Bịa Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke”!
ỌTỤTỤ nde mmadụ ga-anọ ya n’ọtụtụ narị ebe a ga-eme ya n’ụwa nile. Na Nigeria nanị, e dokwara mgbakọ 110. Nke mbụ ga-abụ n’October 10-12, 1997, nke ikpeazụ ga-abụkwa na January 16-18, 1998. O yikarịrị ka otu n’ime mkpọkọta ụbọchị atọ ndị a—Friday ruo Sunday—ga-abụ n’obodo ukwu na-adịghị anya site n’ebe i bi.
Ị ga-erite uru site n’ụba ntụziaka Bible dị irè. Usoro ihe omume ahụ ga-eji olu ụtọ malite n’ụtụtụ Friday na 9:20. Na Saturday na Sunday usoro ihe omume ga-eji olu ụtọ malite na 9:00 kwa ụtụtụ. Ụtụtụ Friday ga-enwe minit 25 nke ajụjụ ọnụ a ga-agba ndị mmadụ ndị okwukwe ha n’Okwu Chineke metụtaworo ndụ ha n’ụzọ miri emi. Nnọkọ mbụ ahụ ga-eji okwu bụ́ isi, “Isite n’Okwukwe Na-ejegharị, Ọ Bụghị n’Ọhụhụ Ụzọ” mechie.
Okwu mbụ n’ehihie Friday ga-atụle òkè dị mkpa ndị ntorobịa na-ekere n’ọgbakọ ndị Kraịst. Usoro isiokwu na-esonụ nke nwere akụkụ atọ ga-atụle ụkpụrụ Bible dị ka ha si emetụta àgwà ndị Kraịst n’okwu, omume, na ọdịdị onwe onye. Okwu ndị ga-esochi bụ́ “Kpachara Anya Banyere Enweghị Okwukwe” na “Okwu Chineke Dị Ndụ” na-elekwasị anya na ndụmọdụ ọma ahụ dị ná Ndị Hibru isi nke 3 na 4. Usoro ihe omume Friday ga-emechi n’okwu bụ́ “Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile.”
Okwu mbụ n’ụtụtụ Saturday bụ “Okwukwe Bụ Ihe Nwụrụ Anwụ ma Ọrụ Adịghị Ya.” Okwu ọzọ dị mkpa n’ụtụtụ ahụ, “Gbanye Mkpọrọgwụ ma Guzosie Ike n’Eziokwu Ahụ,” na-akọwa ụzọ a pụrụ isi too eto n’ime mmụọ. Nnọkọ ahụ ga-eji otu ihe na-adị ná mgbakọ nile mechie, “Okwukwe n’Okwu Chineke Na-eduje na Baptism,” nke ndokwa maka ime ndị ọhụrụ na-eso ụzọ baptism ga-esochi ma ọ gasịa.
Okwu mmeghe n’ehihie Saturday, “Na-agbasi Mgba Ike n’Ihi Okwukwe Ahụ,” na-atụle ndụmọdụ dị ike nke akwụkwọ Bible bụ́ Jud. Usoro isiokwu ga-ewe otu hour nke isiokwu ya bụ́ “Ka Anyị Jee n’Ụlọ Jehova” ga-atụle abamuru nke nzukọ ndị Kraịst. Usoro ihe omume ụbọchị ahụ ga-emechi n’okwu bụ́ “Ọdịdị nke Okwukwe Gị—A Na-anwale Ya Ugbu A.”
Usoro ihe omume ụtụtụ Sunday nwere usoro isiokwu nwere akụkụ atọ nke ga-atụle akwụkwọ Bible bụ́ Joel, gụnyekwara otú o si emetụta ụbọchị anyị. Ihe na-esochizi bụ ihe nkiri Bible isiokwu ya bụ́ “Ka Anya Gị Na-ele Otu Ebe.” Ihe dị oké mkpa ná mgbakọ ahụ bụ okwu ihu ọha ehihie ahụ, “Okwukwe na Ọdịnihu Gị.”
N’ezie ị ga-abakwu ụba n’ime mmụọ site n’ịnọ ya. A ga-eji obi ụtọ nabata gị ná nnọkọ nke ọ bụla. Mee atụmatụ ugbu a ịga. Maka ebe kasị nso n’ebe i bi, kpọtụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị ma ọ bụ degara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ. I nwekwara ike ịchọta ebe nile a ga-enwe mgbakọ na Nigeria ná mbipụta Teta! nke June 8.