Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Egwú
ITI egwú taa bụ achụmnta ego na-enye ọtụtụ ijeri dollar. Ndị a ma ama na-eti egwú na ndị na-akwado ha na-enweta nnukwu ego. Ma, ọ bụ ihe na-eme eme na enweghị obi ụtọ, ịnwụchu ọnwụ, na igbu onwe onye emewo ná ndụ ụfọdụ ndị na-eti egwú nweworo nnọọ ihe ịga nke ọma. E gosipụtawokwa n’ụzọ zuru ezu na ụfọdụ egwú na-emerụ omume ọma, mmetụta uche, na ọnọdụ ime mmụọ, ọ pụkwara iduga n’ime ihe ike, àgwà ịkpọ ndị ọzọ asị.
Otú ọ dị, ọ dị mma inwe echiche ziri ezi banyere egwú. Ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ ihe na-ezighị ezi ma na-emerụ ahụ dị n’ụdị nkà a, ụfọdụ egwú pụrụ imeziwanye ndụ mmadụ ma nyetụ ọṅụ na afọ ojuju. Ọ pụrụ ime ka mmetụta uche na ọnọdụ ime mmụọ anyị ka mma. Tụlee nanị ihe atụ ole na ole.
Abụ ọma dị 150 nke Bible bụ edemede e ji nkà dee—uri ndị a na-agụ agụ, abụ ndị dị nsọ, na ekpere. Taa a na-eji obi ụtọ agụ ha n’ọtụtụ narị asụsụ. Otú ọ dị, ndị Hibru oge ochie abụghị nanị ọgụgụ ka ha gụrụ abụ ọma ndị ahụ; ha bụrụ ha. Ọtụtụ mgbe ha ji ngwá egwú ndị nwere ụda dị ụtọ mee otú ahụ—ụzọ dị mma isi jikọta amamihe Chineke ha, bụ́ Jehova, dị ka ọ dị n’okwu ndị ahụ, na mmetụta uche nke ndị a zụrụ azụ na-abụ abụ pụrụ itinye n’uche ndị na-ege ha. N’abụtụghị nke kasị dị ala ma ọ bụ ọbụna nke mgbe ochie, ihe àmà na-egosi na ọdịdị na ụdị egwú ndị Hibru tiri ka nke mba ndị gbara ha gburugburu n’oge ahụ bụrụ ọkpọka.
Ka e mesịrị, ndị Kraịst nke narị afọ mbụ bụrụ abụ ọma na abụ nsọ ndị ọzọ iji too Chineke na iji wepụ nchegbu. Egwú si otú a meziwanye ndụ ha. Sitekwa n’ịbụ abụ ndị dabeere na Bible, ha tinyere ihe ọmụma Chineke n’obi ha n’ụzọ miri emi karị, bụ́ nke dị ha mkpa iji duzie ndụ ha.—Matiu 26:30; Ọrụ 16:25.
Ndị Gris oge ochie kwenyere na egwú na-ewulite àgwà mmadụ ma na-eme ka nwoke ma ọ bụ nwanyị zukwuo ezu. N’ụwa nke narị afọ nke 20 a, bụ́ nke na-eji agụmakwụkwọ n’ọmụmụ sayensị, n’ọmụmụ ọnọdụ akụ̀ na ụba, na ọmụmụ nrụrịta ụka ezi uche dị na ya akpọrọ ihe, a na-elegharakarị iji nkà iti egwú azụlite akụkụ nke àgwà mmadụ bụ́ mmetụta uche.
Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi
Ige egwú dị ụtọ pụrụ ịbụ ahụmahụ bara uru ma na-enye obi ụtọ. Ma, mmadụ pụrụ ọbụna inwetakwu ọṅụ n’ịkpọ ngwá egwú ma ọ bụ isoro ìgwè ndị enyi bụọ abụ. Ịma eti egwú pụrụ imepe ohere buru ibu nke ezi obi ụtọ.
Otú ọ dị, dị ka ọ dị ihe ndị ọzọ na-enye obi ụtọ ná ndụ, e nwere mkpa nke imeru ihe n’ókè, inwe echiche ziri ezi, na ime nhọrọ n’akụkụ a nke ntụrụndụ. Nke a bụ eziokwu ọ bụghị nanị n’ihe banyere ụdị egwú a họọrọ kamakwa n’ihe banyere oge a na-etinye n’ige ma ọ bụ iti egwú.
Ọ bụrụ na otu ụdị egwú amalitewala inwe mmetụta na-adịghị mma ná mmetụta uche, omume, na mmekọrịta gị, mgbe ahụ họrọ ụdị ọzọ. Chebe ntị gị iji chebe mmetụta uche gị iji chebe obi na uche gị!
Nke a bụ eziokwu karịsịa n’ihe banyere okwu abụ. Ha pụrụ ịmalite ime ka ị ghọọ ụdị mmadụ nke ndị echiche ha banyere ndụ na omume ọma dị iche na nke gị chọrọ ka ị ghọọ, bụ́ ndị pụrụ ịkwado ụzọ ndụ rụrụ arụ nke asọpụrụghị Chineke kama ịjụ ya. N’ọnọdụ ụfọdụ ọbụna isiokwu nke abụ pụrụ ịkpalite ụdị mmetụta na-ezighị ezi.
Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-adụ ndị ga-eme ihe na-atọ ya ụtọ ọdụ ka ha “chee ahụ [ha] n’ihu Chineke, dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke ezi ụtọ, nke bụ́ ikpe ekpere [ha] dị ka uche sị dị.” (Ndị Rom 12:1) N’ụzọ doro anya, mmetụta uche anyị bụ akụkụ nke ‘àjà ahụ dị ndụ.’ Ya mere ọ bụrụ na anyị mekata chọpụta na mmetụta uche anyị amalitewala imebi ezi echiche anyị ma na-eduhie omume anyị n’ihi ike nke egwú, mgbe ahụ ọ bụ oge ịgbanwe àgwà ige egwú anyị. Cheta: Ike nke egwú pụrụ imetụta obi na uche gị—n’ụzọ dị mma ma ọ bụ n’ụzọ dị njọ!
[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]
Ịkwalite Ikike Ịmụta Ihe
“Nnyocha na-egosi na ịnụ egwú dakọrọ adakọ mgbe mgbe pụrụ ịkwalite ikike ịmụta ihe nke nwa ọhụrụ. Ma n’ọtụtụ ebe obibi, ha adịtụghị ege ya.”—Audio, March 1999.