Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 49
  • È Nwere Ihe Ụdị Egwú M Na-akpọ Mere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • È Nwere Ihe Ụdị Egwú M Na-akpọ Mere?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Uru egwú bara
  • Nsogbu ndị dị́ n’egwú
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka Egwú Ghara Iri M Isi?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Nọrọ Na Nche Megide Egwú Na-adịghị Ewuli Elu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Egwú
    Teta!—1999
  • Egwú Ndị Na-eme Chineke Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 49
Ebe otu nwata nwaanyị ji ekwentị ya ege egwú

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

È Nwere Ihe Ụdị Egwú M Na-akpọ Mere?

“Mgbe ọ bụla m jikechara ịgawa ebe m na-aga, m na-agbanye egwú. M banye n’ụgbọala, m gbanye egwú. Mgbe ọ bụla m nọ n’ụlọ na-ezu ike, na-ehicha ihe ma ọ bụ na-agụ akwụkwọ, m na-akpọnye egwú. M na-ege egwú mgbe ọ bụla.”​—Carla.

Egwú ọ̀ na-amasị gị otú o si amasị Carla? Ya bụrụ otú ahụ, isiokwu a ga-enyere gị aka ịhụ uru egwú bara, otú ị ga-esi ezere nsogbu ndị dị́ na ya, na otú ị ga-esi na-akpachapụ anya ahọrọ ụdị egwú ị ga na-ege.

  • Uru egwú bara

  • Nsogbu ndị dị́ n’egwú

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Uru egwú bara

E nwere ike iji ige egwú tụnyere iri nri. Iri nri bara uru ma iribiga ya oké na-akpata nsogbu. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ige egwú. Tụlee uru egwú bara:

  • Egwú nwere ike ime ka obi dị́ gị mma.

    “Ọ bụrụ na obi adịghị m mma, m gbanyehaala egwú kacha atọ m ụtọ, obi na-adị m mma ozugbo.”​—Mark.

  • Egwú nwere ike ime ka i cheta ihe mere n’oge gara.

    “E nwere otu egwú ọ na-abụ m nụ, m cheta ihe mere m obi ụtọ n’oge gara aga. Obi na-adị m ezigbo ụtọ mgbe ọ bụla m nụrụ egwú ahụ.”​—Sheila.

  • Egwú nwere ike ime ka ndị mmadụ na ibe ha dịrị n’otu.

    “Mgbe m gara otu mgbakọ mba niile nke Ndịàmà Jehova, anyị mmiri gbara m mgbe ndị niile bịara ya na-abụ abụ mmechi. Anyị niile na-asụ asụsụ dị́ iche iche, ma abụ ahụ mere ka anyị dịrị n’otu.”​—Tammy.

  • Egwú nwere ike ime ka ị mụta ịkpa ọtụtụ àgwà ọma.

    “Ịmụ otú e si eji ngwá egwú akụ egwú na-eme ka mmadụ mụta inwe ndidi. Ọ bụghị ihe mmadụ na-amụta ngwa ngwa. Naanị ihe ga-eme ka mmadụ mụta ya bụ onye ahụ inwe ndidi.”​—Anna.

Ị̀ maara? Akwụkwọ Baịbụl kacha buo ibu bụ akwụkwọ Abụ Ọma. Abụ dị́ na ya dị otu narị na iri ise.

Ebe otu nwa okorobịa na-ele mkpụrụ osisi apụl mebiri emebi anya

Otú ahụ ị na-ahọ nri ị na-eri ahọ ka i kwesịkwara ịna-ahọ ụdị egwú ị na-ege ahọ

Nsogbu ndị dị́ n’egwú

Ụfọdụ egwú dị ka nri mebiri emebi, ha nwere ike ịkpatara mmadụ nsogbu. Lee ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ.

  • Ihe a na-ekwu n’ọtụtụ egwú bụ gbasara omume rụrụ arụ.

    “O yiziri ka egwú ndị kacha ewu ewu bụ ndị na-ekwu naanị gbasara mmekọahụ rụrụ arụ. Ha anaghịzidi ezo ọnụ.”​—Hannah.

    Baịbụl kwuru, sị: “Ka a ghara ịkpọtụdị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu aha n’etiti unu.” (Ndị Efesọs 5:3) Jụọ onwe gị, sị: ‘Ụdị egwú m na-ege ọ̀ na-eme ka m ghara irube isi na ndụmọdụ a Baịbụl nyere?’

  • Egwú ụfọdụ nwere ike ime ka obi na-ajọ gị njọ.

    “Mgbe ụfọdụ, m na-amụ anya n’abalị na-ege egwú na-eme ka m na-eche banyere ihe ndị na-eme ka ike ụwa gwụ m. Ụdị egwú a nwere ike ime ka ihe ọjọọ na-abata m n’obi.”​—Tammy.

    Baịbụl kwuru, sị: “Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị.” (Ilu 4:​23) Jụọ onwe gị, sị: ‘Egwú m na-ege ọ̀ na-eme ka m chewe ihe na-adịghị mma n’obi m?’

  • Egwú ụfọdụ nwere ike ime ka ị na-ewe iwe.

    “Egwú ndị na-eme ka mmadụ na-ewe iwe, kpọọ ndị ọzọ asị, ma ọ bụ leda onwe ya anya na-akpatara m nsogbu. M na-achọpụta na obi anaghị adịzi m mma ma m gehaala ụdị egwú ahụ. Ndị ezinụlọ anyị achọpụtakwala ya.”​—John.

    Baịbụl kwuru, sị: “Wepụnụ ha niile n’ebe unu nọ, ya bụ, ọnụma, iwe, ihe ọjọọ, okwu mkparị, wepụkwanụ okwu rụrụ arụ n’ọnụ unu.” (Ndị Kọlọsi 3:8) Jụọ onwe gị, sị: ‘Egwú m na-ege ọ̀ na-eme ka m na-ewe iwe ma ọ bụ ghara ịna-echebara ndị ọzọ echiche?’

Gịnị ka i kwesịrị ime? Na-ahọ ụdị egwú ị na-ege ahọ. Ọ bụ ihe otu nwa agbọghọ a na-akpọ Julie na-agbalị ime. Ọ sịrị: “M na-elerukarị egwú ndị m nwere anya, na-ewepụkwa nke ọ bụla na-adịghị mma. Ọ naghị adị mfe mgbe niile, ma ama m na ọ bụ ihe m kwesịrị ime.”

Otu nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Tara na-eme ụdị ihe a. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịna-akụ egwú ụda ya na-atọ ezigbo ụtọ na redio. Ma, m gee ntị nụ ihe ha na-agụ, m na-etinye redio ahụ n’ebe a na-eme ihe ọzọ. Ihe a m na-eme dị ka mmadụ ịgbụpụ nri dị́ ụtọ ọ kpụ n’ọnụ. Ma, ọ bụrụ na m nwee ike izere egwú ndị na-ekwu gbasara omume rụrụ arụ, ọ ga-adịrị m mfe izere ime omume rụrụ arụ. Achọghị m ịna-eche na e nweghị ihe ụdị egwú m na-ege nwere ike ime m.”

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

Abigail

“Egwú nwere ike ịgbanwe otú obi dị́ anyị, ọ bụrụkwa na anyị akpacharaghị anya, ụdị egwú ndị anyị na-ege nwere ike ịkpatara anyị nsogbu anyị na-agaghị achọpụta ruo mgbe o riri anyị isi.”​—Abigail.

Robert

“Egwú i gere naanị obere oge nwere ike ịdị gị n’isi ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi ya, ọ bụrụ na ihe a gụrụ n’egwú adịghị mma, i kwesịrị ịgbanyụ ya ozugbo. Ma ọ bụghị ya, ọ ga-adịgide gị n’obi.”​—Robert.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya