Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g00 10/8 p. 31
  • Ị Gaghị Achọ Ka Ọ Kwaa Gị!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị Gaghị Achọ Ka Ọ Kwaa Gị!
  • Teta!—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Bịa Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ị̀ Dị Njikere Ịga?
    Teta!—2005
  • Ị Gaghị Achọ Ka Ọ Kwaa Gị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ị̀ Ga-anọ n’Ebe Ahụ?
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2000
g00 10/8 p. 31

Ị Gaghị Achọ Ka Ọ Kwaa Gị!

KA GỊNỊ kwaa gị? Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-eme Okwu Chineke” nke Ndịàmà Jehova! A na-enwe usoro mgbakọ a, bụ́ nke ga-amalite n’October na Nigeria n’ọtụtụ narị obodo ukwu n’ụwa nile. N’ihe ka n’ọtụtụ ebe, ihe omume ga-eji olu ụtọ malite n’ụtụtụ Friday na 9:30.

Mgbe a malitesịrị ya site n’ịgba ume ka a ṅaa ntị n’ihe Okwu Chineke na-ekwu, ihe omume ahụ ga-aga n’ihu site n’okwu bụ́ “Nwee Obi Ụtọ n’Ihi Ịdị Mma Jehova” na “Nọgidesie Ike Dị Ka Ị Na-ahụ Onye ahụ A Na-apụghị Ịhụ Anya.” Mgbe nke ahụ gasịrị a ga-emechi ihe omume nke ụtụtụ ahụ site n’okwu bụ́ isi nke mgbakọ ahụ, bụ́ “Toonụ Jehova—Onye Na-eme Ihe Ndị Dị Ebube.”

Usoro isiokwu nwere akụkụ atọ banyere ụzọ isi họrọ onye òtù ọlụlụ, iwulite ezinụlọ siri ike n’ụzọ ime mmụọ, na ịkụziri ụmụaka ịhụ Jehova n’anya ga-esochi okwu mbụ nke nnọkọ ehihie, bụ́ “Ike Agwụla Gị n’Obi Ime Ihe Ọma.” Okwu mmechi nke ụbọchị ahụ, bụ́ “Isoro Nzukọ Jehova Na-aga Ụkwụ na Ụkwụ,” ga-atụleghachi ọganihu a nọgidere na-enwe n’oge a nke metụtara nghọta e nwere banyere nzube Chineke.

Ihe omume nke ụtụtụ Saturday ga-enwe usoro isiokwu nke abụọ nke nwere akụkụ atọ, a kpọrọ ya “Ndị Ozi nke Okwu Chineke.” Nke a ga-atụ aro otú anyị ga-esi na-arụ ọrụ anyị nke ime ndị na-eso ụzọ. Mgbe nke ahụ gasịrị a ga-ekwu okwu na-akpali akpali bụ́ “Emenyeghị Chineke Ihere.” Mgbe nke ahụ gasịrị a ga-enwe okwu baptism, a ga-enyekwa ndị ruru eru ohere ịbụ ndị e mere baptism.

N’ehihie, usoro isiokwu nke atọ nke nwere akụkụ atọ ga-akọwa isiokwu bụ́ “Rụsie Ọrụ Ike Iji Zụlite Iji Ihe Ime Mmụọ Akpọrọ Ihe,” bụ́ mgbe a ga-atụ aro bara uru banyere ụzọ isi zụlite iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. A ga-emechi nnọkọ ahụ site n’okwu na-enye ihe ọmụma bụ́ “Ịga Ije n’Ìhè Okwu Chineke nke Na-enwuwanye Enwu.” Ọ ga-atụle Aịsaịa isi nke 25 na 26, ọ ga-akọwakwa otú anyị pụrụ isi ghọta akwụkwọ a na-adọrọ nnọọ mmasị dị na Bible.

N’ụtụtụ Sunday a ga-enwekwa usoro isiokwu ikpeazụ nwere akụkụ atọ isiokwu ya bụ “Amụma Bara Uru nke Zefanaịa Maka Ndị Na-eme Uche Chineke.” Ọ ga-akọwa otú amụma ahụ si mezuo n’oge ochie n’isi mba Juda na otú o si emezu n’oge anyị, karịsịa n’isi okpukpe dị iche iche nke ụwa a. Mgbe nke ahụ gasịrị, ị ga-ele ihe nkiri a ga-eji ejiji mgbe ochie zuru ezu na ya, nke isiokwu ya bụ “Ihe Atụ Ịdọ Aka ná Ntị Maka Ụbọchị Anyị,” bụ́ nke ga-atụle omume rụrụ arụ nke ndị ikom Israel mere kpọmkwem tupu ụmụ Israel abanye n’Ala Nkwa ahụ. Akụkụ nnọkọ ikpeazụ nke mgbakọ ahụ n’ehihie Sunday ga-abụ okwu ihu ọha, bụ́ “Ihe Mere A Ga-eji Na-echebara Oké Ọrụ Nile nke Chineke Echiche.”

Mee ndokwa ugbu a ka i wee gaa ya ụbọchị atọ ahụ dum. Iji mata ebe kasị gị nso a ga-enwe ya, gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè unu ma ọ bụ detara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ. E nwere ndepụta nke ebe nile a ga-enwe mgbakọ na Nigeria ná mbipụta Ụlọ Nche nke May 1, bụ́ magazin a na-ebipụtakọ ya na nke a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya