Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 10/8 p. 20-21
  • Ụzọ Isi Họrọ Onye Òtù Ọlụlụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Isi Họrọ Onye Òtù Ọlụlụ
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Elela Nanị Ọdịdị Elu Ahụ
  • ‘Lụọ Nanị n’Ime Onyenwe Anyị’
  • Alụmdi na Nwunye Ndị Ọzọ Haziri
  • Nduzi Chineke Maka Ịhọrọ Onye Òtù Ọlụlụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Alụmdi na Nwunye Bụ Onyinye Chineke Nwere Ịhụnanya Nyere Anyị
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Alụmdi na Nwunye Pụrụ Ịga nke Ọma n’Ụwa nke Taa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ịdị n’Otu n’Ụzọ Okpukpe n’Alụmdi na Nwunye—n’Ihi Gịnị Ka O Ji Dị Mkpa?
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 10/8 p. 20-21

Echiche nke Bible

Ụzọ Isi Họrọ Onye Òtù Ọlụlụ

A JỤRỤ OTU NWANYỊ NA-ALỤBEGHỊ DI SỊ, “Ọ̀ DỊTỤLA MGBE Ị NA-ECHE ECHICHE ỊLỤ DI?” “ICHE YA ECHE?” KA Ọ ZARA NGWA NGWA. “ANA M ENWE NCHEGBU MAKA YA.”

OKWU dị nkenke nke nwanyi a na-egosi ihe dị ukwuu banyere ọchịchọ ụfọdụ ndị nwere ịbụ ndị a hụrụ n’anya na inwe mkpakọrịta. Ọtụtụ ndị weere ịchọta onye òtù ọlụlụ dị ka otu n’ime ihe ndị kasị mkpa ná ndụ. N’ihi ya, gburugburu ụwa, e nwewo ụlọ ọrụ ndị na-amụba n’ike n’ike iji nyere ndị mmadụ aka ịchọta ndị òtù ọlụlụ. Ka o sina dị, n’ọtụtụ ebe n’ụwa, ọnụ ọgụgụ alụmdi na nwunye ndị kụrụ afọ n’ala karịrị ọnụ ọgụgụ ndị gara nke ọma.

Ndị mmadụ ijiri aka ha họrọ onye òtù ọlụlụ ha bụ ihe a na-ahụkarị n’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ. N’aka nke ọzọ, alụmdi na nwunye nke ndị nne na nna jiri aka ha hazie ka bụ omenala n’ebe ụfọdụ n’Esia na Africa. Na nke ọ bụla, usoro ahụ ekwesịghị ịbụ nke e mere n’elezighị anya. Ọ bụ mkpebi ole na ole ndị ọzọ mmadụ na-eme ná ndụ nwere ike ịkpata obi ụtọ ma ọ bụ mwute dị ka alụmdi na nwunye. Alụmdi na nwunye ịhụnanya dị na ya pụrụ ịbụ ihe kasị eweta obi ụtọ na afọ ojuju. N’ụzọ dị iche, njikọ a na-esekarị okwu na ya pụrụ ịnọgide na-abụ ihe na-akpata ihe mgbu na nchekasị.—Ilu 21:19; 26:21.

Dị ka ndị ọzọ, ezi ndị Kraịst chọrọ ka njikọ alụmdi na nwunye ha wetara ha ọṅụ na afọ ojuju. Ma ọ bụkwa ọchịchọ ha ime ihe na-atọ Chineke ụtọ na ịsọpụrụ ya. (Ndị Kọlọsi 3:23) N’ịbụ Onye Okike na Onye Malitere alụmdi na nwunye, Chineke ma nke ọma ihe ndị dị anyị mkpa n’ezie na ihe kasị mma maka anyị. (Jenesis 2:22-24; Aịsaịa 48:17-19) Ọzọkwa, eri ọtụtụ narị afọ iri nke ịdị adị mmadụ, ọ hụwo nde kwuru nde alụmdi na nwunye, ma ndị ọma ma ndị ọjọọ. Ọ maara ihe ga-aga nke ọma na ihe na-agaghị aga nke ọma. (Abụ Ọma 32:8) Site n’Okwu ya, bụ́ Bible, ọ na-enye ụkpụrụ ndị doro anya, a kapịrị ọnụ bụ́ ndị pụrụ inyere onye Kraịst ọ bụla aka ime nhọrọ dabeere n’ihe ọmụma. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ụkpụrụ ndị a?

Elela Nanị Ọdịdị Elu Ahụ

N’ebe ndi mmadụ nweere onwe ha ịhọrọ ndị ha ga-alụ, ha pụrụ izute ndị ha ga-alụ ná ndabata ma ọ bụ ndị enyi ma ọ bụ ndị ezinụlọ ha pụrụ ime ka ha mata ndị ahụ. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ ndọrọ elu ahụ na-ebu ụzọ akpali mmasị ịhụnanya. Ọ bụ ezie na nke a bụ ihe mkpali dị otú o kwesịrị ma dị ike n’ezie, Bible na-agba anyị ume ka anyị ghara ile nanị ọdịdị elu ahụ mgbe anyị na-atụle alụmdi na nwunye.

“Amara bụ ụgha, ịma mma bụkwa ihe efu: ma nwanyị nke na-atụ egwu Jehova, nwanyị ahụ ga-enwe otuto,” ka Ilu 31:30 na-ekwu. Pita onyeozi kwuru banyere ‘uwe a na-apụghị imebi nke bụ́ mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo, nke dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke.’ (1 Pita 3:4) Ee, àgwà ime mmụọ nke onye mmadụ na-aga ịlụ—nrara onye ahụ raara onwe ya nye Chineke na ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ nakwa àgwà ndị Kraịst ya—dị mkpa nke ukwuu karịa mma elu ahụ. Ọ dị mkpa iwepụta oge iji mee nhọrọ e leruru anya ala mee, na-ahọrọ onye gị na ya nwere otu ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ na onye na-etinyekwa mgbalị igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. Nke a ga-eme ihe dị ukwuu n’ime ka e nwee njikọ alụmdi na nwunye obi ụtọ.—Ilu 19:2; Ndị Galetia 5:22, 23.

‘Lụọ Nanị n’Ime Onyenwe Anyị’

Gị na onye ị chọrọ ịlụ inwe otu ihe mgbaru ọsọ na nkwenkwe dị ezigbo mkpa. Alụmdi na nwunye bụ ezigbo ihe ịma aka, nke na-achọ ka mmadụ abụọ ahụ mee ọtụtụ mgbanwe n’akparamàgwà na n’omume ha. N’ụzọ ezi uche dị na ya, otú ihe ndị gị na onye ị na-aga ịlụ nwekọrọ ọnụ dịruru ọtụtụ ugbu a, otú ahụ ka mgbanwe ndị ahụ ga-adịkwu mfe.

Nke a na-enyere anyị aka ịhụ ihe mere Pọl onyeozi jiri gbaa ndị Kraịst ume ka ha zere ịbụ ndị ha na ‘ndị na-ekweghị ekwe kekọtara onwe ha.’ (2 Ndị Kọrint 6:14) Pọl maara na ịlụ onye gị na ya na-enweghị otu okwukwe na nghọta nke ụkpụrụ Bible pụrụ ịkpata esemokwu na enweghị nkwekọrịta. Ezi uche dị na ndụmọdụ ahụ bụ́ ka a ‘lụọ nanị n’ime Onyenwe anyị.’ (1 Ndị Kọrint 7:39) Ọ na-egosi echiche Chineke. Ndị ji amamihe na-agbaso ya na-ezere ọtụtụ nnukwu ihe isi ike na nsogbu.—Ilu 2:1, 9.

Alụmdi na Nwunye Ndị Ọzọ Haziri

Gịnị banyere ebe alụmdi na nwunye ndị ọzọ haziri ka bụ omenala? Dị ka ihe atụ, ụfọdụ emewo atụmatụ na ọ bụ ndị nne na nna na-ahazi pasent 80 nke alụmdi na nwunye nile a na-enwe n’ebe ndịda India. Ma ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst hà na-agbaso ọdịnala a ma ọ bụ na ha adịghị agbaso ya bụ okwu dịịrị mmadụ ikpebi. Ka o sina dị, nhazi ndị dị otú ahụ na-enwe ihe ịga nke ọma karịsịa mgbe ụkpụrụ ime mmụọ bụ ihe a kasị lebara anya.

Ndị na-akwado alụmdi na nwunye ndị ọzọ haziri na-eche na ọ na-eme ka ime mkpebi dịrị n’aka ndị nwere ahụmahụ ma tozuo okè. “Ụfọdụ ndị nne na nna na-eche na n’ihi afọ ndụ ụmụ ha na enweghị ahụmahụ ha, a pụghị ịtụkwasị ha obi ịma kpọmkwem ihe bụ́ ntozu okè ime mmụọ nke onye ha na-aga ịlụ,” ka otu onye Kraịst bụ́ okenye n’Africa na-ekwu. “Ndị na-eto eto enweghị ahụmahụ ná ndụ, ha pụkwara iji mmetụta uche na-ekpebi ihe,” ka otu onye ozi na-ejegharị ejegharị si India kwukwara. Ebe ndị nne na nna maara àgwà ụmụ ha karịa onye ọ bụla ọzọ, ha na-eche na ọ bụ nanị ha nọ n’ọnọdụ imetara ụmụ ha nhọrọ amamihe dị na ya. Ọ ga-abụkwara ha amamihe ilebara echiche nke nwa okoro na nwa agbọghọ ahụ anya.

Otú ọ dị, mgbe ndị nne na nna leghaara ụkpụrụ Bible anya, ha pụrụ ịta ahụhụ ihe si na ya pụta n’ikpeazụ ma ọ bụrụ na e mesịa nwee nsogbu n’alụmdi na nwunye ahụ. Ebe ndị ahụ na-aga ịlụ di na nwunye na-adịghị enwekarị ohere dị ukwuu ibu ụzọ mata onwe ha nke ọma, nsogbu pụrụ ịdapụta. Mgbe ọ dapụtara, ka otu onye Kraịst bụ́ nna n’India na-akọwa, “ihe a na-emekarị bụ ịta ndị nne na nna ụta.”

Banyere ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-ahazi alụmdi na nwunye, a ghaghịkwa ịtụle ihe banyere nzube ha. Mgbe e lekwasịrị anya karịsịa n’ihe onwunwe na agụụ ịbụ onye a na-akwanyere ùgwù ná nhọrọ nke onye òtù ọlụlụ, nsogbu na-ebilite. (1 Timoti 6:9) Ya mere, ndị na-ahazi alụmdi na nwunye kwesịrị ịjụ onwe ha, ‘E mere nhọrọ a iji hụ na ndị òtù ọlụlụ ahụ nwere obi ụtọ na ahụ ike ime mmụọ? Ka, kama nke ahụ, ọ̀ bụ iji kwalite ọnọdụ ma ọ bụ akụ̀ na ụba ezinụlọ ma ọ bụ iji nweta ego?’—Ilu 20:21.

Ndụmọdụ Bible doro anya ma baa uru. Mgbe a na-atụle onye ga-abụ onye òtù ọlụlụ, omume ọma na ọnọdụ ime mmụọ nke onye ahụ a na-aga ịlụ kwesịrị mgbe nile ịbụ isi ihe a na-elekwasị anya, n’agbanyeghị otú e si mee nhọrọ ahụ. Mgbe e mere nke a, a na-asọpụrụ Jehova Chineke, bụ́ Onye Mere ndokwa alụmdi na nwunye, ndị ahụ na-alụ di na nwunye pụkwara iji ọnọdụ ime mmụọ siri ike malite. (Matiu 7:24, 25) Nke a ga-eme n’ụzọ dị ukwuu ka e nwee njikọ obi ụtọ, dị mma.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya