Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 144
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ịkpọ Ozu Ọkụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ịkpọ Ozu Ọkụ?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Ihe ụfọdụ na-abụghị eziokwu banyere ịkpọ ozu ọkụ
  • Ọ̀ Dị Njọ Ịkpọ Ozu Ọkụ?
    Teta!—2009
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ịlaghachi n’Ájá n’Ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Ndị Dị na Magazin A
    Teta!—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 144
Ihe e tinyere ntụ e nwetara n’ozu a kpọrọ ọkụ nọ n’akụkụ foto onye ahụ nwụrụ anwụ

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ịkpọ Ozu Ọkụ?

Ihe Baịbụl kwuru

O nweghị ebe Baịbụl kwuru kpọmkwem banyere ịkpọ ozu ọkụ. O nweghịkwanụ ebe Baịbụl nyere iwu na a ga na-eli ozu eli ma ọ bụ kpọọ ya ọkụ.

Baịbụl kwuru gbasara ndị fere Chineke ndị liri ndị ha nwụrụ anwụ. Dị ka ihe atụ, Ebreham gbara ezigbo mbọ nweta ebe ọ ga-eli Sera, nwunye ya.​—Jenesis 23:​2-​20; 49:​29-​32.

Baịbụl kwukwara gbasara ndị fere Chineke ndị kpọrọ ozu ndị nwụrụ anwụ ọkụ. Dị ka ihe atụ, mgbe e gburu Eze Sọl nke Izrel na ụmụ ya nwoke atọ n’agha, ozu ha tọgbọ n’ebe ndị iro ha ji ha mere ihe masịrị ha. Mgbe ndị dike Izrel nụrụ banyere ya, ha gara buru ozu Sọl na ụmụ ya, kpọọ ha ọkụ ma lie ọkpụkpụ ha. (1 Samuel 31:​8-​13) Baịbụl gosiri na nke a bụ ụzọ dị mma e nwere ike isi lie ozu ụmụ nwoke ndị ahụ.​—2 Samuel 2:​4-6.

Ihe ụfọdụ na-abụghị eziokwu banyere ịkpọ ozu ọkụ

Ụgha: Ịkpọ ozu ọkụ bụ ịkparị onye ahụ nwụrụ anwụ.

Eziokwu: Baịbụl kwuru na ndị nwụrụ anwụ na-alaghachi n’ájá, nke bụ́ ihe na-emekarị ozu ma o ree. (Jenesis 3:​19) Ịkpọ ozu ọkụ na-enye aka mee ka ozu ahụ ree ngwa ngwa ma ghọọ ntụ ma ọ bụ ájá.

Ụgha: Ọ bụ naanị ndị ha na Chineke na-adịghị ná mma ka Baịbụl kwuru na a kpọrọ ozu ha ọkụ.

Eziokwu: E nwere ndị nupụụrụ Chineke isi Baịbụl kwuru na a kpọrọ ozu ha ọkụ, dị ka Ekan na ndị ezinụlọ ya. (Joshụa 7:25) Ma nke a bụ ihe mere naanị otu ugbo, emeghị ya ka ọ bụrụ iwu. (Diuterọnọmi 21:​22, 23) Dị ka anyị kwuru ná mbụ, e nwedịrị ndị rubeere Chineke isi a kpọrọ ozu ha ọkụ, dị ka Jọnatan, nwa Eze Sọl.

Ụgha: Chineke agaghị akpọlite onye a kpọrọ ozu ya ọkụ.

Eziokwu: Ihe ọ bụla e mere ozu agaghị egbochi Chineke ịkpọlite onye nwụrụ anwụ, ma e liri ya n’ala, kpọọ ya ọkụ, onye ahụ ò furu n’ime osimiri, ma ọ bụ anụ ọhịa tagburu ya. (Mkpughe 20:13) Ọ gaghị esiri Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ike inye onye ahụ ahụ́ ọhụrụ.​—1 Ndị Kọrịnt 15:​35, 38.

Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ikpebi ma Ị Ga-eli Ozu Eli ma Ọ Bụ Kpọọ Ya Ọkụ?

Mgbe ị na-ekpebi ihe a ga-eme ozu, chebara ihe ndị a echiche.

  • Gịnị ka onye ahụ nwụrụnụ chọrọ? Baịbụl kwuru na e nwere oge ndị ezinụlọ onye ahụ nwụrụnụ mere ihe onye ahụ kwuru ka e mee ozu ya tupu ya anwụọ.​—Jenesis 50:​4, 5; Ọpụpụ 13:19.

  • Gịnị ka a na-emekarị gburugburu ebe i bi? Nke a na-esokarị ekpebi ihe a ga-eme ozu. (Jọn 19:40) Dị ka ihe atụ, n’oge Baịbụl, ndị mmadụ na-elikarị ndị ha nwụrụnụ eli. (Jenesis 49:31; 1 Samuel 28:3) Otú ahụ ka ọ dịkwa taa, mmadụ nwere ike ikpebi ime ozu otú ọ bụla ndị mmadụ na-emekarị n’ebe o bi ma ọ bụrụhaala na ihe ahụ emegideghị ihe Baịbụl kwuru.

  • Gịnị ka iwu obodo kwadoro ka a na-eme? Baịbụl gwara anyị ka anyị na-erubere ndị ọchịchị isi. (Ndị Rom 13:1) N’ebe ụfọdụ, ndị ọchịchị na-eji aka ha nye iwu otú a ga-esi mee ozu. Dị ka ihe atụ, n’ihe gbasara ịkpọ ozu ọkụ, n’obodo ụfọdụ ndị ọchịchị na-agwa ndị mmadụ ebe ha nwere ike iwụfu ntụ fọdụrụnụ ma a kpọchaa ozu ọkụ.

  • Olee otú ndị ọzọ si ele ya anya? Akwụkwọ Nsọ gbara anyị ume ka anyị na-achọ ọdịmma ndị ọzọ. (Ndị Filipaị 2:4) Mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme ozu, ọ dị mma ka anyị chebara ajụjụ ndị a echiche: Olee otú ndị ezinụlọ anyị na ndị ọzọ si ele ịkpọ ozu ọkụ ma ọ bụ ili ya eli anya? Olee otú ndị mmadụ n’ebe anyị bi si ele ya anya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya