Mgbakọ “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke 1998-1999 Dị Nso!
NA NIGERIA nanị, e mere ndokwa mgbakọ 108 site n’October 1998 ruo January 1999. O yikarịrị ka otu n’ime mgbakọta ụbọchị atọ ndị a ga-abụ n’obodo na-adịghị anya site n’ebe i bi. N’ọtụtụ ebe, usoro ihe omume ahụ ga-eji olu ụtọ malite n’elekere 9:20 ụtụtụ Friday. Na Saturday na Sunday, usoro ihe omume ga-eji olu ụtọ malite n’elekere 9:00 ụtụtụ.
Usoro ihe omume ụtụtụ Friday ga-eme ka akụkọ banyere ọganihu nke nkwusa Alaeze n’akụkụ dị iche iche nke ụwa pụta ìhè. Okwu bụ́ isi bụ́ “Ihe Mgbapụta Kraịst—Ụzọ Nzọpụta nke Chineke” ga-emesi isiokwu nke mgbakọ ahụ ike.
N’ehihie usoro isiokwu, bụ́ “Nne na Nna—Kụnyenụ Ụzọ Chineke n’Ime Ụmụ Unu,” ga-atụ aro ụzọ a ga-esi kwalie ndị na-eto eto ịhụ Jehova n’anya na ijere ya ozi. Usoro ihe omume nke ehihie ga-eji okwu bụ́ “À Na-adị Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?” mechie.
Usoro ihe omume nke ụtụtụ Saturday na-enwe akụkụ atọ ndị na-esochi ibe ha nke ọrụ ime ndị na-eso ụzọ nke Ndịàmà Jehova, bụ́ “Inyere Ndị Mmadụ Aka Ịbata n’Ụzọ Na-eduga ná Ndụ,” “Ihe Ịma Aka nke Ijekwuru Ndị Mmadụ,” na “Izi Ndị Na-eso Ụzọ Ihe Nile Kraịst Nyere n’Iwu.” Ná mmechi nke usoro ihe omume nke ụtụtụ, a ga-enwe ndokwa maka ndị ọhụrụ na-eso ụzọ ịbụ ndị e mere baptism.
Okwu mmeghe ehihie Saturday, bụ́ “Ije Ozi n’Olileanya nke Ndụ Na-enweghị Ngwụsị,” na-agba anyị ume iji ekpere chebara ihe mere anyị ji ejere Chineke ozi echiche. Okwu ndị bụ́ “Inwe Ekele Maka ‘Onyinye n’Ụdị Mmadụ,’ Bụ́ Ndị Na-ezi Ụzọ Chineke” na “Ụdị Mmadụ—Yipụ nke Ochie Ma Yikwasị nke Ọhụrụ” na-eme nnyocha na-enye ihe ọmụma nke amaokwu ruo n’amaokwu nke Ndị Efesọs isi nke 4. Ọzọkwa, a ga-enye ndụmọdụ dị mma dabeere n’Akwụkwọ Nsọ n’okwu bụ́ “Debe Onwe Gị n’Enweghị Ntụpọ Site n’Ụwa” nakwa n’usoro isiokwu nwere akụkụ atọ bụ́ “Ndị Ntorobịa—Gbasoonụ Ụzọ Chineke.” Usoro ihe omume nke ehihie ejiri okwu bụ́ “Onye Okike—Àgwà Ya na Ụzọ Ya Nile” mechie.
Usoro ihe omume nke ụtụtụ Sunday na-enwe usoro okwu nwere akụkụ atọ ndị ga-ekwu banyere isiakwụkwọ ndị ikpeazụ nke akwụkwọ Bible bụ́ Ezikiel nakwa ihe amụma ha pụtara. Ihe ga-emechi usoro ihe omume nke ụtụtụ ahụ bụ ihe nkiri a ga-eyi uwe ihe nkiri zuru ezu mee bụ́ nke dabeere n’ikwesị ntụkwasị obi nke ndị ntorobịa Hibru atọ ahụ. Isi ihe nke mgbakọ ahụ n’ehihie bụ okwu ihu ọha, bụ́ “Nanị Ụzọ Na-eduga ná Ndụ Ebighị Ebi.”
N’ezie ị ga-abakwu ụba n’ụzọ ime mmụọ site n’ịnọ ya n’ụbọchị atọ dum ahụ. E ji obi ụtọ anabata gị ịnọ ya ná nnọkọ nke ọ bụla, bụ́ ndị, n’ezie, a ga-enwe n’anaghị gị ego. Maka ebe kasị nso n’ebe i bi, kpọtụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị ma ọ bụ degara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ.