Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g04 8/8 p. 24-25
  • Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Ụkpụrụ Omume Ọma?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Ụkpụrụ Omume Ọma?
  • Teta!—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Ị Ga-esi Chebe Onwe Gị Pụọ n’Ịbụ Onye E Gwuru Wayo
    Teta!—2004
  • Ilekwasị Ndị Agadi Anya
    Teta!—1997
  • Gịnị Ka Achụmnta Ego Gị Ga-efu Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Igwu Wayo—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2004
g04 8/8 p. 24-25

Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Ụkpụrụ Omume Ọma?

ANYỊ bi n’ụwa ebe ụkpụrụ omume na-agbanwe agbanwe. A na-elegharazi omume akwụwaghị aka ọtọ ndị a na-akatọ n’oge gara aga anya taa. N’usoro mgbasa ozi, a na-emekarị ka ndị ohi na ndị wayo yie ndị ọma na ndị dike. N’ihi ya, ọtụtụ mmadụ kwekọrọ ná nkọwa e nyere na Bible: “Ị [hụrụ] onye ohi, ihe ya ewee tọọ gị ụtọ.”—Abụ Ọma 50:18.

Ma, e kwesịtụghị inwe mmasị n’ebe ndị wayo nọ. Otu onye edemede kwuru, sị: “Otu ihe [na-eme] ka ndị wayo pụọ iche bụ ikike ebumpụta ụwa ha nwere, bụ́ nke a na-achọpụtakarị n’oge ha dị nnọọ obere, iji na-aghọgbu ndị nọ ha nso. Ihe ọzọ bụ eziokwu ahụ bụ́ na aghụghọ dị otú ahụ adịtụghị eme ka ha nwee obi amamikpe ma ọ bụ kwaa ụta. N’ụzọ dị iche, ọ na-eme ka ha nwee nnọọ afọ ojuju—ụdị obi ụtọ nke na-agba ha ume ịnọgide na-aghọ aghụghọ iji nweta ihe ọ bụla ha chọrọ, n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu onye ha na-aghọgbu.”

N’eziokwu, ọha na eze na-enwe ọmịiko n’ebe nwanyị di ya nwụrụ nke e gwunaara ego o jiri biri nọ, ma, ọ bụ mmadụ ole na ole na-enwe ọmịiko mgbe mmadụ riri ego nnukwu ụlọ ọrụ achụmnta ego ma ọ bụ gwuo ụlọ ọrụ inshọransị wayo. Ọtụtụ mmadụ na-ekwubi na nnukwu ụlọ ọrụ achụmnta ego bụ ite ego n’onwe ha. Ma ụdị wayo ahụ adịghị abụ nanị nsogbu dịịrị nnukwu ụlọ ọrụ achụmnta ego ahụ n’onwe ha; ha na-ebufe mfu ha n’isi ndị ahịa ha. Dị ka ihe atụ, na United States, ezinụlọ na-eriju afọ na-akwụ ihe karịrị 1,000 dollar kwa afọ dị ka ego ntụkwasị n’ego inshọransị iji kwụchie ego ndị wayo gwunaara ụlọ ọrụ inshọransị.

Ọzọkwa, ọtụtụ mmadụ na-eji ohere ndị dapụtaranụ azụ ngwá ahịa adịgboroja ndị e gburu ná ntụ, ndị dị ka uwe, elekere mgbanaka, senti, ihe ntecha, na akpa a na-ese n’aka. Ha pụrụ ịchọpụta na ngwá ahịa adịgboroja na-efu nnukwu ụlọ ọrụ achụmnta ego ọtụtụ ijeri dollar kwa afọ, ma ha na-eche na ọ dịghị emetụta ha. Otú ọ dị, mee elu mee ala, ndị ahịa aghaghị ịkwụ ego ka ukwuu maka ngwá ahịa bụ́ ezigbo ya nakwa ozi e jeere ha. Tụkwasị na nke ahụ, ịzụ ngwá ahịa adịgboroja na-eme ka ego na-aba n’akpa ndị omempụ.

Otu onye edemede nke nọ n’ọrụ nke igbochi wayo dere, sị: “Ekwenyesiri m ike na isi ihe mere e ji nwee ọtụtụ wayo taa bụ n’ihi na anyị na-ebi n’ụwa nke na-adịtụghị agbaso ụkpụrụ omume ọma. E nwewo ndalata dị njọ n’ụkpụrụ omume ọma bụ́ nke mere ka e nwee ụwa e ji wayo mara. . . . Anyị bi n’ụwa ebe a na-adịghị akụzi ụkpụrụ omume n’ebe obibi. Anyị bi n’ụwa nke na-adịghị akụzi ụkpụrụ omume ọma n’ụlọ akwụkwọ, n’ihi na a ga-ebo ndị nkụzi ebubo na ha na-akụzi ụkpụrụ omume ọma.”

N’ụzọ dị iche, Ndịàmà Jehova na-akụzi ma na-agbalịsi ike ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume ndị dị n’Okwu Chineke. Ọ bụ ụkpụrụ ndị dị ka ndị a na-eduzi ha:

● “Ị ghaghị ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”—Matiu 22:39.

● “Erigbula mmadụ.”—Mak 10:19.

● “Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi, kama ka ọ rụsie ọrụ ike, na-eji aka ya arụ ọrụ ọma, ka o wee nwee ihe ọ ga-ekenye onye nọ ná mkpa.”—Ndị Efesọs 4:28.

● “Anyị na-achọ ịdị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.”—Ndị Hibru 13:18.

Ọ bụ ezie na Ndịàmà abụghị ndị onwe ha juru afọ ma ọ bụ ndị ezi omume n’anya onwe ha, ha kweere na ọ bụrụ na mmadụ nile agbasoo ụkpụrụ ndị a, ụwa ga-abụ ebe ka nnọọ mma obibi. Ha kwekwaara ná nkwa Chineke bụ́ na otu ụbọchị ọ ga-adị otú ahụ.—2 Pita 3:13.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 25]

Ọ bụrụ na mmadụ nile ebie ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume ndị dị n’Okwu Chineke, ụwa ga-abụ ebe ka nnọọ mma obibi

[Foto dị na peeji nke 24]

Ezi Ndị Kraịst na-agbaso ụkpụrụ Bible, ndị dị ka “Ị ghaghị ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya