Olee Otú E Si Akwalite “Àgwà Agụghị Ọnwụ n’Oké Ihe”?
“Ọtụtụ kilomita na-ekewapụ ụmụaka ndị Kosovo gbara ọsọ ndụ nwere mkpasasị uche pụọ n’ebe ụmụaka America a na-emeso ihe ike, ndị na-enwekwa ahụmahụ ndị ọzọ na-egbu mgbu, nọ, ma ọdịiche dị ná mmetụta uche ha na-enwe nwere ike ghara ibu oké ibu.”—Marc Kaufman, The Washington Post.
Ma ọ̀ masịrị anyị ma ọ bụ na ọ masịghị anyị, ọnwụ na-emetụta anyị nile n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. Nke a bụ eziokwu n’agbanyeghị ebe anyị bi—ná mba agha kpụ ọkụ n’ọnụ tisasịrị ma ọ bụ ná nke nwetụrụ udo.
A PỤRỤ ịhụ ngosipụta nke “àgwà agụghị ọnwụ n’oké ihe” n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ịda mbà n’obi, nhụjuanya, ọgwụ iri ahụ, isikwopụ afọ ime, àgwà ibibi onwe onye, mmadụ igbu onwe ya, na igbu mmadụ n’ìgwè e nwere taa. Prọfesọ Michael Kearl, nke Ngalaba Nkà Mmụta Mmekọrịta Ọha na Eze na Nkà Mmụta Maka Ụmụ Mmadụ na Mahadum Trinity dị na San Antonio, Texas, U.S.A., kọwara ụzọ aghụghọ e si jiri okwu metụtara ọnwụ na-eme ihe, sị: “Anyị lee anya n’ihe ndị mere ná ngwụsị narị afọ nke iri abụọ [1999], anyị ga-ahụ na . . . ọnwụ aghọwala ihe a na-anakwere dị ka ebe ndụ, ume, na mmekọrịta ọha na eze hiwere isi. Ọnwụ na-akwalite okpukpe anyị, nkà ihe ọmụma, echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nkà na ọgwụgwọ ọrịa. Ọ na-eme ka a na-erepụ akwụkwọ akụkọ na akwụkwọ nkwekọrịta inshọransị, na-akwalite mmepụta nke ihe omume telivishọn, . . . ọbụnakwa na-enye ụlọ mmepụta ngwá ahịa anyị dị iche iche ihe mkpali.” Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ nke otú e si egosipụta ihe ijuanya a a na-akpọ àgwà agụghị ọnwụ n’oké ihe, n’oge anyị.
Ire Ngwá Agha
A na-egosipụta “àgwà agụghị ọnwụ n’oké ihe” kwa ụbọchị site n’ire ngwá agha. A na-eji ngwá agha egbu ndị agha, ma ha na-egbukarị ndị nkịtị, gụnyere ndị inyom na ụmụaka na-enweghị ihe ha mere. N’agha, ma ọ̀ bụ nke obodo ma ọ bụ na ọ bụghị, ndụ na-abụkarị ihe a na-ejighị akpọrọ ihe. Ọ̀ bụ ego ole ka mgbọ onye e goro igbu mmadụ ma ọ bụ nke onye nọ n’ebe nzuzo gbaa mmadụ égbè na-ada?
Mfe ọ na-adịrị ọha na eze inweta ngwá agha ná mba ụfọdụ akpatawo oké ịrị elu na-adịgide adịgide nke ọnwụ ndị mmadụ na nke ìgwè mmadụ dị iche iche. Mgbe a gbagbusịrị ndị mmadụ n’otu ụlọ akwụkwọ dị elu na Littleton, Colorado, e nwere mkpesa dị iche iche n’ihi ire ngwá agha ebe nile na nnweta ụmụaka na-enweta ha n’ụzọ dị mfe. Ọnụ ọgụgụ ndị na-eto eto na-anwụ ọnwụ ike na United States karịrị akarị—dị ka magazin bụ́ Newsweek si kwuo, a na-enwe nkezi nke mmadụ 40 kwa izu. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 90 n’ime ndị a bụ ndị a gbagburu agbagbu. Nke a na mgbuchapụ 150 ndị a na-eme kwa afọ, ndị dị ka nke ahụ mere na Littleton, ha nhata!
Ndị Na-emepụta Ihe Ntụrụndụ
Ihe nkiri sịnịma na-eji okwu metụtara ọnwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Dị ka ihe atụ, ihe nkiri pụrụ ime ka omume rụrụ arụ, ime ihe ike, ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụ ime mpụ a haziri ahazi yie ihe na-akpali akpali wee si otú a na-eme ka a ghara ijicha ndụ na-akpọrọ ihe, na-emebikwa ụkpụrụ omume ọma. E nwere ihe nkiri ndị na-eme ọbụna ka ọnwụ bụrụ ihe e ji ama dike—na-egosi echiche ụgha nke ịdị ndụ mgbe a nwụsịrị na nlọghachi nke a na-eche na ụfọdụ na-alọghachi ileta ndị dị ndụ—na-eme nanị ka ọnwụ bụrụ ihe na-enweghị ihe ọ bụ.
Otú ahụ ka ọ dịkwa ụfọdụ ihe omume telivishọn na egwú. Dị ka akụkọ si kwuo, ụmụaka ahụ gburu ndị mmadụ na Littleton nwere mmasị dị ukwuu n’ebe otu onye na-akụ egwú rock nọ, bụ́ onye ghọworo onye a ma ama n’ihi “ihe ngosi, ndị ọ na-abụ e metụ ka ndị ikom e metụkwa ka ndị inyom nwere obi ọjọọ, na ha,” nakwa n’ihi egwú ya ndị nwere “isiokwu ndị na-ekwu banyere nnupụisi na ọnwụ.”
Na United States, e mere ka iwu metụtara ihe omume telivishọn e kwesịrị ikiri sikwuo ike, iji mee ka ndị na-eto eto ghara ikiri ihe ndị pụrụ imebi ha. Ọ dịbeghị ezigbo ihe si na ya pụta. Mgbe ọ na-ede ihe na Newsweek, Jonathan Alter kwuru na nke a “pụrụ ime ka ụmụaka chọkwuo ikiri ihe ndị rụrụ arụ.” O kwukwara na iji menye ndị na-ewebata ime ihe ike n’usoro mgbasa ozi ihere ma manye ha ibelata ya, President Clinton aghaghị “ịkpọrọ ọha na eze aha nnukwu ụlọ ọrụ nile (na ndị isi ha)” bụ́ ndị na-emepụta ọ bụghị nanị ihe nkiri sịnịma ndị a na-ama mmadụ mma na ha na egwú ‘rap nke òtù ndị omempụ’ kamakwa egwuregwu kọmputa ndị na-eme ka ‘ọ fọdụ nke nta ka ụmụaka na-egbu ndị mmadụ n’ezie.’
Ọnwụ n’Egwuregwu Vidio na n’Internet
N’akwụkwọ ya bụ́ The Deathmatch Manifesto, Robert Waring na-akọwa otú egwuregwu ebe mmadụ abụọ na-achọ igburịta onwe ha si ewuru ndị nọ n’oge uto.a Maazị Waring kwenyere na e nwewo ọtụtụ ndị na-egwu egwuregwu a na nzuzo. N’ezie, egwuregwu ndị a na-enwe mmetụta, ọ bụghị nke izi ezigbo ihe, kama nke ịkụzi otu e si egbu mmadụ. “Iso onye si n’ebe ọ bụla n’ụwa egwu egwuregwu ma na-agbalị igosi ihe ị pụrụ ime, bụ ahụmahụ na-akpali akpali. N’ezie, ọ dị mfe ịbụ onye a rabanyere na ya,” ka Waring na-ekwu. Mkpali nke ebe ndị dị ka hà dị adị n’ezie bụ́ ndị e mere maka ịnọ lụọ ọgụ ndị a na-awụfu ọbara na ha, na-adọrọcha uche ndị nọ n’oge uto. N’ịbụ ndị na-enweghị Internet, ụfọdụ na-azụrụ ihe e ji eme egwuregwu vidio bụ́ nke ha ga-eji mee egwuregwu na telivishọn ha n’ụlọ. Ndị ọzọ na-agakarị n’ebe e mepere maka ọha na eze bụ́ ebe ha na-akwụ ụgwọ iji nweta ngwá egwuregwu vidio ma jiri ya lụọ ihe ‘na-afọ nke nta’ ka ọ bụrụ ọgụ ndị mmadụ na-egburịta onwe ha na ya.
Ọ bụ ezie na a na-ahazi egwuregwu ndị “a na-egburịta mmadụ na ha” na-adabere n’afọ ndụ nke onye na-egwu ha, eziokwu dị na ya bụ na a na-eme ihe dị nta iji chịkwaa ha. Eddie dị afọ 14 si United States kwuru, sị: “Ndị mmadụ ga-agwa gị na i torubeghị, ma ha agaghị egbochi gị ịzụrụ [ngwá egwuregwu ahụ].” Nke a na-agba égbè aghara aghara na ya na-amasị ya. Ọ bụ ezie na ndị mụrụ ya maara banyere nke a ma bụrụ ndị na-enweghị mmasị na ya, ha adịghị emekarị nchọpụta iji mara ma ọ̀ na-egwu egwuregwu ahụ. Otu onye nọ n’afọ iri na ụma ruru ná nkwubi okwu a: “Ọgbọ anyị kasị ọgbọ ọ bụla ọzọ bụrụ nke ime ihe ike na-adịghị emetụ n’ahụ. TV na-azụ ụmụaka ugbu a karịa ndị mụrụ ụmụ, telivishọn na-emekwa ka ụmụaka nwee echiche efu banyere ime ihe ike.” John Leland, mgbe ọ na-ede ihe na Newsweek, kwuru, sị: “Ka ihe ruru nde 11 nke ndị nọ n’afọ iri na ụma ji kọmputa eme ihe ugbu a [na United States], ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ agakwughị amatụ ụdị ndụ ụmụ ha ndị nọ n’oge uto na-ebi.”
Ụzọ Ndụ nke Na-eduba n’Ọnwụ
Gịnị banyere omume ndị a na-esighị n’egwuregwu ndị “a na-egburịta mmadụ na ha” na ihe nkiri ndị a na-eme ihe ike na ha, mụta? Ọ bụ ezie na n’ìhè, ọ dịghị mkpa anyị na ndị gbapụrụ iche ná mmadụ ịsọrịta ajọ mpi iji mara onye ga-egbu ibe ya, ụzọ ọtụtụ ndị si ebi ndụ na-agụnye omume nke mmadụ igbu onwe ya. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị ndị òtù ezinụlọ, ụlọ ọrụ ahụ ike dị iche iche, na ndị ọzọ na-adọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ dị n’ise siga na ịṅụ ọgwụ ọjọọ, omume ndị a na-anọgide na-aga n’ihu. Ọtụtụ mgbe ha na-akpata ọnwụ nnwụchu. Iji nwekwuo uru na-ezighị ezi, ụlọ ọrụ azụmahịa na ndị na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ na-anọgide na-eji nchegbu, enweghị olileanya, na ịda ogbenye n’ụzọ ime mmụọ nke ndị mmadụ eme ihe.
Ònye Kpatara Ihe A Nile?
Bible ọ̀ na-egosi ọnwụ dị ka ihe e kwesịri iji na-atụrụ ndụ? Ụzọ ndụ ndị pụrụ iduba anyị n’ọnwụ hà ziri ezi? Ee e. Nye ezi ndị Kraịst, dị ka Pọl onyeozi, ọnwụ abụghị ihe ọzọ ma e wezụga “onye iro.” (1 Ndị Kọrint 15:26) Ndị Kraịst adịghị ele ọnwụ anya dị ka ihe na-adọrọ mmasị na ihe egwuregwu, kama dị ka ihe na-emegide ihe e kere eke, ihe sitere kpọmkwem ná mmehie na ná nnupụisi megide Chineke. (Ndị Rom 5:12; 6:23) Ọ dịghị mgbe ọnwụ bụ akụkụ nke nzube mbụ Chineke maka mmadụ.
E kwuru na Setan nwere “ike nke ọnwụ.” A kpọrọ ya “ogbu mmadụ,” ọ bụchaghị n’ihi na ọ na-eji aka ya kpọmkwem akpata ọnwụ, kama n’ihi na ọ na-eme ya n’ụzọ aghụghọ, site n’ịraba ndị mmadụ ná mmehie, site n’ịkwalite omume na-akpata mbibi na ọnwụ, sitekwa n’itinye àgwà nke igbu ọchụ n’uche na n’obi ndị ikom, ndị inyom, nakwa ọbụna ụmụaka. (Ndị Hibru 2:14, 15; Jọn 8:44; 2 Ndị Kọrint 11:3; Jemes 4:1, 2) Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka ndị na-eto eto ji kasị bụrụ ndị ọ na-elekwasị anya? Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nyere ha aka?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’egwuregwu ndị “a na-egburịta mmadụ na ha,” ka akwụkwọ a na-akọwa, “a na-akpali ndị na-egwu ya igburịta onwe ha n’egwuregwu kọmputa ndị a na-egwu n’ebe yiri ka ọ dị adị n’ezie.”
[Foto dị na peeji nke 7]
“Ọgbọ anyị kasị ọgbọ ọ bụla ọzọ bụrụ nke ime ihe ike na-adịghị emetụ n’ahụ”