Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g01 10/8 p. 18-19
  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Chineke Na-anagide Ihe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Chineke Na-anagide Ihe?
  • Teta!—2001
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Chineke Ji Anagide Ihe?
  • Chineke Onye Ebere, Onye Ndidi
  • Ebe Ndidi Chineke Ga-ejeru
  • Rite Uru Ugbu A Site na Ndidi Chineke
  • Mmadụ Ịnabata Mmadụ Ibe Ya
    Teta!—2015
  • Otú Baịbụl Ga-esi Nyere Anyị Aka Ịna-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Dị Mma
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Ịnagide Ihe—Site n’Otu Akụkụ Gabigara Ókè Gaa n’Ọzọ
    Teta!—1997
  • Ị̀ Na-anagide Ihe n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2001
g01 10/8 p. 18-19

Echiche nke Bible

Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Chineke Na-anagide Ihe?

“CHINEKE, Ọ BỤ EZIE NA Ọ NA-ACHỌ IGOSI IWE YA, NA IME KA A MARA IKE YA, MA O WEERE OGOLOGO NTACHI OBI HIE NNE NAGIDE IHE IWE E DOZIWORO KA HA BAA N’ỊLA N’IYI.”—NDỊ ROM 9:22.

N’AKỤKỌ ihe mere eme nile, Chineke ediwo oké ihe ọjọọ na ajọ omume pụtara ìhè. Ihe karịrị afọ 3,000 gara aga, Job kwara arịrị, sị: “Gịnị mere ndị na-emebi iwu na-adị ndụ, ghọọ okenye, na-abụkwa ndị dị ike bụ́ dimkpa? E mewo ka mkpụrụ ha so ha guzosie ike n’ihu ha, e mewokwa ka ụmụ nke pụtara n’ahụ ha guzosie ike n’anya ha. Ụlọ ha dị n’udo pụọ n’oké egwu, mkpanaka Chineke adịghịkwa n’ahụ ha.” (Job 21:7-9) Ndị ọzọ bụ́ ndị hụrụ ikpe ziri ezi n’anya, dị ka Jeremaịa onye amụma, egosiwokwa nchegbu maka ihe yiri ka ọ bụ nkịtị Chineke na-agbachi ndị ajọ mmadụ.—Jeremaịa 12:1, 2.

Gịnị ka i chere? Ọ̀ na-eju gị anya na Chineke kwere ka ajọ omume dịrị? Ị̀ na-eche mgbe ụfọdụ na Chineke kwesịrị ime ngwa ngwa bibie ndị ajọ mmadụ nile n’egbughị oge? Tụlee ihe Bible na-ekwu banyere ókè Chineke na-anagideru ihe na ihe ndị kpatara ya.

Gịnị Mere Chineke Ji Anagide Ihe?

Anyị aghaghị ibu ụzọ jụọ, sị: Gịnị mere Chineke, onye nwere ụkpụrụ ezi omume ndị kasị elu ji anagide ihe ọjọọ? (Deuterọnọmi 32:4; Habakuk 1:13) Nke a ọ̀ pụtara na ọ na-agbachi ihe ọjọọ nkịtị? Ọ dịghị ma ọlị! Tụlee ihe atụ na-esonụ: Ka e were ya na ọ dị onye dọkịta na-awa ahụ nke na-adịghị agbaso ụkpụrụ ndị bụ́ isi banyere ịdị ọcha, onye na-akpatakwara ndị ọ na-agwọ oké ihe mgbu. Ọ bụrụ na ọ na-arụ ọrụ n’ụlọ ọgwụ, ọ̀ bụ na a gaghị ewepụ ya ozugbo? Ma e nwere ọnọdụ ụfọdụ ndị pụrụ ịchọ ka a nagidekwuo ihe karị. Dị ka ihe atụ, n’ọnọdụ chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa, ikekwe n’ọgbọ agha, ọ̀ bụ na ọ gaghị adị mkpa ka a hapụ ndị dọkịta na-awa ahụ ịrụ ọrụ n’ọnọdụ ndị na-abụchaghị nke ọgbara ọhụrụ ndị dịkwa ize ndụ, ikekwe na-eji ọbụna ngwá ọrụ nakwa ihe ndị e ji awa ahụ ndị a pụrụ iwere dị ka ndị na-adịchaghị mma?

N’ụzọ yiri nke a, taa Chineke ji ndidi na-anagide ọtụtụ ihe ndị na-adịghị amasị ya ma ọlị. Ọ bụ ezie na ọ kpọrọ ajọ omume asị, o kwere ka ọ dịgide ruo nwa oge. E nwere ezi ihe mere o ji mee otú ahụ. Otu ihe bụ na, nke a na-enye ohere iji kpebie kpam kpam ihe iseokwu ndị dị oké mkpa, ndị nnupụisi Setan kpalitere n’ogige Iden. Ndị a bụ ihe iseokwu ndị metụtara izi ezi na ikwesị ekwesị nke ụzọ Chineke si achị. Ọzọ, ya iji ntachi obi na-edi ihe ọjọọ na-enye ndị na-eme ihe ọjọọ oge na ohere iji gbanwee.

Chineke Onye Ebere, Onye Ndidi

Nne na nna anyị mbụ bụ́ Adam na Iv sonyere ná nnupụisi Setan megide Chineke. N’ụzọ ziri ezi, Chineke gaara ebibiworị ha ozugbo. Kama nke ahụ, o gosiri na ya bụ onye ebere na onye ndidi, jiri ịhụnanya nye ha ohere ịmụta ụmụ. Ma ụmụ a, na ezinụlọ dum nke ụmụ mmadụ ndị si ha n’ahụ pụta bụ ndị a mụrụ mgbe ha bụ ndị mmehie.—Ndị Rom 5:12; 8:20-22.

Chineke zubere ịnapụta mmadụ n’ọnọdụ ọjọọ ya. (Jenesis 3:15) Otú ọ dị, ka ọ dịgodị, n’ihi na ọ maara otú ezughị okè anyị ketara site n’aka Adam si emetụta anyị, ọ na-egosi anyị ndidi na ebere dị ukwuu. (Abụ Ọma 51:5; 103:13) Ọ ‘na-aba ụba n’ebere’ ọ dịkwa njikere ma nwee ọchịchọ ‘ịgbaghara mmehie n’ụba.’—Abụ Ọma 86:5, 15; Aịsaịa 55:6, 7.

Ebe Ndidi Chineke Ga-ejeru

Otú ọ dị, ọ ga-abụ enweghị ịhụnanya na ihe ezi uche na-adịghị na ya Chineke ikwere ka ihe ọjọọ dịruo mgbe ebighị ebi. Ọ dịghị nna na-ahụ n’anya nke ga-anọgide na-anagide ihe ọjọọ nke otu n’ime ụmụ ya, bụ́ onye nọgidere mara ụma na-akpatara ndị ọzọ so n’ezinụlọ ya oké ihe mgbu. N’ihi ya, ndidi Chineke n’ịnagide mmehie bụ nke a ga-ejikọta ya na àgwà ndị ọzọ dị ka ịhụnanya, amamihe, na ikpe ziri ezi. (Ọpụpụ 34:6, 7) Ozugbo e mezuru nzube mere o ji na-enwe ogologo ntachi obi, nkịtị ọ na-agbachi ihe ọjọọ ga-akwụsị.—Ndị Rom 9:22.

Pọl onyeozi kọwapụtara nke a n’ụzọ doro anya. “N’ọgbọ nile gara aga,” ka o kwuru n’otu oge, “[Chineke] kwere ka mba nile na-aga n’ụzọ nile nke aka ha.” (Ọrụ 14:16) N’oge ọzọ, Pọl kwuru banyere otú ‘Chineke si lefuru oge nile nke amaghị ihe anya’ n’akụkụ nke ndị nupụworo isi n’iwu ya na ụkpụrụ ya. “Ugbu a,” ka Pọl gara n’ihu ikwu, “[Chineke] na-agwa mmadụ ka ha nile chegharịa n’ebe nile.” N’ihi gịnị? “Ebe o debeworo otu ụbọchị, nke Ọ ga-ekpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume.”—Ọrụ 17:30, 31.

Rite Uru Ugbu A Site na Ndidi Chineke

Mgbe ahụ, n’ezie, ọ dịghị onye kwesịrị iche na ya pụrụ ileghara iwu Chineke anya ma rịọ nnọọ Chineke mgbaghara na-esighị n’obi mgbe ọ na-achọ ịgbanahụ ihe ndị si n’omume ya pụta. (Joshua 24:19) Ọtụtụ ndị n’Israel oge ochie chere na ha pụrụ ime otú ahụ. Ha emeghị mgbanwe. Nzube Chineke ji enwe ndidi ma na-anagide ihe funahụrụ ha. Chineke agbachighị omume ọjọọ ha nkịtị ruo mgbe ebighị ebi.—Aịsaịa 1:16-20.

Bible na-egosi na iji zere ikpe ikpeazụ nke Chineke, mmadụ aghaghị ‘ichegharị’—ya bụ, iji obi mwute nakwere ọnọdụ ezughị okè ya nke ime mmehie n’ihu Chineke, mgbe ahụkwa si n’ihe ọjọọ wezuga onwe ya n’ezie. (Ọrụ 3:19-21) Mgbe ahụ, na-adabere n’àjà mgbapụta Kraịst, Jehova Chineke ga-agbaghara ya. (Ọrụ 2:38; Ndị Efesọs 1:6, 7) N’oge nke ya, Chineke ga-ewepụ ihe ọjọọ nile mmehie Adam rụpụtara. A ga-enwe “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ebe ọ na-agakwaghị anagide “ịdị adị . . . nke ihe ndị na-eti mkpu ka a laa ha n’iyi.” (Mkpughe 21:1-5; Ndị Rom 9:22, Phillips) Lee ihe magburu onwe ya ga-esi na ndidi dị ukwuu nke Chineke, nke nwere njedebe, pụta!

[Foto dị na peeji nke 19]

Chineke kwere ka Adam na Iv mụọ ụmụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya