‘Mgbanwe Ndị Kasị Ukwuu’
“Narị afọ nke 20 enwewo ọtụtụ mgbanwe kasị ukwuu karịa narị afọ ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.”—The Times Atlas of the 20th Century.
MGBE ọtụtụ ndị na-atụleghachi narị afọ nke 20, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha ga-ekwenyere Walter Isaacson, onyeisi ndị na-achịkọta akụkọ magazin Time, bụ́ onye kwuru, sị: “N’iji ya tụnyere ọtụtụ narị afọ ndị gafeworonụ, nke a abụwo otu n’ime ndị kasị eju anya: nke na-akpali akpali, na-emenye egwu mgbe ụfọdụ, nke nọworo na-adọrọ mmasị.”
Gro Harlem Brundtland, bụbu praịm minista Norway, na-ekwukwa na a kpọwo narị afọ a “narị afọ e mebigara ọtụtụ ihe ókè, . . . ebe àgwà ọjọọ nke ụmụ mmadụ ruru ọ̀tụ̀tụ̀ na-enweghị atụ.” Ọ na-ekwu na ọ bụwo “narị afọ e nwere nnukwu ọganihu, [n’ebe ụfọdụ kwa e nwere] uto n’ọnọdụ akụ̀ na ụba bụ́ nke a na-enwetụbeghị mbụ.” Otú ọ dị, n’otu oge ahụ, olileanya adịghịrị obodo ukwu ndị dara ogbenye n’ọdịnihu n’ihe banyere “mmadụ ijubiga ókè na ha na ọrịa ndị ịda ogbenye na gburugburu ebe obibi na-adịghị mma na-akpata.”
Ọgba Aghara Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị
Mgbe narị afọ nke 20 malitere, usoro ndị ọchịchị nke Manchu dị na China, Alaeze Ukwu Turkey, na ọtụtụ alaeze ukwu nke Europe chiri akụkụ ka ukwuu nke ụwa. Alaeze Ukwu Britain nanị chịrị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ụwa, chịakwa ihe karịrị 1 n’ime mmadụ 4 ọ bụla nọ n’ụwa. Ogologo oge tupu ngwụsị nke narị afọ ahụ, alaeze ukwu ndị a nile kwụsịrị ịdị. “Na 1945,” ka The Times Atlas of the 20th Century na-ekwu, “oge ọchịchị eze ukwu bịara ná njedebe.”
Njedebe nke ọchịchị ndị ọcha nyere ohere ka oké ịhụ mba n’anya nke zuru Europe ọnụ n’agbata narị afọ nke 17 na nke 19 banye n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa. The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri oké ịhụ mba n’anya belatara n’ọtụtụ mba ndị dị na Europe . . . Otú ọ dị, n’Esia na n’Africa, ịhụ mba n’anya mụbara n’ike, n’ụzọ bụ́ isi iji megide ọchịchị ndị ọcha.” N’ikpeazụ, dị ka The Collins Atlas of World History si kwuo, “Mba Ndị Na-emepechaghị Emepe batara n’akụkọ ihe mere eme, ọgbọ nke malitekwara na narị afọ ise gara aga mgbe mgbasa nke Europe malitere abịawo ná njedebe ugbu a.”
Ka alaeze ukwu dị iche iche dara, mba ndị nweere onwe ha weghaara ọnọdụ ha—ọtụtụ n’ime ha nwere ụdị ọchịchị onye kwuo uche ya. Ọtụtụ mgbe, a gbara mgba dị egwu megide ọchịchị onye kwuo uche ya, dị ka mmegide ndị sitere n’aka ọchịchị aka ike ndị dị na Europe na Esia n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Ọchịchị ndị a gbochiri mmadụ inwere onwe ya, ha nọgidekwara na-achịkwa akụ̀ na ụba, usoro mgbasa ozi, na ndị agha, n’ụzọ siri ike. E mesịrị gbochie mgbalị ha mere ịchị ụwa, ma, ọ bụ nanị mgbe e mefusịrị nnukwu ego ma gbuo ọtụtụ ndị.
Narị Afọ nke Agha
N’ezie, ihe mere kpọmkwem ka narị afọ nke 20 pụọ iche na narị afọ nile gara aga bụ agha. Banyere Agha Ụwa Mbụ, onye Germany na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Guido Knopp na-ede, sị: “August 1, 1914: Ọ dịghị onye ọ gbatara n’uche na narị afọ nke 19, bụ́ nke ndị Europe nwere oge udo dị ogologo na ya, gwụsịrị n’ụbọchị ahụ; ọ dịghịkwa onye matara na narị afọ nke 20 malitere nnọọ kpọmkwem n’oge ahụ—na-enwe oge agha dịruru iri afọ atọ ma na-egosi ihe mmadụ pụrụ ime mmadụ ibe ya.”
Hugh Brogan, bụ́ prọfesọ akụkọ ihe mere eme, chetaara anyị na “ọ dịghị ọnụ e ji ekwu njinji jiri na United States n’ihi agha ahụ, ọ dị egwu, ọ ka na-emetụtakwa ndị mmadụ taa [na 1998].” Otu prọfesọ akụkọ ihe mere eme na Mahadum Harvard, bụ́ Akira Iriye, dere, sị: “Agha Ụwa Mbụ bụ ihe omume dị ịrịba àmà n’ọtụtụ ụzọ n’akụkọ ihe mere eme nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Esia nakwa na nke United States.”
N’ụzọ kwere nghọta, The New Encyclopædia Britannica kpọrọ agha ụwa mbụ na nke abụọ ahụ “oge oké mgbanwe n’ihe banyere mmetụta nke ọnọdụ mba nwere n’ebe ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya dị na narị afọ 20.” Ọ na-ekwu na “Agha Ụwa Mbụ dugara n’ọdịda nke usoro ọchịchị nke ndị eze ukwu anọ . . . , kpata Mgbanwe Ọchịchị Bolshevik na Russia, . . . tọọkwa ntọala Agha Ụwa nke Abụọ.” Ọ na-agwakwa anyị na ‘ogbugbu, oké mgbupịa, na mbibi nke agha ụwa ndị ahụ fọrọ nke nta ka ha ghara inwe atụ.’ Guido Knopp na-ekwukwa, sị: “Obi ọjọọ na ime ihe ike nke mmadụ gabigara ókè. Site n’agha ndị ahụ . . . a malitere ọgbọ nke weere mmadụ dị ka ngwá ọrụ, ọ bụghị dị ka mmadụ.”
Iji gbochie ajọ agha ndị ọzọ dị ka ndị ạ, e guzobere Njikọ Mba Nile na 1919. N’ịbụ nke na-emezughị nzube ya nke ichekwa udo ụwa, e jiri òtù Mba Ndị Dị n’Otu dochie anya ya. Ọ bụ ezie na òtù UN nwere ihe ịga nke ọma n’igbochi agha ụwa nke atọ, o nweghị ike igbochi Agha Nzuzo, bụ́ nke na-eyi egwu ịkawanye njọ ruo n’ókè nke ịghọ oké mgbukpọ e ji ngwá agha nuklia mee ruo ọtụtụ iri afọ. O gbochibeghịkwa ntakịrị agha ndị a na-alụ gburugburu ụwa, dị ka nke na-aga n’ihu n’ógbè Balkan.
Ka ọnụ ọgụgụ mba ndị dị n’ụwa rịworo elu, otú ahụ kwa ka nsogbu ime ka e nwee udo n’etiti ha rịworo. Ntụnyere e ji map e nwere tupu Agha Ụwa Mbụ tụnyere nke oge a na-ekpughe na ná mmalite narị afọ a, ọ dịkarịa ala mba Africa 51 na mba Esia 44 ndị dị taa adịbughị. N’ime mba 185 so n’òtù Mba Ndị Dị n’Otu ugbu a, 116 abụghị mba nweere onwe ha mgbe e guzobere ya na 1945!
“Otu n’Ime Ihe Omume Ndị Kasị Dị Ịtụnanya”
Ka narị afọ nke 19 ahụ na-agwụsị, Alaeze Ukwu Russia bụ ọchịchị kasị ukwuu n’ụwa. Ma nkwado ọ na-enweta na-ebelata n’ike n’ike. Dị ka Geoffrey Ponton na-ede akwụkwọ si kwuo, ọtụtụ ndị chere na “mgbanwe dị mkpa karịa ndozi.” Ọ na-ekwukwasị: “Ma o were otu nnukwu agha, bụ́ Agha Ụwa Mbụ, na ọgba aghara ọ kpatara, iji weta ezi mgbanwe.”
Mweghara Ọchịchị Bolshevik weghaara ọchịchị Russia n’oge ahụ tọrọ ntọala nke alaeze ukwu ọhụrụ—Ọchịchị Kọmunist ụwa nke Soviet Union kwadoro. Ọ bụ ezie na e guzobere Alaeze Ukwu Soviet n’oge agha zuru ụwa ọnụ, ọ daghị n’agha ahụ. Down With Big Brother, bụ́ akwụkwọ Michael Dobbs dere, na-ekwu na mgbe ọ na-erule ngwụsị afọ ndị 1970, Soviet Union bụ “alaeze ukwu ọtụtụ mba mejupụtara nke nọworo na-ada ada n’ụzọ na-enweghị mmekwata.”
Ka o sina dị, ọ dara na mberede. Akwụkwọ bụ́ Europe—A History, nke Norman Davies dere, na-ekwu, sị: “Ọ̀tụ̀tụ̀ o ji daa n’ike karịrị ọdịda ndị ọzọ nile dị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme nke Europe,” ‘ọ dakwara n’onwe ya.’ N’ezie, “mbilite, mgbasa na ọdịda nke Soviet Union,” ka Ponton na-ekwu, bụ “otu n’ime ihe omume ndị kasị dị ịtụnanya nke narị afọ nke iri abụọ.”
N’ezie, ọdịda Soviet Union bụ nanị otu n’ime ọtụtụ mgbanwe ndị kasị ukwuu e nwere na narị afọ nke 20 nke kpataworo ọtụtụ ihe. Otú ọ dị, mgbanwe ọchịchị abụghị ihe ọhụrụ. A na-enwe ha eri ọtụtụ puku afọ.
Otú ọ dị, otu mgbanwe ọchịchị e nwere na narị afọ nke 20 kasị dị ịrịba ama. Ihe mgbanwe a bụ na otú o si metụta gị bụ ihe ọzọ a ga-atụle.
Otú ọ dị, ka anyị buru ụzọ tụlee ụfọdụ ihe ndị sayensị rụzuru na narị afọ nke 20. Banyere ihe ndị a, Prọfesọ Michael Howard na-ekwubi, sị: “Ndị Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe na Ebe Ugwu America yiri ka ha nwere ezi ihe mere ha ga-eji were narị afọ nke 20 dị ka mmalite nke ọgbọ ọhụrụ ga-eweta obi ụtọ n’akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ.” Ọganihu ndị a hà ga-eduga n’ihe a kpọrọ ndụ dị mma?
[Chaatị/Foto ndị dị na peeji nke 2-7]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
1901
Eze nwanyị Victoria anwụọ mgbe ọ chịsịrị afọ 64
Mgbe ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa dị ijeri 1.6
1914
E gbuo Archduke Ferdinand. Agha Ụwa Mbụ etiwapụ
Eze ukwu ikpeazụ nke Russia, bụ́ Nicholas nke Abụọ, na ezinụlọ ya
1917
Lenin akpata mgbanwe ọchịchị na Russia
1919
E guzobe Njikọ Mba Nile
1929
Ndakpọ nke ụlọ ahịa ego United States eduga n’Oké Ndakpọ Akụ̀ na Ụba
Gandhi anọgide n’ọgụ ọ na-alụ maka nnwere onwe India
1939
Adolf Hitler awakpoo Poland, malite Agha Ụwa nke Abụọ
Winston Churchill aghọọ praịm minista Great Britain na 1940
Oké Mgbukpọ ahụ
1941
Japan atụọ bọmbụ na Pearl Harbor
1945
United States atụọ bọmbụ atọm na Hiroshima nakwa na Nagasaki. Agha Ụwa nke Abụọ ebie
1946
Òtù Mba Ndị Dị n’Otu enwee nzukọ ezumezu mbụ ya
1949
Mao Tse-tung akpọsaa People’s Republic of China
1960
E kepụta mba Africa 17 ọhụrụ
1975
Agha Vietnam ebie
1989
A kwatuo Mgbidi Berlin ka Ọchịchị Kọmunist dakpọrọ
1991
Soviet Union ekewasịa