Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w24 Ọktoba p. 30
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Eze Devid na Abụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Egwú Ndị Na-eme Chineke Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • È Nwere Ihe Ụdị Egwú M Na-akpọ Mere?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka Egwú Ghara Iri M Isi?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
w24 Ọktoba p. 30
Ebe ndị Izrel, bụ́ ndị na-akụ egwú, na-afụ opi, na-akpọ ụbọ akwara, jirikwa oké olu na-abụ abụ mgbe ha na-efe Jehova.

Ị̀ Maara?

Olee otú egwú dịruru mkpa n’Izrel oge ochie?

EGWÚ dị ezigbo mkpa n’Izrel oge ochie. Ọtụtụ ugboro, Baịbụl kwuru banyere ndị na-akụ ngwá egwú na ndị na-abụ abụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na e kee Akwụkwọ Nsọ ụzọ iri, otu ụzọ bụ abụ. Dị ka ihe atụ, e dere akwụkwọ Abụ Ọma, Abụ Solomọn, na Abụ Ákwá ka a na-abụ ha abụ. Ọ bụ ya mere otu akwụkwọ nke kwuru gbasara egwú n’oge a na-ede Baịbụl ji kwuo na Baịbụl mere ka o doo anya na ndị Izrel na-abụ abụ ma na-akụ egwú n’ọtụtụ ihe ha na-eme ná ndụ.

Ịbụ abụ na ịkụ egwú n’ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị. Ndị Izrel na-akụ egwú ma na-abụ abụ iji gosi otú obi dị ha. (Aịza. 30:29) Ụmụ nwaanyị na-eji obere ịgbà kụọ egwú, jiri obi ụtọ na-abụ abụ, gbaakwa egwú n’oge ha na-eme ememme, dị ka mgbe a na-echi mmadụ eze, mgbe ndị agha meriri n’agha, nakwa mgbe a na-eme ememme ndị e ji efe Chineke. (Ikpe 11:34; 1 Sam. 18:6, 7; 1 Eze 1:39, 40) Ndị Izrel na-abụkwa abụ iru uju mgbe mmadụ nwụnahụrụ ha. (2 Ihe 35:25) O doro anya na dị ka otu akwụkwọ si kwuo, ndị Izrel ji egwú na ịbụ abụ kpọrọ ezigbo ihe.

Ịkụ egwú na ịbụ abụ n’obí eze. Ige egwú na-atọ ndị eze Izrel ka mmanụ aṅụ. Eze Sọl kpọtara Devid n’obí ya ka ọ na-akụrụ ya egwú. (1 Sam. 16:18, 23) Mgbe Devid mechara bụrụ eze, o mepụtara ngwá egwú dị iche iche, dee abụ ndị na-atọ ụtọ, haziekwa ndị ga na-akụ egwú n’ụlọ nsọ Jehova. (2 Ihe 7:6; Emọs 6:5) Eze Solomọn nwekwara ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị na-abụ abụ n’obí ya.​—Ekli. 2:8.

Egwú e ji efe Chineke. Nke kacha mkpa bụ na ndị Izrel ji egwú fee Jehova. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere puku mmadụ anọ (4,000) ndị na-akụ egwú n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. (1 Ihe 23:5) Ha kụrụ ájà, kpọọ ụbọ akwara na une, fụọkwa opi. (2 Ihe 5:12) Ma ọ bụghị naanị ndị a bụ́ ndị aka ochie ji egwú fee Chineke. O doro anya na ọtụtụ ndị Izrel na-abụ Abụ Mgbago mgbe ha na-aga Jeruselem ịga mee ememme ndị ha na-eme kwa afọ. (Ọma 120–134) Ihe ndị Juu dere n’oge ochie kwuru na ndị Izrel bụrụ Abụ Ọma Halela n’oge ha na-eri nri Ememme Ngabiga.

Ịkụ egwú na ịbụ abụ ka dịkwa ndị Chineke mkpa taa. (Jems 5:13) Anyị na-abụ abụ mgbe anyị na-efe Chineke. (Efe. 5:19) Ịbụ abụ na-eme ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu. (Kọl. 3:16) Ọ na-emekwa ka anyị nwee obi ike mgbe ihe siiri anyị ike. (Ọrụ 16:25) Ọ bụ ụzọ magburu onwe ya anyị si egosi na anyị nwere okwukwe na Jehova nakwa na anyị hụrụ ya n’anya.

a Ihe ndị Juu na-akpọ Abụ Ọma nke 113 ruo 118 bụ Abụ Ọma Halel. Ha na-abụ ya iji too Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya