Ike nke Egwú
“Ọ bụ nanị egwú pụrụ iji ụtọ na-adọrọ adọrọ ozugbo a nụrụ ya mee ka uche na-awagharị awagharị dịrị otu ebe, meekwa ka onye ihe na-egbu mgbu n’obi jụrụ.”
OTÚ a ka William Congreve dere n’ihe dị ka afọ 300 gara aga n’akwụkwọ ya bụ́ Hymn to Harmony. Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, ihe odide ndị Gris oge ochie zọọrọ na “ọzụzụ maka egwú bụ ngwá ọrụ dị irè karịa nke ọ bụla ọzọ, n’ihi na usoro ụda na ndakọ na-abami n’ime obi mmadụ.”
Ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ, bụ́ ndị hụworo ka ụmụ ha nọ n’afọ iri na ụma na-enwe ihu mgbarụ ma na-eme isi ike mgbe ha nọsịrị ọtụtụ oge na-ege egwú rock na-ada oké ụda, ahụwo na nke ahụ bụ eziokwu. A hụkwara ya n’ime afọ ndị 1930 na 1940 na Germany mgbe ndị Nazi jiri egwú na-akpali akpali e ji azọ ije nye aka ịkwadebe ìgwè mmadụ ige okwu na-emegharị anya nke Adolf Hitler.
Obi abụọ adịghị ya na egwú pụrụ imetụta uche na obi, a pụkwara iji ya chịkwaa ha n’ụzọ dị mma ma ọ bụ n’ụzọ dị njọ. Dị ka ihe atụ, e kwere na ụmụaka ịnụ ụdị egwú ụfọdụ na-eme ka ha nwekwuo ọgụgụ isi na mmetụta uche. Ọbụna ndị nsụ pụrụ mgbe ụfọdụ iji ahịrịokwu ndị ha na-apụghị ikwu ekwu bụọ abụ.
Mmetụta egwú na-enwe n’ahụ ndị na-arịa ọrịa akwara ozi nke na-akpata agazighị ije na-eju anya mgbe ụfọdụ, dị ka Anthony Storr si kwuo n’akwụkwọ ya bụ́ Music and the Mind. Storr nyere ihe atụ nke otu nwanyị na-arịa ọrịa: “N’ịbụ onye ọrịa [Parkinson] mere ka ọ ghara inwe ike ịgagharị agagharị, ọ ga-anọgide nnọọ n’enweghị ike ịgagharị agagharị ruo mgbe o chetara egwú ndị ọ maara n’oge ọ bụ ntorobịa. Na mberede ndị a ga-eme ka o nwee ike ịgagharị ọzọ.”
Ihe Na-akpata Nchegbu
Ya mere o yiri ka e nwere uru ndị a pụrụ ịsị na ha na-esite n’ike nke egwú. Otú ọ dị, e nwere ihe ize ndụ na ndị rụrụ arụ ma ọ bụ ndị anyaukwu pụrụ iji ike nke egwú mere ajọ ngwá ọrụ. Nnyocha ụfọdụ e mere egosiwo ihe jikọtara àgwà ịkpọ ndị ọzọ asị na ụdị egwú ụfọdụ kpọmkwem.
N’ịkwado nzọrọ ndị dị otú ahụ, magazin bụ́ Psychology of Women Quarterly na-akọ, sị: “E nwere ihe àmà ụfọdụ na-egosi na ikiri vidio ndị na-egosi egwú rock na-enwe otu mmetụta ahụ ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na-enwe n’ihi na ndị ikom e gosiri vidio ndị na-egosi egwú rock ndị a na-eme ihe ike na ha jiri obi ịta mmiri na iwe mesoo ndị inyom ihe karịa ndị ikom e gosiri vidio ndị na-egosi egwú rock ndị a na-adịghị eme ihe ike na ha.”
Ọ bụghị nanị ndị ikom na-enwe mmetụta a. Ọ pụkwara imetụta ndị inyom. Otu akụkọ ahụ kwukwasịrị: “Ma ndị ikom ma ndị inyom pụrụ ịmalite ịnakwere ozi na-adịghị mma na-adị n’abụ ndị a banyere abaghị uru nke ụmụ nwanyị.”
Magazin bụ́ Sex Roles kwenyere ná nkwubi okwu a, na-ekwu, sị: “Otu nnyocha e mere na nso nso a . . . chọpụtara na ngwakọta nke ịbụ ndị sitere n’ezinụlọ na-adịchaghị mma na ịbụ ndị kiriworo vidio ndị na-egosi egwú nke ukwuu kpatara nnọọ àgwà inwe mmekọahụ otú masịrị onye n’etiti ụmụ nwanyị nọ n’oge uto.” Ime ihe ike pụtara ìhè na okwu abụ na-ekwu banyere mmekọahụ n’ezoghị ọnụ nke egwú rap ụfọdụ mere ka otu ọkàikpe ógbè nke United States kwuo na otu egwú rap “rụrụ arụ ma e lee ya anya dị ka ụkpụrụ ógbè si dị.”
Ọkàikpe ahụ ò kwubigara okwu ókè? Ọ dịghị ma ọlị! Magazin bụ́ Adolescence kwubiri na “ma ndị nọ n’oge uto ma ndị mụrụ ha na-akọ na oké nsogbu ka dịrị nnọọ ná ndụ ndị nọ n’oge uto na-ege egwú rock na-ada oké ụda na egwú rap.” Oké nsogbu dị otú ahụ na-akpata “àgwà oké iwe na ibibi ihe” na emeghị nke ọma n’ụlọ akwụkwọ.
N’ezie, e nwere nnọọ ihe ndekọ nke ihe ndị jikọrọ ụdị egwú ụfọdụ na mmekọahụ, igbu onwe onye, na àgwà ịkpọ ndị ọzọ asị. Ma nke a ọ̀ pụtara na egwú nile nwere ihe jikọtara ha na mmetụta ndị dị otú ahụ na-adịghị mma? Gụọ ihe isiokwu ndị na-esonụ nwere ikwu banyere nke a.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
Egwú pụrụ imetụta obi na uche n’ụzọ dị mma ma ọ bụ n’ụzọ dị njọ