọnụ ahịa n’ebe ngosi ihe mgbe ochie ma ọ bụ machibido ndị nleta ịga n’ebe ndị ahụ,” ka magazin ahụ na-ekwu. Otú ọ dị, ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ ihe ruuru ọha na eze ịhụ ihe ochie ndị a n’ebe ndị ahụ e gwupụtara ha. Ná mgbalị idozi nsogbu ahụ, Òtù Na-ahụ Maka Ebe Ndị E Gwupụtara Ihe Mgbe Ochie nke Mba Nile amalitewo idepụta ebe ndị a na-eyi egwu n’ụwa nile. Ma ka ọ dị ugbu a, ọ bụ nanị ihe dị ka ebe 50 ka e depụtaworo.

Ọ̀ Bụ Dibịa Ezé Ọgwụgwọ Ya Na-adịghị Egbu Mgbu?

Ọ ga-amasị ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa ezé ịhụ ka ngwá ndị dibịa ezé ji efo ezé kemgbe ụwa ghọrọ ihe gara aga. Dị ka magazin bụ́ FDA Consumer si kwuo, n’oge na-adịghị anya ọ pụrụ ịdị otú ahụ ruo n’ókè ụfọdụ. Na nso nso a Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Oriri na Ọgwụ nke United States kwadoro iji ngwá ọla erbium: ụzarị ọkụ YAG awa ezé. Kama iji obere ngwá e ji efo ezé wepụ ezé rere ere, ndị dibịa ezé nweziri ike iji ngwá ụzarị ọkụ wepụ ya, na-agbari nnọọ uru ahụ rere ere nke dị n’ezé, ka magazin ahụ na-ekwu. Ngwá ụzarị ọkụ ahụ nwere ọtụtụ ihe o ji baa uru karịa ngwá ndị e ji efo ezé kemgbe ụwa. Otu ihe bụ na iji ngwá ụzarị ọkụ agwọ ọrịa adịghị egbucha mgbu. N’ihi ya, ọ gakwaghị adị mkpa ịgba ọtụtụ ndị ọrịa ọgwụ nkụnwụ ahụ. Nke abụọ, ebe ọ bụ na dibịa ezé agaghị echere ka ọnụ gị kụnwụọ, ọ pụrụ ịmalite ọgwụgwọ ozugbo. Ọzọkwa, a dịkwaghị enwe ajọ ụda nke ngwá e ji efo ezé nke na-eji oké ọsọ agba gburugburu. Otú ọ dị, otu ihe ndọghachi azụ dị na ya bụ na a pụghị iji ngwá ụzarị ọkụ ahụ rụọ ọrụ n’ezé ndị e jirila ihe nyachie oghere dị na ha.

Ihe Mkpofu Nuklia

Kemgbe afọ ndị 1960, ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ngwá agha nuklia n’ụwa ekpofuwo ihe karịrị metric tọn 200,000 nke ihe mkpofu nuklia, ka magazin bụ́ New Scientist na-akọ. Kwa afọ a na-ekpokwasịkwa tọn 10,000 ọzọ n’ikpo ahụ. Olee ebe ihe mkpofu a na-egbu egbu na-aga? “A na-edebe nnọọ ihe ka ukwuu n’ime ha n’ebe ndị e nwere ihe ndị na-achịkwa ikike nuklia,” ka magazin ahụ na-ekwu. Otú ọ dị, e mere ebe ndị a otú ha ga-enwe ike ịnagide ihe mkpofu na-ewepụta ụzarị na-egbu egbu ruo nanị iri afọ ole na ole. Ya mere ka oge na-aga, ọ ga-adị mkpa ikpofu ihe mkpofu nuklia ahụ n’ebe mkpofu ihe ndị na-adịte aka. Ma ihe bụ nsogbu bụ na ọ dịghị mba nweworo ike iwu ebe ndebe ihe dị n’okpuru ala nke na-adịghị ize ndụ maka iberibe ihe ndị na-ewepụta ụzarị na-egbu egbu o nwere. N’ihi ya, “ọnyà ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ngwá agha nuklia siri amawo ha,” ka New Scientist na-ekwu.

Imegharị Ahụ n’Okwu Iji Cheta Okwu Kwesịrị Ekwesị

“Nnyocha ọhụrụ e mere na-egosi na mmegharị ahụ n’okwu na-enyere ndị na-ekwu okwu aka mgbe nile icheta okwu,” ka magazin bụ́ Newsweek na-akọ. Ọ bụ ezie na a na-ejikarị mmegharị ahụ nke na-akọwa ihe egosipụta otú ihe hà ma ọ bụ otú ọ dị, mmegharị ahụ ndị ọzọ, dị ka “imegharị aka nkịtị mgbe a na-ekwu okwu,” na-arụ ihe ọzọ. Robert Krauss, bụ́ prọfesọ nke nkà akparamàgwà mmadụ na Mahadum Columbia, na-ekwu na ụdị mmegharị ahụ n’okwu ndị a “na-enyere ndị mmadụ aka icheta okwu ndị na-esi ike ncheta” site n’ịgbape ihe ọ kpọrọ “ikike ncheta okwu.” Ndị nnyocha ji ikike ncheta dị otú ahụ tụnyere mgbanwe na-ewere ọnọdụ mgbe otu ísìsì, ụtọ, ma ọ bụ ụda mere ka e cheta ihe. Dị ka ihe atụ, dị nnọọ ka ísìsì nke otu ihe na-esi ísì ụtọ pụrụ ime ka i cheta nne gị ochie, imegharị ahụ n’okwu pụkwara imeghe “ọnụ ụzọ” e si abanye n’okwu, dị ka ọkà mmụta akwara ozi ụbụrụ bụ́ Brian Butterworth si kwuo.

Ndị Na-anwụ n’Ihi Ọrụ

Gburugburu ụwa, mmadụ 3,000 na-anwụ kwa afọ n’ihi ihe mberede ndị metụtara ọrụ, ka akwụkwọ akụkọ France a na-ebipụta kwa ụbọchị bụ́ Le Monde na-akọ. Dị ka Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ọrụ nke Mba Nile si kwuo, ihe karịrị nde ndị ọrụ 250 na-emerụ ahụ kwa afọ, na-akpata ọnwụ nke ihe karịrị otu nde mmadụ. “Ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ n’ihi ọrụ karịrị nkezi ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ kwa afọ n’ihe mberede okporo ụzọ (990,000), n’agha (502,000), n’ime ihe ike ndị ọzọ (563,000), na ndị ọrịa AIDS na-egbu (312,000),” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu.

Ntiwapụ nke Ọrịa Cancer Ọnụ

Na Delhi, India, ndị na-arịa ọrịa cancer ọnụ karịrị ndị na-arịa ya na Los Angeles, California, okpukpu anọ, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Indian Express na-akọ. Ugbu a, pasent 18.1 nke ndị nile malitere ịrịa ọrịa cancer ọhụrụ n’etiti ndị ikom nke Delhi na-arịa ọrịa cancer ọnụ—nke mụbara site na pasent 10 na 1995. Ihe ndị bụ́ isi na-akpata ọrịa cancer ọnụ bụ ịta akwụkwọ ụtaba, bidis (siga ndị India), na pan masala (ngwakọta nke ụtaba, akị osisi betel a kwọrọ akwọ, na ihe ndị ọzọ), bụ́ ndị a na-eji mkpà akwụkwọ fụkọta ma taa. Akwụkwọ akụkọ ahụ kpọrọ ịrị elu nke ụmụ akwụkwọ na-amaghị nke a na-akọ na-ata pan masala, ihe dị egwu. Otu ọkachamara dọrọ aka ná ntị na India nile na-eche “ntiwapụ nke ọrịa cancer ọnụ” ihu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya