Nkwenkwe Ụgha—n’Ihi Gịnị Ka O Ji Nnọọ Dịgide?
DỊ KA ị pụrụ ịma, a ka nwere ọtụtụ ndị na-eche na nwamba ojii ịgbafe n’ihu ha bụ ihe àmà ọjọọ ma ọ bụ ndị na-atụ egwu ịgafe n’okpuru ubube. Ọtụtụ ndị kwenyekwara na Friday bụ́ ụbọchị 13 nke ọnwa bụ ụbọchị chi ọjọọ nakwa na ọ dị ize ndụ ịnọ n’okpukpu ụlọ nke 13. Nkwenkwe ụgha ndị dị otú ahụ ka dị n’agbanyeghị na ezi uche adịghị na ha.
Cheedị echiche banyere ya. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị ji anyara ọgwụ ma ọ bụ na-esu aka n’osisi mgbe ha na-ekwupụta ihe ha nwere olileanya na ọ ga-eme? Ọ́ bụghị n’ihi na, n’enweghị ezigbo ihe àmà, ha kweere na omume ndị a ga-eweta chi ọma? Akwụkwọ bụ́ A Dictionary of Superstitions na-ekwu, sị: “Onye nwere nkwenkwe ụgha kwenyere na ihe, ebe, anụmanụ, ma ọ bụ omume ụfọdụ bụ chi ọma (ihe àmà ọma ọ bụ ọtụmọkpọ) nakwa na ndị ọzọ bụ chi ọjọọ (ihe àmà ọjọọ ma ọ bụ mgbaàmà nke ihe ndabara ọjọọ).”—Lee Ndị Galetia 5:19, 20.
Mgbalị Iji Kpochapụ Ya na China
N’ụzọ doro anya, mgbalị ndị e mere n’oge a iji kpochapụ nkwenkwe ụgha arụpụtaghị ihe ọ bụla. Dị ka ihe atụ, na 1995 Ndị Ome Iwu nke Shanghai nyere otu iwu gọọmenti nke na-amachibido nkwenkwe ụgha dị ka ihe ncheta nke oge ya gafeworo nke mba ahụ. Nzube ya bụ “ikpochapụ nkwenkwe ụgha nke oge ochie, ịgbanwe omenala olili ozu na ịkwalite mwulite nke isi obodo mepere emepe karị.” Ma gịnị siworo na ya pụta?
Dị ka otu akụkọ si kwuo, ndị bi na Shanghai jigidesiri nkwenkwe ụgha ha ike. N’inupụ isi n’iwu ndị ọchịchị machibidoro omenala ndị China nke ịkpọ akwụkwọ ego adịgboroja ọkụ n’akụkụ ili ndị nna ochie, otu onye gara ebe a na-eli ozu kwuru, sị: “Anyị kpọrọ ijeri yuan 19 ọkụ [ihe dị ka ijeri dollar atọ].” O kwukwasịrị: “Ime nke a bụ omenala. Ọ na-eme ndị bụ́ chi obi ụtọ.”
Akwụkwọ akụkọ a ma ama bụ́ Guangming Daily kwusiri okwu ike banyere adịghị irè nke mmachibido iwu ahụ, na-ekwu na a pụrụ inwe ihe ruru “nde mmadụ ise ji ịgba afa mere aka ọrụ na China, ebe ngụkọta ọnụ ọgụgụ nke ndị na-ahụ maka sayensị na nkà na ụzụ dị nanị nde 10.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru, sị: “O yiri ka ọ bụ nanị ndị na-agba afa na-amụba amụba.”
Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana, Mbipụta nke Mba Nile, na-ekwu banyere ndịgide nke nkwenkwe ụgha, sị: “N’ọdịbendị nile, ọ bụghị nanị na a na-ejigide omenala ochie ụfọdụ, kamakwa a na-enye ha nkọwa ndị dị iche ma na-eme ka ha pụta ihe ndị ọzọ.” Otu mbipụta na-adịbeghị anya nke The New Encyclopædia Britannica kwetara, sị: “Ọbụna n’ihe a sị na ọ bụ oge ọgbara ọhụrụ, bụ́ oge mgbe e ji nnwapụta ezi uche dị na ya akpọrọ oké ihe, e nwere mmadụ ole na ole na-agaghị, ma a manye ha, ekwe ikwenye na nzuzo n’otu nkwenkwe ma ọ bụ abụọ nke ezi uche na-adịghị na ha ma ọ bụ nkwenkwe ụgha.”
Ụkpụrụ Ihu Abụọ
Ọtụtụ ndị yiri ka hà nwere ụkpụrụ ihu abụọ, n’ihi na ha agaghị anọ n’ihu ọha kweta ihe ha na-eme mgbe nanị ha nọ. Otu onye dere akwụkwọ na-ekwu na ihe kpatara ịla azụ a bụ n’ihi ịtụ egwu iyi onye nzuzu n’anya ndị ọzọ. N’ihi ya, ndị dị otú ahụ pụrụ ịhọrọ ịkpọ omume nkwenkwe ụgha ha ihe ha na-eme mgbe dum ma ọ bụ àgwà. Ndị na-eme egwuregwu, dị ka ihe atụ, pụrụ ikwu na akparamàgwà ha bụ omenala ha na-eme tupu ha amalite egwuregwu.
Na nso nso a otu odeakụkọ kwuru okwu ihu abụọ banyere akwụkwọ ozi a na-ezigara ọtụtụ ndị ma kwuo ka onye nke ọ bụla zigara ya ọtụtụ ndị ọzọ. A na-ekwekarị onye na-enyefe ndị ọzọ akwụkwọ ozi dị otú ahụ nkwa inwe chi ọma, ebe a na-ewere ya na onye o ruru n’aka kwụsị ga-ezute ihe ọjọọ. Ya mere onye odeakụkọ ahụ ghọrọ onye ọhụrụ e nyefere ya, o kwukwara, sị: “Unu maara na adịghị m eme ihe a n’ihi na m nwere nkwenkwe ụgha. Achọrọ m nanị izere chi ọjọọ.”
Ndị ọkà mmụta ihe banyere mmadụ na ndị ọkachamara n’ihe banyere ọdịnala na-eche na ọbụna okwu bụ́ “nkwenkwe ụgha” dabeere nnọọ n’echiche onwe onye; ha na-ala azụ ịkọwa ụkpụrụ akparamàgwà ụfọdụ n’ụzọ dị otú ahụ. Ha na-ahọrọ iji okwu ndị bụ́ “omenala na nkwenkwe mba,” “ọdịnala,” ma ọ bụ “usoro nkwenkwe” eme ihe bụ́ okwu ndị “na-akọwa ọtụtụ ihe” karị, ma bụrụ ndị na-adịghị akpọ okwu aha. Dick Hyman, n’akwụkwọ ya bụ́ Lest Ill Luck Befall Thee—Superstitions of the Great and Small (Ka Chi Ọjọọ Ghara Ịkpọ Gị Ihu—Nkwenkwe Ụgha Ndị Ukwu na Ndị Nta), kwuru n’eziokwu, sị: “Nkwenkwe ụgha nwere ndị nkwado ole na ole ma nwee ọtụtụ ndị nwere ya, dị ka mmehie na azụ̀zụ̀.”
Ma, n’agbanyeghị ihe ọ bụla a na-akpọ ya, nkwenkwe ụgha ka dị. N’ihi gịnị ka o ji dị otú a n’ọgbọ nkà mmụta sayensị nke taa gbagoteworonụ n’ụzọ nkà na ụzụ?
Ihe Mere O Ji Nnọọ Dịgide
Ndị ụfọdụ na-ekwu na inwe nkwenkwe ụgha bụ ihe dị mma nye ụmụ mmadụ. E nwere ọbụna ndị na-ekwu na ọchịchọ inwe nkwenkwe ụgha dị ná mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị. Otú ọ dị, e nwere nnyocha ndị na-egosi na ọ dịghị otú ahụ. Ihe àmà e nwere na-egosi na ndị mmadụ na-enwe nkwenkwe ụgha n’ihi ihe a kụziiri ha.
Prọfesọ Stuart A. Vyse na-akọwa, sị: “A na-amụta akparamàgwà nkwenkwe ụgha n’oge ndụ mmadụ, dị ka e si amụta ihe ka ọtụtụ n’akparamàgwà ndị ọzọ. A mụkọtaghị anyị na àgwà isu aka n’osisi; anyị mụtara ime otú ahụ amụta.” A na-ekwu na ndị mmadụ na-amụta ikwenye na majik mgbe ha bụ ụmụaka ma nọgidekwa bụrụ ndị nwere nkwenkwe ụgha mgbe ha ‘nwetasịrị ezi echiche nke ndị toruworo ogo mmadụ.’ Oleekwa ebe ha si na-enweta ọtụtụ nkwenkwe ụgha?
Ọtụtụ nkwenkwe ụgha na nkwenkwe okpukpe ndị e jiri kpọrọ ihe nwere njikọ chiri anya. Dị ka ihe atụ, nkwenkwe ụgha bụ akụkụ okpukpe nke ndị ahụ biri n’ala Kenean tupu ụmụ Israel. Bible na-ekwu na ọ bụ omenala ndị Kenean ịjụ ndị mmụọ ase, ime majik, ịdabere n’iji igwe ojii tụọ isi ọma ma ọ bụ isi ọjọọ, ịgba afa, ijekwuru ndị dibịa nrafu, ijekwuru ndị na-ajụ mmụọ ihe na ndị dibịa afa, na ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase.—Deuterọnọmi 18:9-12.
A makwaara ndị Gris oge ochie n’ihi nkwenkwe ụgha ndị e jikọtara ha na okpukpe ha. Ha kweere n’afa, ịjụ ndị mmụọ ase, na majik, dị nnọọ ka ndị Kenean kweere. Ndị Babilọn na-elekpu anya n’imeju nke anụmanụ, na-eche na ha ga-esi na ya mara ihe ha kwesịrị ime. (Ezikiel 21:21) A makwaara ha n’ihi ịgba chaa chaa ha, ha na-achọkwa enyemaka n’aka ihe Bible zoro aka na ya dị ka “chi nke Chi Ọma.” (Aịsaịa 65:11, NW) Ruo taa e ji inwe nkwenkwe ụgha mara ndị na-agba chaa chaa.
Ọ dị mma ịmara na ọtụtụ chọọchị n’ezie akwadowo ịrara onwe onye nye ịgba chaa chaa. Otu ihe atụ bụ Chọọchị Katọlik na nkwado ọ na-akwado egwuregwu ndị dị ka bingo. N’otu aka ahụ, otu onye na-agba chaa chaa kwuru, sị: “Eji m n’aka na Chọọchị Katọlik ma na [ndị na-agba chaa chaa nwere nkwenkwe ụgha,] n’ihi na ndị nọn na-eburu igbe ụtụ ha nọrọ mgbe nile n’akụkụ ahịrị a na-anọ agba ọsọ. Olee otú onye Katọlik, dị ka ọtụtụ n’ime anyị bụ, ga-esi gafere onye ‘sista’ n’atụghị ụtụ ma na-atụ anya inwe ihe ịga nke ọma ọ bụla n’ọsọ ịnyịnya? N’ihi ya anyị ga-atụnye ụtụ. Ọ bụrụkwa na anyị emerie n’ụbọchị ahụ, anyị ga-emesapụzi aka nke ukwuu, na-enwe olileanya na ọ ga-eme ka anyị nọgide na-enwe ihe ịga nke ọma.”
Ihe atụ pụtara ìhè nke njikọ chiri anya dị n’etiti okpukpe na nkwenkwe ụgha bụ nkwenkwe ụgha ndị metụtara Krismas, bụ́ ememe nke chọọchị dị iche iche nke Krisendọm na-akwado. Nke a na-agụnye olileanya bụ́ na isusu ọnụ n’okpuru osisi mistletoe ga-eduga n’alụmdi na nwunye na ọtụtụ nkwenkwe ụgha e nwere banyere Santa Claus.
Akwụkwọ bụ́ Lest Ill Luck Befall Thee na-ekwu na a malitere inwe nkwenkwe ụgha ná mgbalị “ịmata ihe ga-eme n’ọdịnihu.” N’ihi ya taa, dị nnọọ ka ọ dịworo n’akụkọ ihe mere eme nile, ma ndị nkịtị ma ndị ndú ụwa na-ejekwuru ndị na-agba afa na ndị ọzọ na-ekwu na ha nwere ike majik. Akwụkwọ bụ́ Don’t Sing Before Breakfast, Don’t Sleep in the Moonlight (Abụla Abụ Tupu I Rie Nri Ụtụtụ, Ehila Ụra Ebe Ọnwa Na-agba) na-akọwa, sị: “Ọ dị ndị mmadụ mkpa ikwere na e nwere ọgwụ na ọtụmọkpọ ndị ga-ewepụ egwu nke ma ihe a maara ma ihe a na-amaghị ama.”
N’ihi ya omume nkwenkwe ụgha anwawo ime ka ụmụ mmadụ nwee echiche nke ịchịkwa egwu ha. Akwụkwọ bụ́ Cross Your Fingers, Spit in Your Hat (Tụkọta Aka Gị, Gbụba Asọ n’Okpu Gị) na-ekwu, sị: “[Ụmụ mmadụ] na-adabere na nkwenkwe ụgha n’ihi otu ihe ahụ mere ndị mmadụ jibu na-adabere na ya. Mgbe ihe ndị [ha] na-apụghị ịchịkwa dakwasịrị [ha]—bụ́ ndị dabeere na ‘chi ọma’ ma ọ bụ ‘n’ihe ndabara’—nkwenkwe ụgha na-eme ka [ha] nwee mmetụta nke ịnọkwu ná nchebe.”
Ọ bụ ezie na sayensị emeziwanyewo ọnọdụ ụmụ mmadụ n’ọtụtụ ụzọ, ha ka nwere echiche nke anọghị ná nchebe. N’ezie, anọghị ná nchebe akawo njọ n’ihi nsogbu ndị sayensị kpatara. Prọfesọ Vyse na-ekwu, sị: “Nkwenkwe ụgha na ikwenye n’ihe na-enweghị isi bụ nnọọ akụkụ nke ọdịbendị anyị . . . n’ihi na ụwa oge anyị emewo ka echiche anyị nke amaghị ihe ga-emenụ sikwuo ike.” The World Book Encyclopedia kwubiri, sị: “Nkwenkwe ụgha ma eleghị anya ga-abụ akụkụ nke ndụ ma ọ bụrụhaala na ndị mmadụ . . . amaghị ihe ọdịnihu ga-abụ.”
Mgbe ahụ, ná nchịkọta, nkwenkwe ụgha ka dị n’ihi na ha gbanyere mkpọrọgwụ n’egwu na-atụ ihe a kpọrọ mmadụ ma bụrụ nke ọtụtụ nkwenkwe okpukpe ndị e jiri kpọrọ ihe na-akwado. Otú ọ dị, ànyị kwesịrị ikwubi na nkwenkwe ụgha bara uru, ebe ọ na-enyere ndị mmadụ aka ịnagide ihe ndị ha na-amaghị? Ọ́ dịghị emerụ ahụ? Ka ọ̀ bụ ihe dị ize ndụ e kwesịrị izere ezere?
[Foto dị na peeji nke 5]
A pụrụ inwe nde mmadụ ise ji ịgba afa mere aka ọrụ na China nanị
[Foto dị na peeji nke 6]
Site n’ịkwalite egwuregwu “bingo,” ọtụtụ chọọchị azụlitewo nkwenkwe ụgha
[Foto dị na peeji nke 7]
Omenala Krismas ndị dị ka isusu ọnụ n’okpuru osisi “mistletoe” gbanyere mkpọrọgwụ na nkwenkwe ụgha