Ịlaghachi n’Ájá n’Ụzọ Dị Aṅaa?
“ÁJÁ ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.” Mgbe mmadụ mbụ bụ́ Adam, nụrụ okwu ndị ahụ, ọ maara ihe ọ ga-atụ anya ya. E sitewo n’ájá nke ala mee ya, ọ gaghị alaghachikwa ebe ọ bụla ọzọ ma ọ bụghị n’ájá. Ọ ga-anwụ n’ihi na o nupụworo Onye Okike ya, bụ́ Jehova Chineke, isi.—Jenesis 2:7, 15-17; 3:17-19.
Bible na-egosi na e si n’ájá mee ụmụ mmadụ. Ọ na-ekwukwa, sị: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4; Abụ Ọma 103:14) Ọnwụ ewetaworo ọtụtụ nde mmadụ iru újú, ugboro ugboro kwa kpalie ajụjụ banyere ili ozu mmadụ.
Ihe Ndị A Na-eme n’Oge Gara Aga na Ugbu A
Olee otú e si eli ozu mmadụ n’oge ochie n’etiti ndị Chineke? N’akụkụ mmalite ya, Bible na-ehota ụzọ dị iche iche nke isi mee ihe banyere ndị nwụrụ anwụ, gụnyere ili ha n’ime ala. (Jenesis 35:8) E liri nna ochie ahụ bụ́ Abraham na nwunye ya, bụ́ Sera, nakwa nwa ha bụ́ Aịsak na nwa nwa ha bụ́ Jekọb n’ọgba Makpila. (Jenesis 23:2, 19; 25:9; 49:30, 31; 50:13) E liri ndị ikpe Israel bụ́ Gideọn na Samson ‘n’ili nna ha.’ (Ndị Ikpe 8:32; 16:31) Nke a na-atụ aro na ndị Chineke nke oge ochie nwere mmasị karị n’inwe ebe ili ozu nke ezinụlọ. Mgbe Jisọs Kraịst nwụrụ na narị afọ mbụ O.A., a tọgbọrọ ahụ ya n’ili ọhụrụ e gwuru n’oké nkume. (Matiu 27:57-60) Mgbe ahụ, n’ozuzu ya, a na-eli ozu ụmụ mmadụ n’ime ala ma ọ bụ n’ime ili. Nke a ka bụkwa ihe a na-eme n’ebe ka ukwuu gburugburu ụwa.
Otú ọ dị, n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa taa, oké ụkọ nke ohere na oké ịda ọnụ nke ala na-eme ka ọ na-esi ike karị inweta ebe ili ozu. N’ihi ya, ụfọdụ ndị na-atụle ụzọ ndị ọzọ nke isi na-eli ozu mmadụ.
Ịghasasị ntụ mgbe e susịrị ozu mmadụ ọkụ na-aghọwanye ihe a na-emekarị. N’England e si otú a ewezụga ihe dị ka 40 pasent nke ndị nwụrụ anwụ. Na Sweden, ebe a na-esu ihe karịrị 80 pasent nke ozu ndị nwụrụ n’ógbè mepere emepe ọkụ, e wepụtara ọhịa ụfọdụ maka ịghasasị ntụ. Na Shangai kwa na n’obodo ukwu ole na ole ndị ọzọ nke China ndị bi n’ụsọ osimiri, gọọmenti obodo ukwu dị iche iche na-akwado ịghasasị ntụ n’ìgwè n’elu oké osimiri ọtụtụ ugboro n’afọ.
Olee ebe a pụrụ ịghasasị ntụ? Ọ bụghị nnọọ ebe ọ bụla. Ụfọdụ pụrụ ịtụ ụjọ na ịghasasị ntụ ahụ na-emebi gburugburu ebe obibi. Otú ọ dị, n’ezie, ntiwapụ ọ bụla nke ọrịa nke pụrụ ịdapụta bụ nke a na-emebi site n’isu ozu ọkụ. Ebe ili ozu ụfọdụ n’England na ogige ncheta ụfọdụ na United States wepụtara ubi ahịhịa ụfọdụ ma ọ bụ ubi okooko osisi dị ka ebe ịghasasị ntụ. N’ezie, ndị Kraịst na-echegbu onwe ha karịsịa banyere echiche Akwụkwọ Nsọ metụtara isu ozu ọkụ na ịghasasị ntụ.
Gịnị Bụ Echiche Akwụkwọ Nsọ?
N’otu nkwupụta okwu megide “eze Babilọn,” Aịsaịa onye amụma kwuru, sị: “E siwo n’ili gị tụpụ gị.” (Aịsaịa 14:4, 19) È kwesịrị iji ịghasasị ntụ tụnyere ụdị ọnọdụ mweda n’ala dị otú ahụ? Ee e, n’ihi na ọ dịghị ebe ọ bụla e zoro aka n’isu ozu ọkụ na nchekwa ya ma ọ bụ ịghasasị ntụ sitere na ya.
Jisọs Kraịst kwuru okwu banyere mbilite n’ọnwụ elu ala nke ndị nwụrụ anwụ nke ga-ewere ọnọdụ n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri ya mgbe o kwuru, sị: “Ndị nile dị n’ili ga-anụ olu [m], ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:28, 29) Otú ọ dị, na inwe otu ebe kpọmkwem e liri ozu adịchaghị mkpa bụ nke e gosipụtara n’otu nkọwa amụma ọzọ banyere mbilite n’ọnwụ ahụ. Mkpughe 20:13 na-ekwu, sị: “Oké osimiri wee nyeghachi ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ya; ọnwụ na Hedis nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ha.” Ya mere, ihe dị mkpa abụghị ebe ma ọ bụ otú mmadụ si ‘laghachi n’ájá.’ Kama nke ahụ, ọ bụ ma Chineke o chetara onye ahụ, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ. (Job 14:13-15; tụlee Luk 23:42, 43.) N’ezie ili ndị a chọrọ mma adịghị Jehova mkpa iji nyere ya aka icheta ndị mmadụ. Isu ozu ọkụ adịghị egbochi mmadụ ibilite n’ọnwụ. Ọ bụrụkwa na e jiri ezi ebumnobi mee nghasasị nke ntụ ahụ, n’enweghịkwa ememe okpukpe ụgha, ọ gaghị abụ ihe na-ekwekọghị n’Akwụkwọ Nsọ.
Ọ ga-adị ndị kpebiri ịghasasị ntụ mkpa ịṅa ntị n’iwu na-achị ala. Ọ ga-abụkwa ihe kwesịrị ekwesị ka ha tụlee banyere mmetụta nke ndị mmadụ nwụnahụrụ na ndị ọzọ. Ndị na-ejere Jehova ozi ga-eme nke ọma ịkpachara anya ka iji nnwere onwe ndị Akwụkwọ Nsọ nyere ha n’akụkụ a ghara iwetara aha ọma nke ndị Kraịst nkọcha. Nke a dị mkpa karịsịa n’ala ebe isu ozu ọkụ na ịghasasị ntụ bụ nke iwu nabatara ma bụrụ nke a na-anabatachabeghị n’ụzọ zuru ezu n’ógbè ahụ. N’ezie, onye Kraịst ga-ezere ememe ma ọ bụ omenala ọ bụla ndị dabeere ná nkweta nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ.
Nnwere Onwe Zuru Ezu Pụọ n’Ili!
Ụfọdụ ndị na-akwado ịghasasị ntụ na-ekwu na ọ pụtara nnwere onwe pụọ n’ili ozu n’ime ebe ili. Otú ọ dị, ihe ga-eweta ahụ efe kasị ukwuu ga-abụ mmezu nke nkwa Bible na “dị ka onye iro ikpeazụ, a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.”—1 Ndị Kọrint 15:24-28.
Nke a pụtara na ebe ili, ili, ọbụna isu ozu ọkụ na ịghasasị ntụ, ga-aghọ ihe oge ya gafeworo. Ee, ọnwụ agaghị adịkwa. N’okpuru ike mmụọ nsọ, Jọn onyeozi dere, sị: “M wee nụ oké olu ka ọ na-esi n’ocheeze ahụ daa, sị, Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.
Ihe a nile ga-emezu mgbe a ga-ewepụ kpam kpam ọnwụ ụmụ mmadụ nke bụ n’ihi mmehie Adam n’okpuru Alaeze Chineke. N’oge ahụ olileanya nke ịlaghachi n’ájá agaghị echekwa ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ihu.
[Foto ndị dị na peeji nke 29]
Ụzọ ụfọdụ a na-esikarị ewezụga ozu mmadụ
[Foto dị na peeji nke 31]
Ịghasasị ntụ n’Ọnụ Mmiri Sagami, Japan
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’ikike Koueisha, Tokyo