Ilekwasị Ndị Agadi Anya
LEZIE anya. Ndị ọkà wayo emewo nkwadebe. Ha maara ihe ndị na-eme ndị agadi ndị kasị mma ilekwasị anya maka nghọrị. N’ime United States, dị ka ihe atụ, ndị gafeworo afọ 65 mejupụtara nanị 12 pasent nke ụba mmadụ. Ma, ha nwere ngụkọta nke ihe karịrị ijeri $800 ha na-enweta n’onwe ha, na-emejupụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 70 pasent nke nchịkọta akụ̀ na ụba dum nke ezinụlọ ndị dị na United States. N’ụzọ na-adịghị eju anya, ndị agadi dị otú ahụ mejupụtara ihe dị ka 30 pasent nke ndị nile a na-egwu wayo.
Gịnị na-eme ka ndị agadi dị mfe inweta? “Ha na-atụkwasịkarị ihe obi dị ka okike si dị, ha nwekwara ike ghara ịma banyere itinye ego n’azụmahịa n’oge a,” ka magazin bụ́ Consumers’ Research na-akọwa. Otu onye ọrụ uwe ojii kwara arịrị na wayo azụmahịa telifon “na-erigbukarị ndị owu na-ama na ndị dị mfe nnweta—ndị agadi—ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị a na-enweta. Ndị a bụ ndị tolitere n’oge mgbe ikwe n’aka mmadụ dị nnọọ mma ka okwu ọnụ ya.” E hotara otu onye nnọchiteanya nke Òtù Ndị Laworo Ezumike Nká nke America dị ka onye kwuru, sị: “Ọtụtụ mgbe a na-ekwu na anyaukwu ga-etinye gị ná nsogbu. N’ebe ndị agadi nọ, ọ bụghị anyaukwu. Egwu imefucha ego ha ná ndụ na-atụ ha. Ha achọghị ịbụrụ ụmụ ha ibu arọ. Mgbe ahụ ha na-atụ egwu ime mkpesa maka [wayo ahụ] n’ihi na ha na-atụ egwu na ụmụ ha ga-eche na ha apụghị ilekọta onwe ha.”
Ọ bụghị mgbe nile ka ọ na-abụ na a ghọgburu ma ọ bụ duhie ndị agadi e gwuru wayo. N’ọnọdụ ụfọdụ owu na-ama ha, ikekwe na-enwe mkpa “ịzụta” ọbụbụenyi. N’otu ógbè e ji ire ụtọ mee ka ụmụ nwanyị ụfọdụ di ha nwụrụ bụ́ ndị owu na-ama buru ụzọ kwụọ $20,000 maka “mmụta ịgba egwú nke ruru oge ndụ dum,” ka otu onye nta akụkọ akwụkwọ akụkọ dere. “Ike adịghị ụfọdụ ma ọlị ịga ije. Ọ bụghị na ha amaghị ihe a na-akọ, nanị na o ji ha ná njọ.” Otu ụlọ ịgba egwú na-enye ndị ọhụrụ debanyere aha ebe ha ga-aga iji soro ndị enyi ha nwetara ọhụrụ nọkọọ, ọtụtụ mgbe ndị ọgbọ ha. Onye ahịa bụ́ nwa amadị onye na-ajagbu mmadụ ná mma, onye nwere ire ụtọ, onye pụkwara ije ozi dị ka onye na-akụziri ha ịgba egwú, siri ike iguzogide.
Zute Ndị Nghọrị Japan
Ụfọdụ ndị nghọrị na-aghọrị ndị agadi owu na-ama n’ụzọ ndị ọzọ. Na Japan ndị ọkà wayo na-enweghị ụkpụrụ emewo ka hà bụ ndị na-eche banyere mmadụ, na-ewepụta oge iso ndị agadi ha nwetara kwurịta okwu, na-ege ha ntị. Nwayọọ nwayọọ ha na-emewanye nleta, mgbe ha nwetakwara obi ike nile nke onye ha lekwasịrị anya, ha na-akwalite ahịa wayo. Otu ihe atụ yiri ibe ya nke atụmatụ wayo dịgasị otú ahụ bụ otu wayo ọlaedo ebe a kọrọ na a ghọnaara ihe dị ka mmadụ 30,000, gụnyere ọtụtụ ndị na-anara ụgwọ ezumike nká, ijeri 200 yen (ijeri $1.5). “Ohere Adịghị Maka Inwetaghachi Ihe Funahụrụ Ndị A Ghọrịrị,” bụ isiakụkọ Asahi Evening News nke Japan.
Asahi Shimbun nke Tokyo kọrọ banyere okwu a: Otu nwanyị katatụrụ ahụ na-ere ahịa letara otu agadi nwoke, na-asị: “Ana m eche banyere gị, Maazị K. karịa ọrụ m, n’ihi na i bi nanị gị.” O gere ntị n’ọtụtụ akụkọ ya, ire ọma nwanyị ahụ duhiekwara ya. Ka ọ na-apụ, ọ rịọrọ maka ikike ịbịa n’echi ya. “Nsogbu adịghị,” ka nwoke ahụ zara.
Nleta mgbe mgbe sochiri; ha ga-erikọ nri anyasị ọnụ, ọbụna na ọ na-ewetara Maazị K. nri. “Aga m elekọta gị ruo mgbe ị nwụrụ,” ka o kwere ná nkwa. O wee kpọtụọ: “Aga m elekọtara gị ala na ụlọ gị. Ụlọ ọrụ m na-arụrụ ọrụ ka wepụtara ụzọ uru dị na ya nnọọ mmadụ isi jiri ala na ụlọ ya mee ihe.” Atụmatụ ahụ chọrọ ka o jiri ala na ụlọ ya gbaziri ego, zụrụ ùkwù ọlaedo, ma tinye ya n’aka ụlọ ọrụ ya. E siwo ọnyà ahụ. Maazị K. ghọrọ onye ọzọ sonyere n’ọtụtụ ndị a ghọrịrị. Ozugbo azụmahịa ahụ gasịrị, nwaada ahụ abịakwaghị ọzọ.
“Dị ka onye soja,” ka Maazị K. kwuru, “anọrọ m n’ọnụ ọnwụ. Ma o siri ike ọbụna karị ịbụ onye a ghọnaara ala na ụlọ m site n’aka onye ji adịghị ike anyị bụ́ ndị agadi bi nanị ha, ndị na-enweghị ndị ikwu ọ bụla ịdabere na ha, na-emere nri. O yiri ka ụwa erutewo n’ọgbọ ebe ndị mmadụ na-achọ ego, ọbụna site n’ụzọ wayo.”
Ịghọrị Ndị Agadi n’Itali
Akwụkwọ bụ́ L’Italia che truffa (Itali Na-eme Nghọrị) kọrọ banyere nnukwute atụmatụ ndị nghọrị n’Itali chepụtara iji ghọnarịsịa ndị agadi ihe ndị dị oké ọnụ ahịa ha kpakọbara. Na 1993 e hiwere otu gọọmenti nke onye bụbu gọvanọ nke Ụlọ Akụ̀ Itali nọ n’isi ya. Mbịanye aka ya, dị ka o kwesịrị, dị n’akwụkwọ ego (ndị o doro anya na a ka ji ha eme ihe) ndị e wepụtara n’oge ọ bụ gọvanọ. Mgbe ha bịarutere n’ọnụ ụzọ ụfọdụ ndị agadi, ụfọdụ ndị nghọrị, ndị na-akọwa onwe ha dị ka ndị ọrụ Ụlọ Akụ̀ Itali ma na-eji kaadị nkọwa ndị bụ adịgboroja anwapụta ya, na-agwa onye ọ bụla ha ghọrịrị, sị: “Ị maara na gọvanọ Ụlọ Akụ̀ Itali aghọwo onye isi oche nke Òtù Ndị Minista; ya mere, mbịanye aka ya dị n’akwụkwọ ego adịkwaghị irè. Anyị nwere ibu ọrụ ịchịkọta akwụkwọ ego ochie nile site n’aka ezinụlọ dị iche iche ma jiri ndị ọhụrụ onye nọchiri ya bịanyere aka na ha dochie ha . . . Nke a bụ risit. Jiri akwụkwọ a gaa n’ụlọ akụ̀ gị nwanne echi, ị ga-anatakwa ọnụ ego i nyeworo anyị ugbu a.” Site n’atụmatụ a, ndị nghọrị ahụ nakọtara nde lire 15 (ihe dị ka $9,000) n’otu ụbọchị!
Ụfọdụ ndị nghọrị n’Itali na-ejekwu ndị na-adịghị eleru anya, gụnyere ndị agadi, n’okporo ámá. Ha na-agwa ndị na-amaghị ihe na-eme ka ha sonye n’otu nnyocha ma nye ha akwụkwọ ka ha bịanye aka, na-asị na mbịanye aka ha bụ nanị iji nwapụta na ha keere òkè ná nnyocha ahụ. N’ezie, ha na-abịanye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta nke na-achọ ka ha mee otu ihe ma ọ bụ zụrụ otu ihe.
E mesịa, mgbe nwa oge gasịrị, onye ahụ na-anata ngwugwu nke ihe ụfọdụ, ikekwe na-enwe ịdọ aka ná ntị dị mfe ịhụ n’ihe mfuchi ya nke na ọ bụrụ na a jụ ihe ahụ, a ga-achọ ụzọ taa ya ahụhụ. Ụjọ na-ejide ụfọdụ, karịsịa ndị agadi, na-eche na ọ ga-aka mma ịkwụ ụgwọ dịtụ nta ma debe ihe ndị ahụ na-abakebeghị uru karịa ịbụ onye a kpụụrụ gaa ụlọikpe.
Ruo ókè hà aṅaa ka nghọrị gbasaruru n’Itali? Dị ka L’Italia che truffa na-ekwu, ọnụ ọgụgụ nghọrị a na-eme mkpesa ya na-eru ihe dị ka 500,000 n’otu afọ. Ọ dịkarịa ala a dịghị eme mkpesa okpukpu atọ nke ọnụ ọgụgụ nghọrị ahụ. Otu odeakụkọ TV kwuru, sị: “Ngụkọta ya bụ ihe dị ka nde ọnyà abụọ nke ụdị nile kwa afọ, ma ọ bụ ihe dị ka puku ise ruo isii n’otu ụbọchị.”
Otú a ka ọ na-adị. Ọ dịghị ọgbọ (ma ọ bụ ìgwè agbụrụ, mba, ma ọ bụ ebo, ma e kwuwerị) nke ndị ga-aghọnara ndị mmadụ ego ha—ọtụtụ mgbekwa ihe ha kpadoro ná ndụ ha—na-eleghara anya. Kpachara anya! Ọ pụrụ ime gị.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 24]
Ụzọ Isi Zere Ịbụ Onye A Ghọrịrị
Ọ BỤGHỊ òtù azụmahịa telifon nile na-aghọ aghụghọ. N’ime United States, dị ka ihe atụ, e nwere ụlọ ọrụ 140,000 aka ha dị n’azụmahịa telifon na 1994, dị ka Òtù Ndị Laworo Ezumike Nká nke America (AARP) na-ekwu. A na-eme atụmatụ na 10 pasent, ma ọ bụ 14,000, n’ime ha bụ ndị wayo. Ya mere, ọ dị mkpa ịmụrụ anya mgbe a na-ekwu ihe na-ebu isi. Ndị a bụ aro ụfọdụ iji nyere gị aka izere ịbụ onye ndị azụmahịa telifon ghọrịrị.
◆ Ọ bụrụ na mmadụ akpọọ ịgwa gị na i ritewo onyinye n’efu, ikekwe ihe kasị mma ị pụrụ ime bụ ịtọgbọ fon ahụ.
◆ Ọ bụrụ na onye azụmahịa telifon esie ọnwụ ka ị zụrụ ihe taa ma ọ bụghị ya oge ga-agafe, nke a na-abụkarị ihe mgbaàmà na ihe ahụ bụ aghụghọ.
◆ Chebe nọmba kaadị ịzụ ihe n’aka gị. Enyela ya ndị ị na-amaghị bụ́ ndị na-akpọtụrụ gị ịrịọ ego.
◆ Azụla ihe ọ bụla na telifon ọ gwụla ma ọ bụ gị kpọrọ ma soro ụlọ ọrụ na-ezite ngwá ahịa bụ́ nke ị maara a na-anụ aha ya, na-emekọ ihe.
Ọ dị ndị nwere ụlọ mkpa ịkpachara anya maka wayo ndozi ụlọ. Ndị a bụ ịdọ aka ná ntị ole na ole, dị ka Òtù Ihe Ndị Metụtara Ndị Ahịa nke AARP setịpụrụ:
◆ Egola onye ị na-amaghị ọrụ ọ gwụla ma i nyochasịwo ihe nnwapụta ya; jụọ maka aha na nọmba telifon nke ndị ọzọ ọ rụwooro ọrụ.
◆ Abịanyela aka n’ihe ọ bụla n’ejighị nlezianya nyochaa ya, jidekwa n’aka na ị ghọtara ma kwenye n’ihe nile e setịpụrụ ná nkwekọrịta ọ bụla.
◆ Adaberela n’onye ọ bụla ịkọwara gị nkwekọrịta ọ gwụla ma ọ bụ onye ị maara ma tụkwasị obi. Jiri aka gị gụọ ihe ndị dị inyoghị inyoghị.
◆ Ebula ụzọ kwụọ ụgwọ maka ndozi ihe. Hụ na a rụsịwo ọrụ ahụ otú juru gị afọ tupu ị na-akwụcha ụgwọ.
Mụrụ anya. Jiri akọ na-eme ihe. Egbula oge ịsị mba ma ọ bụrụ na i nweghị mmasị n’ịzụrụ ihe. Chetakwa: Ọ bụrụ na ihe e kwuru eyie nke na-ebu isi, ma eleghị anya ọ bụ wayo.
[Foto dị na peeji nke 23]
Ndị ọkà wayo pụrụ ime ka hà na-eche banyere ndị mmadụ, iji ghọrịa ndị agadi