Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 11/8 p. 3-4
  • Nkwenkwe Ụgha—Olee Ókè Ọ Gbasaruru Taa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkwenkwe Ụgha—Olee Ókè Ọ Gbasaruru Taa?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Ka Gbasara Dị Ka Ọ Gbasaburu
  • Nkwenkwe Ụgha—n’Ihi Gịnị Ka O Ji Nnọọ Dịgide?
    Teta!—1999
  • Nkwenkwe Ụgha Ò Kwekọrọ n’Ozizi Baịbụl?
    Teta!—2008
  • Nkwenkwe Ụgha Ọ̀ Na-achịkwa Ndụ Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ndụ Nkwenkwe Ụgha Na-achịkwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 11/8 p. 3-4

Nkwenkwe Ụgha—Olee Ókè Ọ Gbasaruru Taa?

A NA-ANỤ ya n’ebe ọ bụla—n’ụlọ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ụgbọ njem ọha na eze, na n’okporo ámá. Ị maa uzere, ndị ị na-amaghị ndị ha bụ, bụ́ nnọọ ndị na-agafere agafere asị gị: “Ndụ gị.” E nwere okwu ndị yiri ya n’ọtụtụ asụsụ. N’asụsụ German ihe a na-ekwu bụ “Gesundheit.” Ndị Arab na-asị “Yarhamak Allah,” ụfọdụ ndị Polynesia nke Ebe Ndịda Pacific na-asịkwa “Tihei mauri ora.”

N’ikwere na ọ bụ nanị ọnụ ọma nkịtị sitere n’ụkpụrụ omume ọha mmadụ, ọ pụrụ ịbụ na i chebachabeghịrị ihe mere ndị mmadụ ji ekwu nke a echiche. Ma, okwu ahụ gbanyere mkpọrọgwụ na nkwenkwe ụgha. Moira Smith, bụ́ onye nlekọta ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Akwụkwọ Ọdịnala dị na Mahadum Indiana dị na Bloomington, Indiana, U.S.A., na-ekwu banyere okwu ahụ, sị: “O sitere n’echiche bụ́ na ị na-amapụta mkpụrụ obi gị n’uzere.” Ịsị “Ndụ gị” bụ n’ezie ịgwa Chineke ka o weghachi ya.

Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ma eleghị anya ga-ekweta na ezi uche adịghị n’ikwenye na mkpụrụ obi na-ahapụ ahụ gị mgbe ị mara uzere. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary kọwara nkwenkwe ụgha dị ka “nkwenkwe ma ọ bụ omume a na-eme n’ihi amaghị nke a na-akọ, ịtụ ihe a na-amaghị ama egwu, ịtụkwasị obi na majik ma ọ bụ n’ihe ndabara, ma ọ bụ echiche ụgha e nwere banyere ihe na-akpata ihe.”

Ka a sịkwa ihe mere onye dibịa bekee nke narị afọ nke 17 ji kpọọ nkwenkwe ụgha ndị e nwere n’oge ya “njehie iberibe” nke ndị na-agaghị akwụkwọ. N’ihi ya, ka ụmụ mmadụ batara na narị afọ nke 20, rụzuokwa ọtụtụ ihe na nkà mmụta sayensị, The Encyclopædia Britannica nke 1910 jiri nchekwube buru ụzọ hụ oge mgbe “nkwenkwe ụgha [na-agakwaghị] adị n’ụwa mepere anya.”

Ọ Ka Gbasara Dị Ka Ọ Gbasaburu

Nchekwube ahụ e nwere ihe dị ka iri afọ asatọ gara aga enweghị ebe ọ dabeere, n’ihi na nkwenkwe ụgha yiri ka ọ ka gbanyesiri mkpọrọgwụ ike dị ka ọ gbanyeburu. Nnọte aka dị otú a bụ ihe e ji mara nkwenkwe ụgha. Okwu bụ́ “nkwenkwe ụgha,” sitere n’okwu Latin bụ́ super, pụtara “n’elu,” na stare, nke pụtara “iguzoro.” N’ụzọ dị otú a, a kpọrọ ndị dike lanarịrị agha superstites, ebe ha dị ndụ mgbe ndị dike ibe ha nwụrụ n’agha, n’ụzọ nkịtị “na-eguzo” n’elu ha. N’izo aka n’otú a e si nweta ya, akwụkwọ bụ́ Superstitions (Nkwenkwe Ụgha) na-ekwu, sị: “Nkwenkwe ụgha ndị ka dị taa anọgidela n’agbanyeghị mgbalị ndị e mere n’oge ndị gara aga ikpochapụ ha.” Tụlee nanị ihe atụ ole na ole na-egosi na nkwenkwe ụgha ka dị.

◻ Mgbe onye na-achị otu obodo ukwu dị n’Esia nwụsịrị ọnwụ mberede, otu onye ọrụ o wutere nke bi n’ebe obibi gọọmenti dụrụ onye na-aga ịchị obodo ukwu ahụ ọdụ ka o jekwuru onye pụrụ iche na-eme anwansi, bụ́ onye tụrụ aro ka a gbanwee ọtụtụ ihe n’ime na gburugburu ebe obibi ahụ. Onye ọrụ ahụ chere na mgbanwe ndị ahụ ga-egbochi chi ọjọọ ahụ.

◻ Onyeisi nke otu ụlọ ọrụ nwere ọtụtụ nde dollar na United States na-eji otu nkume pụrụ iche mgbe nile. Kemgbe o nwesịrị ihe ịga nke ọma ná ngosi ngwá ahịa mbụ ya, ọ naghị apụ èzí n’ejighị ya.

◻ Tupu ha ekwubie okwu azụmahịa ndị buru ibu, ndị isi achụmnta ego bụ́ ndị Esia na-achọkarị ndụmọdụ onye na-akọ ọdịnihu.

◻ Otu onye na-eme egwuregwu, n’agbanyeghị na ọ na-azụ onwe ya nke oma, na-ekwu na ọ bụ otu ihe ọ na-eyi na-eme ka o merie. N’ihi ya ọ na-anọgide na-eyi ya—n’asaghị ya mmiri—n’asọmpi ndị e nwere n’ọdịnihu.

◻ Otu nwa akwụkwọ na-eji otu mkpịsị akwụkwọ ede ihe n’ule ma na-enweta akara dị elu. N’ihi ya, ọ na-ele mkpịsị akwụkwọ ahụ anya dị ka “chi ọma.”

◻ N’ụbọchị agbamakwụkwọ ya, otu nwanyị a na-alụ ọhụrụ ejiri nlezianya hazie ihe ndị ọ ga-eji gbaa akwụkwọ ka ọ gụnye “ihe meworo ochie, ihe ọhụrụ, ihe ọ gbazitere agbazite, na ihe na-acha anụnụ anụnụ.”

◻ Otu onye asapee Bible otu ugboro ma gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ o buru ụzọ hụ, na-ekwenye na ihe ndị ahụ e dere na ya ga-enye ya kpọmkwem nduzi dị ya mkpa n’oge ahụ.

◻ Ka otu nnukwu ụgbọelu na-agba n’ụzọ ọ ga-esi felie, ọtụtụ ndị o bu emee akara nke obe. Onye ọzọ esutụ medal “Senti” Christopher ọnụ n’oge ụgbọelu ahụ na-efe n’elu.

O doro anya na ọbụna taa nkwenkwe ụgha gbasara nnọọ ebe nile. N’eziokwu, Stuart A. Vyse, bụ́ osote prọfesọ nke nkà mmụta akparamàgwà mmadụ na Kọleji Connecticut, kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Believing in Magic—The Psychology of Superstition (Ikwere na Majik—Echiche Nkwenkwe Ụgha), sị: “Ọ bụ ezie na anyị bi n’ụwa gbagoteworonụ n’ụzọ nkà na ụzụ, nkwenkwe ụgha ka gbasara ebe nile dị ka ọ gbasaburu.”

Nkwenkwe ụgha gbasiri nnọọ mkpọrọgwụ ike taa nke na mgbalị iji kpochapụ ya akụwo afọ n’ala. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya