Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g00 3/8 p. 30
  • ‘Ụwa Anyị Ga-adị Iche’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Ụwa Anyị Ga-adị Iche’
  • Teta!—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Jehova Emerie N’ikpe E kpewere Kemgbe Ọtụtụ Afọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ndịàmà Jehova Nọ na Russia—Echiche Onye Ọka Mmụta Okpukpe
    Teta!—1997
  • Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi Russia Etoo Ndịàmà Jehova
    Teta!—1998
  • Gịnị Bụ Ọdịnihu Dịịrị Okpukpe?
    Teta!—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2000
g00 3/8 p. 30

‘Ụwa Anyị Ga-adị Iche’

Mgbalị e mere ịkagbu mgbakọ Ndịàmà Jehova na Moscow n’August gara aga dọọrọ uche ọtụtụ ndị. Andrei Zolotov, Jr., kọrọ na The Moscow Times nke August 21, 1999, na “Vladimir Kozyrev, osote onye ntụzi nke ámá egwuregwu ahụ, kwuru na ndị nlekọta nke ebe ahụ adịghị emegide Ndịàmà Jehova inwe nzukọ ha. O kwuru na ya amaghị ebe iwu [ịkagbu ya] sitere.”

N’ime otu akwụkwọ ozi e bipụtara na The Moscow Times otu izu ka e mesịrị, otu onye gụrụ ya toro akwụkwọ akụkọ ahụ maka ibipụta isiokwu ahụ “kọrọ ihe nile otú ha dị n’ezie” ma kwuo na “o kwesịrị n’ezie ka ndị mmadụ gụọ ya.” O kwuru, sị: “Akụkọ unu banyere nsogbu dị ukwuu Ndịàmà Jehova chere ihu n’ịkwadebe maka mgbakọ ha na-enwe kwa afọ [kpughere] mmeso dị njọ a na-emeso ha.”

Mgbe ahụ onye dere akwụkwọ ozi ahụ kwuru na Ndịàmà Jehova “bụ ndị a maara nke ọma n’ụwa nile (nakwa na Russia ugbu a) . . . A maara . . . ha . . . nke ọma dị ka ndị ezigbo mmadụ, ndị nwere obi ọma, na ndị dị umeala n’obi bụ́ ndị ọ dị mfe isoro mekọọ ihe, ha adịghị arụgide ndị ọzọ ma ọlị ma na-achọ udo mgbe nile ná mmekọrịta ha na ndị ọzọ n’agbanyeghị nkwenkwe okpukpe ha ma ọ bụ nke ndị Kraịst Ọtọdọks, ndị Alakụba ma ọ bụ ndị Buddha. E nweghị ndị na-eri ngo, ndị aṅụrụma ma ọ bụ ndị na-aṅụ ọgwụ ọjọọ n’etiti ha, ihe kpatara ya dokwara anya: Ha na-agbalị nnọọ ịbụ ndị nkweta ha ndị dabeere na Bible na-eduzi n’ihe ọ bụla ha na-eme ma ọ bụ na-ekwu. Ọ bụrụ na mmadụ nile nọ n’ụwa na-agbalịtụ ibi ndụ kwekọrọ na Bible dị ka Ndịàmà Jehova na-eme, ụwa anyị a nwere obi ọjọọ gaara nnọọ adị iche.”

Ndị ọchịchị ndị nyochaworo ihe banyere Ndịàmà Jehova ma soro ha mekọọ ihe n’onwe ha na-akwado nkọwa ahụ dị n’elu. Dị ka ihe atụ, ndị ọchịchị dị otú ahụ, nyere Ndịàmà ikike iwu ọmarịcha Ụlọ Mgbakọ ọhụrụ a dị na St. Petersburg, Russia. N’oge a raara ya nye na September 18 gara aga, mmadụ 2,257 ji ọṅụ na-ekiri ihe na-emenụ jupụtara ụlọ ahụ, mmadụ 2,228 ọzọkwa gere ntị n’usoro ihe omume ahụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị na St. Petersburg nakwa n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Solnechnoye dị nso.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya