Gee Ntị Ma Mụta Ihe
“ANYỊ mụtara pasent 85 nke ihe anyị maara site n’ige ntị,” ka otu akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Toronto Star na-ekwu. Ọ bụ ezie na anyị na-eji ihe ka ukwuu n’oge anyị ege ntị, a na-adọpụ uche anyị ma ọ bụ anyị na-echewa ihe ọzọ ma ọ bụ na-echezọ pasent 75 nke ihe anyị nụrụ. Ndekọ ọnụ ọgụgụ a na-adọrọ mmasị na-emesi ike mkpa ọ dị ịzụlite ikike ige ntị anyị.
“Ọ bụ enwechaghị nkà ige ntị na-akpata ọtụtụ nsogbu ndị a na-enwe n’etiti ọha mmadụ,” ka akụkọ ahụ kwuru. Rebecca Shafir, bụ́ ọkà n’ịkọwa ihe banyere nsogbu ikwu okwu na ọkachamara n’ihe banyere nkwurịta okwu, kweere na ọ bụ ya na-akpatakarị igbu onwe onye, ime ihe ike n’ụlọ akwụkwọ, ntịsa ezinụlọ, na ịṅụ ọgwụ ọjọọ.
Ndị ọkà mmụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-ekwu na ndị mmadụ nwere ụzọ dị iche iche ha si ege ntị. Ụfọdụ ndị na-enwekarị mmasị n’ige akụkọ banyere ndị mmadụ, ha na-enwekwa mmasị ịnụtacha ihe nile na-adọrọ mmasị n’akụkọ. Ndị ọzọ na-enwekarị mmasị n’ige ntị n’ihe ndị mere n’akụkọ, ha na-achọkwa ka onye na-akọ akụkọ ahụ gaa kpọmkwem n’ihe a chọrọ. “N’ihi ya, ná mkparịta ụka dị n’etiti onye na-enwekarị mmasị n’ige akụkọ banyere ndị mmadụ na onye na-enwekarị mmasị n’ige ihe ndị mere n’akụkọ, a pụrụ inwe ọnọdụ nke na ọ dịghị onye ga-ekwu ihe ibe ya na-anụ,” ka Star ahụ na-ekwu.
E nwere ezi ihe mere Jizọs ji mesie ike mkpa ọ dị ‘ilezi anya otú i si aṅa ntị.’ (Luk 8:18) Ige ntị nke ọma na-egosi na mmadụ nwere àgwà ọma. Ọ bụ akụkụ dị oké mkpa nke nkwurịta okwu na-aga nke ọma. Aro ndị dị irè banyere ụzọ isi gee ntị mgbe a na-enwe nkwurịta okwu na-agụnye ileghara ihe ndị na-adọpụ uche anya, ịnọlite anọlite, na ịzaghachi n’ụzọ dị mma site n’ile onye nke ọzọ anya n’anya na ikwe n’isi. Ebe ọ bụ na ihe ka ukwuu n’ihe anyị na-amụta dabeere n’ige ntị nke ọma, anyị nile aghaghị ịnọgide na-arụ ọrụ n’otú anyị si ege ntị.